• All e-books and audiobooks on The New Life Mission website are free
  • Explore multilingual sermons in global languages
  • Two new revised editions in English have been released
  • Check out our website translated into 27 languages
Search

Sermons

Isi-okwu 3 : Ozi Ọma Miri ahu na Mọ Nsọ

[3-1] Nb͕aputa Ebighi-Ebi Ahu (Jọn 8:1-12)

Nb͕aputa Ebighi-Ebi Ahu (Jọn 8:1-12)(Jọn 8:1-12)
“Ma Jisus gara ugwu Olive. O we bia kwa ọzọ n’isi-ututu n’ulo uku Chineke, ndi-Ju nile we biakute Ya; O we nọdu ala, we nēzí ha ihe. Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we kuta otù nwanyi nke ejidereri n’ikwa-iko; mb͕e ha guzosiri ya n’etiti, ha we si Ya, Onye-ozizí, ejidewo nwanyi a n’ikwa-iko, mb͕e ọ nēme ihe ahu. Ma n’iwu-ayi Moses nyere ayi iwu itu ndinyom di otú a nkume: gini kwa ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya? Ma nka ka ha nēkwu inwa Ya, ka ha we nwe ihe ha gēji bo Ya ebubo. Ma Jisus ruru ala, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n’ala. Ma mb͕e ha nọgidere nāju Ya, O welie Onwe-ya elu, si ha, Onye akēmehieghi n’etiti unu, ya buru uzọ tu ya nkume. O we ruru kwa ala ọzọ, were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n’ala. Ma mb͕e ha nuru ya ha pua n’otù n’otù, malite na ndi bu okenye, rue ndi-ikpé -azu: ewe rapu nání Jisus, Ya na nwanyi ahu, ebe o guzoro, n’etiti. Jisus we welie Onwe-ya elu, si ya, Nwanyi, òle ebe ha nọ? ọ̀ dighi onye ọ bula mara gi ikpé? O we si, Ọ dighi onye ọ bula, Onye-nwe-ayi. Jisus we si, Mu onwem amaghi kwa gi ikpé: ga nke gi. site n’ub͕u a adila nēmehie ọzọ. Ya mere Jisus gwara ha okwu ọzọ, si, Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agaghi-ejeghari n’ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu.” 
 
 
Ǹmehie ra otú ole ka Jisus hichapuru?
Nmehie nile nke uwa
 
Jisus nyere ayi nb͕aputa ebighi-ebi. O nweghi otù onye n’uwa nka nke apughi izọputa ma ọ buru na ha kwere na Jisus dika Onye-nzọputa-ha. Ọ b͕aputara ayi dum Ọ buru na enwere onye-nmehie nke nēnwe ihe-nb͕u n’ihi nmehie-ha, ọ bu n’ihi na ha aghọtaghi otù Jisus jiworo naputa-ha na nmehie nile site na baptism-Ya.
Ayi nile kwesiri imara we kwere-kwa n’ihe-nzuzo ahu nke nzọputa. Jisus būru nmehie nile ayi site na baptism-Ya we būruwo kwa ikpé nke nmehie nile ayi site n’inwu ọnwu n’Obe.
I kwesiri ikwere na nzọputa sitere na miri ahu na Mọ Nsọ; nb͕aputa ebighi-ebi ahu na nmehie nile. I kwesiri ikwere na ihu-n’anya-Ya di-uku nke mereri gi onye ezi omume. Kwere n’ihe O meworo n’ihi nzọputa-gi n’Osimiri Jọdan na n’Obe.
Jisus mara bayere nmehie nile ayi zoro ezo, kwa. Ufọdu ndi nwere èchìchè n’ezighi ezi bayere nmehie. Ha nēchè n’enwere ufọdu nmehie apughi ib͕aputa. Jisus b͕aputaworo nmehie nile, otù nime ha nile.
Enweghi otù nmehie n’uwa nka nke Ọ rapuru ibupu. N’ihi na O hichapuru nmehie nile n’uwa nka, enweghi ndi-nmehie ọzọ. Ì matara na ozi ọma ahu b͕aputaworo nmehie nile, ọbuná nmehie nke ọdi-n’iru-gi? Kwere na ya ka ewe zọputa-gi. Ka i we nye kwa Chineke otuto.
 
 
Nwanyi Ahu Nke Ejidereri N’ikwa-iko Mb͕e Ọ Nēme Ihe ahu
 
Ǹdi ra aṅa nākwa iko n’uwa?
Madu nile
 
Na Jọn isi 8, enwere otù nwanyi nke ejidereri n’ikwa-iko mb͕e ọ nēme ihe ahu. Ayi we hu kwa otù Jisus si zọputa-ya. Ayi gāchọ iketa amara ahu nke ọ natara. Ọ bughi ihe dikariri uku ikwu na madu nile nākwa iko n’oge ndu-ha nile. Onye ọ bula nākwa iko.
Ọ buru n’icheghi otú a, ọ bu n’ihi na ayi nēme ya ọtutu mb͕e o we di ka ayi anaghi eme ya. N’ihi gini? Ayi nēbi ndu n’ọtutu ikwa-iko na ndu nile ayi.
M’tulere nwanyi ahu m’we nātughari uche ka enwere ma-ọbu enweghi onye n’etiti ayi nākwaghi iko. Enweghi onye nākwaghi iko dika nwanyi ahu nke ejidereri n’ikwa-iko. Ayi dum nēme ka ayi emeghi ya.
Ì nēchè na m’hiere uzọ? É-è, ehieghm uzọ. Le anya nke-ọma nime onwe-gi. Onye ọ bula n’iru uwa nka meworo ya. Ha nākwa iko mb͕e ha nēle nwanyi nọ n’uzọ anya, n’èchìchè-ha ya na n’omumue-ha kwa, oge ọ bula, ebe ọ bula.
Ha anaghi amata na ha nēme ya. Enwere ọtutu ndi nke nāmataghi rue ubọchi ha nānwu na ha kwaworo ọtutu iko nke anādighi-aguta aguta na ndu-ha. Ọ bughi nání ndi ejidereri, kama ayi nile ndi ejideghi ma-ọli. Nile nile nēme ya n’uche-ha nile, ya na n’omume ha nile. Ọ̀ bu nka abughi ihe di na ndu-ayi?
Ì nēwe iwe? Ọ bu ezi-okwu. Ayi nēzo iji ọnu-ayi kwuputa-ya n’ihi na ayi nēnwe ihere. M’kweyere na ndi nile n’ubọchi ndia nākwa iko oge nile kama ha adighi-amata na ha nēme ya.
Ndi nile nākwa iko na nkpuru-obi-ha, kwa. Ayi, ndi Chineke kère, nēbi n’uwa nka na amataghi na ayi nākwa iko nke na nkpuru-obi-ayi. Ikpọ isi ala nye chi ndi ọzọ bu ikwa iko n’ime-mọ n’ihi na Onye-nwe-ayi bu nání Di madu nile.
Nwanyi ahu nke ejidereri n’ikwa-iko bu madu dika ayi, o we nata amara Chineke dika ayi ndi ab͕aputara mere. Kama ndi nwere iro-abua bú ndi-Farisi mere ya ka o guzo n’etiti we rua ya aka nēme ka ha bu ndi-ikpé, we jikere itu ya nkume. Ha jikere ime ya ihe-ọchi na ima kwa ya ikpé dika ha onwe-ha bu ndi di ọcha, dika ha akwaghi iko ma-ọli.
Ndi-Kristian ibem, ndi mara onwe-ha dika okpotokpo nmehie adighi-ekpe ndi ọzọ ikpé n’iru Chinkeke. Kama, n’ihi na ha mara na ha nākwa kwa iko na ndu-ha nile, ha natara amara Chineke nke b͕aputaworo ayi nile. Nání ndi matara na ha bu ndi-nmehie ndi kwara ọtutu iko mb͕e nile bu ndi ruru eru ib͕aputa n’iru Chineke.
 
 

Ònye Nānata Amara Chineke? 

 
Ònye nēbi ndu di ọcha nākwaghi iko ọ gānata amara-Ya, ma-ọbu onye erughi eru nke nēkwezu na o nēmehie nke-uku gānata amara Ya? Onye nke nāmazu na o nwere nmehie otú a bu onye nke nānata amara babigara oké nke nb͕aputa-Ya. Ndi apughi inyere onwe-ha aka, ndi adighi ike nēnweghi kwa olile-anya nānata nb͕aputa. Ha bu ndi nọ n’okpuru amara-Ya.
 
Ònye nānata amara Chineke?
Onye erughi eru
 
Apughi ib͕aputa ndi nēchè na ha enweghi nmehie. Hà esi aṅa anata amara nb͕aputa-Ya mb͕e enweghi ihe ọ bula nke agāb͕aputa?
Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi dọrọ nwanyi ahu ejidereri n’ikwa-iko mb͕e ọ nēme ihe ahu rue n’iru Jisus we guzo ya n’etiti-ha we jua kwa Ya si, “Ma n’iwu-ayi Moses nyere ayi iwu itu ndinyom di otú a nkume: gini kwa ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya?” Gini mere ha jiri kuta nwanyi ahu n’iru Jisus we nwa Ya? 
Ha onwe-ha kwarari iko ọtutu mb͕e, ma ha nāchọ ikpe ya ikpé we site kwa n’aka Jisus b͕ue ya we nānwa kwa itukwasi ita-uta-ya n’isi-Ya. 
Jisus matarari ihe di ha nile n’uche-ha, we mara kwa ihe nile bayere nwanyi ahu. Ya mere O we si, “Onye akēmehieghi n’etiti unu, ya buru uzọ tu ya nkume.” Mb͕e ahu ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, malite na ndi bu okenye rue ndi-ikpé-azu, we pua n’otù n’otù ewe rapu nání Jisus Ya na nwanyi ahu.
Ndi nke rapuru bu ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-ndu okpukpe. Ha nāchọ ikpe nwanyi ahu ikpé bú onye ejidereri n’ikwa-iko mb͕e ọ nēme ihe ahu, nēme kwa ka ha onwe-ha abughi ndi-nmehie.
Jisus kwusara ihu-n’anya-Ya n’uwa nka. Ọ bu Usu nke ihu-n’anya. Jisus nyere ndi nile nri, me ka ndi nwuru anwu si n’ọnwu bilie, nye nwa nwanyi di ya nwuru ndu, me ka Lazarọs nke Betani di ndu ọzọ, me ka aru ndi-ekpenta di ike, we mere ndi-ob͕eye ọtutu ihe-iriba-ama. O bupuru nmehie nile nke ndi-nmehie we nye kwa ha nzọputa.
Jisus huru ayi n’anya. Ọ bu Onye puru ime ihe nile nke puru ime ihe ọ bula, kama ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ chere na Ọ bu onye-iro ha. Ọ bu ihe mere ha ji kuta nwanyi ahu n’iru Ya we nwa Ya.
Ha we jua, “Ma n’iwu-ayi Moses nyere ayi iwu itu ndinyom di otú a nkume: gini kwa ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya?” Ha chere na Ọ gāgwa ha tu ya nkume. N’ihi gini? Ọ buru na ekpe ayi ikpé dika ihe edeworo akwukwọ iwu Chineke si di, ndi madu dum nke kwaworo iko ka ageji nkume tub͕u n’adighhi iche. 
Ekwesiri itub͕u ndi nile na nkume, ndi nile ka akàra kwa-ra akà iga n’ọku-ala-mọ. Ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu. Otù ọ di, Jisus agwaghi-ha ka ha tu ya nkume, kama Ọ siri, “Onye akēmehieghi n’etiti unu, ya buru uzọ tu ya nkume.”
 
Gini mere Chineke ji nye ayi ihe Iwu ahu di 613?
Ime ka ayi mazu na ayi bu ndi-nmehie
 
Iwu ahu nāluta iwe. Chineke di nsọ Iwu-Ya di kwa nsọ. Iwu Nsọ a biakutere ayi n’ime ihe iwu di 613. Ihe mere Chineke jiri nye ayi ihe Iwu ahu di 613 bu ime ka ayi mazu na ayi bu ndi-nmehie; na ayi bu ndi ezughi okè. Ọ nēzí ayi na ayi kwesiri ilegide anya na amara Chineke ka ewe ab͕aputa ayi. Ọ buru na ayi amataghi nka we che bayere nání ihe edeworo, ayi dum ka ekwesiri iji nkume tub͕ue n’ezie dika nwanyi ahu ejidereri mb͕e ọ nēme ihe ahu. 
Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi bú ndi amaghi ezi-okwu nke Iwu-Ya chere na ha puru itu nwanyi ahu nkume ma eleghi-anya tu ayi, kwa. Ònye puru itu nwanyi ahu nēweghi olile-anya nkume? Ọbuná ejidereri ya mb͕e ọ nēme ihe ahu, ọ dighi otù onye n’uwa nka puru itu ya nkume.
Ọ buru na ekpere nwanyi ahu na onye ọ bula nime ayi ikpé site otù Iwu ahu si di, ayi na nwanyi ahu gānata ikpé di egwù. Kama Jisus zọputara ayi, ayi bú ndi-nmehie, na nmehie nile ayi na ikpé ahu ziri ezi. N’ime nmehie nile ayi, ọ buru na etinyesiri Iwu Chineke ike dika edeworo ya n’akwukwọ, ònye nime ayi puru-idi ndu? Onye ọ bula nime ayi gējedebe n’ọku-ala-mọ.
Kama ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi matara Iwu ahu nání dika edeworo ya n’akwukwọ. Ọ buru na etiyere Iwu-Ya nke-ọma, ọ gēb͕u ha n’ezie dika onye ahu nke ha nēkpe ikpé. N’ezi-okwu, iwu Chineke ka enyeworo ndi madu ka ha we pu ighọta nmehie ha, kama ha taworo ahuhu n’ihi na ha ghọtahiere ya we ghara kwa itiye ya nke-ọma.
Ndi-Farisi nke ta, dika ndi-Farisi n’Akwukwọ Nsọ, mara Iwu nání dika edeworo ya n’akwukwọ. Ha kwesiri ighọta amara ahu, ikpé-ziri-ezi, na ezi-okwu ahu nke Chineke. Ekwesiri izí ha ozi ọma nb͕aputa ka ewe zọputa-ha.
Ndi-Farisi we si, “Enyere ayi iwu itu ndinyom di otú a nkume: kama gini kwa ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya?” Ha juru, nējigide kwa nkume n’aka n’obi-ike. Ha chere n’ezie na Jisus enweghi ihe ọ bula ikwu bayere ya. Ha nēché ka Jisus nara nri ọnyà-ha. 
Ọ buru na Jisus kpereri ikpé dika Iwu ahu si di, Ha gāra-atu kwa Ya nkume. Ìzù ha bu itu ha abua nkume. Ọ buru na Jisus gwarari ha ka ha ghara itu nwanyi ahu nkume, Ha gāsi na Jisus nēleli Iwu Chineke ahu, we tu kwa Ya nkume n’ihi nkwulu. Ọ bu ọnyà di egwù!
Kama Jisus ruru ala ma were nkpisi-aka-Ya nēde ihe n’ala, ma ha nọgidere nāju Ya, “Gini ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya? Gini ka I nēde n’ala? Za ajuju ayi. Gini ka Gi onwe-gi nēkwu bayere ya?” Ha nātu Jisus aka we ga n’iru ikpab͕u Ya.
Jisus welie Onwe-ya elu we si ha na onye akēmehieghi n’etiti ha ya buru uzọ tu ya nkume. Mb͕e ahu O ruru ala were nkpisi-aka-Ya nēdegide ihe n’ala. Mb͕e ahu ndi nuru ya, ebe akọ-na-uche-ha kpere ha ikpé, puru n’otù n’otù, malite na ndi bu okenye, rue ndi-ikpé-azu. Arapuworo nání Jisus, ya na nwanyi ahu nke nēguzo n’iru Ya.
 
 
“Onye Akēmehieghi N’etiti Unu, Ya Buru Uzọ Tu Ya Nkume”
 
Òle ebe edekọworo nmehie nile?
N’elu mbadamba nkume bú obi-ayi ya na n’Akwukwọ nke Ọlu
 
Jisus gwara ha, “Onye akēmehieghi n’etiti unu, ya buru uzọ tu ya nkume,” Ọ we nēdegide ihe n’ala. Mb͕e ahu ha malitere ipu n’otù n’otù, malite na ndi bu okenye. Ndi-Farisi ndi bu okenye, ndi mereri ọtutu nmehie kari, buru uzọ pua. Ndi bu ndi-okorọbia we pua kwa. Ka ayi were ya na Jisus nēguzo n’etiti ayi, ayi we nēguzo nwanyi ahu b͕urub͕uru. Ọ buru na Jisus siri-ri ayi na otù onye n’etiti ayi nke akēmehieghi ya buru uzọ tu nkume, gini ka i gaworo eme?
Gini ka Jisus nēde n’ala? Chineke, onye kere ayi, nēde nmehie nile ayi n’ebe abua di iche.
Nke mbu, O nēde nmehie nile ayi n’elu mbadamba nkume bú obi-ayi
“Ejiwo pen ígwè, ji kwa ọnu-ọnu diamond, de nmehie Juda: atuwo ya n’elu mbadamba nkume, bú obi-ha, na n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nile nke umu” (Jeremaia 17:1).
Chineke nāgwa ayi okwu site na Juda. Ejiworo pen ígwè tua nmehie madu nile, ji kwa ọnu-ọnu diamond. Edekọrọ ha n’elu mbadamba nkume bú obi-ayi. Jisus ruru ala we de n’ala na madu nile bu ndi-nmehie.
Chineke mara na ayi nēmehie Ọ we tu nmehie nile n’elu mbadamba nkume bú obi-ayi. Na mbu, O dekọrọ ọlu ayi nile, nmehie nile nke ayi nēme n’ihi adighi-ike-ayi n’ebe Iwu ahu di. Dika edekọrọ nmehie nile n’obi-ayi, ayi nāmazu na ayi bu ndi-nmehie mb͕e ayi nēlegide Iwu ahu anya. N’ihi na O dekọrọ ha n’obi-ayi, n’akọ-na-uche-ayi, ayi nāmara na ayi bu ndi-nmehie n’iru Ya.
Jisus ruru kwa-ra ala nke ub͕o abua ide ihe n’ala. Akwukwọ Nsọ nāsi na edekọrọ nmehie nile ayi n’Akwukwọ nke Ọlu n’iru Chineke (Nkpughe 20:12). Aha otù onye na nmehie-ya nile ka edekọrọ n’Akwukwọ ahu. Edekọ kwa-ra ha n’elu mbadamba nkume bú obi onye ahu. Edekọrọ nmehie nile ayi ub͕ọ abua n’Akwukwọ nke Ọlu na n’elu mbadamba nkume bú obi-ayi.
Edekọrọ nmehie nile n’elu mbadamba nkume bú obi madu nile, ma-ọbu okorọbia ma-ọbu okenye. N’ihi nka ha enweghi ihe ọ bula ha gēkwu bayere nmehie ha n’iru Jisus. Ha bú ndi nānwa itu nwanyi ahu nkume enweghi olile-anya n’ebe okwu-Ya nile nọ.
 
Òle mb͕e nmehie nile ayi, bú nke edekọrọ n’ebe abua ahu, ehichapuru ha?
Mb͕e ayi nabatara nb͕aputa nke miri ahu na ọbara Jisus n’obi-ayi.
 
Otú ọ di, mb͕e i nara nzọputa-Ya, nmehie-gi nile nke di n’Akwukwọ nke Ọlu kāgēhichapu ewe deputa kwa aha-gi n’Akwukwọ nke Ndu. Ndi aha-ha nāputa ìhè n’Akwukwọ nke Ndu gāga elu-igwe. Ezi ihe nile ha, ihe nile ha meworo n’uwa nka n’ihi ala-eze Chineke ya na ezi omume Ya ka edekọ-kwa-ra n’Akwukwọ nke Ndu. Anabataworo ha n’elu-igwe. Ndi nile bú ndi anaputaworo na nmehie nile ha gābà n’ala ebighi-ebi ahu.
Nmehie madu nile ka edekọrọ n’ebe abua ahu. Ya mere o dighi onye puru iduhie Chineke. Enweghi onye ọ bula nke akēmehieghi n’obi-ha na nke akākwaghi iko n’obi-ha. Ayi dum bu ndi-nmehie na ndi ezughi okè.
Ndi nke anabataghi nb͕aputa Jisus n’obi-ha bu ndi aghaghi inwe ihe-nb͕u n’ihi nmehie nile ha. Ha enweghi obi-ike. Ha nātu Chineke ujọ, ha nātu ujọ n’iru Chineke na ndi ọzọ n’ihi nmehie nile ha. Kama mb͕e ha nānabata n’obi-ha ozi ọma nke nb͕aputa ahu nke miri ahu na Mọ Nsọ, nmehie nile ha nke edekọworo n’elu mbadamba nkume nke bú obi-ha ya na n’Akwukwọ nke Ọlu ka agēhichapu ọ di ọcha. Anaputaworo ha na nmehie nile ha.
Enwere Akwukwọ nke Ndu n’elu-igwe. Aha nile nke ndi kwere na nb͕aputa nke miri ahu na Mọ Nsọ ka edekọworo n’akwukwọ ahu, ha gābà kwa n’elu-igwe. Ha nābà n’elu-igwe, ma-ọbughi n’ihi na ha emehieghi n’uwa nka, kama n’ihi na anaputaworo ha na nmehie nile ha site n’ikwere na nb͕aputa sitere na miri ahu na Mọ Nsọ. Ọ bu ‘n’iwu nke okwukwe’ (Ndi-Rom 3:27).
Ndi-Kristian ibem, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi bu ndi-nmehie, dika nwanyi ahu ejidereri n’ikwa-iko. 
N’ezi-okwu, ha meworo ọtutu nmehie kari n’ihi na ha nēme we nāghọb͕u kwa onwe-ha na ha abughi ndi-nmehie. Ndi-ndu okpukpe ahu bu ndi ori sitere n’akwukwọ ike. Ha bu ndi-ori nke nkpuru-obi, ndi-ori nke ndu. Ha nēji obi-ike chọ izí ndi ọzọ ihe n’uzọ aghughọ nādighi na ya, ọbuná akāb͕aputaghi ha onwe-ha.
Enweghi otù onye nke enweghi nmehie dika Iwu ahu si di. Ma madu puru ighọ onye ezi omume, ọ bughi n’ihi na ha emeghi nmehie, kama n’ihi na ab͕aputaworo ha na nmehie nile ha, edekọwo kwa-ra aha ha n’Akwukwọ nke Ndu. Ihe di nkpà bu ka edekọworo aha madu n’Akwukwọ nke Ndu. N’ihi na ndi nile apughi ibi ndu ghara ime nmehie, ekwesiri ib͕aputa-ha.
Ma agānabata-gi n’elu-igwe nādabere na ma-ọbu i kwere ma-ọbu ikweghi. Ma-ọbu i gānara amara Chineke ma-ọbughi ya nādabere na ma-ọbu i nānabata nzọputa nime Jisus. Gini mere nwanyi ahu ejidere? Ọ nēguzo n’ebe ahu we mechie kwa anya-ya n’ihi na ọ matara na ọ gānwu. Ma eleghi anya ọ nēti nkpu ákwá n’egwù na nchèghari. Ndi madu nēkwuru onwe-ha ezi-okwu mb͕e ha nānọ n’ọnu ọnwu.
“O, Chineke, o kwesiri ekwesi na m’gānwu. Biko nabata npkuru-obim n’aka-Gi abua, me-kwa-ram ebere. Biko merem ebere, Jisus.” Ọ riọrọ Jisus ihu-n’anya nb͕aputa. “Chineke, ọ buru na I ikpem ikpé , m’gābu onye ekpere ikpé, ọ buru kwa na I si kwa na enweghm nmehie ọ bula, mb͕e ahu nmehiem nile ka agēhichapu. Ọ di n’aka Gi.” Ma eleghi anya ọ nēkwu ihe ndia nile. Ihe nile di n’aka Jisus.
Nwanyi ahu nke ekutara n’iru Jisus asighi, “M’mere ihe ọjọ, biko b͕agharam ikwa-ikom.” Ọ siri, “Biko zọputam na nmehiem nile. Ọ buru na I b͕aputa nmehiem nile, agāzọputam. Ma ọ bughi ya, m’gāga n’ọku-ala-mọ. M’nāchọ nb͕aputa-gi. M’nāchọ ihu-n’anya Chineke, M’nāchọ ka O merem ebere.” O kpuchiri anya-ya kwuputa kwa nmehie-ya nile.
Ma Jisus juru ya, “Òle ebe ha nọ? ọ̀ dighi onye ọ bula mara gi ikpé?” O we za si, “Ọ dighi onye ọ bula, Onye-nwe-ayi”
Jisus we si ya, “Mu onwem amaghi kwa gi ikpé.” Jisus amaghi ya ikpé n’ihi na O bupururi nmehie-ya nile site na baptism-Ya n’osimiri Jọdan, ab͕aputarari ya. Now, Jesus, not the woman, had to be judged for her sins. Ub͕u a, Jisus, ma-ọbughi nwanyi ahu, ka ekwesiri ikpe ikpé n’ihi nmehie-ya nile.
 
 
O Si, “Mu Onwem Amaghi Kwa Gi Ikpé.” 
 
Jìsus mara ya ikpé?
É-è
 
Jisus were nzọputa gọzie nwanyi nka. Ab͕aputaworo nmehie-ya nile. Onye-nwa-ayi Jisus nāgwa ayi na Ọ b͕aputara nmehie nile ayi na ayi dum bu ndi ezi omume.
Ọ nāgwa ayi otú a na Bible. Jisus bupuru nmehie nile ayi site na baptism-Ya n’Osimiri Jọdan, mb͕e ahu O we nwua kwa n’Obe ikwu ugwọ nmehie nile ayi. Ọ nāgwa ayi n’ebe ọ di ọcha na Ọ b͕aputara ndi nile kwere na nb͕aputa nke baptism na ikpé Ya n’Obe. Ayi dum nāchọ Okwu nile nke Jisus edeworo we nāchọ kwa ijidesi Okwu ahu ike. Mb͕e ahu, agēwere nb͕aputa gọzie ayi dum. 
“Chineke, abaghm urù n’iru Gi. Enweghm talent ọ bula. Enweghm ihe ọ bula igosi Gi ma-ọbughi nmehiem nile. Kama ekwerem na Jisus bu Onye-nwe-ayi nke nb͕aputa. O bupuru nmehiem nile n’Osimiri Jọdan we kpuchie ha nile n’Obe. O bupuru nmehiem nile site na baptism-Ya ya na ọbara-Ya. Ekwerem na Gi, Onye-nwe-ayi.” 
Otú a ka esi zọputa gi. Jisus ‘amaghi ayi ikpé.’ O nyere ayi ike ibu umu Chineke bú ndi bu ndi ezi omume: Nye ndi nke kwere na nb͕aputa nke miri ahu na Mọ Nsọ.
Ndi-eyì m’huru n’anya! Ab͕aputaworo nwanyi ahu. Nwanyi ahu nke ejidereri n’ikwa-iko ka ejiworo nb͕aputa gọzie n’iru Jisus. Apuru igọzi kwa ayi otú a. Onye ọ bula nke mazuru nmehie ya we riọ Chineke imere ha ebere, onye ọ bula nke nēkwere na nb͕aputa nke miri ahu na Mọ Nsọ nime Jisus nānara ngọzi nke nb͕aputa si n’aka Chineke. Ndi kwezuru nmehie ha n’iru Chineke ka apuru ib͕aputa. Onye nke nēmehie ma ghara imazu nmehie nile nke aka-ya ka apughi iwere nb͕aputa gọzi.
Jisus bupuru nmehie nile nke uwa (Jọn 1:29). Onye-nmehie ọ bula ka apuru izọputa ma ọ buru na ha kwere na Jisus. Jisus we si nwanyi ahu, “Mu onwem amaghi kwa gi ikpé.” O siri na O maghi ya ikpé n’ihi na nmehie-ya nile diri n’aru-Ya, O būru nmehie nile ayi nye Onwe-ya, ewe kpe Ya ikpé n’ọnọdu-ayi.
 
 
Ekwesiri Ib͕aputa Ayi N’iru Jisus, Kwa
 
Òle nke ka uku, ihu-n’anya Chineke ma-ọbu ikpé Chineke?
Ihu-n’anya Chineke
 
Ndi-Farisi, jigidere ọtutu nkume n’aka-ha, dika ndi-ndu okpukpe nke ta, nākọwa Iwu ahu dika edeworo n’akwukwọ. Ha kwere na n’ihi na Iwu nāgwa ayi ka ayi ghara ikwa iko, onye nke nēmehie ka ageji nkume tub͕ue. Ha nēwere anya ikwa-iko nēle umu-nwanyi anya we nēme ka ha anaghi akwa iko. Apughi ib͕aputa ma-ọbu izọputa ha. Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ bu ndi-omume-ọma nke uwa a. Ha abughi ndi Jisus kpọrọ. Ndi madu ndia anughi ma-ọli olu-Ya, “M’gaghi ama gi ikpé.”
Nání nwanyi ahu nke ejidereri n’ikwa-iko nuru okwu ọṅù ndia ahu. Ọ buru na i nēkwuru onwe-gi ezi-okwu n’iru Ya, apu-kwa-ra igọzi gi dika ya. “Chineke, m’nākwa iko na ndu nile. Ọ di ka adighm eme-ya n’ihi na m’nēme ya ọtutu mb͕e otú a. M’nēmehie ọtutu ub͕ò n’otù ubọchi.”
Mb͕e ayi nēguzo n’iru Iwu ahu we nabata ezi-okwu ahu nke bú na ayi bu ndi-nmehie ndi kwesiri inwu ọnwu we bia iru Chineke site n’obi ezi-okwu we nāmazu kwa onwe-ayi dika ayi di, nāsi, “Chineke, ihe a bu ihe m’bu. Biko zọputam.” Chineke gēji nb͕aputa gọzi ayi. 
Ihu-n’anya Jisus, nke ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ, emeriwo ikpé-ziri-ezi nke Chineke. “Mu onwem amaghi kwa gi ikpé.” O maghi ayi ikpé O we si, “Ibu onye ab͕aputaworo.” Onye-nwe-ayi Jisus Kraist bu Chineke ọmiko. Ọ naputaworo ayi na nmehie nile nke uwa.
Chineke ayi bu Chineke nke Ikpé-ziri-ezi na Chineke nke Ihu-n’anya. Ihu-n’anya nke miri ahu na Mọ Nsọ ka ọbuná ikpé Ya uku.
 
 

Ihu-n’anya Ya Ka Ikpé-ziri-ezi-Ya Uku

 
Gini mere O jiri b͕aputa ayi nile?
N’ihi na ihu-n’anya-Ya ka ikpé-ziri-ezi-Ya uku.
 
Ọ buru na Chineke manyereri ikpé-Ya ka O we mezu ikpé-ziri-ezi-Ya, Ọ garari ekpe ndi-nmehie nile ikpé we ziga ha n’ọku-ala-mọ. Kama n’ihi ihu-n’anya Jisus nke nāzọputa-ayi n’ikpé ahu ka uku, Chineke zitere Ọkpara Ọ muru nání Ya, Jisus. Jisus būru nmehie nile ayi nye Onwe-ya we nata kwa ikpé ziri ezi n’ihi ayi dum. Ub͕u a, onye ọ bula nke nēkwere na Jisus dika Onye-nzọputa-ha nāghọ nwa-Ya na onye ezi omume. N’ihi na ihu-n’anya-Ya ka ikpé-ziri-ezi-Ya uku, Ọ b͕aputara ayi dum.
Ayi aghaghi ikele Chineke n’ihi na Ọ maghi ayi ikpé nání site n’ikpé-ziri-ezi-Ya. Dika Jisus gwara ndi-ode-akwukwọ, ndi-Farisi, na ndi nēso uzọ-ha, Chineke nāchọ ebere na imara Chineke, ma-ọbughi àjà-ayi. Ufọdu ndi nēb͕u ehi na ewu kwa-ubọchi we nāchu ya dike àjà n’iru Chineke we nēkpe kwa ekpere, “Chineke, b͕aghara nmehiem nile kwa-ubọchi.” Chineke achọghi àjà ayi nile, kama okwukwe ayi na nb͕aputa nke miri ahu na Mọ Nsọ. Ọ nāchọ ka ayi buru ndi ab͕aputaworo na ndi anaputaworo. Ọ nāchọ inye ayi ihu-n’anya-Ya we nāchọ kwa inabata okwukwe nile ayi. Ùnu puru ihu nka? Jisus enyewo ayi nzọputa.
Jisus nākpọ nmehie asì, kama O nwere ihu-n’anya nēre ọku n’obi ny ndi madu, ndi ekere n’onyinyo nke Chineke. O zubereri ọbuná tutu nmalite oge ime ayi umu Chineke, O we hichapu nmehie nile ayi site na baptism na ọbara Ya. Chineke kere ayi ib͕aputa-ayi, iyikwasi ayi uwe nime Jisus, ime kwa ayi umu-Ya. Nka bu ihu-n’anya O nwere n’ebe ayi nọ, ndi O kère èkè.
Ọ buru na Chineke kpe ayi ikpé nání dika Iwu-Ya ziri ezi si di, ayi, ndi-nmehie, gēkwesi inwu ọnwu. Kama Ọ naputara ayi site na baptism na ikpé amara Ọkpara-Ya n’Obe. Ì kwere ya? Ka ayi me ka ọ buru ihe itukwasi obi site na Testament Ochie.
 
 
Eron Bikwasiri Aka-ya Abua N’isi Ewu-ọpupu ahu
 
Ònye tukwasiri nmehie nile Israel n’elu nkpi ahu di ndu dika onye nānọchi anya ha?
Onye-isi-nchu-àjà
 
Akwuru ugwọ nmehie nile nke uwa site n’ibikwasi-aka-n’isi nke Testament Ochie na baptism nke Testament Ọhu. Na Testament Ochie, nmehie nile nke Ndi-Israel kwa-arọ ka ekpuchiri site n’aka Onye-isi-nchu-àjà, onye bikwasiri aka-ya abua n’isi nkpi ahu zuru okè.
“Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n’isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n’elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie-ha nile; o gētiye kwa ha n’elu isi nkpi ahu, zilaga ya n’ọzara site n’aka nwoke jikere ejikere” (Levitikọs 16:21). 
Otú a ka esi kpuchie nmehie nile ha n’ubọchi ndia nke Testament Ochie. Ka ewe b͕aputa na nmehie nile nke kwa-ubọchi, madu kutara nwa-aturu ma-ọbu nkpi nke zuru okè n’ulo-ikwū we chua kwa ya dika àjà n’ebe-ichu-àjà. Ọ tiyere aka-ya abua n’isi àjà ahu, mb͕e ahu atukwasiri nmehie-ya nile n’àjà ahu. Mb͕e ahu eb͕uru àjà ahu we were ọbara-ya tinye n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu site n’aka onye-nchu-àjà.
Enwere ọtutu mpi na akuku anọ nke ebe-ichu-àjà ahu. Mpi nile ndia nēgosiputa Akwukwọ nile nke Ọlu nke akọwaworo na Nkpughe 20:12. Ọbara-ya nke fọduru ka efesara n’ala, kwa. Ala nọchiri anya obi madu n’ihi na eji ájá ke madu. Ndi ahu kpuchiri nmehie nile ha kwa-ubọchi n’uzọ a.
Kama ha apughi inye àjà-nmehie kwa-ubọchi. Ya mere, Chineke kwere ka ha kpuchie arọ nmehie nile ha na nání otù arọ. Nka bu n’ubochi nke-iri nke onwa nke-asa, bú Ubọchi Nkpuchi-nmehie. N’ubọchi ahu, onye nānọchi anya ndi Israel dum, onye-isi-nchu-àjà, kutara nkpi abua we bikwasi aka-ya abua n’isi-ha itukwasi nmehie nile nke ndi ahu n’isi-ha we chu ha dika ájá n’iru Chineke ikpuchiri ndi Israel nmehie.
“Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n’isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n’elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie-ha nile; o gētiye kwa ha n’elu isi nkpi ahu, zilaga ya n’ọzara site n’aka nwoke jikere ejikere” (Levitikọs 16:21). 
Chineke rọputara Eron dika Onye-isi-nchu-àjà nke Israel. Kama madu nile gēbikwasi aka-ha n’isi àjà ahu n’otù n’otù, onye-isi-nchu-àjà, dika onye nānọchi anya ndi-Israel nile, bikwasiri aka-ya abua n’isi nkpi ahu di ndu n’ihi nb͕aghara nke otù arọ nmehie nile(Bupuru Nmehie).
Ọ gākọputa nmehie nile nke Israel n’iru Chineke, “O Chineke, umu-Gi Israel emehiewo. Ayi akpọwo isi ala nye arusi nile, mebiwo ihe Iwu-Gi nile ahu, buruwo aha-Gi ime ihe efu, piwo ọtutu arusi, huwo kwa ha n’anya kari Gi. Ayi edoghi ubọchi-izu-ike nsọ, ayi asọpurughi nna-ayi na nne-ayi, b͕uwo madu, kwawo iko ma zuwo kwa ori.... Ayi dabàra onwe-ayi n’ekworo na ise-okwu.”
Ọ guputara nmehie nile. “Chineke, ma ndi Israel ma mu onwem apughi idebe otù n’ime Iwu Gi. Ka ewe b͕aputa nmehie nile ndia, m’nēbikwasi akam abua n’isi nkpi a we nātukwasi kwa n’elu-ya nmehie nile ndia ahu.” Onye-isi-nchu-àjà bikwasiri aka-ya abua n’àjà ahu n’ihi ndi-Israel we tukwasi nmehie nile ha n’isi àjà ahu. Ibikwasi-aka-n’isi putara ‘itukwasi’ (Levitikọs 1:1-4, 16:20-21).
 
Èsi aṅa mezue nkpuchi nmehie n’oge Testament Ochie?
Site n’ibikwasi aka abua n’isi àjà-nmehie
 
Chineke nyereri ndi Israel ememe ichu-àjà nmehie ka ha we pu itukwasi nmehie nile ha ka ewe b͕aputa kwa ha. O kwuputara na ekwesiri inwe àjà-nmehie zuru okè, ibikwasi-aka-n’isi àjà-nmehie nye ndi Israel n’ihi nmehie nile ha, na àjà-nmehie ahu kwesiri inwu n’ọnọdu otù onye.
N’Ubọchi Nkpuchi-nmehie, eb͕uru àjà-nmehie were ọbara-ya bà n’Ebe Nsọ ahu we fesa ya n’ebe-nkpuchi-nmehie ahu ub͕ò asa. Otú a, ndi Israel kpuchiri nmehie nke otù arọ n’ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa.
Onye-isi-nchu-àjà bàra n’Ebe Nsọ ahu nání ya ichu àjà ahu, kama ndi nile zukọrọ n’èzí we ṅa nti ka udà ataṅu ọla-edo nile di n’ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu nke ephod nke Onye-isi-nchu-àjà we ku ub͕ò asa dika anēfesa ọbara ahu n’ebe nkpuchi-nmehie ahu. Mb͕e ahu ndi-Israel gāṅuri ọnù na ekpuchiwo nmehie nile ha. Udà ataṅu ọla-edo nile ahu putara udà ozi ọma ọṅù.
Ọ bughi ezi-okwu na Jisus huru nání ufọdu ndi n’anya we b͕aputa kwa nání ha. Jisus bupuru nmehie nile nke uwa nání otù mb͕e site na baptism-Ya. Ọ chọrọ inaputa ayi dum nání otù mb͕e. Apughi ib͕aputa nmehie nile ayi kwa-ubọchi; ehichapuru ha nání otù mb͕e.
Na Testament Ochie, enyeworo nkpuchi-nmehie site n’ibikwasi-aka-n’isi àjà-nmehie. Eron bikwasiri aka-ya abua n’isi nkpi ahu di ndu n’iru ndi-Israel dum we guputa nmehie nile nke ndi ahu mereri n’arọ ahu. O tukwasiri nmehie nile ahu na nkpi ahu n’iru madu nile. Ǹ’ebe ka nmehie nile nke ndi ahu di mb͕e ahu? Ha nile ka atukwasiworo na nkpi ahu.
Mb͕e ahu, ezilagara nkpi ahu site n’aka ‘nwoke jikere ejikere.’ Nkpi ahu, nke nmehie nile Israel di n’aru-ya, ka ezilagara n’ọzara ebe enweghi miri ma-ọbu ahihia. Nkpi ahu, mb͕e ahu, gāwaghari n’ọzara n’okpuru ifufe anyanwu di ọku we nwua n’ikpè-azu. Nkpi ahu nwuru n’ihi nmehie nile nke Israel.
Nka bu ihu-n’anya Chineke, ihu-n’anya nb͕aputa. Otú a ka ha si kpuchie arọ nmehie nile ha n’ubọchi ndia ahu. Kama ayi nēbi n’oge Testament Ọhu. Ọ ruwo ihe ra ka arọ 2000 mb͕e Jisus ridatara n’uwa-ayi. Ọ biara we mezue kwa nkwà-Ya nke O kwereri na Testament Ochie. Ọ biara we b͕aputa kwa nmehie nile ayi.
 
 
Ka Ewe b͕aputa Ayi Dum 
 
Gini bu ihe ‘JISUS’ putara?
Onye-nzọputa bú onye gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha
 
Ka ayi gu Matiu 1.
“Ma mb͕e ihe ndia di ya n’obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwù ikuru nwunye-gi Meri: n’ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n’aka Mọ Nsọ. Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n’ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha” (Matiu 1:20-21).
Nna-ayi n’Elu-igwe binyere aru Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke bú Meri iziga Ọkpara-Ya n’uwa nka isachapu nmehie nile nke uwa. O zigara Meri mọ-ozi we si ya, “Le kwa, i gāturu ime, muta Nwa-nwoke, kpọ aha-Ya JISUS.” Ọ putara na Ọkpara ahu, nke nābia site aru Meri, gāghọ Onye-nzọputa ahu. Jisus Kraist putara onye gāzọputa ndi nke Ya, ya bu, Onye-nzọputa ahu.
Uzọ Jisus ji bupu nmehie nile nke uwa bu site na baptism-Ya n’Osimiri Jọdan. Mb͕e Jọn Baptist mere Ya baptism, atukwasiri nmehile nile nke uwa na Ya. Ka ayi gu Matiu 3:13-17.
“Mb͕e ahu Jisus siri na Galili bia rue Jọdan jekuru Jọn ahu, ka o we me Ya baptism. Ma Jọn nēb͕ochi Ya, si, Ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism, Gì onwe-gi nābiakutekwam? Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n’ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya. Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya; ma le, olu sitere n’elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma’” 
Jisus jekuru Jọn Baptist ka ewe b͕aputa ayi dum na nmehie nile ayi. 
Ọ jere nime miri ahu we weda kwa isi-Ya n’iru Jọn. “Jọn, Mem baptism ub͕u a. Ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Dika M’gēbupu nmehile nile nke uwa we naputa kwa ndi-nmehie nile na nmehie nile ha, M’nāchọ ibupu nmehie nile ha site na baptism. Mem baptism ub͕u a! Kwere ya!”
Otú a, ọ kwesiri imezu ezi omume nile. Emere Jisus baptism site n’aka Jọn Baptist. N’oge ahu, ezi omume nile nke Chineke nke b͕aputara ayi na nmehie nile ayi ka emezuru.
Otú a ka O si bupu nmehie nile ayi. Atukwasiri nmehie-gi nile na Jisus, kwa. Ì nāghọta nka?
Kweren na nb͕aputa nke baptism Jisus na Mọ Nsọ ka ewe zọputa-gi.
 
Èsi aṅa mezue ezi omume nile?
Site na baptism nke Jisus
 
Chineke bururi uzọ kwe Israel nkwà na agāsachapu nmehie nile nke ndi Israel site n’ibikwasi aka n’isi n’àjà nke àjà-nmehie ahu. Otú ọ di, dika ọ bu ihe agaghi ekwe omume madu nile ibikwasi aka ha n’isi nkpi ahu n’otu n’otu, Chineke we do Eron nsọ ka o we buru onye-isi-nchu-àjà ka o we pu ichu àjà nye ndi Israel nile. Otú a, ọ tukwasiri nmehie nile ha nke otù arọ n’isi àjà-nmehie ahu nání otù mb͕e. Nka bu kwa Amam-ihe-Ya na Ike nke nzọputa. Chineke Mara ihe di kwa Itu-n’anya.
O zigara Ọkpara Ya bú Jisus izọputa uwa-ayi. Ya mere àjà-nmehie ahu jikeworo. Ub͕u a, ekwesiriri inwe onye nānọchi anya madu nile, onye gēbikwasi aka-ya abua n’isi Jisus we tukwasi kwa nmehie nile nke uwa na Ya. Onye nānọchi anya ahu bu Jọn Baptist. Na Matiu 11:11, Chineke zigara onye nānọchi anya ndi madu dum n’iru Jisus.
Ọ bu Jọn Baptist, onye-isi-nchu-àjà nke ikpe-azu nke madu. Dika edeworo ya na Matiu 11:11, “N’etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku.” Ọ bu nání onye nānọchi anya madu nile. O zigara Jọn dika onye nānọchi ihe nile ekère èkè ka o we pu ime Jisus baptism we tukwasi kwa nmehie nile nke uwa na Ya.
Ọ buru na billion madu asatọ n’uwa jekuru Jisus ub͕u a n’otù n’otù we kwesi kwa-ri ibikwasi aka-ha na Jisus itukwasi nmehie nile ha na Ya, gini gēme isi-Ya? Ọ buru na ihe kariri billion madu asatọ n’uwa a kwesiri-ri ibikwasi aka-ha na Jisus, ọ gaghi-abu ihe di nma ile anya. Ufọdu ndi nānu ọku n’obi gēwere ike bikwasi aka-ha me kwa ka ntutu-isi-Ya nile dàpu. Chineke, site n’amam-ihe-Ya, rọputara Jọn ka ọ buru onye nānọchi anya ayi we tukwasi kwa nmehie nile nke uwa na Jisus nání otù mb͕e.
Edekọworo ya na Matiu 3:13, “Mb͕e ahu Jisus siri na Galili bia rue Jọdan jekuru Jọn ahu, ka o we me Ya baptism.” Nka bu mb͕e Jisus b͕ara arọ 30. Ebìri Jisus úgwù n’ubọchi nke asatọ mb͕e amusiri Ya. Enwere nání ufọdu ihe edekọrọ bayere Ya si na mb͕e ahu rue mb͕e Ọ b͕ara arọ 30.
Ihe mere Jisus kwesiri-ri iché rue mb͕e O b͕ara arọ 30 bu ka Ọ we ghọ Onye-isi-nchu-àjà nke elu-igwe ka ewe emezu Testament Ochie. N’akwukwọ Deuteronomi, Chineke gwara Moses okwu si na onye-isi-nchu-àjà kwesiri ib͕a arọ 30 tutu ọ we je ozi nke òtù ndi-isi-nchu-àjà. Jisus bu Onye-isi-nchu-àjà nke elu-igwe. Ì kwere na nka?
N’akwukwọ Testament Ọhu, Matiu 3:13-14,nāsi, “Mb͕e ahu Jisus siri na Galili bia rue Jọdan jekuru Jọn ahu, ka o we me Ya baptism. Ma Jọn nēb͕ochi Ya, si, Ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism. Gì onwe-gi nābiakutekwam?” Onye bu onye nānọchi anya madu? Jọn Baptist. Mb͕e ahu onye bu onye nānọchi anya Elu-igwe? Ọ bu Jisus Kraist. Ndi nānọchi anya ahu zutere. Mb͕e ahu ònye di elu kari? N’ezie, onye ahu nānọchi anya Elu-igwe.
Ya mere Jọn Baptist, onye nwere anya-ike di-uku o we nētiri ndi-ndu okpukpe nkpu n’ubọchi ndia ahu, “Umu nke aju-ala! Chègharianu!” n’otù ntabi-anya ọ ghọrọ onye wedara onwe-ya n’iru Jisus. “Ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism, Gì onwe-gi nābiakutekwam?”
N’ebe ahu, Jisus siri, “Kwerem ub͕u a: n’ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile.” Jisus biara n’uwa nka imezu ezi omume nile nke Chineke, emezu kwa-ra ya mb͕e emere Ya baptism site n’aka Jọn Baptist.
“Mb͕e ahu o kwere Ya. Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya; ma le, olu sitere n’elu-igwe, si, ‘Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.’”
Nka bu ihe mere mb͕e emere Ya baptism. Emeghere ọnu-uzọ elu-igwe mb͕e emere Ya baptism site n’aka Jọn Baptist we bupu nmehie nile nke uwa.
“Site n’ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya” (Matiu 11:12).
Ndi-amuma nile na iwu Chineke bururi amuma rue na Jọn Baptist. “Site n’ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya.” Madu nile nke nēkwere na baptism-Ya puru ibà n’Ala-eze Elu-igwe n’adighi iche.
 
 
“Mu Onwem Amaghi Kwa Gi Ikpé”
 
N’ihi gini ka eji kpe Jisus ikpé n’Obe?
N’ihi na O bupuru nmehie nile ayi.
 
Emere Jisus baptism site n’aka Jọn Baptist we bupu nmehie nile nke uwa. Emesia, Ọ si nwanyi ahu, “Mu onwem amaghi kwa gi ikpé.” Ọ maghi nwanyi ahu ikpé n’ihi na O bupuru nmehie nile nke uwa n’Osimiri Jọdan, Jisus, ọ bughi nwanyi ahu, ka ekwesiri ima ikpé n’ihi nmehie nile ndia ahu.
Jisus hichapuru nmehie nile nke uwa. Ayi puru ihu otù O si tua egwù n’ihi nb͕u Ọ gēwere ntachi-obi nọgide n’Obe n’ihi na “ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu” (Ndi-Rom 6:23). Ọ riọrọ Chineke ub͕ò atọ n’elu Ugwu Olive ka O bupuru Ya ikpé ahu. Jisus nwereri anu-aru nke madu, ya mere ọ bu ihe kwere nghọta na Ọ nātu nb͕u ahu egwù. Jisus aghaghi iwusì ọbara ka ewe mezue ikpé ahu.
Dika àjà-nmehie ahu na Testament Ochie aghaghi iwusì ọbara ka ọ kwua ugwọ nmehie nile, aghaghi ichu Ya dika àjà n’Obe. Ọ bupururi nmehie nile nke uwa ma ub͕u a Ọ ghaghi inye ndu Ya n’ihi nb͕aputa-ayi. Ọ mara na ekwesiri ikpe Ya ikpé n’iru Chineke.
Jisus enweghi nmehie ọ bula n’obi-Ya. Kama dika atukwasiri nmehie nile na Ya site na baptism-Ya, Chineke aghaghi ikpe Okpara nke aka-Ya ikpé ub͕u a. Otú a, na nke mbu, ikpé-ziri-ezi nke Chineke we mezue na nke abua, Ọ nyebigara ayi ihu-n’anya-Ya n’ihi nzọputa-ayi. Ya mere, ekwesiri ikpe Jisus ikpé n’Obe.
“Mu onwem amaghi kwa gi ikpé, ma-ọbu kpe gi ikpé.” Nmehie nile ayi, nke ama-ama me ma-ọbu nke amaghi-ama me, nke amazuru ma-ọbu nke amazughi, Chineke aghaghi ikpe ha ikpé.
Chineke ekpeghi ayi ikpé, kama kpere Jisus ikpé, onye bururi nmehie nile ayi nye Onwe-ya site na baptism-Ya. Chineke achọghi ikpe ndi-nmehie nile ikpé n’ihi ihu-n’anya-Ya na ọmiko-Ya. Baptism ahu na ọbara ahu n’Obe bu ihu-n’anya nb͕aputa-Ya nye ayi. “N’ihi na Chineke huru uwa n’anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi” (Jọn 3:16).
Otú a ka ayi si mara ihu-n’anya-Ya. Jisus amaghi nwanyi ahu ejidereri n’ikwa-iko ikpé.
Ọ matara na ọ bu onye-nmehie n’ihi ejidere ya-ri mb͕e ọ nākwa iko ahu. Ọ bughi nání na o nwere nmehie n’obi-ya, kama o me-kwa-ra ya n’anu-aru. O nweghi uzọ o ji agọnari nmehie-ya. Otú ọ di, n’ihi na o kwere na Jisus bupuru nmehie-ya nile, azọputara ya. Ọ buru na ayi kwere na nb͕aputa Jisus, agāzọputa ayi. Kwere ya! Ọ bu ihe di nma nye ayi.
 
Ònye ka ngọzi kachasi diri?
Ndi enweghi nmehie 
 
Ndi nile nēmehie. Ndi nile nākwa iko. Kama anaghi ekpe ndi nile ikpé n’ihi nmehie nile ha. Ayi nile emehiewo, kama ndi kwere na nb͕aputa nke Jisus Kraist enweghi nmehie n’obi-ha. Onye nke nēkwere na nzọputa Jisus bu onye kachasi nwe ọṅù. Ndi ngọzi kachasi diri bu ndi nke anaputaworo na nmehie nile ha, ha bu ndi ezi omume ub͕u a nime Jisus.
Chineke gwara ayi okwu bayere obi-utọ a na Ndi-Rom 4:7, “Ngọzi nādiri ndi ab͕aghara nmebì-iwu nile ha, Ndi ekpuchi-kwa-ra nmehie nile ha.” Ayi dum nēmehie rue oge ayi nānwu. Ayi bu ndi nādighi asọpuru Chineke na ndi ezughi okè. Ayi nāga n’iru ime nmehie ọbuná mb͕e ayi mazuru Iwu-Ya. Ayi adighi ike.
Kama Chineke naputara ayi site na baptism na ọbara ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya we nāsi ayi, mu na gi, na ayi abughi kwa ndi-nmehie ọzọ, na ayi bu ndi ezi omume n’iru-Ya ub͕u a. Ọ nāgwa ayi okwu si na ayi bu umu-Ya.
Ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ bu ozi ọma nke nb͕aputa. Ì kwere ya? Nye ndi kwere, Ọ nēkwezu ha dika ndi ezi omume, ndi azọputaworo, na umu-Ya. Ònye ka obi kachasi nātọ utọ n’uwa nka? Onye nke kwere ewe naputawo kwa ya. Ànaputawo gi?
Jìsus rapuru ibūru nmehie-gi nile? É-è, O būru nmehie-gi nile site na baptism-Ya. Kwere ya. Kwere ka ewe b͕aputa-gi na nmehie-gi nile.
 
 
Dika Agāsi Na eji Aziza Zachapu
 
Ǹmehie ra aṅa ka Jisus bupuru?
Nmehie nile nke uwa
 
Ka ayi gu Jọn 1:29. “N’echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!’” (Jọn 1:29)
“Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!” 
Jọn Baptist tukwasiri nmehie nile nke uwa na Jisus na Jọdan. N’echi-ya, ọ b͕ara àmà na Jisus bu Nwa-aturu Chineke nke nēbupu nmehie nile nke uwa. Ọ tukwasiri nmehie nile nke uwa n’ùbú-Ya abua.
Nmehie nile nke uwa putara nmehie nile nke ndi madu nēme n’uwa nka, site n’Òkìkè rue ọgwugwu oge. Ihe ra ka arọ 2000 gara aga, Jisus bupuru nmehie nile nke uwa we b͕aputa-ayi. Dika Nwa-aturu Chineke, O bupuru nmehie nile ayi ewe ekpe kwa Ya ikpé n’ihi ayi.
Nmehie ọ bula nke ayi bú ndi madu nēme ka atukwasiri na Jisus. O ghọrọ Nwa-aturu Chineke nke bupuru nmehie nile nke uwa.
Jisus biara n’uwa nka dika Onye-nzọputa, onye ahu nke gāzọputa ndi-nmehie nke uwa. Ayi nēme nmehie n’ihi na ayi adighi ike, n’ihi na ayi jọrọ njọ, n’ihi na ayi amaghi ihe, n’ihi na ayi enweghi uche, na n’ihi na ayi ezughi okè. Nmehie nile ndia ka atukwasiri n’isi Jisus site na baptism-Ya na Jọdan. O mere ka ihe nile gwu site n’ọnwu nke anu-aru-Ya n’Obe. Elìri-Ya kama we si na ọnwu bilie n’ubọchi nke-atọ.
Dika Onye-nzọputa ndi-nmehie nile, dika Onye-nmeri, dika Onye-ikpé, Ọ nọ n’aka nri nke Chineke ub͕u a. Ọ naghi-ab͕aputa-ayi ọtutu ub͕ò, ihe nile ayi kwesiri ime bu ikwere na Ya ka ewe zọputa ayi. Ndu ebighi-ebi nēchère ndi kwere, nbibi nēchère ndi nke nēkweghi. Enweghi òkè ọzọ.
Jisus naputara unu nile. Unu bu ndi obi kachasi nātọ utọ n’uwa. Nmehie nile i gēme n’ọdi-n’iru n’ihi adighi-ike-gi, O būru ha dum.
Ènwere nmehie fọduru n’obi-gi? —É-è—
Jìsus bupuru ha nile? —E! O mere nka.—
Ndi nile di otù. O nweghi onye di nsọ kari ndi-ab͕ata-obi-ha. Kama dika ọtutu ndi bu ndi-iru-abua, ha nēchè na ha abughi ndi-nmehie. Ma n’ezie ha bu kwa ndi-nmehie. Uwa nka bu greenhouse nke nāzùputa nmehie.
Mb͕e umu-nwanyi nēsi n’ulo-ha nile aputa, ha nētiye eb͕ub͕ere-ọnu uhie, tiye iru-ha nile ntu-ntu, b͕akọ ntutu-isi-ha, yikwasi uwe di nma, yikwasi kwa akpukpọ-ukwu nile di elu. Umu-nwoke nāga kwa na nke onye nākpu isi ka akpu-ha isi, jikere onwe-ha, tiye uwe nile di ọcha na ab͕ati ejiji nile, me kwa ka akpukpọ-ukwu ha nile di nēnwu enwu.
Ma mb͕e ha nādi ka ọkpara-eze nile na ada-eze nile n’èzí, nime ha dika ihe nile jọrọ njọ.
Ègo nātọ obi ndi madu utọ? Àru-isi-ike nātọ obi ndi madu utọ? É-è. Nání nb͕aputa nātọ obi ndi nile utọ n’ezie. Ọbuná otù madu si di n’èzí, ha kwesiri ebere ma ọ buru na ha nwere nmehie n’obi-ha. Ha nēbi ndu egwù n’ihi ikpé.
Onye ab͕aputaworo nēnwe anya-ike dika ọdum ọbuná nime nkirika ákwà. Enweghi nmehie n’obi-ha. “Imela, Onye-nwe-ayi, I zọputara onye-nmehie dika mu. I hichapuru nmehiem nile. Amaram na adighm nma ile anya, kama m’nēto Gi n’ihi izọputam. Ab͕aputawom na nmehiem nile rue mb͕e ebighi-ebi. Otuto diri Chineke!”
Onye anaputaworo bu onye obi nātọ utọ n’ezie. Onye agọziworo site n’amara nb͕aputa-Ya bu onye obi nātọ utọ n’ezie.
Dika Jisus, ‘Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa,’ bupuworo nmehie nile ayi, ayi enweghi nmehie. Ọ ‘gwusiri’ nzọputa nye ayi n’Obe. Nmehie nile ayi, gunyere nke gi na nkem, nēso kwa na ‘nmehie nke uwa,’ ya mere, ayi dum ka azọputaworo.
 
 

Site n’Ihe Chineke Nāchọ

 
Àyi nēnwe nmehie n’obi-ayi mb͕e ayi nānọ nime Jisus Kraist?
É-è, ayi adighi enwe nmehie
 
Ndi-eyì huru n’anya, nwanyi ahu ejidereri n’ikwa-iko kwere n’okwu nile nke Jisus ewe zọputara kwa ya. Edekọrọ akukọ bayere ya na Bible n’ihi na ewere nb͕aputa gọzie ya. Kama, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi bú ndi-iru-abua si n’ebe Jisus nọ b͕alaga.
Ọ buru na i kwere na Jisus, ọ bu Elu-igwe, ma ọ buru na irapu Jisus, ọ bu n’ọku-ala-mọ. Ọ buru na i kwere n’ọlu-Ya nile, ọ dika Elu-igwe, ma ọ buru na i kweghi n’ọlu-Ya nile, ọ dika ọku-ala-mọ. Nb͕aputa adighi n’ọlu onye ọ bula n’otù n’otù, ọ bu n’ihi nzọputa nke Jisus.
Ka ayi gu Ndi-Hibru 10. “N’ihi na iwu ahu, ebe o nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apughi ime ka ndi nābiaru ha nso zue okè mb͕e ọ bula, site n’otù àjà ndia nke ha nēche n’iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile. N’ihi na ma ọ dighi otú a, àgaghi-echebìwori ha n’iru Chineke, n’ihi na ndi nēkpe ekpere, ebe emeworo ka ha di ọcha otù mb͕e, ha agaghi-enwe akọ-na-uche ọ bula nke nmehie di iche iche ọzọ? Ma nime àjà ndia ncheta nke nmehie di kwa-arọ. N’ihi na ọbara nke oke-ehi na nke ewu apughi iwepu nmehie. N’ihi nka mb͕e Ọ nābia n’uwa, Ọ si, Àjà na ihe echere n’iru Gi, I chọghi ha, Ma aru ka I kwadebere nyem; Àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, ha abughi ihe di Gi ezi nma: Mb͕e ahu ka M’siri, Le, abiawom (N’akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem) Ime ihe I nācho, Chineke. Mb͕e O buru uzọ kwu, si, Àjà na ihe echere n’iru Gi na àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, I chọghi ha, ha abughi kwa ihe di Gi ezi nma (bú ihe anēche n’iru Chineke dika iwu si di), mb͕e ahu ka Ọ siworo, Le, abiawom ime ihe I nāchọ. Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo. Ọ bu kwa n’ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n’iche aru Jisus Kraist n’iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e” (Ndi-Hibru 10:1-10). 
“Site n’ihe Chineke nāchọ” Jisus churu ndu-Ya dika àjà ibupu nmehie nile ayi nání otù mb͕e ewe kpe-Ya ikpé nání otù mb͕e we di kwa ndu ọzọ.
Ya mere, edoworo ayi nsọ. “Edoworo ayi nsọ” (Ndi-Hibru 10:10) edeworo ya na tense zuru okè. Ọ putara na ekwesighi kwa ikwu okwu bayere nb͕aputa ọzọ. Edowo gi nsọ.
“Onye-nchu-àjà ọ bula nēguzo kwa kwa-ubọchi nēfè òfùfè nēche kwa otù àjà ndia n’iru Chineke ọtutu mb͕e, bú àjà nke nāpughi ihichapu nmehie mb͕e ọ bula: ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n’iru Chineke n’ihi nmehie, O we nọdu n’aka-nri Chineke mb͕e nile; nēle anya n’oge fọduru rue mb͕e agēdo ndi-iro-Ya dika ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya abua. N’ihi na O sitewo n’iche Onwe-ya n’iru Chineke dika àjà otù mb͕e me ka ndi anēdo nsọ zue okè mb͕e nile” (Ndi-Hibru 10:11-14). 
Edoworo unu nile nsọ rue ebighi-ebi. Ọ buru na ime nmehie echi, ì gābu onye-nmehie ọzọ? Ọ̀ bu Jisus ebupughi kwa nmehie ndi ahu nile? O bupuru ha. O bupuru nmehie nile nke ọdi-iru, kwa.
“Mọ Nsọ nāb͕a-kwa-ra ayi àmà: n’ihi na mb͕e O kwuru, si, Nka bu Testament nke Mu na ha gāb͕a Mb͕e ubọchi ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru; M’gētiye iwum n’obi-ha, Ọ bu kwa n’uche-ha ka M’gēdekwasi ha dika n’akwukwọ; mb͕e ahu Ọ si, M’gaghi-echeta kwa nmehie nile ha na nmebi-iwu nile ha ọzọ ma-ọli. Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n’iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ” (Ndi-Hibru 10:15-18). 
Ahiri-okwu a ‘ebe nb͕aghara ihe ndia di’ putara na O kpuchiri nmehie nile nke uwa(Bupuru Nmehie). Jisus bu Onye-nzọputa-ayi. Onye-nzọputam na Onye-nzọputa-gi. Azọputawo ayi site n’ikwere na Jisus. Nka bu nbaputa di nime Jisus, nka bu kwa amara kachachi uku na onyinye kachasi uku nke si na Chineke. Mu na gi, ndi ab͕aputaworo nmehie nile ha, bu ndi ngọzi kachasi diri n’etiti ndi nile! 
 
Okwuchukwu a dịkwa n`ụdị ebook. Pịa na mkpuchi akwụkwọ n`okpuru.
ÀMUWO GI ỌZỌ N’EZIE SITE NA MIRI NA MỌ NSỌ? [Nbiputa Ntughari Ọhu]