• All e-books and audiobooks on The New Life Mission website are free
  • Explore multilingual sermons in global languages
  • Two new revised editions in English have been released
  • Check out our website translated into 27 languages
Search

Sermons

Isi-okwu 2 : Iwu ahu

[2-1] Ọ Buru Na Ayi Nēme Ihe Nile site n’Iwu ahu, Ọ̀ Puru Izọputa Ayi? (Luk 10:25-30)

Amuworo Madu nile ka Ndi-nmehie (Mak 7:20-23)
(Luk 10:25-30)
“Ma le, otù onye-iwu biliri, we nwa Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu gini ka m’gēme ka m’we keta ndu ebighi-ebi? O we si ya, Gini ka edeworo n’akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya? O we za, si, Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n’anya site n’obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum; hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi. O we si ya, I zara nke-ọma: me nka, i gādi kwa ndu. Ma ebe ọ nāchọ igu onwe-ya n’onye ezi omume, ọ si Jisus, Ònye bu kwa onye-ab͕ata-obim? Jisus zara ya, si, Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n’etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ.’” 
 
 
Gini bu nsob͕u kachasi uku nke madu?
Ha nēbi ndu nime ọtutu ọhù-ugha hiere uzọ.
 
Luk 10:28, “Me nka, i gādi kwa ndu.”
Ndi nile nēbi ndu nime ọtutu ọhù-ugha-ha nke hiere uzọ. Ọ di ka ha adighi ike na nka. Ọ di ka ha bu ndi-amam-ihe ma ọ di nfé irafu-ha we nānọgide kwa n’amataghi akuku-ha jọrọ njọ. Ayi amataghi onwe-ayi site na mb͕e amuworo-ayi, ma ayi nēbi ndu dika ayi mara nka. N’ihi na ndi nile amataghi onwe-ha, Bible nāgwa ayi na ayi bu ndi-nmehie.
Ndi nile nēkwu okwu bayere ọdidi nmehie nke aka-ha. Ha enweghi ike ime ezi ihe, otú ọ di ọ diri ha nfé igu onwe-ha na ndi ezi omume. Ha nāchọ inwe nkpako n’ezi ọlu-ha nile we nāfuli kwa onwe-ha elu. Ha nāsi na ha bu ndi-nmehie ma nēme ka ha bu ezi ndi.
Ha mara na ha enweghi ezi ihe nime ha ma-ọbu ike ime ezi ihe ma ha nānwa irafu ndi ọzọ mb͕e ufọdu ha nārafu kwa ọbuná onwe-ha. “Bianu, ayi apughi ibuchasi ndi jọrọ njọ. Agēnwe ufọdu ezi ihe di nime ayi.”
N’ihi ya, ha nēle ndi ọzọ anya we si onwe-ha, “Chai, ọ dirim nma na o meghi ya. Ọ gādikari ya na nma ma ọ buru na o meghi ihe ahu. Ọ dikariri ya nma ma ọ buru na o kwughi okwu otú ahu. M’nēchè ọ dikariri nma ikwusa ozi ọma n’uzọ di otú a ma-ọbu otú a. Ab͕aputara ya tutu mu, ya mere m’chere na o kwesiri ime ihe dika onye ab͕aputaworo. Ab͕aputaram n’oge nādighi anya, ma ọ buru na amutam kari, m’gēme kari ka ọ nēme”
Ha nāmu nma n’obi-ha. “Cherenu. I gāhu na adighm ka gi onwe-gi. Ya mere i nēche na inọm n’iru ub͕u a, ọ bughi-ya? Cherenu. Edeworo ya na Bible na ndi bu uzọ gābu ndi ikpè-azu. M’mara na ọ nēmetutam. Cherenu, m’gēgosi-gi.” Ndi nile nārafu onwe-ha.
Ọbuná ọ gēme otù ihe ahu ma ọ buru ọ nọ n’ọnọdu onye di otú a, ọ ka nēkpe-ya ikpé.
Mb͕e ajuru ka ndi nile nwere ike ime ezi ihe, ọtutu ndi nēkwu na ha enweghi ike di otú a. Ma ha nwere ọhù-ugha na ha onwe-ha nwere ike ahu. Ya mere ha nānwasi ike ime rue mb͕e ha nānwu.
Ha nēchè na ha nwere ‘ezi ihe’ n’obi-ha, na ha nwe kwa-ra ike ime ezi ihe. Ha nēchè kwa na ha onwe-ha bu ezi ndi. Ọbuná ogologo oge amuru ha ọzọ, ọbuná ndi nwetara oké ọga-n’iru n’ozi Chineke nēchè, ‘M’puru imere Onye-nwe-ayi nka ma-ọbu nke ọzọ.’ 
Ma ọ buru na ayi wezuga Onye-nwe-ayi na ndu-ayi, àyi puru ime ezi ihe n’ezie? Ènwere ezi ihe di nime madu? Ọ̀ puru ime ezi ihe na ndu ọ nēbi? Ndi madu enweghi ike ime ezi ihe. Mb͕e ọ bula ha nānwa ime ihe nile n’aka nke onwe-ha, ha nēmehie.
Ọtutu nākwapu Jisus mb͕e ab͕aputasiri ha we nānwa ime ezi ihe nile n’aka nke onwe-ha. Enweghi ihe di nime ayi ma ọ bughi ajọ ihe. Ayi puru nání ime ihe jọrọ njọ. Site n’onwe-ayi (ọbuná ndi azọputaworo), ayi puru nání imehie. Ọ bu ezi-okwu nke anu-aru-ayi.
 
Gini bu ihe ayi nēme mb͕e nile, ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ?
Ihe ọjọ
 
N’akwukwọ abu ayi, ‘To Onye-nwe-ayi,’ enwere abu nke nāga otú a, “♪Aru nābaghi urù nke nēhie uzọ ma ewezuga Jisus, ewezuga gi m’di dika ub͕ọ nke nāgafe n’oké osimiri nēnweghi ákwà-nb͕ochi-ifufe nke ub͕ọ♪.” Ewezuga Jisus, ayi puru nání imehie. Ayi bu ndi ezi omume nání n’ihi na azọputaworo ayi. N’ezie, ayi jọrọ njọ.
Onye-ozi Pọl we si, “N’ihi na ezi ihe nke m’nāchọ ka m’nēmegh: kama ihe ọjọ nke m’nāchọghi, ihe ahu ka m’nēme.” (Ndi Rom 7:19). Ọ buru na madu ya na Jisus nọ, ọ putaghi ihe ọ bula. Ma mb͕e ọ nweghi ihe jikọrọ ya na Ya, ọ nānwa ime ezi ihe n’iru Chineke. Kama ka ọ nānwa kari, ka ọ nāchọputa onwe-ya ka ọ nēme ihe ọjọ kari.
Ọbuná Eze Devid nwere otù òkìkè ahu. Mb͕e obodo ya nọ n’udo nēme kwa nke-ọma, otù anyasi, ọ rigoro n’elu ulọ ijeghari. Ọ huru onyinyo nānwà ọnwuwa we dàra utọ ikwa-iko. Ọ̀ di ka gini mb͕e o chefururi Onye-nwe-ayi! Ọ jọrọ njọ n’ezie. O b͕uru Urai we kuru nwunye-ya, ma Devid apughi ihu ajọ ihe ahu di nime onwe-ya. O mere ọtutu ngọpu n’ihi ihe nile ọ mere.
Mb͕e ahu n’otù ubọchi, onye-amuma Netan biakutere ya we si. “Ndikom abua di n’otù obodo; otù bu ọgaranya, nke-ọzọ bu ob͕eye. Ọgaranya ahu nwere ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi bara uba nke-uku. Ma ob͕eye ahu enweghi ihe ọ bula, ma-ọbughi otù nwa-nne-aturu ntà, nke ọ zutara debe ya ndu: o we nọyere ya, nọye-kwa-ra umu-ya, tolite; n’iberibe ihe-oriri-ya ka ọ nēri, n’iko-ya ka ọ nāṅu kwa, n’obi-ya ka o nēdina kwa, o we ghọrọ ya nwa-nwayi. Onye-ije we biakute ọgaranya ahu, o we rapu iwere anu n’etiti ìgwè ewu na aturu-ya ma-ọbu n’etiti ìgwè ehi-ya, idoziri onye-ije ahu nke biakutere ya, ma o were nwa-nne-aturu nke ob͕eye, doziere nwoke ahu biakutere ya.” (II. Samuel 12:1-4).
Devid we si, “N’ezie onye kwesiri ọnwu ka nwoke ahu bu nke nēme ihe a!” Akpotere iwe-ya nke-uku, ya mere ọ we si, ‘O nwere ọtutu anu nke nke aka-ya, ọ puru n’ezie iwere otù nime ha. Ma o were otù nwa-nne-aturu ntà nke ob͕eye ahu ijikere ya ka nri nye onye-ije ya. O kwesiri inwu!” Ma Netan we gwa ya, “Gi onwe-gi ka nwoke ahu bu!” Ọ buru na ayi esoghi Jisus we nọnyere kwa-ra Ya, ọbuná ndi amuworo ọzọ puru idi otú a.
Ọ bu otù ihe nye ndi nile, ọbuná ndi kwesiri ntukwasi-obi. Ayi nāsu ngọngọ mb͕e nile nēme kwa ihe jọrọ njọ ma ewezuga Jisus. Ya mere ayi nēnwe ekele ọzọ ta na Jisus zọputara-ayi ọbuná ihe jọrọ njọ di nime ayi. “♪M’nāchọ izu ike n’okpuru ǹdò Obe ahu♪” Obi-ayi nēzu ike n’okpuru ǹdò nke nb͕aputa nke Kraist. Ma ọ buru na ayi si na ǹdò ahu pua we le kwa onwe-ayi anya, ayi apughi izu ike ma-ọli.
 
 

Chineke Nyere Ayi Ezi Omume nke Okwukwe tutu Iwu ahu

 
Òle nke bu uzọ diri, okwukwe ma-ọbu Iwu ahu?
Okwukwe
 
Onye-ozi Pọl siri na Chineke nyere ayi ezi omume nke okwukwe na mbu. Ezi omume sitere n’okwukwe bu uzọ bia. O nyere ya Adam na Iv, nye Ken na Ebel, emesia nye Set na Inok… rue Noa…, emesia nye Abraham, emesia rue Aisak, nye Jekob na umu-ya ndikom di iri na abua. Ọbuná ewezuga Iwu ahu, ha ghọrọ ndi ezi omume n’iru Chineke site n’okwukwe-ha na Okwu-Ya. Agọziri we nyekwa ha izu-ike site n’okwukwe-ha n’Okwu-Ya.
Mb͕e oge gasiri nkpuru Jekob biri n’ala Ijipt dika ndi-orù rue arọ 400 n’ihi Josef. Mb͕e ahu, Chineke duputara-ha bà n’ala Kenean site n’aka Moses. Otú ọ di, n’ogologo oge arọ 400 ahu ha nọ n’orù, ha chefururi ezi omume nke okwukwe. 
Ya mere Chineke mere ka ha gāfe Oké Osimiri Uhie site n’ihe-iriba-ama-Ya durute-ha n’ọzara ahu. Mb͕e ha biarutere ọzara Nmehie ahu, O nyere-ha Iwu ahu n’Ugwu Sainai. O nyere-ha Iwu ahu, nke jikọtara Okwu Iri ahu na ihe Iwu ahu di 613 nke edeworo n’otù n’otù. “Abum Onye-nwe-ayi Chineke, Chineke nke Abraham, Chineke nke Aisak, Chineke nke Jekob. Ka Moses rigota n’Ugwu Sainai, M’gēnye unu iwu ahu.” Chineke nyere Israel Iwu ahu.
O nyere-ha Iwu ahu ka ha we ‘nwe nmazu nke nmehie’ (Ndi Rom 3:20). Ọ bu ime ka ha mara ihe Ọ nāhu n’anya na ihe Ọ nākpọ asi ya na ikpughe ezi omume na idi-nsọ-Ya. 
Ndi Israel nile ndi nọrọri n’orù n’ala Ijipt rue arọ 400 gāfere Oké Osimiri Uhie ahu. Akēzuteghi Chineke nke Abraham, Chineke nke Aisak, Chineke nke Jekob ma-ọli. Ha amataghi-Ya. 
Mb͕e ha nēbi dika ndi-orù rue arọ 400 ndia, ha chefururi ezi omume nke Chineke. N’oge ahu, ha enweghi onye-ndu. Jekob na Josef bu ndi-ndu-ha, ma ha nwururi. Ọ di ka Josef dàra ibufe okwukwe ahu nye umu-ya ndikom, bú Manase na Efraim.
Ọtú ọ di, ha kwesiri ichọta Chineke-ha ọzọ we zute kwa Ya n’ihi na ha chefururi ezi omume Chineke. Ya mere Chineke buru uzọ nye ha ezi omume nke okwukwe emesia we nye kwa ha Iwu ahu mb͕e ha chefururi okwukwe ahu. O nyere ha Iwu ahu ka O we me ka ha laghachikute Ya.
Izọputa Israel, ime kwa ha ndi-Ya, umu Abraham, O gwara ha ka ebì-ha úgwù. 
Ìzù-Ya n’ikpọ-ha bu ime ka ha mara na enwere Chineke site n’ime ka Iwu ahu guzo ma nke abua bu ime ka ha mara na ha bu ndi-nmehie n’iru-Ya. Chineke chọrọ ka ha biarute Ya nso we ghọ kwa ndi-Ya site n’usoro-nchu-àjà nb͕aputa nke Chineke nyereri-ha. Ma O mere ha ndi-Ya.
Ab͕aputara ndi Israel site n’aka iwu ahu (usoro-ichu-àjà) site n’ikwere na Mesaia onye gāje ibia. Ma usoro-ichu-àjà ahu talatarari mb͕e ọtutu oge gasiri. Ka ayi hu mb͕e nka mere.
Na Luk 10:25, “Otù onye-iwu biliri, we nwa Ya.” Onye-iwu ahu bu otù onye-Farisi. Ndi-Farisi bu ndi-nchekwa ndi nke nānwa ibi ndu dika Okwu-Ya si di. Ha bu ndi nābwa ibu uzọ chekwa obodo-ha mb͕e ahu site kwa n’Iwu ahu di ndu. Mb͕e ahu enwe-kwa-ra ndi-Zilotis ndi-nkpali ndi nēji iweli-olu elu enweta ọhù-ha nile.
 
Ònye ka Jisus nāchọ izute?
Ndi-nmehie enweghi onye nāzù ha dika aturu
 
Enwere ufọdu ndi okpupke dika ha ọbuná ta. Ha nēdu ọtutu ije-ọra were isi-okwu dika ‘zọputa ndi anēmeb͕u n’uwa.’ Ha nēkweye na Jisus biara izọputa ndi-ob͕eye na ndi anēmeb͕u. Ya mere, mb͕e ha mutara nkà-nmuta-okpukpe na ọtutu seminary, ha nēsonye na ndọrọ ndọrọ ọchichi, we nānwa ‘inaputa ndi anapuworo ihe ha’ n’akuku nile nke ọra obodo.
Ha bu ndi nārugide si, “Ka ayi nile nēbi ndu site n’Iwu di nsọ di kwa ebere. Me ihe Iwu ahu nāchọ, site n’Okwu-Ya.” Kama ha amazughi ihe Iwu ahu putara n’ezie. Ha nānwa ibi ndu dika edeworo n’akwukwọ Iwu ahu kama ha amataghi kwa nkpughe ihe O ji buru Chineke nke Iwu ahu.
Ya mere ayi puru ikwu na enweghi ndi-amuma, bú ndi-orù nke Chineke, ihe ra ka arọ 400 tutu Kraist. N’uzọ nka ha ghọrọ ìgwè aturu nke nēnweghi onye nāzù ha dika aturu.
Ha enweghi Iwu ahu ma-ọbu onye-ndu. Chineke ekpugheghi onwe-Ya site na ndi-ndu okpukpe n’oge ahu bú ndi-iru-abua. Obodo ahu ghọrọri ób͕è nke Ala-eze ndi-Rom. Ya mere Jisus gwara ndi Israel ahu ndi soro Ya bà n’ọzara ahu na Ọ gaghi ezilaga-ha n’agu. O nwere ọmiko n’ebe ìgwè aturu ndi nēnweghi onye nāzù ha dika aturu nọ. Enwere ọtutu ndi nāta ahuhu n’oge ahu.
Ọ bu ndi-iwu ahu na ndi ọzọ ndi nọ n’udi ọnọdu dika nka bu ndi enyereri ihe ùgwù nile; ndi-Farisi buru ndi si n’agburu nke Israel, Okpukpe ndi-Ju. Ha di nkpako otú a.
Onye-iwu ahu juru Jisus na Luk 10:25, “ọ̀ bu gini ka m’gēme ka m’we keta ndu ebighi-ebi?” Ọ di onye-iwu ahu ka ọ dighi onye ka ya nma n’etiti ndi Israel. Ya mere onye-iwu ahu (onye nke ab͕aputaghi) mara Ya aka, nāsi, “ọ̀ bu gini ka m’gēme ka m’we keta ndu ebighi-ebi?”
Onye-iwu a bu onyinyo ayi onwe-ayi. Ọ juru Jisus “ọ̀ bu gini ka m’gēme ka m’we keta ndu ebighi-ebi?” Jisus zara si ya, “Gini ka edeworo n’akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya?”
Ya mere ọ zara si, “Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n’anya site n’obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum” na “hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi”
Jisus gwara ya, “I zara nke-ọma: me nka, i gādi kwa ndu.”
Ọ mara Jisus aka mb͕e ọ mataghi onwe-ya dika onye ọjọ, okpotokpo nmehie onye apughi ime ezi ihe ma-ọli. Ya mere Jisus juru ya, “Gini ka edeworo n’akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya?”
 
Ì si aṅa agu Iwu ahu?
Ayi bu ndi-nmehie ndi apughi idebe Iwu ahu ma-ọli.
 
“O we si ya, Gini ka edeworo n’akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya? O we za, si, Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n’anya site n’obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum; hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi. O we si ya, I zara nke-ọma: me nka, i gādi kwa ndu” (Luk 10:26-28).
“ì si aṅa agu ya?” Nka putara i si aṅa mara we nāghọta kwa Iwu ahu. 
Dika ọtutu ndi n’ubọchi ta, onye-iwu ahu che-kwa-ra na Chineke nyere-ya Iwu ahu idebe-ya. Ya mere ọ zara, “Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n’anya site n’obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum, hu kwa onye-ab͕ata-obi-gi n’anya dika onwe-gi” 
Iwu ahu enweghi ihe ita-uta. O nyere ayi Iwu zuru okè. Ọ gwara ayi ka ayi hu Onye-nwe-ayi n’anya site n’obi-ayi dum na npkuru obi-ayi dum, na ike-ayi dum na uche-ayi dum hu kwa onye-ab͕ata-obi-ayi n’anya dika onwe-ayi. Ọ bu ihe ziri ezi ka ayi hu Chineke-ayi n’anya site n’obi-ayi dum na ike-ayi dum, kama ọ bu okwu di nsọ nke apughi idebe ma-ọli.
“ì si aṅa agu ya?” putara n’Iwu ahu ziri ezi, kama ì si aṅa aghọta ya? Onye-iwu ahu chere na Chineke nyere ya idebe. Ma enyeworo ayi Iwu Chineke ka ayi we pu imazu adighi-ike-ayi na ikpughechasi ajọ omume nile ayi. Ọ nēkpughe nmehie nile ayi, “I mehiewo. I b͕uru madu mb͕e M’gwara gi ka i ghara ib͕u madu. Gini mere i ṅaghm nti?”
Iwu ahu nēkpughe nmehie nile di n’obi ndi nile. Ka ayi were ya n’uzọm ibiaru ebe a, m’huru ufọdu egusi chara acha n’ubi. Chineke dọrọm aka na nti site n’Iwu ahu, “Ghara ighọta egusi ndia n’ubi ka ihe-oriri. Ọ Gēmem ihere ma ọ buru na ime nka.” “E, Nna.” “Ubi a diri onye di otú a, ya mere i ikwesighi ighọta ha ma-ọli.” “E, Nna.”
Mb͕e ayi nānu na ayi ekwesighi ighọta ha n’ubi ma-ọli, ayi nēnwe ọchichọ di uku ighọta ha. Ọ buru na ayi ab͕atia eriri rubber, ọ nālaghachikute ayi n’ọnọdu mbu ya. Nmehie ndi nile yiri nka.
Chineke gwara ayi ka ayi ghara ime ihe ọjọ ma-ọli. Chineke puru ikwu nka n’ihi na Ọ di nsọ, n’ihi na O zuru okè, n’ihi na O nwere ike ime otú a. N’aka nke ọzọ, ayi apughi ‘ma-ọli’ ighara imehie na ‘ma-ọli’ ime ezi ihe. Ayi enweghi ezi ihe ‘ma-ọli’ n’obi-ayi. Iwu ahu nāsi ma-ọli (eji okwu a bú ‘ma-ọli’ deputa ya). N’ihi gini? N’ihi na ndi nile nwere agu ihe ọjọ n’obi-ha. Ayi nēmeputa agu ihe ọjọ ayi. Ayi nākwa iko n’ihi na ayi nwere ikwa-iko n’obi-ayi.
Ayi kwesiri iji ntukwasi-obi gu Bible. Na mbu mb͕e m’kwere na Jisus, m’kwere dika Okwu ahu si di. M’guru na Jisus nwuru n’elu Obe n’ihim apughi kwam ib͕ochi anya-miri irùputa. Abum onye jọrọ njọ otú a Ọ we nwua n’elu Obe n’ihim. Obim b͕urum nb͕u nke-uku ya mere ekwerem na Ya. Mb͕e ahu m’chere, ‘O buru na m’gēkwere, m’gēkwere dika Okwu ahu si di.’
Mb͕e m’guru Ọpupu 20, ọ we si, “Gi enwela Chi ọzọ tiyerem.” M’kpere ekpere nchèghari dika okwu a si di.. M’nyochara uburum ihu ma enwere mb͕e m’nwereri chi ọzọ tiyere Ya, burula aha Ya ime ihe efu, ma-ọbu ka enwe mb͕e m’kpọrọri isi ala nye chi ndi ọzọ ma-ọli. Amataram na m’kpọrọri isi ala nye chi ndi ọzọ ọtutu ub͕ò mb͕e anāchu-àjà isọpuru ndi murum. M’mereri nmehie nke inwe chi ọzọ.
Ya mere m’kpere na nchèghari, “Onye-nwe-ayi, akpọwom isi ala nye ọtutu arusi. Ekwesiri ikpem ikpé n’ihi ya. Biko b͕aghara nmehiem. Agaghm eme ya ọzọ ma-ọli.” Ya mere, elekọtaworo otù nmehie.
Mb͕e ahu m’nwara icheta ka m’bururi aha Ya ime ihe efu. Mb͕e ahu, echetaram mb͕e malitere ikwere na Chineke, M’sere anwuru. Ndi eyìm gwaram si, “Ọ̀ bughi ihe ihere i nenye Chineke site n’ise anwuru? Ònye-Kristian gēsi aṅa pu ise anwuru?”
Ọ iburu aha Ya ime ihe efu, ọ̀ bughi ya? Ya mere m’kpere ekpere ọzọ, “Onye-nwe-ayi, m’buru aha Gi ime ihe efu. Biko b͕agharam. M’gēb͕ochi ise anwuru.” Ya mere m’nwara ib͕ochi ise anwuru kama kpugide ọku n’ọnu nēnwupu we nēnwuda kwa rue otù arọ. O siri ike n’ezie, ọ fọduru ihe ntà ka ọ buru ihe agaghi ekwe omume ib͕ochi ise anwuru. Ma n’ikpè-azu, m’jikọtara onwem ib͕ochichasi ise anwuru. M’chere na elekọtarari nmehie ọzọ.
Nke ọzọ bu “Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ.” Nka putara ighara ime ihe ndi ọzọ n’Ubọchi-nzukọ Kraist nile; ighara ilu ọlu, ma-ọbu ikpata ego. Ya mere m’b͕ochi-kwa-ra nka.
Mb͕e ahu enwere “Sọpuru nna-gi na nne-gi.” M’sọpuru ha mb͕e m’nọ n’ebe di anya, kama ọ gābu ebe isi-ọwuwa si aputa mb͕e m’nọ nso, “O chi-mo-o, emehiewom n’iru Chineke. Biko b͕agharam, Onye-nwe-ayi.” M’kpere na nchèghari.
Ma apughm isọpuru ndi murum ọzọ n’ihi na ha bu ndi nwuru anwu mb͕e ahu. Gini ka m’gēme? “Onye-nwe-ayi, biko b͕aghara onye-nmehie a bú onye aputaghi ihe ọ bula. I nwuru ọnwu n’elu Obe n’ihim.” Le ka ọnum juru n’ekele!
Otú a, ọ m’chere na m’lekọtarari nmehiem nile n’otù n’otù. Enwere iwu ndi ọzọ, dika eb͕ula madu, akwala-iko, enwela anya-uku.... m’mazuru na edebeghm ọbuná otú. M’kpere ekpere abali nile. Dika i mara, ikpe ekpere nchèghari abughi ihe utọ. Ka ayi kwuo bayere ya.
Mb͕e m’chetara bayere ọnwu-Ya n’obe, m’puru iji obi so Ya hukọ ahuhu n’ihi otù o si nēb͕u nb͕u. Ma Ọ nwuru n’ihi ayi ndi apughi ibi ndu dika Okwu-Ya si di. M’tiri nkpu ákwá abali nile n’ihi otù O si hum-n’anya m’we kele kwa Ya n’ihi inyem ihe di ezi nma.
Arọ nke mbum iga nzukọ Kraist bu ihe di nfé otú a, kama ihe ra ka arọ nke abua ọ ghọrọ ihe siri ike, n’ihi na m’kwesiriri ichesi èchìchè ike ka anya-miri we malite irùputa n’ihi na m’mere ya ọtutu mb͕e.
Mb͕e anya-miri ahu adighi aputa, mb͕e ufọdu m’rigoro n’elu ọtutu ugwu we bu ọnu ihe ra ka ubọchi 3. Ejuputaram nime anya-mirim, we ridata n’obodo, we tie kwa nkpu ákwá n’ulo nzukọ Kraist.
Ndi nọm nso we si, “I ghọworo onye di nsọ nke-uku site n’ekpere gi nile n’ugwu ndia.” Ma otù o si nādi anya-miri ahu kpọrọ nku ọzọ. Ọ ghọrọ ihe siri ike n’ezie n’arọ nke-atọ-ya. M’gēcheta ihe ọjọ nile m’mereri ndi eyìm na ndi-Kristian ibem we ti kwa nkpu ákwá ọzọ. Mb͕e arọ 4 gasiri, anya-miri ahu we kpọ nku ọzọ. Enwere glands nāmi anya-miri n’anyam, ma ha adighi-alu ọlu ọzọ.
Mb͕e arọ 5 gasiri, apughm iti nkpu ákwá, ọbuná otù m’si nwa. Mb͕e ihe ra ka arọ abua ọzọ gasiri, m’kpọrọ onwem asi we laghachi na Bible ọzọ.
 
 

N’Aka Iwu ahu Ka Nmazu Nke Nmehie Sitere 

 
Òle ihe ayi aghaghi imazu bayere Iwu ahu?
Ayi apughi idebe Iwu ahu ma-ọli.
 
Na Ndi-Rom 3:20, ayi nāgu, “Ọ bu n’aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere.” M’guru ama-okwu nka ibu nání okwu nke diri Onye-ozi Pọl we kwere n’okwu nke m’rọputara. Ma mb͕e anya-mirim nile kpọsiri nku apughm inọgide na ndu okwukwem.
Ya mere, emehierem nēwepughi aka we chọputa kwa na enwerem nmehie n’obim na ọ bu ihe agaghi ekwe omume isite n’aka Iwu ahu di ndu. Apughm inagide ya. Kama apughi kwam itufu Iwu ahu n’ihi na ekwerem na enyere-ya ayi idebe. N’ikpè-azu, aghọrọm onye-iwu dika ndi ekwuru bayere ha n’Akwukwọ Nsọ. Ọ ghọrọ ihe sirim ike otú a igaba n’iru na ndu okwukwe.
Ya mere, i si na ihe-isi-ike pua, m’kpere ekpere we chọ kwa Onye-nwe-ayi site n’obi aghughọ adighi na ya. Ya mere, m’zutere Ozi ọma miri na Mọ Nsọ site n’Okwu ahu, we bia kwa mazu kwere kwa na ab͕aputarari nmehiem nile(Bupuru Nmehie).
Mb͕e ọ bula m’huru okwu nile ahu na enweghm nmehie, ọ dika ikuku ume-ndu nke nēfe n’obim. M’nwereri ọtutu nmehie ra otú a mb͕e m’nāgu Iwu ahu, m’we malite imazu nmehie nile ndia. M’mebiri Okwu Iri ahu dum n’obim. Imehie n’obi bu kwa nmehie, m’ghọrọri onye kwere n’Iwu ahu nāmataghi-ya
Mb͕e m’debere Iwu ahu, obi nādim utọ. Ma mb͕e apughm idebe Iwu ahu, m’husiri anya, nwe nmekpa-aru we kwa iwe. N’ikpè-azu, ike gwurum bayere ihe nile. Ọ buru na ezíri-rim na mbu, “É-è, é-è. Enwere ihe ọzọ Iwu ahu putara. Ọ nēgosi-gi na ibu okpotokpo nmehie; i nwere ihu-n’anya n’ebe ego nọ, n’ebe nwoke na nwanyi na ihe nile nọ, na n’ebe ihe nile di nma ile anya nọ. I nwere ọtutu ihe i huru-n’anya kari Chineke. I nāchọ iso ihe nile nke uwa. Enyeworo-gi Iwu ahu, ọ bughi ka idebe-ya, kama ọ bu ka imazu onwe-gi dika onye-nmehie nwere ihe ọjọ n’obi-gi.”
Ọ buru na nání madu zíri-rim ezi-okwu a mb͕e ahu, agaghm ahu ahuhu rue arọ 10. Otú a, m’nọrọri n’okpuru Iwu ahu rue arọ 10 tutu m’we biaru na nmazu nka.
Iwu nke anọ bu, “Cheta ubọchi-izu-ike, ido ya nsọ.” Ọ putara na ayi agaghi alu-ọlu n’Ubọchi-izu-ike. Ọ putara na ayi kwesiri ijeghari, ghara iji ub͕ọ-ala ma ọ buru na ayi nēje ebe nile di anya. Echerem na m’kwesiri iji ukwu jeru ebe m’nēzí ozi ọma ka m’we nwe nsọpuru. N’ebe ọ bu na, achọrọm izí bayere Iwu ahu. Otú a, echerem na m’kwesiri ime ihe m’nēkwusa. Ọ bu ihe siri ike otú a na m’biaruru nso iwezuga onwem.
Dika edekọworo-ya ebe a, “ì si aṅa agu ya?” Aghọtaghm ajuju a we hua ahuhu rue arọ 10. Onye-iwu ahu ghọtahiere ya kwa. O chere na ọ buru na ọ ṅa nti n’Iwu ahu we bi kwa ndu na ntukwasi-obi, ọ gābu onye ngọzi diri n’iru Chineke. 
Ma Jisus gwara ya, “ì si aṅa agu ya?” É-è, i zara nke-ọma; i nēwere ya dika edeworo ya n’akwukwọ. Nwa idebe ya. I gādi ndu ma ọ buru na ime nka, ma nwu ma ọ buru na imeghi. Ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu. “I gānwu ma ọ buru na imeghi.” (azu-okwu nke ndu bu ọnwu, ọ̀ bughi ya?)
Ma onye-iwu ahu akāghọtaghi. Onye-iwu ahu bu ayi, gi na mu. M’guru nkà-nmuta-okpukpe rue arọ 10. M’nwara ihe nile, gua ihe nile we me kwa ihe nile: ibu ọnu, ihu ọtutu ọhù-ugha, kwue okwu n’asusu ọhu di iche iche... M’guru Bible rue arọ 10 nwe kwa olile-anya imezu ihe. Kama n’ime mọ, m’ka bu onye-ìsì.
Ya mere onye-nmehie kwesiri izute onye puru ime ka ọ hu na Onye-nzọputa ahu bu Onye-nwe-ayi Jisus. Mb͕e ahu ọ nāmazu “Aha! Ayi apughi idebe Iwu ahu ma-ọli. Ọbuná otù ayi si nwasie ike, ayi gāga n’ọku-ala-mọ site n’inwa nání. Ma Jisus biara izọputa-ayi site na miri ahu na Mọ Nsọ! Hallelujah!” Apuru ib͕aputa-ayi site na miri ahu na Mọ Nsọ. Ọ bu amara ahu, onyinye ahu nke Chineke. Ya mere ayi nēto Onye-nwe-ayi.
Enwezurum chi-ọma izùputa n’uzọ nke olile-anya nādighi, ma ufọdu ji ndu ha nile nāgu nkà-nmuta-okpukpe n’efu we ghara kwa imata ezi-okwu ahu rue ubọchi ha nānwu ọnwu. Ufọdu ndi kwere rue ọtutu okpukpu arọ 10 ma-ọbu site n’ọb͕ọ rue n’ọb͕ọ, ma amughi ha ọzọ ma-ọli.
Ayi nēsi ibu onye-nmehie zùputa mb͕e ayi mazuru na ayi apughi idebe Iwu ahu ma-ọli, mb͕e ahu guzo n’iru Jisus we ṅa nti n’ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ. Mb͕e ayi zutere Jisus, ayi gēsi n’ikpé na ahuhu puta. Ayi bu ndi-nmehie jọkariri njọ, kama ayi nāghọ ndi ezi omume n’ihi na Ọ zọputara-ayi site na miri ahu na ọbara ahu. 
Jisus gwara ayi na ayi apughi ibi ndu n’ihe Ọ nāchọ ma-ọli. Ọ gwara onye-iwu ahu nka, ma ọ ghọtaghi. Ya mere Jisus kọrọ-ya akukọ inyere ya aka ighọta.
 
Gini nēme ndi madu daworo na ndu okwukwe?
Nmehie
 
“Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n’etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ” (Luk 10:30). Jisus nāgwa ya na onye ọ bula huru ahuhu na ndu ya nile, dika nwoke ahu nke ndi nāpunara madu ihe tiri ihe-otiti we rapu ya ọtọgbọrọ.
Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko. Jeriko bu uwa nke nmehie ma Jerusalem nānọchi anya obodo okpukpe, obodo okwukwe, nke juputara na ndi nēji iwu ahu nāfuli elu. Ọ nāgwa ayi na ọ buru na ayi kwere na Kraist dika okpukpe, aghaghi ibibi ayi.
“Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n’etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ.” Jerusalem bu obodo sara mbara nke nwere ọnu-ọgugu madu riri nne. Enwere onye-isi-nchu-àjà, usu nile nke ndi-nchu-àjà, ndi-Livai na ọtutu ndi okpukpe amara aha-ha nke-ọma n’ebe ahu. Enwere ọtutu ndi mara Iwu ahu nke-ọma. N’ebe ahu, ha nānwa ime ihe nile Iwu ahu nāchọ, ma n’ikpè-azu ha dara we nēje na Jeriko. Ha gara n’iru idabà n’uwa (Jeriko) we zute kwa ndi nāpunara madu ihe. 
Nwoke ahu dabà-kwa-ra n’etiti ndi nāpunara madu ihe ndi ahu we b͕a ya ọtọ. “Ib͕a ya ọtọ” putara na ezi omume ya funariri-ya. Ọ bu ihe agaghi-ekwe omume ayi isi n’Iwu ahu di ndu. Onye-ozi Pọl siri na Ndi-Rom 7:19-20, “N’ihi na ezi ihe nke m’nāchọ ka m’nēmegh: kama ihe ọjọ nke m’nāchọghi, ihe ahu ka m’nēme. Ma ọ buru na ihe m’nachọghi, ihe ahu ka m’nēme, ọ bughi mu onwem nāluta kwa ya ọzọ, kama ọ bu ihe ahu nke nēbi nimem, bú nmehie.”
M’nāchọ ime ezi ihe we bi kwa ndu dika Okwu-Ya si di. Kama n’ime “bú n’obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche” (Mak 7:21-23).
N’ihi na ha di n’obi-ayi we nāputa kwa mb͕e nile, ayi nēme ihe ayi nāchọghi ime, ayi adighi kwa eme ihe ayi kwesiri ime. Ayi nāga n’iru ime ihe ndia ahu jọrọ njọ di n’ime obi-ayi nēwepughi aka. Ihe ekwensu kwesiri ime bu inye ayi nání ihe-nkpali ntà imehie.
 
 
Nmehie nile Di N’ime Obi Ndi Madu Dum 
 
Àyi puru ime ihe Iwu ahu nāchọ?
É-è
 
Ọ si na Mak 7, “Ihe ọ bula nke si n’ìhè ba nime madu, na ọ pughi imeru ya; kama ihe nke si nime madu puta, nke ahu nēmeru madu.” 
Jisus nāgwa ayi na enwere èchìchè nile jọrọ njọ, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko nile, ib͕u-madu nile, ori nile, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, na enweghi-uche n’me n’obi madu. Ayi dum nwere ib͕u-madu n’obi-ayi.
Enweghi onye adighi eb͕u madu. Ndi bú nne nētiri umu ha nkpu si, “É-è. Emela nka. M’gwara gi ka i ghara ime nka, uchu b͕akwa gi. M’siri emela ihe ahu.” Mb͕e ahu kwa, “Bia ebe a. M’gwara gi we gwa gi ọzọ ka i ghara ime ihe ahu. M’gēb͕u i n’ihi nka.” Nka bu ib͕u-madu. I puru ib͕u umu-gi site n’ọtutu okwu-gi nile bú nke nēnweghi-uche.
Kama ọ buru na ayi tukwasi iwe ayi nile n’aru-ha, umu-ayi gānwu. Ayi gaworo eb͕u ha n’iru Chineke. Mb͕e ufọdu ayi nātu onwe-ayi ujọ. “Chi-mo-o! Gini mere m’ji me nka?” Ayi nēle nchifia nile mb͕e ayi kusiri umu-ayi ihe we nēchè na isi adighi ayi nma ime ihe ahu. Ayi nēme omume n’uzọ a n’ihi na ayi nwere ib͕u-madu n’obi-ayi.
Ya mere “Nke m’nāchọghi, ihe ahu ka m’nēme” putara na ayi nēme ihe jọrọ njọ n’ihi na ayi jọrọ njọ. Ọ bu ihe di nfé ekwesu inwa ayi imehie.
Ka ayi si na otù nwoke nke anab͕aputaghi nānọdu ọdu n’ulo-ọnọdu-abali n’ubi rue arọ 10, nēlekwasi anya na mb͕idi-ulo nātugharia uche dika Sung-chol bú oké onye monk nke Korea. Ọ di nma mb͕e ọ nānọdu ọdu nēchè iru-ya na mb͕idi-ulo ahu, ma otù onye kwesiri iwetara ya nri we bupu ihe-inyì.
Mb͕e ahu ya na madu aghaghi inwekọ ihe. Ọ gaghi abu nsob͕u ma ọ buru na ọ bu nwoke, kama ka ayi si na onye ahu bu nwayi mara nma. Ọ buru na ọ gāhu ya n’otù ntabi-anya, ọdu nile nke ọ nọduru gābu ihe efu. Ọ nēche, “Ekwesighm ikwa iko; enwerem ya n’obim, ma m’kwesiri iwusì ya. M’kwesiri ikwapu-ya. É-è! Si n’uchem pua!” 
Ma ntachi-obi-ya gēkusi dika anwuru-ọku mb͕e ọ nāhu ya. Mb͕e nwayi ahu puru, ọ gēle anya n’obi-ya. Arọ iri nke ọlu siri ike, ha nile bu ihe efu.
Ọ bu ihe dikariri Setan nfé inapu madu ezi omume ya. Ihe nile Setan gēme bu inye ya ntakiri ikwa-aka. Mb͕e madu nāb͕a nb͕a ighara imehie mb͕e akāb͕aputaghi-ya, ọ gāga n’iru idabà na nmehie. Na madu nākwu otù uzọ n’uzọ iri na ntukwasi-obi kwa-Ubọchi-nzukọ Kraist, bue ọnu rue ubọchi 40, ubọchi 100 nke ekpere ututu... ma Setan nānwa nānwa ha site n’ihe nile di nma na ndu.
“M’chọrọ inye gi ọnọdu di elu n’ulo-ọlu a, ma i bu onye-Kristian i pughi kwa ilu ọlu kwa-Ubọchi-nzukọ Kraist, ì gēme ya? Ọ bu ọnọdu di oké elu. I puru ilu ọlu kwa-Ubọchi-nzukọ Kraist 3 we ga na nzukọ Kraist nání otù ubọchi n’ọnwa. Mb͕e ahu i gērita ọnọdu di oké elu nwe kwa ugwọ-ọlu b͕ara abuba nke-uku. Òle bayere nka?” Na nka, ma eleghi anya ndi 100 n’etiti ndi di 100 gādabà n’ọnwunwa a.
Ọ buru na nka adighi aluputa ihe, enwere ndia bú ndi adighi ike n’ebe nwanyi nọ. Setan gētiye otù nwanyi n’iru ya, ọ we dabà n’oké ihu-n’anya we nēchèfu kwa Chineke n’otu ntabi-anya. Otú a ka esi anapu madu ezi omume ya.
O buru na ayi nwa isi n’Iwu ahu di ndu, ihe nile ayi gēnweta n’ikpè-azu bu ọnyá nke nmehie, ihe-nb͕u na ob͕eye; ezi omume ayi nile gēfunari-ayi. “Si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n’etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ.” 
Nka putara ọbuná ayi puru inwa inọ na Jerusalem site n’ibi ndu dika ihe Chineke di Nsọ nāchọ, ayi nāsu ngọngọ oge nile n’ihi adighi-ike nile nke aka-ayi ma agēbibi kwa ayi.
Mb͕e ahu kwa ayi gēkpe ekpere na nchèghari n’iru Chineke. “Onye-nwa-ayi, emehiewom. Biko b͕agaharam; Agaghm eme ya ọzọ ma-ọli. M’nēkwe gi nkwà na nka gābu nke ikpè-azu n’ezie. M’nārio gi nārio-kwa-gi ka ib͕agharam nání otù mb͕e a”
Ma ọ gaghi-adigide ma-ọli. Ndi nile apughi ibi n’uwa nka nēmehieghi. Ha puru izere-ya ihe ra ka ub͕ò abua, ma ọ gābu ihe agaghi ekwe omume izere imehie ọzọ. Ya mere anēme nmehie nēwepughi aka. “Onye-nwa-ayi, biko b͕agharam.” Ọ buru na nka gaba n’iru, ha gēbupu onwe-ha n’ulo nzukọ Kraist (okpukpe). Ha gēbupu onwe-ha n’ebe Chineke nọ n’ihi nmehie nile ha we nējedebe kwa n’ọku-ala-mọ. 
Iga na Jeriko putara idabà nime uwa nmehie, nābiaru uwa nso nāgabiga kwa n’ebe di anya na Jerusalem. Na nmalite, Jerusalem ka di nso kari. Ma dika anēmeghari imehie na ichèghari, ayi nāchọputa na ayi onwe-ayi nēguzo n’uzọ obodo Jeriko, dabàworo nime omimi uwa.
 
Ònye ka apuru izọputa?
Ndi ahu nke nēwepu aka-ha inwa n’aka nke onwe-ha
 
Ònye ka nwoke ahu zutere n’uzọ ya iga Jeriko? O zutere ndi nāpunara madu ihe. Onye adighi ebi ndu ọbuná site n’Iwu ahu nāghọ nkita di ala. Ọ nāṅu, dà n’ura ebe ọ bula, nāwupu kwa mamiri ya ebe nile. Nkita nka gēbilite n’ura n’echi-ya we nāṅu kwa ọzọ. Nkita di ala gēri ǹsí nke aka-ya. N’ihi nka ka o ji buru nkita. Ọ matara na o kwesighi iṅu. Ọ nēchèghari n’ututu echi-ya ma nāṅu kwa ọzọ. 
Ọ dika nwoke ahu zutere ndi nāpunara madu ihe n’uzọ ya iga Jeriko. Arapuworo ya, ti kwa ya ihe-otiti ma we rapu kwa ya ọtọgbọrọ. Enwere nání nmehie n’obi-ya. Otú a ka madu di.
Ndi nile nēkwere na Jisus ma nēsi n’aka Iwu ahu adi ndu na Jerusalem ma agārapu ha azu, ebe ọ bu nání nmehie gādi n’obi-ha. Ihe nile ha nwere igosi na ndu-ha nile nke opkukpe ha bu ọnyá nke nmehie. Ndia nwere nmehie n’obi-ha bu ndi agātubà n’ọku-ala-mọ. Ha matara ya kama ha amaghi ihe ha gēme. Mù na gi nọwo-kwa-ra n’ebe ahu? E. Ayi dum bu otù.
Onye-iwu ahu nke ghọtahiere iwu Chineke gāb͕a nb͕a na ndu-ya nile kama ọ gējedebe n’ọku-ala-mọ, n’ọnyá. Ọ bu ayi, mu na gi.
Nání Jisus puru izọputa ayi. Enwere ọtutu ndi-amam-ihe na buruburu-ayi, ha nāfuli elu rue mb͕e ebighi n’ihi ihe ha mara. Ha nile nēme ka ha nēsi n’aka Iwu Chineke ahu di ndu Ha apughi kwa ikwuru onwe-ha ezi okwu. Ha apughi ikpọ ihe di nma ihe di nma na ihe ọjọ ihe ọjọ, ma ha nānwa idozi ihe-anya nāhu nke-ọma ka ọ dika ha kwesiri ntukwasi-obi.
N’etiti ha bu ndi-nmehie ndi nọ n’uzọ-ha iga Jeriko, bú ndi etiri ihe-otiti site n’aka ndi nāpunara madu ihe we rapu kwa ha hatọgbọrọ. Ayi kwesiri imata otù ayi si buru ndi dika ihe nādighi ike ntiwa n’iru Chineke.
Ayi kwesiri ikwezu n’iru Ya, “Onye-nwa-ayi, m’gāga n’ọku-ala-mọ ma ọ buru na izọputaghm. Biko zọputam. M’gāga ebe ọ bula I nāchọ, ma-ọbu na miri-ozizo nēzo ma-ọbu n’oké ajọ ifufe nēfe, ma ọ buru na I gēkwe ka m’nu ezi ozi ọma ahu. Ọ buru na irapu nání m, m’gāga n’ọku-ala-mọ. M’nāriọ Gi ka izọputam”
Ndi nke matara na ha nējedebe n’ọku-ala-mọ, ndi nke rara nye n’aka inwa ichu ezi omume nke aka ha we nādabere n’Onye-nwa-ayi, ndia bu ndi nke apuru izọputa. Apughi izọputa-ayi site n’aka-ayi ma-ọli.
Ayi kwesiri imara na ayi dika nwoke ahu nke dabàra n’etiti ndi nāpunara madu ihe.
 
Okwuchukwu a dịkwa n`ụdị ebook. Pịa na mkpuchi akwụkwọ n`okpuru.
ÀMUWO GI ỌZỌ N’EZIE SITE NA MIRI NA MỌ NSỌ? [Nbiputa Ntughari Ọhu]