• All e-books and audiobooks on The New Life Mission website are free
  • Explore multilingual sermons in global languages
  • Two new revised editions in English have been released
  • Check out our website translated into 27 languages
Search

Sermons

Isi-okwu 1 : Nmehie

[1-1] Ayi Aghaghi Ibu Uzọ Mara Bayere Nmehie Ayi ka Ewe B͕aputa-ayi (Mak 7:8-9, 20-23)

Ayi Aghaghi Ibu Uzọ Mara Bayere Nmehie Ayi ka Ewe B͕aputa-ayi (Mak 7:8-9, 20-23)(Mak 7:8-9) 
“‘Unu nārapu ihe Chineke nyere n’iwu, jide kwa ozizí madu nyere n’aka-unu idebe. O we si ha, Unu nāju ihe Chineke nyere n’iwu nke-ọma, ka unu we debe ozizí nke enyere n’aka-unu idebe.’” 
 
(Mak 7:20-23)
“O we si, Ihe nke si nime madu puta, nke ahu nēmeru madu. N’ihi na n’ime, bú n’obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche: ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa, ha nēmeru madu.” 
 
 
Na mbu, m’gāchọ ikọwa ihe nmehie bu. Enwere ọtutu nmehie nke Chineke nākọwa, enwe-kwa-ra ọtutu nmehie madu nākọwa. Okwu ahu bú nmehie, n’asusu Grik, putara ‘enwetaghi akàrà ahu’. Ọ putara, emeghi ihe n’ebe ọ di nma. Ọ bu nmehie ma ọ buru na ayi adighi-eso ihe nile Chineke nyere n’iwu nke-ọma. Ka ayi lebà anya n’otù madu si kọwa nmehie.
 
Gini bu nmehie?
Ọ bu aṅaghi nti n’ihe nile Chineke nyere n’iwu.
 
Ayi nāgukọta nmehie dika n’akọ-na-uche-ayi si di. Ya bu, ọ bughi nmejọ megide ihe Chineke nyere n’iwu kama ihe ekpere ikpé-ya dika ebe madu si puta, obi, na akọ-na-uche ya. 
Ọ bu ihe anēkpe ikpé-ya site n’aka onye ọ bula n’otù n’otù. Ya mere, otù ọlu ka agāgu ma-ọbu ghara igu na nmehie, site n’otù ọkọlọtọ nile nke otù onye si di. Ya mere Chineke nyeworo ayi ihe di 613 nke Iwu ahu ka ọ buru otù ọkọlọtọ n’ihi ikpé.
Ihe-osise a di n’ala nēgosi nmehie nke madu.
 
Iwu mba, iwu ndi-obodo
Akọ-na-uche madu
Iwu Chineke
omume na omume-ọra nile
 
Ya mere, ayi ekwesighi ma-ọli ime ka ọkọlọtọ nile guzo n’akọ-na-uche-ayi. 
Nmehie nke akọ-na-uche-ayi adabeghi n’ihe Chineke kọwaworo dika nmehie. Ya mere, ayi ekwesighi iṅa nti n’akọ-na-uche-ayi, kama me ka ọkọlọtọ nke nmehie dabere n’ihe nile Chineke nyere n’iwu.
Onye ọ bula nime ayi nwere uche nke aka-ya bayere ihe nmehie bu. Ufọdu nāgu ya na erughi-eru-ha ma ndi ọzọ nāgu ya na omume di njọ. 
Dika ihe-atù, na Korea, anāgu-ya dika ọlu nye umu iji ahihia kpuchie ílì ndi muru-ha, idozi ahihia ahu we lekọta kwa ílì ahu rue mb͕e ha onwe-ha nānwu. Kama na nke otù ab͕uru ochie na Papua New Guinea, ha nāsọpuru ndi muru ha nwuru anwu site n’ikesa anu-aru ahu n’etiti ndi èzí-na-ulo-ha nile we nēri kwa ya. (Amaghm ka ha nēsi ma-ọbu anaghi-esi-ya anu-aru ahu nwuru anwu tutu ha nēri-ya.) Ọ di ka ichọ ib͕ochi ikpuru iri anu-aru ahu. Ome-n’ala ndia nēgosi na uche madu bayere ihe nmehie bu di iche iche n’ọtutu ebe. 
Ya mere ọ di kwa otù ahu n’ihe bu ezi ihe na ihe bu nmehie. Otú ọ di, Bible nāgwa ayi na ihe bu nmehie bu aṅaghi nti n’ihe nile Chineke nyere n’iwu. “‘Unu nārapu ihe Chineke nyere n’iwu, jide kwa ozizí madu nyere n’aka-unu idebe. O we si ha, Unu nāju ihe Chineke nyere n’iwu nke-ọma, ka unu we debe ozizí nke enyere n’aka-unu idebe.” (Mak 7:8-9). Chineke enweghi nmasi otù ihe anya nāhu nke anu-aru-ayi di. Ọ nēle anya n’etiti obi-ayi.
 
 
Ọkọlọta Nke Madu Bu Nmehie N’Iru Chineke 
 
Gini bu nmehie jọkariri njọ?
Ọ bu ilefu Okwu Chineke anya.
 
Ka m’gwa gi ihe nmehie bu n’iru Chineke. Ọ bu idà ibi ndu dika ihe Ọ nāchọ si di. Ọ bu ekweghi n’okwu-Ya. Chineke siri na ọ bu nmehie ibi ndu dika ndi-Farisi, ndi juru ihe Chineke nyere n’iwu tiye kwa nkpà karia n’ozizí nile nke ome-n’ala-ha. Jisus guru ndi-Farisi ibu ndi-iru-abua. 
“Òle Chineke unu kwere na Ya? Ùnu nātu egwum nēweli kwam elu n’ezie? Unu nēji aham afuli elu, ma ùnu nāsọpurum n’ezie?” Ndi madu nēle ihe anya nāhu we nēlefu Okwu-Ya anya. Ọ bu kwa nmehie n’iru-Ya. Nmehie jọkariri njọ bu ilefu Okwu-Ya anya. Ùnu mara bayere nka? Nka ahu bu nmehie jọkariri njọ n’etiti nmehie nile.
Adighi-ike-ayi bu nání ihe ita-uta-ayi, nání ndahie nile. Ihe nile hiere-uzọ nke ayi nēme na ajọ ihe ayi nēme n’ihi ezughi-okè ayi abughi isi nmehie, kama ihe-ita-uta. Chineke nākpa ókè n’etiti nmehie na ihe-ita-uta. Ndi nke nēlefu Okwu-Ya anya bu ndi-nmehie, ọbuná na ma ọ buru na ha enweghi ihe-ita-uta. Ha bu oké ndi-nmehie n’iru Chineke. Nka mere Jisus ji bara ndi-Farisi nba.
Na Pentateuch site na Jenesis rue na Deuteronomi, enwere ihe nile enyere n’iwu nke nāgwa ayi ihe ayi gēme na ihe ayi agaghi eme. Ha bu Okwu Chineke, ihe nile O nyere n’iwu. Ayi apughi idebe ya 100%, kama ayi kwesiri imazu ha dika ihe nile O nyere n’iwu. O nyeworo-ayi ha nile site na mbu, ayi aghaghi kwa inabata-ha dika o si di.
“Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke dikwara, Okwu ahu buru kwa Chineke” (Jọn 1:1). Mb͕e ahu Ọ si, “Ka ihè di: ìhè we di” (Jenesis 1:3). Ọ kere ihe nile. O me-kwa-ra ka Iwu ahu guzo. 
“Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n’etiti ayi, Okwu ahu buru kwa Chineke” (Jọn 1:1, 14). Chineke, mb͕e ahu, gēsi aṅa gosi Onwe-ya nye ayi? Ọ nēgosi Onwe-ya nye ayi site n’ihe nile O nyere n’iwu. Chineke bu Okwu ahu, Ọ nēgosi Onwe-ya site n’ihe nile O nyere n’iwu. Chineke bu Mọ ahu. Gini ka ayi nākpọ kwa Bible? Ayi nākpọ ya Okwu Chineke.
Asiri n’ebe a, “Unu nārapu ihe Chineke nyere n’iwu, jide kwa ozizí madu nyere n’aka-unu idebe.” Enwere ihe di 613 nime Iwu-Ya. I gēme nka i gaghi eme kwa nka ahu, sọpuru ndi muru gi, etc. Na Levitikọs, ọ nēkwu na nwanyi aghaghi ime otú a na nwoke kwesiri ime kwa otú a na ihe agēme mb͕e anu-ulo nādabà nime olùlù, etc. Enwere ihe di 613 di otù a, Iwu-Ya.
Kama n’ihi na ha abughi okwu madu, ayi kwesiri itughari uche nime ha mb͕e nile. Ayi kwesiri iṅa Chineke nti ọbuná ayi apughi kwa idebe Iwu-Ya nile, na nke ntà ayi kwesiri imazu ha. 
Ènwere otù ebe n’Okwu Chineke nke adighi nma? Ndi-Farisi ahu rapuru ihe Chineke nyere n’iwu. Ha we jide ozizí madu nyere n’aka-ha idebe kari ihe O nyere n’iwu. Okwu nke di okenye ha di ha nkpà kari okwu nile Chineke. Ọ di otú a mb͕e amuru Jisus. Jisus nākpọ ya asi karicha mb͕e ndi madu nēlefuru Okwu Chineke anya.
Chineke nyeworo ayi ihe di 613 nke Iwu ahu izí ayi Ezi-okwu ahu, Ọ bu Chineke-ayi, ihe nmehie nile ayi bu n’iru-Ya, na igosi ayi idi-nsọ-Ya. Ya mere, n’ihi na ayi bu ndi-nmehie n’iru-Ya, ayi kwesiri ikwere na Jisus onye ezitere si n’ebe Chineke nọ n’ihi ihu-n’anya-Ya nye ayi ma ayi kwesi kwa-ra isi n’okwukwe di ndu.
Ndi nke nārapu Okwu-Ya, na ndi nke ekweghi ekwe bu ndi-nmehie. Ndi apughi idebe Okwu-Ya bu kwa ndi-nmehie, kama irapu Okwu-Ya bu nmehie kachasi njọ. Ha bu ndi nke gējedebe n’ọku-ala-mọ. Ekweghi ekwe bu imehie n’iru-Ya.
 
 

Ihe Mere Chineke Jiri Nye Ayi Iwu ahu 

 
Gini mere Chineke jiri nye ayi Iwu ahu?
Ime ka ayi mazu nmehie nile ayi na ahuhu diri ha
 
Gini mere Chineke jiri nye ayi Iwu ahu? Ọ bu ime ka ayi mazu nmehie nile ayi we laghachikute aka-Ya. O nyere ayi ihe di 613 nke Iwu ahu ka ayi pu imazu nmehie nile ayi ka ewe b͕aputa ayi site na Jisus Kraist. Nka bu ihe mere Chineke jiri nye ayi Iwu ahu.
Ndi Rom 3:20 nāsi, “N’ihi na ọ bu n’aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere.” Ya mere ayi mara na ihe mere Chineke jiri nye ayi iwu ahu abughi ka Ọ manye ayi n’ibi ndu site na ya. 
Mb͕e ahu gini bu ihe-nmazu nke ayi nēnweta site n’aka Iwu ahu? Ọ bu na ayi adighi ike iṅa-chasi Iwu ahu nti n’udi-ha dum na ayi bu ndi-nmehie n’iru-Ya. Gini ka ayi nāmazu site n’aka ihe ahu di 613 nke Iwu-Ya? Ayi nāmazu erughi-eru na enweghi-ike-ayi ibi ndu site n’Iwu-Ya. Ayi nāmazu na ayi, ihe Chineke kère èkè, bu ndi adighi ike. Ayi nāmazu na ayi bu ndi-nmehie n’iru-Ya, na ayi dum kwesiri ijedebe n’ọku-ala-mọ dika iwu-Ya si di.
Mb͕e ayi mazuru nmehie nile ayi na enweghi-ike-ayi, mb͕e ahu gini ka ayi gēme? Àyi gānwa ighọ ndi zuru okè? É-è. Ihe ayi kwesiri ime bu ikwezu na ayi bu ndi-nmehie, kwere na Jisus, ka ewe b͕aputa-ayi site na nzọputa-Ya sitere na miri ahu na Mọ Nsọ, we kele kwa Ya. 
Ihe mere O jiri nye ayi Iwu ahu bu ime ka ayi mazu nmehie nile ayi na ahuhu diri nmehie ndia ahu ka ayi we mara na apughi izọputa-ayi n’ọku-ala-mọ ma ewezuga Jisus. Ọ buru na ayi kwere na Jisus dika Onye-nzoputa-ayi, agāb͕aputa-ayi O nyere ayi Iwu ahu izọputa ayi.
O nyere ayi Iwu ahu ime ka ayi mata otù ayi si buru ndi-nmehie zuru okè ka ewe zọputa kwa nkpuru-obi-ayi na nmehie. O nyere ayi Iwu ahu we ziga Jisus izọputa ayi. O zigara Ọkpara nke-aka-Ya ibupu nmehie nile ayi site na Baptism. Apu-kwa-ra izọputa ayi site n’ikwere na Ya.
Ayi aghaghi imazu na ayi ndi-nmehie nēnweghi olile-anya we kwesi kwa ikwere na Jisus ka ewe me ka ayi si n’orù nmehie pua, ghọ umu-Ya we nyeghachi Chineke otutu. 
Ayi kwesiri ighọta Okwu-Ya. Nmalite nile sitere na Ya. Ayi kwesi-kwa-ra imalite n’Okwu-Ya we ghọta kwa ezi-okwu ahu nke nb͕aputa site n’Okwu-Ya. Ayi kwesiri ichè èchìchè we kpe kwa ikpé site n’Okwu-Ya. Nka bu okwukwe di nma we zie kwa ezi.
 
 
Gini bu ihe di n’Obi Ndi Madu? 
 
Gini ka ayi kwesiri ime n’iru Chineke?
Ayi kwesiri ikwezu nmehie-ayi we riọ Chineke ka Ọ zọputa-ayi. 
 
Okwukwe kwesiri imalite na Okwu Chineke, ayi kwesi-kwa-ra ikwere na Ya site n’Okwu-Ya. Ọ buru na ọ dighi otú a, ayi gādabà na nduhie. Nka ahu gābu okwukwe ezighi ezi na nke ugha.
Mb͕e ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ huru ndi nēso uzọ Jisus ka ha nēji aka nādighi ọcha nēri achicha, ha ekwesighi ibara ha nba ma ọ buru na ha hururi ya site n’Okwu Chineke. Okwu ahu nāgwa-ayi na ihe ọ bula nābà nime madu site n’èzí apughi imeru ya n’ihi ọ nāga nime afọ, ọ bughi nime obi-ya o we pua kwa. 
Dika asiri na Mak 7:20-23, “O we si, Ihe nke si nime madu puta, nke ahu nēmeru madu. N’ihi na n’ime, bú n’obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche: ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa, ha nēmeru madu.” Jisus siri na ndi nile bu ndi-nmehie n’ihi na amuru ha na nmehie. 
Ì nāghọta ihe nka putara? Amuru ayi dika ndi-nmehie n’ihi na ayi bu npkuru Adam. Kama ayi apughi ihu ezi-okwu ahu n’ihi na ayi anabataghi ma-ọbu kwere n’Okwu-Ya nile. Gini bu ihe di n’obi madu?
Ka ayi lebà anya na Mak 7:21-22. “N’ihi na n’ime, bú n’obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche.” Ihe ndia nile nēsi n’obi madu aputa we nēmeru ya we meru kwa ndi ọzọ. 
Edekọworo ya n’Abù Ọma, “Mb͕e m’huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi, Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; Gini ka madu bu, na I nēcheta ya; Na nwa nke madu, na I nēleta ya?” (Abù Ọma 8:3-4) 
Gini mere O ji leta ayi? O letara ayi n’ihi na Ọ huru ayi n’anya. O kere ayi, hu ayi n’anya, we nwe kwa obi ebere nye ayi bú ndi-nmehie. O hichapuru nmehie nile ayi we me ayi ndi-Ya. “Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n’uwa nil! Gi Onye tiyeoworo ebube-Gi n’elu ígwé.” (Abù Ọma 8:1) Eze Devid buru abù na Testament Ochie mb͕e ọ mazuru na Chineke gāghọ Onye-nzọputa ndi-nmehie. 
Na Testament Ọhu, Onye-ọzi Pọl kwu-kwa-ra otu ihe ahu. Ọ bu ihe di itu-n’anya na ayi, ihe Chineke kère èkè, puru ighọ umu-Ya. Emeworo nka site n’obi-ebere-Ya nye ayi. Nka bu ihu-n’anya Chineke.
Inwa isite n’Iwu Chineke dichasia ndu bu, n’otu uzọ, iru-Ya aka n’anya. Ọ bu kwa èchìchè nke nēsite n’amaghi-ihe-ayi. Ọ dighi nma ibi ndu pua n’ebe ihu-n’anya-Ya di ma nāb͕a nb͕a idebe Iwu ahu we nēkpe kwa ekpere. Ọ bu ihe Chineke nāchọ ka ayi kwesi imazu na ayi bu ndi-nmehie site n’Iwu ahu we kwere kwa na nb͕aputa nke miri ahu na ọbara (Mọ Nsọ).
Edeworo Okwu-Ya na Mak 7:20-23, “Ihe nke si nime madu puta, nke ahu nēmeru madu. N’ihi na n’ime, bú n’obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche: ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa, ha nēmeru madu.” 
Jisus siri na ihe nke si nime ndi madu aputa, nmehie di nime, nēmeru ha. Nri Chineke nēnye ayi apughi imeru ndi madu. Ihe nile ekère èkè di ọcha, kama nání ihe nke si nime madu aputa, ya bu, nmehie-ya nile, nēmeru ya. Amuworo ayi nile dika nkpuru Adam. Mb͕e ahu esi aṅa mua ayi? Eji udi nmehie di iri na abua mua ayi.
Mb͕e ahu, àyi puru ibi ndu nēmeghi nmehie? Ayi gāga n’iru imehie, n’ihi na amuworo-ayi na nmehie. Àyi puru ib͕ochi onwe-ayi imehie nání n’ihi na ayi nāmazu Iwu ahu? Àyi puru idi ndu site n’aka ihe nile enyere n’iwu? É-è.
Dika ayi nānwa, otú a ka ọ nāghọ ihe sikariri ike. Ayi kwesiri imazu erughi-eru-ayi we rapu. Mb͕e ahu, site n’obi di ume-ala, ayi puru inabata baptism na ọbara Jisus, nke nāzọputa-ayi.
Ihe nile di 613 nke Iwu ahu di nma zie kwa ezi. Kama ndi nile bu ndi-nmehie site na mb͕e aturu ime-ha nime afọ nne-ha. Mb͕e ayi matara na Iwu Chineke di nma kama na amuworo ayi dika ndi-nmehie ndi apughi ighọ ndi ezi omume ma-ọli site n’onwe-ayi, ayi gāmazu kwa na ayi nāchọ ọmiko Chineke we nāchọ kwa ka azọputa-ayi site na nb͕aputa Jisus nime miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu. Mb͕e ayi nāmazu erughi-eru-ayi, na ayi apughi ighọ ndi ezi omume site n’onwe-ayi na ayi gāga n’ọku-ala-mọ n’ihi nmehie nile ayi, enweghi ihe ayi gēme kari idabere na nb͕aputa Jisus.
Ayi kwesiri imara na ayi apughi izi ezi ma-ọbu ezighi ezi n’iru Chineke site na onwe-ayi. Ya mere, ayi kwesiri ikwezu n’iru Chineke na ayi bu ndi-nmehie ndi akara akàrà iga ọku-ala-mọ, ayi puru ikpe kwa ekpere n’ihi ebere-Ya, “Chineke, biko zọputam na nmehiem nile me-kwa-ram ebere.” Mb͕e ahu, Chineke gēzute ayi n’ezie site na Okwu-Ya. Site n’uzọ a, apuru inaputa ayi.
Ayi nādi elebà anya n’epkere Devid dika Okwu Chineke edeworo. “Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu, Di kwa ọcha n’obi mb͕e I nēkpe ikpe” (Abù Ọma 51:4) 
Devid matara na ọ bu okpotokpo nmehie onye jọrọ njọ rue itubà n’ọku-ala-mọ, kama o kwezuru ya n’iru Chineke, “Ọ buru na I nākpọm onye-nmehie, abum onye-nmehie; Ọ buru na I nākpom onye ezi omume, abum onye ezi omume; Ọ buru na izọputam, agāzọputam; ọ buru kwa na I zigam n’ọku-ala-mọ, m’gējedebe n’ọku-ala-mọ.” 
Nka bu ezi okwukwe. Otú a ka esi azọputa ayi. Otú a ka ayi kwesiri i di ma ọ buru na ayi nēnwe olile-anya idi njikere ikwere na nb͕aputa Jisus.
 
 

Ayi Kwesiri imazu Ihe Nmehie Ayi Bu N’ezie 

 
N’ihi na ayi dum bu umu Adam, ayi dum nwere agu ihe ọjọ n’obi-ayi. Otú ọ di, gini ka Chineke nāgwa ayi? Ọ nāgwa ayi ka ayi ghara ikwa iko. Ayi nwere ib͕u-madu n’obi-ayi, ma gini ka Chineke nāgwa ayi? Ọ nāgwa ayi ka ayi ghara ib͕u madu. Ayi nile nēwesara ndi muru ayi iwe n’obi-ayi, ma Ọ nāgwa ayi ka ayi sọpuru ndi muru ayi. Ayi kwesiri imazu na Okwu-Ya dum zie ezi we di kwa nma, ma ayi dum nwere nmehie n’obi-ayi.
Ọ̀ bu ihe ziri ezi ma ọ bughi? O ziri ezi n’ezie. Ya mere, gini ka ayi gēme n’iru Chineke? Ayi kwesiri ikwezu na ayi bu okpotokpo nmehie, na ndi-nmehie nēnweghi olile-anya. O zighi ezi iche na ayi bu ndi ezi omume nnyahu n’ihi na ayi mere ezi ihe na ayi bu ndi-nmehie ta n’ihi na ayi meworo nmehie ta. Amuworo ayi dika ndi-nmehie. Ihe ọ bula ayi nēme, ayi ka gābu ndi-nmehie. N’ihi nka ekwesiri ib͕aputa-ayi site na miri na ọbara Jisus.
Ayi abughi ndi-nmehie n’ihi ọlu-ayi nile: dika ikwa-iko, ib͕u-madu, ori, etc., kama ayi bu ndi-nmehie n’ihi amuworo ayi dika ndi-nmehie. Amuworo ayi n’udi nmehie nile di iri na abua. N’ihi na amuworo ayi dika ndi-nmehie n’anya Chineke, ayi apughi ighọ ezi ndi ma-ọli site n’ọlu nke aka ayi. Ayi puru nání ime ka ayi bu ezi ndi.
Amuworo-ayi n’uche juputara na dika i b͕u-madu, ori, etc. Ya mere, ayi gēsi aṅa pu ighọ ndi ezi omume nání n’ihi na ayi emeghi nmehie nile ndia n’ezie? Ayi apughi ibu ndi ezi omume ma-ọli n’iru Chineke site onwe-ayi. Ọ buru na ayi nēchè na ayi bu ndi ezi omume, ọ bu iru-abua. Jisus kpọrọ ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ ‘ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ bú ndi-iru-abua’. Amuworo madu nile dika ndi-nmehie. Ha nēmehie n’iru Chineke ogologo ndu-ha nile.
Onye ọ bula nēchè na ọ lughi ọ̀gù ma-ọbu ọ kughi onye ọ bula ihe ma-ọbu ezughi ori ọbuná àgìgá n’aka onye ọ bula na ndu-ya nile nēkwu okwu-ugha n’ihi na amuworo madu nile dika ndi-nmehie. Onye ahu bu onye-ugha, onye-nmehie, na onye-iru-abua. Otú a ka Chineke si ahu ya.
I bu onye-nmehie site n’ọmumu. Ọbuná na i meghi otù nmehie n’omume, akara-gi akàrà ọku-ala-mọ. Ọbuná ma ọ buru na i debeworo ọtutu nime Iwu ahu na ihe nile enyere n’iwu, i ka bu onye-nmehie akara akàrà iga ọku-ala-mọ.
Mb͕e ahu gini bu ihe ayi gēme n’iru udi akara-àkà a? Ayi kwesiri iriọ ọmiko-Ya we dabere na Ya ka ewe zọputa-ayi na nmehie nile ayi. Ọ buru na Ọ zọputaghi ayi, o nweghi ihe ayi puru ime karia iga n’ọku-ala-mọ. Nka bu akara-àkà-ayi.
Ndi nke nānabata Okwu-Ya nēkwezu kwa na ha bu ndi-nmehie n’ezie. Ha mata-kwa-ra na ha bu ndi ezi omume. Ya mere, ha matara n’ilefu Okwu-Ya anya ma ghara imazu Okwu-Ya bu nmehie. Ndi nke nānabata Okwu-Ya bu ndi ezi omume, ọbuná na ha bu ndi-nmehie na mbu. Amuru ha ọzọ site na Okwu-Ya we nara kwa amara-Ya. Ha bu ndi ngọzi gādiri karisia.
 
 
Ndi nke Nānwa ka Ewe b͕aputa-ha site n’Ọlu-ha nke Iwu ka Bu Ndi-nmehie 
 
Òle ndi ka bu ndi-nmehie ọbuná mb͕e ha kweresiri na Jisus?
Ndi nānwa ka ewe zọputa-ha site n’ọlu nke iwu ha
 
Ka ayi gu Ndi Galetia 3:10 na 11. “N’ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n’ọlu nke iwu, ha nọ n’okpuru ọbubu-ọnu: n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n’ihe nile edeworo n’akwukwọ iwu, ime ha. Ma ọ putara ìhè na ọ dighi onye ọ bula anāgu n’onye ezi omume n’iwu n’iru Chineke: n’ihi na, Onye ezi omume gēsite n’okwukwe di ndu;”
Asiri na onye ọ bula nānọgideghi n’ihe nile edeworo n’akwukwọ iwu nọ n’okpuru ọbubu-ọnu. Ndi nke kwere na Jisus ma nānwa ka agu-ha na ndi ezi omume site n’ọlu nile ha nọ n’okpuru ọbubu-ọnu. Òle ebe ndi nānwa igu-ha na ndi ezi omume site n’ọlu nke iwu nānọ? Ha nọ n’okpuru ọbubu-ọnu nke Chineke.
Gini mere Chineke jiri nye-ayi Iwu ahu? O nyere ayi Iwu ahu ka ayi we mazu nmehie ayi (Ndi Rom 3:20). Ka ayi we mara na ayi bu ndi-nmehie n’ozuzu okè ndi akara akàrà ọku-ala-mọ.
Kwerenu na baptism Jisus, Ọkpara Chineke, ka ewe amua unu ọzọ site na miri na Mọ Nsọ. Mb͕e ahu agāzọputa-unu na nmehie nile unu, we ghọ kwa ndi ezi omume, nwe ndu ebighi-ebi, ga kwa n’elu-igwe. Nwe okwukwe n’obi-unu.
 
 
Nmehie Kachasi Di Npako n’Uwa 
 
Gini bu nmehie kachasi di npako n’uwa?
Inwa isite n’Iwu ahu di ndu.
 
Enweghi ihe dikariri nkpà karia ikwere na Chinkeke. Ayi bu ndi ngọzi gādiri site n’inwe okwukwe na ngọzi-Ya. Chineke zubere izọputa ndi nke nwere okwukwe n’Okwu-Ya.
Ma ta, n’etiti ndi nile kwere ekwe, enwere ọtutu ndi nānwa isite n’Iwu-Ya di ndu. Ọtutu ndi-Kristian di otú a. Ọ bu ihe nānata otutu na ha nānwa isite n’Iwu ahu di ndu, kama ò gēsi aṅa kwe omume?
Ayi kwesiri imazu otù ayi si buru ndi enweghi uche site inwa isite n’Iwu-Ya di ndu. Dika ayi nānwa, otú a ka ọ gēsikari ike. Ọ si, “Okwukwe si n’ọnunu puta” (Ndi Rom 10:17). Ayi kwesiri iju npako-ayi ka ewe zọputa-ayi.
 
 

Ayi kwesiri Irara Ọkọlọta Nke Aka Ayi Nye ka Ewe Zọputa-ayi 

 
Gini bu ihe ayi kwesiri ime ka ewe zọputa-ayi?
Ayi kwesiri irara ọkọlọta nile nke aka ayi nye
 
Àgēsi aṅa pu izọputa madu? Ọ gēkwe omume nání mb͕e ha nāmazu onwe-ha dika ndi-nmehie. Enwere ọtutu ndi ab͕aputaghi n’ihi na ha apughi irara okwukwe-ha nile ezighi ezi na nnwasi-ike nile nye. 
Chineke nāsi na ndi nile nke jidesiri Iwu ahu aka ike nọ n’okpuru ọbubu-ọnu. Ndi nke kwere na ha puru ighọ ndi ezi omume nwayọ nwayọ dika ha nēkweregide na Jisus we nānwa kwa ime ihe nile Iwu ahu nāchọ nọ n’okpuru ọbubu-ọnu-Ya. Ha kwere na Chineke, ma ha nēchè na ha kwesiri ibi ndu dika Iwu ahu si di ka ewe zọputa-ha.
Ndi-eyì m’huru n’anya, àyi puru ighọ ndi ezi omume site n’ọlu-ayi mb͕e ayi ka di ndu? Ayi nāghọ ndi ezi omume nání site n’ikwere n’Okwu Jisus, nání mb͕e ahu ka agāb͕aputa ayi. Nání site n’inwe okwukwe na baptism Jisus, ọbara-Ya, na Jisus bu Chineke, ka agāb͕aputa-ayi.
Nka mere Chineke jikeworo Iwu nke okwukwe ahu nye ayi dika uzọ eji-aghọ ndi ezi omume. Nb͕aputa site na miri ahu na Mọ Nsọ adighi-adabere n’ọlu nile nke ndi nile kama n’okwukwe n’Okwu Chineke. Chineke naputa-kwa-ra ayi n’ihi okwukwe ahu. Otú a ka Chineke zubere ya na otú O si mezu ya.
Gini mere ab͕aputaghi ndi nke kwere na Jisus? N’ihi na ha anabataghi okwu nke nb͕aputa site na miri ahu na Mọ Nsọ. Ma ayi, ndi ezughi okè dika ha, kāb͕aputaworo site n’okwukwe-ayi n’Okwu Chineke.
“Ndinyom abua ganegwe nri na nkume-igwe-nri; ewere otù, rapu kwa otù” (Matiu 24:41). Onye nke arupuru bu onye nke akāb͕aputaghi. Gini bu ihe mere ageji were otù we rapu kwa otù?
Ihe mere ya bu otù onye ṅara nti we kwere kwa n’Okwu Chineke. Onye nke ọzọ lusiri ọlu ike n’idebe Iwu ahu n’ikpè-azu atubàra ya n’ọku-ala-mọ. Onye ahu nānwa ikpukuru Chineke akpu, kama Chineke kwapuru-ya dika ayi kwapu ahuhu mb͕e ọ nānwa ikpu akpu n’ukwu-ayi. Ọ buru na madu nānwa ikpu akpu rue Chineke site n’inwa idebe Iwu ahu, aghaghi itubà madu ahu n’ọku-ala-mọ.
Nka mere agēji kwesi ib͕aputa-ayi site n’okwukwe na miri ahu na Mọ Nsọ.
“N’ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n’ọlu nke iwu, ha nọ n’okpuru ọbubu-ọnu: n’ihi na edewo ya n’akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n’ihe nile edeworo n’akwukwọ iwu, ime ha. Ma ọ putara ìhè na ọ dighi onye ọ bula anāgu n’onye ezi omume n’iwu n’iru Chineke: n’ihi na, Onye ezi omume gēsite n’okwukwe di ndu,” (Ndi Galetia 3:10-11, Ndi Rom 1:17).
Ekweghi n’Okwu Chineke bu nmehie n’iru-Ya. Ma tiyere nka, ọ bu kwa nmehie irapu Okwu Chineke dika ọkọlọta madu si di. Ayi ndi madu apughi isite n’Iwu-Ya di ndu n’ihi na amuworo ayi dika ndi-nmehie. Ayi nāga kwa n’iru nēme nmehie na ndu-ayi nile Ayi nēme nmehie ntà ebe a, me nmehie ntà ebe ahu, ya na ebe nile ayi nāga. Ayi kwesiri imara na anu-aru-ayi apughi ighara imehie. 
Madu di ka pail iwu-ǹsí di uku. Ọ buru na ayi nwa ibūru ya jegharia, ayi gējedebe iwusì ihe ya nile n’uzọ. Ayi di otú a. Ayi nāga n’iru iwusì nmehie ebe nile ayi nāga. Ì puru ise ya?
Ì gēmegide ka i di nsọ? Ọ buru i puru ihu onwe-gi nke-ọma, i gārapu inwa n’efù ibu onye di nsọ we kwere kwa na miri ahu na ọbara nke Jisus.
Ayi kwesiri iju isi-ike-ayi we kwezu kwa na ayi bu ndi-nmehie n’iru Chineke. Mb͕e ahu, ayi aghaghi ilaghachi n’Okwu-Ya we chọputa otù O jiri zọputa-ha site na miri ahu na Mọ Nsọ.
 
Okwuchukwu a dịkwa n`ụdị ebook. Pịa na mkpuchi akwụkwọ n`okpuru.
ÀMUWO GI ỌZỌ N’EZIE SITE NA MIRI NA MỌ NSỌ? [Nbiputa Ntughari Ọhu]