• All e-books and audiobooks on The New Life Mission website are free
  • Explore multilingual sermons in global languages
  • Two new revised editions in English have been released
  • Check out our website translated into 27 languages
Search

Sermons

Isi-okwu 1 : Nmehie

[1-2] Amuworo Madu nile ka Ndi-nmehie (Mak 7:20-23)

Amuworo Madu nile ka Ndi-nmehie (Mak 7:20-23)

(Mak 7:20-23)
“O we si, Ihe nke si nime madu puta, nke ahu nēmeru madu. N’ihi na n’ime, bú n’obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche” 
 
 

Ndi Nile Nọ n’Aghara Nēbi Kwa Ndu n’Ọhù-ugha-nile Nke Aka Ha

 
Ònye ka ọ kachasi nfé izọputa?
Onye nēchè na ya onwe-ya bu onye-nmehie kachasi njọ
 
Tupu m’ga n’iru, m’nāchọ iju i ajuju. Ì si aṅa hu onwe-gi? Ì nēchè na i bu ezi onye ma-ọbu onye jọrọ njọ? Gini ka i nēchè?
Ndi nile nọ n’ọhù-ugha nile nke aka ha. I pughi idi njọ dika otù i si nēchè, ma-ọbu i bughi ezi onye dika otù i si nēchè.
Ònye, mb͕e ahu, ka gi onwe-gi nēchè gēdu ndu okwukwe nke-ọma kari? Ọ̀ gābu ndi nke nēchè n’onwe-ha na ha bu ezi ndi ma-ọbu ndi nke nēchè n’onwe-ha na ha jọrọ njọ?
Ọ bu nke ikpè-azu. Ya mere, òle onye ọ dikariri nfé ib͕aputa-ya: Ònye nke meworo ọtutu nmehie ma-ọbu onye nke meworo nání nmehie ole-na-ole? Ndi nwere ọtutu nmehie karisia bu ndi ọ dikariri nfé ib͕aputa-ha n’ihi na ndi ahu mara na ha bu ndi-nmehie. Ha puru inabata nb͕aputa ahu nke Jisus jikeworo-ha kari.
Mb͕e ayi lere onwe-ayi anya n’ezie, ayi puru ihu na ayi bu okpotokpo nmehie. Gini ka ndi madu bu? Madu bu ‘nkpuru nke bu ndi nēme ihe ọjọ.’ Na Aisaia 59, ọ nēkwu na enwere ọtutu udi ajọ omume di iche iche n’obi ndi nile. Ya mere, madu bu okpotokpo nmehie. Otú ọ di, ọ buru na ayi kọwa madu dika okpotokpo nmehie, ọtutu agaghi ekweyere-ya. Ikọwa madu dika ‘nkpuru nke bu ndi nēme ihe ọjọ.’ bu nkọwa di ziri ezi. Ọ buru na ayi le onwe-ayi anya n’ezie, ayi gābia na nkwubì-okwu na ayi bu ndi jọrọ njọ. Ndi nēkwuru onwe-ha ezi okwu gābiaru n’otù nkwubì okwu ahu.
Ọ dika na ọ dighi ọtutu ndi nānabata na ha bu okpotokpo nmehie n’ezie. Ọtutu nēbi ndu nkasi-obi n’ihi na ha agughi onwe-ha na ndi-nmehie. N’ihi na ayi bu ndi nēme ihe ọjọ, ayi keworo nmeghe-anya nmehie. Ọ buru na enwere ọtutu ndi mazuru udi nmehie-ha, ha gēnwe kari ihere imehie. Otú ọ di, n’ihi na enwere ọtutu ndi nāmazughi udi nmehie-ha, ha anaghi enwe ihere bayere nmehie-ha.
Otú ọ di, akọ-na-uche-ha mara. Onye ọ bula nwere akọ-na-uche nke nāgwa ya, “Ọ bu ihe ihere.” Adam na Iv zoro onwe-ha n’etiti ọtutu osisi mb͕e ha mereri nmehie. Ta, ọtutu ndi-nmehie nēzo onwe-ha n’ajọ ome-na-ala-ayi—ome-na-ala nmehie-ayi. Ha nēzo onwe-ha n’etiti ndi-nmehie ibe-ha izere ikpé Chineke.
Eduhiere ndi nile site n’ọhù-ugha nke aka ha. Ha nēchè na ha onwe-ha bu ndi di nsọ kari ndi ọzọ. Ha nēti oké nkpú n’iwe, “Ònye di otú a gēsi aṅa pu ime ihe ndia? Ònye kwere ekwe gēsi aṅa pu ime ihe ndia? Nwa gēsi aṅa pu ime ndi nke muru ya ihe ahu?” Ha onwe-ha nēchè na ha agaghi-eme udi ihe di otú a.
Ndi eyì m’huru n’anya, ọ bu ihe siri ike otú a imara udi madu. Ọ buru na ayi nāchọ ka ab͕aputa-ayi, ayi aghaghi ibu uzọ mara onwe-ayi dika ayi di n’ezie. Ọ bu ihe nēwe ogologo oge, enwe-kwa-ra ọtutu nime ayi ra otú a bú ndi nāgaghi achọputa nka ma-ọli rue ubọchi ayi nānwu.
 
 
Mara Onwe-gi 
 
Ǹdi nāmataghi onwe-ha si aṅa ebi ndu?
Ha nēbi ndu nānwa izo onwe-ha.
 
Mb͕e ufọdu ayi nēzute udi ndi nāmataghi onwe-ha n’ezie. Socrates siri, “Mara onwe-gi.” Otú ọ di, ọtutu nime ayi amaghi ihe di n’obi-ayi: ib͕u-madu nile, ori nile, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya...etc.
O nwere òlùlù agwọ n’obi-ya ma nēkwu bayere ezi ọlu. Ọ bu n’ihi na ọ mataghi na amuru-ya dika onye-nmehie. 
Enwere ọtutu ndi otú a n’uwa nka ndi nāmataghi otù ha esi gesi le onwe-ha anya. Ha duhieworo onwe-ha we nēbipu kwa ndu ekpuchiworo nime nduhie nile nke aka ha. Ha nātubà onwe-ha n’ọku-ala-mọ. Ha nāga n’ọku-ala-mọ n’ihi nduhie nile nke aka-ha.
 
 

Ndi Nile Nāwusìgide Nmehie Na Ndu nile Ha 

 
Gini bu ihe mere ha nāga n’ọku-ala-mọ?
N’ihi na ha amataghi onwe-ha.
 
Ka ayi le anya na Mak 7:21-23 “N’ihi na n’ime, bú n’obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche: ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa, ha nēmeru madu.” Obi ndi nile juputara n’èchìchè nile jọrọ njọ site n’ubọchi aturu ime ha.
Ka ayi chèputa n’èchìchè na ihe eji me obi madu bu glass we juputa kwa na miri jọrọ njọ, ya bu, nmehie-ayi. Gini gēme ma ọ buru na onye di otú a jegharia? N’ezie, miri ahu jọrọ njọ ahu (nmehie) gāwusì ebe nile. Dika onye di otú a nējeghari ebe na ebe ahu, nmehie gāga n’iru iwusìgide. 
Ayi, ndi bu nání okpotokpo nmehie, nēbi ndu-ayi otú a. Ayi nāwusì nmehie ebe nile ayi nāga. Ayi gēmehie mb͕e nile na ndu-ayi n’ihi na ayi bu okpotokpo nmehie.
Nsob͕u bu ayi amataghi na ayi bu okpotokpo nmehie na ayi bu npkuru-ọghigha nile nke nmehie. Ayi bu okpotokpo nmehie nwe kwa nmehie n’obi-ayi. Ihe a bu ihe ndi nile bu n’ezie.
Okpotokpo nmehie ahu nējikere irukpuchi. Nmehie ndi madu bu na ha adighi-ekwere na ha, n’ezie, nwere nmehie nime ha, kama na ndi ọzọ dubàra ha na nmehie, ya mere na ọ abughi ha bu ndi nọ ita-uta n’ezie.
Ya mere, ọbuná mb͕e ha nēme nmehie, ha nēchè na ihe nile achọrọ iji sa onwe-ha di ọcha ọzọ bu ka ewe kpuchie nmehie. Ha nāga n’iru isacha onwe-ha, oge nile ha nēmehie, nāgwa onwe-ha na ọ bughi nmehie ihe ita-uta nke aka-ha. Nání n’ihi na ayi nāsachapu ya, àyi adighi-awusì ya ọzọ? Ayi gēkwesi iga n’iru isachapu-ya ọzọ nēwepughi aka.
Mb͕e iko juputara na nmehie, ọ nāga n’iru iwusì. O nweghi urù ọ bara isacha azu-ya. Otu ọ di ọtutu mb͕e ayi nāsacha azu-ya site ọlu-ayi di nma, ọ bu ihe efu ka oge ahu ra bú mb͕e ay dum nwere iko ahu juputara na nmehie.
Amuru ayi na nmehie juputara otú a na obi-ayi agaghi-aghọ ihe tọb͕ọrọ n’efu, ọbuná nmehie ra aṅa nke ayi nāwusì n’ogologo uzọ-ayi. Ya mere, ayi nāga n’iru imehie na ndu-ayi nile.
Mb͕e madu amazughi na ha bu okpotokpo nmehie n’ezie, ha nāga n’iru inwa izo onwe-ha. Nmehie di n’obi ndi nile ma ọ dighi kwa apu site n’isacha azu ka ọ di ọcha. Mb͕e ayi nāwusì nmehie ntà, ayi gēji ihe-nhicha sapu-ya, mb͕e ayi nānwusì ya ọzọ, ayi nēji ákwà anēji hicha aru, were mop, mb͕e ahu were kwa rug. Ayi nāga n’iru ichè na ọ buru nání na ayi ga n’iru isapu-ya nání otù mb͕e, ọ gādi ọcha ọzọ. Otu ọ di, ọ nāga n’iru iwusìgide ọzọ.
Rùe ole mb͕e ka i nēchè nka gāga n’iru? Ọ gāga n’iru rue ubọchi madu ahu nānwu. Madu nēme nmehie rue ubọchi ọ nānwu. N’ihi nka ayi kwesiri ikwere na Jisus ka ewe zọputa-ayi. Ka ewe zọputa-ayi, ayi kwesiri imara onwe-ayi.
 
Ònye puru iji ekele nara Jisus?
Ndi-nmehie ndi kwezuru na ha meworo ọtutu nmehie.
 
Ka ayi si na enwere ndikom abua ndi apuru itunyere dika iko abua juputara n’ajọ miri. Iko abua ahu juputara na nmehie. Otù onye nēle onwe-ya anya we nāsi kwa, “O! m’bu onye-nmehie di otú a.” Mb͕e ahu ọ we rara onwe-ya nye ichọ onye puru inyere ya aka.
Ma onye nke ọzọ nēchè na ọ bughi onye di njọ. Ọ pughi ihu okpotokpo nmehie di nime onwe-ya we nēchè kwa na ọ jọghi njọ otú a. Na ndu-ya nile, ọ nāga n’iru isapu nwusì ahu nile. Ọ nāsapu otù akuku, ọzọ kwa akuku nke ọzọ, nēje n’akuku nke ọzọ ọsọsọ.
Enwere ọtutu ndi ra otú a ndi nēbi ndu na ntukwasi-uche na ndu-ha nile mb͕e nmehie di n’obi-ha ka ha we nwa izere iwusì ya. Kama n’ihi na ha ka nwere nmehie n’obi-ha, gini bu ezi ihe ọ gēme? Itukwasi uche agaghi eduru-ha biakaru nso n’elu-igwe. ‘Itukwasi uche’ nētiye i n’uzọ ọku-ala-mọ.
Ndi eyì m’huru n’anya, ‘itukwasi uche’ nēdubà nání n’ọku-ala-mọ. Mb͕e ndi madu nātukwasi uche, ọtutu nmehie-ha puru ighara iwusì otú a. Kama ha ka bu ndi-nmehie na nwogha.
Gini bu ihe di n’obi madu? Ǹmehie? Òmume ruru aru? E! Èchìchè nile jọrọ njọ? E! Ènwere ori? E! Ǹpako? E!
Ayi mara na ayi bu okpotokpo nmehie mb͕e ayi nāhu onwe-ayi ka ọ nēme nmehie na ajọ ihe mb͕e nēzighi-ayi ime otú a. Ọ puru ighara iputa ìhè mb͕e ayi bu umu-ntakiri.
Ma ọ̀ di aṅa mb͕e ayi nāghọ agadi? Mb͕e ayi nāga ulo akwukwọ secondary, college, na ndi ọzọ, ayi nāmazu na ihe ayi nwere nime ayi bu nmehie. Nka ọ̀ bughi ezi okwu? N’ebe a, ọ nāghọ ihe adighi-ekwe omume izo ya. Ò ziri ezi? Ayi nāga n’iru iwusì ya. Mb͕e ahu ayi nēchèghari. “Ekwesighm ime nka.” Otú ọ di, ayi nāchọputa na ọ bu ihe agaghi ekwe omume ib͕anwe-ya n’ezie. Gini bu ihe mere o ji di otú a? N’ihi na amuworo onye ọ bula nime ayi dika okpotokpo nmehie. 
Ayi adighi-aghọ ndi di ọcha site nání n’ituwasi uche. Ihe ayi kwesiri imazu bu na amuworo-ayi dika okpotokpo nmehie ka ewe b͕aputasia ayi. Nání ndi-nmehie ndi ji ekele nabata nb͕aputa Jisus jikeworo-ha bu ndi apuru izọputa.
Ndi nke nēchè “Emeghm ọtutu ihe jọrọ njọ ma emehieghi kwam nke-uku” adighi-ekwere na Jisus bupuru nmehie nile ha na akara ha akàrà ọku-ala-mọ. Ayi kwesiri imara na ayi nwere okpotokpo nmehie ahu nime ayi. Amuru ayi dum nime ya.
Ọ buru na otù onye chere, “Emeghm ọtutu ihe ọjọ, ma ọ buru na apuru ib͕aputam n’ihi nmehie ntà a,” mb͕e ahu àpuru ime ka ha pua n’orù nmehie ma emesia? Ọ gaghi-adi otú a ma-ọli.
Onye nke apuru ib͕aputa mara onwe-ha na ha bu okpotokpo nmehie. Ha nēkwere n’ezie na Jisus bupuru nmehie nile ha site na ime Ya baptism n’Osimiri Jọdan na O mere ka ha puchasia na nmehie nile mb͕e Ọ nwuru n’ihi ha.
Ma azọputara-ayi ma-ọbughi, ayi nādiri ebi ndu nime ọhù-ugha. Ayi bu okpotokpo nmehie. Nka bu ihe ayi bu. Apuru izọputa-ayi ma ọ buru na ayi kwere na Jisus bupuru nmehie nile ayi.
 
 
Chineke Ab͕aputaghi Ndi Nwere ‘Ntakiri Nmehie’ 
 
Ònye bu onye ahu nke nēduhie Onye-nwe-ayi?
Onye ahu nke nāriọ nb͕aghara nmehie kwa-ubọchi
 
Chineke ab͕aputaghi ndi nwere nání ‘ntakiri nmehie.’ Chineke anaghi-ele-ha anya bú ndi nāsi, “Chineke, enwerem nání ntakiri nmehie nka.” Ndi Ọ nēlere anya bu ndi nke nāsi, “Chineke, abum okpotokpo nmehie. Anamaga n’ọku-ala-mọ. Biko zọputam.” Onye nmehie zuru okè bú onye nāsi, “Chineke, Agāzọputam ma ọ buru na I zọputam. Apughm ikpe ekpere nchèghari ọzọ nání n’ihi na m’gēmehie ọzọ. Biko zọputam.”
Chineke nāzọputa ndi nke nādabesiri na Ya. M nwa-kwa-ra inye ekpere nchèghari kwa-ubọchi. Ma ọtutu ekpere nchèghari emeghi ka m’pua n’orù nmehie ma-ọli. “Chineke, biko merem ebere zọputa kwam na nmehiem nile.” Ndi nke nēkpe ekpere dika nka ka agāzọputa. Ha nēkwere na nb͕aputa Chineke, Baptism Jisus ahu sitere n’aka Jọn Baptist. Agāzọputa ha.
Chineke nānaputa nání ndi mara onwe-ha dika nání okpotokpo nmehie, ndi nāb͕uputa nmehie. Ndi nke nāsi, “Emerem nání ntakiri nmehie nka. Biko b͕agharam n’ihi ya,” ka bu ndi-nmehie Chineke apughi kwa izọputa-ha. 
N’Aisaia 59:1-2, edeworo ya, “Le, aka Jehova adighi nkpunkpu kari izọputa; nti-Ya adighi kwa arọ́ kari inu ihe: kama ajọ omume nile unu aghọwo ihe nākpa ókè n’etiti unu na Chineke-unu, nmehie nile unu ezonariwo kwa unu iru-Ya, O we ghara inu.” 
N’ihi na amuworo ayi dika okpotokpo nmehie, Chineke apughi iji obi ihu-n’anya nēle ayi anya. Ọ bughi n’ihi na aka-Ya di nkpunpku, ma-ọbu nti-Ya di arọ́ na Ọ pughi inu ka ayi nāriọ nb͕aghara-Ya.
Chineke nāsi ayi, “Ajọ omume nile unu aghọwo ihe nākpa ókè n’etiti unu na Chineke-unu, nmehie nile unu ezonariwo kwa unu iru-Ya, O we ghara inu.” N’ihi na ayi nwere nmehie di uku ra otú a n’obi-ayi, ayi apughi ibà n’Elu-igwe ọbuná ọnu-uzọ-ya meghere nke-uku.
Ọ buru na ayi, ndi bu nání okpotokpo nmehie, ariọ nb͕aghara mb͕e nile ayi nēmehie, Chineke ga-ekwesi ib͕u Ọkpara Ya nēwepughi aka. Chineke adighi achọ ime nka. Ya mere, Ọ nāsi, “Ejila nmehie unu nile biakutem kwa-uchọchi. M’zigara Ọkparam ka Ọ b͕aputa-unu na nmehie nile unu. Nání ihe nile unu kwesiri ime bu ighọta otú O si bupu nmehie nile unu we hu ka ọ bu ezi-okwu. Mb͕e ahu, kwere n’ozi ọma nb͕aputa ka ewe zọputa-unu. Nka bu ihu-n’anya kachasi uku nke M’nwere nye unu, ndi M’kère èkè.”
Nka bu ihe Ọ nāsi ayi. “Kwere n’Ọkparam ka ab͕aputa kwa unu. Mu, Chineke-unu, zigara Ọkpara Mu Onwem ka O we kpuchie nmehie nile unu na ajọ omume unu nile. Kwere na Ọkparam ka ewe zọputa-unu.”
Ndi nke amaghi onwe-ha dika okpotokpo nmehie nāriọ Ya nb͕aghara nání n’ihi ntakiri nmehie nke aka-ha. Ha nābia n’iru-Ya n’amazughi otú nmehie ha si di njọ nke-uku di arọ we nēkpe kwa ekpere, “Biko b͕aghara nmehie ntà a. Agaghm eme ya ọzọ ma-ọli”
Ha nānwa kwa iduhie Ya. Ayi adighi-eme nmehie nání otú mb͕e, kama ayi nēme nka nēwepughi aka rue mb͕e ayi nānwu. Ayi gēkwesi iriọgide nb͕aghara rue ubọchi ikpè-azu ahu nke ndu-ayi.
Nb͕aghara otù nmehie ntà apughi idozi nsob͕u ihe ọ bula n’ihi na ayi nēme nmehie kwa-ubọchi nke ndu-ayi rue mb͕e ayi nānwu. Ya mere nání uzọ apuru iji me ka ayi pua n’orù nmehie bu site n’itukwasi nmehie nile ayi na Jisus.
 
Gini bu òkìkè madu?
Okpotokpo nmehie nile
 
Bible nāguputa nmehie nile nke ndi madu. Na Aisaia 59:3-8, “N’ihi na ejiwo ọbara meru aka-unu, ejiwo kwa ajọ omume meru nkpisi-aka-unu; eb͕ub͕ere-ọnu-unu ekwuwo okwu-ugha, ire-unu nātamu ajọ ihe. Ọ dighi onye nākpọ madu eje ikpé n’ezi omume, ọ dighi kwa onye nēji ikwesi-ntukwasi-obi eje ikpé: ha nātukwasi obi n’ihe tọb͕ọrọ n’efu, ha nēkwu kwa okwu-ugha; ha nāturu ime ọnọdu ọjọ, mua ajọ ihe. Àkwá ubí ka ha buworo, ọ bu kwa ulo ududo ka ha nātu: onye ahu nke nēri àkwá-ha gānwu, ọzọ, nke anāzọpia gāb͕awaputa aju-ala. Ulo-ududo-ha agaghi-aghọ uwe, ha agaghi-eji kwa ọlu di iche iche ha kpuchie onwe-ha: ọlu nile ha bu ọlu ajọ ihe, omume nke ihe-ike di kwa n’aka-ha. Ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ, ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ: èchìchè nile ha bu èchìchè ajọ ihe; nbibi na ntipia di n’okporo-uzọ nile nke ha. Uzọ udo ka ha nāmaghi; ọ dighi kwa ikpé ziri ezi di n’uzọ nile ha: ha emewo ka okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ha ab͕agọ; onye ọ bula nke nāzọ ije na ya adighi-ama udo.”
Ajọ omume nēmeru nkpisi-aka nke ndi nile ma ihe nile ha nēme kwa ogologo ndu-ha nile bu ihe ọjọ. Ihe nile ha nēme jọrọ njọ. Irè-ayi kwa ‘nēkwu kwa okwu-ugha.’ Ihe nile nēsi n’ọnu-ayi aputa bu okwu-ugha nile.
“Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n’ihe nke aka ya puta” (Jọn 8:44). Ndi amughi ọzọ nēnwe nmasi ikwu okwu di otú a, “M’nāgwa gi ezi-okwu. M’nāgwa gi n’ezie. Ihe M’nēkwu bu ezi-okwu.” Otú ọ di, ọbuná ihe nile ha nēkwu bu okwu-ugha. Ọ di dika deworo-ya. “Mb͕e ọ bula ọ (ekwensu) nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n’ihe nke aka ya puta.”
Ndi nādabere n’okwu tọb͕ọrọ n’efu nēkwu kwa okwu-ugha. Ndi nāturu ime ọnọdu ọjọ we mua kwa ajọ ihe. Àkwá ubí ka ha buworo ọ bu kwa ulo ududo ka ha nātu. Chineke nāsi, “Onye ahu nke nēri àkwá-ha gānwu, ọzọ, nke anāzọpia gāb͕awaputa aju-ala.” Ọ nāsi na enwere àkwá ubí nime obi-gi. Àkwá ubí! Enwere èchìchè ọjọ nime obi-gi. Ka ab͕aputa i site n’ikwere n’ozi ọma miri ahu na ọbara ahu. 
Mb͕e ọ bula m’nāmalite ikwu bayere Chineke, enwere ndi nke nāsi, “O, onye huru-n’anya. Biko agwalam bayere Chineke. Mb͕e ọ bula m’nānwa ime ihe, nmehie gēsi nimem wusì. Ọ nērùputa dika iju-miri. Apughm izọ otù ukwu ma ghara iwusì nmehie ebe nile. O nweghi ihe m’gēme n’ihi nka. Ọtutu nmehie juputara nimem. Ya mere adila agwam ọbuná bayere Chineke.” 
Onye di otú a mara n’ezie na ọ bu nání okpotokpo nmehie, ma ha amataghi ozi ọma nke ihu nke puru izọputa ha. Ndi mara onwe-ha dika okpotokpo nmehie ka apuru izọputa.
N’ezi okwu, madu nile di otú a. Madu nile nāwusìgide nmehie ebe nile ha nāga. Ọ nērùputa n’ihi na ndi nile bu okpotokpo nmehie. Uzọ agēji zọputa onye di otú a bu site n’ike Chineke. Ọ̀ bughi nání ihe itu-n’anya? Ndi nile nke nāwusì nmehie mb͕e ọ bula ha nēwe iwe, nāṅu ọṅù, ma-ọbu ọbuná nēnwe nkasi-obi ka apuru izọputa nání site n’Onye-nwe-ayi Jisus. Jisus biara izọputa ndia ahu.
O kpuchisiworo nmehie-gi nile. Mara onwe-gi dika okpotokpo nmehie ka ewe zọputa-gi. 
 
Okwuchukwu a dịkwa n`ụdị ebook. Pịa na mkpuchi akwụkwọ n`okpuru.
ÀMUWO GI ỌZỌ N’EZIE SITE NA MIRI NA MỌ NSỌ? [Nbiputa Ntughari Ọhu]