• All e-books and audiobooks on The New Life Mission website are free
  • Explore multilingual sermons in global languages
  • Two new revised editions in English have been released
  • Check out our website translated into 27 languages
Search

Sermons

Isi-okwu 3 : Ozi Ọma Miri ahu na Mọ Nsọ

[3-2] Baptism Jisus ya na Nkpuchi Nmehie nile (Matiu 3:13-17)

Baptism Jisus ya na Nkpuchi Nmehie nile (Matiu 3:13-17)

(Matiu 3:13-17)
“Mb͕e ahu Jisus siri na Galili bia rue Jọdan jekuru Jọn ahu, ka o we me Ya baptism. Ma Jọn nēb͕ochi Ya, si, Ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism, Gì onwe-gi nābiakutekwam? Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n’ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya. Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri ahu rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya; ma le, olu sitere n’elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.” 
 
 
Ènwere Onye Ọ Bula Nke Nāhu Ahuhu si na Nmehie? 
 
Òrù-ayi na nmehie ọ gwuwo?
E.
 
Onye-nwe-ayi Chineke bipuru nkpọrọ-ukwu nke nmehie nile nke ndi nile. Ndi nile nwere oge siri ike nime nmehie bu ndi-orù nmehie. O wepuru nmehie nile ayi. Ènwere onye ọ bula nke nāhu ahuhu si na nmehie?
Ayi kwesiri ighọta na agha-ayi megide nmehie agwuwo. Ayi agaghi-ahu ahuhu na nmehie ọzọ. Orù-ayi na nmehie gwuworo mb͕e Jisus b͕aputara ayi; nmehie nile gwuru mb͕e ahu na ebe ahu. Nmehie nile ayi ka ekpichiworo site n’aka Ọkpara-Ya. Chineke kwuru ugwọ nmehie nile ayi site na Jisus, onye mere ka ayi si n’orù nmehie pua, ebighi-ebi. 
Ì mara otú ndi nile si nāhusi ahuhu si na nmehie nile ha? Ọ malitere n’oge Adam na Iv. Ndi madu nāhu ahuhu si na nmehie nile esi na Adam keta. 
Ma Chineke-ayi b͕ara ọb͕ub͕a-ndu edeworo n’akwukwọ Jenesis 3:15, ọb͕ub͕a-ndu ahu bu na Ọ gānaputa ndi-nmehie nile. Ọ siri na agāb͕aputa ndi madu na nmehie nile ha site n’àjà nke Jisus Kraist sitere na miri ahu na Mọ Nsọ. Mb͕e oge ahu biaruru, O zigara Onye-nzọputa-ayi, Jisus, ibi n’etiti ayi.
O kwe-kwa-ra nkwà iziga Jọn Baptist tutu Jisus O we mezue nkwà-Ya.
Mak 1:1-8 si, “Nmalite ozi ọma jisus Kraist, Ọkpara Chineke. Dika edeworo ya n’akwukwọ Aisaia onye-amuma, si, Le, Mu onwem nēzipu onye-ozim ka ọ ga n’iru gi, Onye gēmezi uzọ-gi; Olu otù onye nēti nkpu n’ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Me okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie; Jọn putara ìhè, onye nēme baptism n’ọhia, nēkwusa kwa baptism nchèghari inwe nb͕aghara nmehie. Ala Judia nile na ndi Jerusalem nile nāpukuru ya; ọ neme kwa ha baptism n’osimiri ahu Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha. Jọn nēyi aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n’úkwù-ya, nēri kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia. Ọ nēkwusa kwa, si, Onye kam ike nābia n’azum, Onye m’nērughi iruru ala itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya abua. Mu onwem jiri miri ahu me unu baptism; ma Onye ahu geji Mọ Nsọ me unu baptism.” 
 
 

Jọn Baptist, Onye-àmà na Onye-nmalite nke Ozi Ọma ahu

 
Ònye bu Jọn Baptist?
Onye-isi-nchu-àjà nke ikpé-azu na onye nānọch anya madu nile
 
Ndia nke kwere na Jisus ka emeworo baptism. Baptism putara; ‘isa ihe, ilì ihe, imikpu ihe, ma-ọbu itukwasi ihe.’ Mb͕e emere Jisus baptism, emezuworo ezi omume Chineke. ‘Ezi omume’ bu ‘Δικαίωση (dikaiosune)’ n’asusu Grik nke putara ‘ibu ihe ziri ezi’, ọ putara-kwa-ra ‘kachasi di nma’ ‘kachasi kwesie ekwesi.’ 
Ka eme Jisus baptism bu ka Ọ ghọ Onye-nzọputa n’uzọ kachasi kwesie ekwesi na uzọ kachasi di nma. Ya mere, ndi nke kwere na Jisus nānata onyinye nb͕aputa si n’aka Chineke site n’ikwere na miri ahu nke baptism Jisus, Obe ahu, na Mọ Nsọ.
Na Testament Ọhu, Jọn Baptist bu Onye-isi-nchu-àjà nke ikpé-azu nke Testament Ochie. Ka ayi le anya na Matiu 11:10-11. Akwukwọ Nsọ nāsi na Jọn Baptist bu onye nānọchi anya ndi madu. Dika onye-isi-nchu-àjà n’oge Testament Ọhu, ọ tukwasiri nmehie nile nke uwa na Jisus; otú a nēje ozi dika onye-isi-nchu-àjà nke Testament Ochie.
Jisus na Onwe-ya b͕ara Jọn Baptist àmà. Ọ we si, na Matiu 11:13-14 “N’ihi na ndi-amuma nile na iwu Chineke buru amuma rue ubọchi Jọn. Ọ buru kwa na unu nāchọ inara ya nke-ọma, nwoke ahu bu Elaija, nke gaje ibia.” Ya mere, Jọn Baptist, onye mere Jisus baptism, bu nkpuru onye-isi-nchu-àjà Eron na onye-isi-nchu-àjà nke ikpé-azu. Bible b͕ara Jọn àmà na ọ bu nkpuru Eron na Testament Ochie (Luk 1:5, I. Ihe Emere 24:10).
Mb͕e ahu gini mere Jọn ji bìri n’ọhia nání ya, nēnyi uwe-oyiyi-ya nke aji camel? Ka o nweta òtù onye-isi-nchu-àjà. Dika onye nānọchi anya madu nile, Jọn Baptist apughi ibi n’etiti ndi nile. Ya mere o tiri ndi ahu nkpu, “Chègharianu, Umu nke aju-ala!” we me kwa ha baptism n’ihi nkpuru nchèghari, nke nēme ka ndi nile we laghachikute Jisus, onye gaje ibupu nmehie nile ha. Jọn Baptist tukwasiri nmehie nile nke uwa na Jisus n’ihi nzọputa-ayi.
 
 
Udi Baptism di Abua 
 
Gini mere Jọn Baptist jiri me ndi ahu baptism?
Iduru ndi nile rue n’ichèghari na nmehie nile ha na ikwere na baptism Jisus nye nzọputa
 
Jọn Baptist mere ndi ahu baptism, mb͕e ahu me kwa Jisus baptism. Nke mbu bu ‘baptism nke nchèghari,’ nke nākpọ ndi-nmehie ka ha laghachichute Chineke. Ọtutu ndi madu nke nuru okwu Chineke site n’ọnu Jọn rapuru arusi-ha nile we laghachikute Chineke. 
Baptism nke Abua bu baptism nke Jisus, baptism nke tukwasiri nmehie nile nke uwa na Jisus. Jọn Baptism mere Jisus baptism imezu ezi omume nile nke Chineke. Emere Jisus baptism site n’aka Jọn Baptist izọputa ndi nile na nmehie nile ha (Matiu 3:15).
Gini mere Jọn ji kwesi ime Jisus baptism? Ka ewe hichapu nmehie nile nke uwa, Chineke kwere ka Jọn tutwasi nmehie nile na Jisus ka ewe pu izọputa ndi nke kwere na Jisus.
Jọn Baptist bu onye nējere Chineke ozi ónye ozi-ya bu inyere ndi madu aka ka asa nmehie nile ha na onye bu onye nānọchi anya ndi madu nke b͕ara ozi ọma nb͕aputa àmà. Ya mere, Jọn kwesiri-ri ibì nání-ya n’ọhia. N’oge Jọn Baptist, ndi Israel mebiri emebi we re kwa ure nke-uku.
Ya mere Chineke si na Testament Ochie, Malakai 4:5-6, “Le, Mu onwem nēzitere unu Elaija, bú onye-amuma, tutu oké ubọchi ahu di egwu nke Jehova abia. Ọ gēme kwa ka obi ndi bu nna chigharikute umu-ha, ka obi umu chigharikute kwa ndi bu nna-ha; ka M’we ghara ibia were iwezuga-ka-ebibie-ya tiḅue uwa”
N’anya Chineke, ndi Israel nile ndi nākpọ isi ala nye Jehova tutu buru ndi nēmebi emebi. O nweghi onye bu onye ezi omume n’iru-Ya. Ndi-ndu okpukpe nke ulo nsọ ahu, dika ihe-atù, ndi-nchu-àjà, ndi-iwu ya na ndi-ode-akwukwọ ha onwe-ha rere ure nke-uku. Ndi Israel na ndi-nchu-àjà echeghi àjà dika iwu Chineke si di.
Ndi-nchu-àjà rapuru ibikwasi-aka-n’isi na ememe nke ichu àjà ọbara, nke Chineke zíru ha n’ihi nkpuchi nmehie nile ha. Edekọrọ ya na ndi-nchu-àjà n’ubọchi nke Malakai rapururi usoro nchu-àjà, ibikwasi-aka-n’isi, na iche ọbara n’ememe ahu.
Ya mere, Jọn Baptist apughi inọ n’etiti-ha. Ya mere Jọn Baptist jere n’ọhia we tìe nkpu. Gini ka o kwuru?
Edeworo ya na Mak 1:2-3, n’okwu nke Aisaia onye-amuma, “Le, Mu onwem nēzipu onye-ozim ka ọ ga n’iru gi, Onye gēmezi uzọ-gi; Olu otù onye nēti nkpu n’ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Me okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.”
Olu si n’ọhia ahu tiri ndi ahu nkpu inara baptism nke nchèghari. Gini bu ‘baptism nke nchèghari’ nke Bible nēkwu bayere? Ọ bu baptism nke Jọn Baptist tiri nkpu bayere ya; baptism ahu nke kpọrọ ndi nile ibiakute Jisus ka ha we kwere na Ya, onye gēbupu nmehie nile ha ka azọputa kwa ha. Baptism nke nchèghari bu nke nēduru ha rue nzọputa.
“Chègharianu ka eme kwa unu baptism, agēme kwa Jisus baptism n’uzọ di otú a ibupu nmehie nile unu.” Iti-nkpu nke Jọn Baptist putara na Jisus gēbupu nmehie nile nke uwa ewe kpe kwa Ya ikpé n’elu Obe izọputa ndi nile ka ha we laghachikute Chineke.
“Mu onwem jiri miri ahu me unu baptism; ma Onye ahu geji Mọ Nsọ me unu baptism” (Mak 1:8). “Geji Mọ Nsọ me unu baptism” putara isachapu nmehie nile unu. Ime baptism putara ‘isa.’ Baptism Jisus n’Osimiri Jọdan nāgwa ayi okwu si na emere Ọkpara Chineke baptism otú a we bupu kwa nmehie nile ayi ka ewe zọputa-ayi.
Ya mere, ayi kwesiri ichighari na nmehie we kwere kwa na Ya. Ọ bu Nwa-aturu nke nēbupu nmehie nile nke uwa. Nka bu kwa ozi ọma nb͕aputa nke Jọn Baptist b͕ara àmà ya.
 
 
Ọlu nke Onye-isi-nchu-àjà n’ihi Nkpuchi Nmehie nile
 
Ònye jikere uzọ nke nzọputa?
Jọn Baptist
 
Aisaia Onye-amuma buru amuma si, “Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n’obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n’aka Jehova okpukpu abua n’ihi nmehie-ya nile” (Aisaia 40:2). 
Jisus Kraist bupuru nmehie nile nke mu na gi na madu nile n’ewezugaghi; nmehie mbu, nmehie nile nke ub͕u a, ọbuná nmehie nile nke odi-n’iru ka asachapuworo site na baptism-Ya. Ọ b͕aputara ayi nile. Ayi kwesiri imara bayere nb͕aputa.
Ka ewe zọputa na nmehie nile ayi, ayi aghaghi ikwere na ozi ọma nke nēkwu si na Jọn Baptist tukwasiworo nmehie nile na Jisus site n’uzọ baptism. 
Ọ bu nghọtahie ichè na “N’ihi Chineke bu ihu-n’anya, ayi puru ibà n’Ala-eze Elu-igwe site nání n’ikwere na Jisus, ọbuná ma ọ buru na ayi nwere nmehie n’obi-ayi.” 
Ka ewe b͕aputa nmehie nile ayi, ayi kwesiri ikwere na baptism-Ya, nke Jọn Baptist sitere na ya tukwasi nmehie nile nke uwa na Jisus. Ọ bu site na ‘miri ahu’ ka Jọn Baptist tukwasiri nmehie nile nke ndi madu na Jisus.
Ihe mbu Chineke mere izọputa ayi bu izite Jọn Baptist. Onye-ozi Chineke, ezigara Jọn Baptist dika ukọ̀ nye Eze ahu, onye tukwasiri nmehie nile nke uwa na Jisus site na baptism. O jere ozi òtù onye-isi-nchu-àjà nke ndi madu dum.
Chineke siri ayi na O zigara onye-ozi-Ya, Jọn Baptist, nye ayi. “Mu nēziga onye-ozim n’iru Gi.” N’iru Gi putara tutu Jisus. Gini bu ihe mere O ji ziga Jọn n’iru Jisus? Ọ bu ka atukwasi nmehie nile nke uwa na Jisus, Ọkpara Chineke, site na baptism. “O gēdozi kwa uzọ n’irum Onye-nwe-unu ahu.” Nka bu ihe Ọ putara.
Ònye bu onye doziri uzọ ahu ka ewe pu ib͕aputa-ayi we ga kwa n’Elu-igwe? Jọn Baptist. ‘Gi’ putara Jisus ‘Mu’ putara Chineke n’Onwe-ya. Ya mere, mb͕e Ọ siri, “Mu nēziga onye-ozim n’iru Gi, o gēdozi kwa uzọ n’irum Onye-nwe-unu ahu,” gini ka ọ putara?
Ònye gēdozi uzọ ayi ka ayi we ga n’Elu-igwe? Jọn Baptist tukwasiri nmehie nile ayi na Jisus ka ayi we kwere na Jisus sachapuru ayi nmehie nile ayi nile; ọlu-ya bu itukwasi nmehie nile site na ime Jisus Kraist baptism. Ọ bu Jisus na Jọn ndi mere ka ọ buru ihe nēkwe omume ayi ikwere n’ezi-okwu ahu ka ewe b͕aputa-ayi.
Ǹa ihe gini ka nzọputa-ayi nādabere? Ọ nādabere ma ayi nēkwere n’ọlu ezi omume nke Jisus, Ọkpara Chineke, na ezi-okwu ahu na onye-ozi Chineke tukwasiri-ri nmehie nile nke uwa na Ya. Ayi dum kwesiri imara ozi ọma nke nb͕aghara nmehie nile(Bupuru Nmehie). Chineke Nna zigara onye-ozi-Ya n’iru, onye nke gēme Ọkpara-Ya baptism, we me kwa ka ọ buru onye nānọchi anya ndi madu. Otú a, Ọ luzuru ọlu nke nb͕aputa nye ayi.
Chineke zigara onye-ozi-Ya bú Jọn Baptist ka o me Ọkpara-Ya baptism ka Jọn Baptist we pu ijikere uzọ nzọputa nye ndi nke kwere n’Ọkpara-Ya. Nka bu ihe mere Jọn jiri me Jisus baptism. Baptism ahu nke Jisus natara n’aka Jọn Baptist bu nb͕aputa nke esite na ya tukwasi nmehie nile ndi madu na Jisus ka ndi nile kwere na Jisus we ga n’Elu-igwe.
Atukwasiri ọbuná nmehie nile nke odi-n’iru nke ndi madu na Jisus site na baptism-Ya. Jisus ya na Jọn Baptist jikere uzọ iga Elu-igwe nye ayi. N’uzọ nka, Chineke kpughere ihe-nzuzo nke nb͕aputa site na Jọn Baptist.
Dika onye nānọchi anya onye ọ bula nime ayi, Jọn Baptist mere Jisus baptism ka ayi we kwere na nb͕aputa-ayi we ga n’Elu-igwe. Ọ tukwasiri nmehie nile na Jisus site na baptism. Nka bu ozi ọma ọṅù nke nb͕aputa, ozi ọma ahu.
 
 
N’ihi Gini Ka Amuru Jọn Baptist? 
 
Sìte n’aka onye ka ayi gēkwere na Jisus?
Jọn Baptist 
 
Na Malakai 3:1, edeworo ya, “Le, Mu nēziga onye-ozim n’iru Gi, o gēdozi kwa uzọ n’irum Onye-nwe-unu ahu.” I kwesiri igusi Bible ike. Gini bu ihe mere Chineke ji ziga onye-ozi-Ya n’iru Jisus? Gini bu ihe mere ejiri mua Jọn Baptist ọnwa 6 tupu Jisus?
Ayi kwesiri ighọta ihe Bible diri bayere ya. Enwere akuku na Testament Ochie bayere ozi nke onye-isi-nchu-àjà Eron. Eron bu nwa-nne Moses nke nke-okenye. Chineke tere ya na umu-ya ndikom manu dika ndi-nchu-àjà. Ndi-Levi ndi ọzọ luru ọlu n’okpuru-ha, nēnwetara ha ihe-ọlu di iche iche agwọkọtara, nāgwakọta ihe nile nke ob͕e achicha ya na ihe di ọzọ di otú a, ebe umu-ndikom Eron churu àjà n’ulo-ikwū ahu di nsọ.
Etere umu-ndikom Eron manu ka ha we keta òkè otù ọnu ọlu n’etiti ha, ma n’Ubọchi Nkpuchi-nmehie, ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa, onye-isi-nchu-àjà nání ya churu àjà nke nkpuchi nmehie n’ihi nmehie nile nke ndi-ya. 
N’akwukwọ Luk 1:5, enwere akukọ bayere agburu Jọn Baptist. Ayi kwesiri ighọta onye-ozi Chineke a nke-ọma ka ewe ghọta Jisus nke-ọma. Ayi dabà n’iche èchìchè bayere Jisus nke-uku, ma nēlefu ihe nile bayere Jọn Baptist anya, onye biara n’iru Ya. M’gāchọ inyere gi aka ighọta.
“Nmalite ozi ọma jisus Kraist, Ọkpara Chineke. Dika edeworo ya n’akwukwọ Aisaia onye-amuma, si, Le, Mu onwem nēzipu onye-ozim ka ọ ga n’iru gi, Onye gēmezi uzọ-gi;” (Mak 1:1-2). Ozi ọma nke Elu-igwe ahu nāmalite na Jọn Baptist mb͕e nile. 
Mb͕e ayi ghọtaziri bayere Jọn Baptist, ayi puru ighọta nke-ọma we kwere kwa n’ozi ọma nke nb͕aputa nke Jisus. O yiri iṅa nti n’olu ukọ̀ nke ayi zigara n’uwa nile ka ayi we ghọta ọnọdu nile nke obodo nile. Mb͕e ayi mara bayere Jọn Baptist, ayi puru ighọta nb͕aputa Chineke nke-ọma.
Ọ bu ihe kwesiri ebere, otú ọ di, na ọtutu ndi-Kristian n’ubọchi ndia anaghi-ahu nkpà nke Jọn. Chineke ezigaghi Jọn Baptist n’ihi na ike gwuru Ya ma-ọbu na O nweghi ihe ọzọ ime. Akwukwọ Ozi Ọma anọ ahu nke Testament Ọhu nēkwu okwu bayere Jọn Baptist tutu nēkwu okwu bayere nb͕aputa nke Jisus.
Ma ndi nēzísa ozi ọma n’ubọchi ta nēlefuchasi Jọn Baptist anya we nāgwa ndi nile okwu na ikwere nání na Jisus zuru okè ka ewe zọputa. N’ezi-okwu ha nēdu ndi nile ibi ndu dika ndi-nmehie na ndu-ha nile we nējedebe n’ọku-ala-mọ. Ọ buru na i kwere nání na Jisus we rapu ighọta ọlu Jọn Baptist, Kristianiti gāghọrọ gi nání otù okpukpe. Èsi aṅa ab͕aputa gi na nmehie-gi nile ma ọ buru n’imaghi ezi-okwu ahu? Ọ bu ihe agaghi ekwe omume.
Ozi ọma nke nb͕aputa esighi ike otú a ọ dighi kwa nfé. Ọtutu ndi ra otú a nēchè na nb͕aputa di n’okwukwe-ayi n’Obe n’ihi na Jisus nwuru ọnwu n’ihi ayi n’Obe. Ma ọ buru na i kwere nání ọnwu-Ya n’obe we ghara imara ezi-okwu nke itukwasi nmehie nile, enweghi okwukwe ra aṅa gēduru rue nb͕aputa zuru okè.
Ya mere, Chineke zigara Jọn Baptist ime ka uwa mara otú esi mezue nb͕aputa na otú Jisus gēsi bupu nmehie nile nke uwa. Nání mb͕e ayi mara ezi-okwu ahu ka ayi gāghọta na Jisus bu Ọkpara Chineke nke būru nmehie nile ayi nye Onwe-ya.
Jọn Baptist nāgwa ayi okwu bayere ezi-okwu nke nb͕aputa. Ọ nāgwa ayi otú o si bia we b͕a kwa àmà na Jisus bu Chineke, na otú ndi madu gēsi nara Ya mb͕e Ìhè ahu ridatara n’uwa nka. Ab͕a-kwa-ra àmà n’akwukwọ Jọn 1 na Jọn Baptist bu onye nke jikere ozi ọma nke nb͕aputa site n’ime Jisus Kraist baptism.
Ọ buru na ayi enweghi àmà Jọn Baptist bayere nb͕aputa, àyi gēsi aṅa kwere na Jisus? Ayi ahughi Jisus ma-ọli, mb͕e ayi si kwa n’ome-n’ala na okpukpe di iche iche bia, ò si aṅa buru ihe nēkwe omume ikwere na Jevoha?
N’inwe ọtutu okpukpe di iche iche n’uwa bà b͕urub͕uru, àyi gēsi aṅa pu imara Jisus Kraist? Àyi gēsi aṅa pu imara na Jisus bu Ọkpara Chineke n’ezie onye b͕aputara-ayi site n’ibūru nmehie nile nke uwa nye Onwe-ya?
Ya mere, ayi kwesiri ilebà anya na Testament Ochie ichọputa site na nmalite okwu nile nke nb͕aputa we bia kwa mara na Jisus bu Onye-nzọputa-ayi. Ayi kwesiri inweta ezi ihe-ọmuma ka ayi we kwere nke-ọma. Enweghi ihe ayi puru ime ma ewezuga ezi ihe-ọmuma. Ka ewe kwere na Jisus ka ewe zọputa kwa, ayi kwesiri imara ozi ọma nke nb͕aputa ahu nke Jọn Baptist b͕ara-ya àmà na ókè-ọlu-ya na ya. Ka enwe okwukwe zuru okè nime Kraist, ayi kwesiri imara ezi-okwu bayere nb͕aputa.
Ya mere, dika Jisus siri, “Unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n’orù” (Jọn 8:31), ayi kwesiri imara ezi-okwu nke nb͕aputa nime Jisus.
 
 
Ihe-àmà nile na Bible 
 
Ǹ’ebe ka Ozi Ọma anọ ahu nāmalite?
Site n’ọbibia nke Jọn Baptist
 
Ka ayi ga n’iru n’ichọputa ihe-àmà nile nke nb͕aputa na Bible. Ka ayi meghe ihe Ozi Ọma anọ ahu nēkwu bayere Jọn Baptist, bayere onye ọ bu, ihe ejiri kpọ-ya ‘onye nānọchi anya ndi madu’ ma-ọbu ‘Onye-isi-nchu-àjà nke ikpé-azu’, otú ejiri tukwasi nmehie nile nke uwa n’isi Jisus site n’aka-ya, ma Jisus bupuru nmehie nile ayi nye Onwe-ya ma-ọbughi.
Ozi Ọma anọ ahu malitere na Jọn Baptist. Jọn 1:6 nāgwa ayi ihe kachasi di nkpà n’ozi ọma ahu. Ọ nāgwa ayi onye luru ọlu nke itukwasi nmehie nile nke uwa na Jisus. “Otù nwoke putara, onye ezitere site n’ebe Chineke nọ, aha-ya bu Jọn. Onye ahu biara ib͕a àmà, ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà, ka madu nile we site n’aka-ya kwere.” (Jọn 1:6-7).
Ọ nāsi, “ka madu nile we site n’aka-ya kwere,” na ka o we “b͕ara Ìhè ahu àmà.” Ìhè ahu bu Jisus Kraist. Ọ putara na Jọn diri ib͕ara Jisus àmà ka ayi dum we pu ikwere site na ya. Ub͕u a, ka ayi le anya nke-ọma n’akwukwọ Matiu.
Na Matiu 3:13-17, “Mb͕e ahu Jisus siri na Galili bia rue Jọdan jekuru Jọn ahu, ka o we me Ya baptism. Ma Jọn nēb͕ochi Ya, si, Ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism, Gì onwe-gi nābiakutekwam? Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n’ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya. Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri ahu rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya; ma le, olu sitere n’elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.” 
 
N’ihi gini ka ayi ji kwesi ighọta agburu nke Jọn?
N’ihi na Bible nāgwa ayi na Jọn bu onye-isi-nchu-àjà nke ndi madu dum.
 
Jọn Baptist mere Jisus baptism. Ọ bu Jọn Baptist onye tukwasiri nmehie nile nke uwa na Jisus Kraist. Na Luk 1, Luk nēkwu bayere agburu nke Jọn Baptist. Ka ayi lebà anya.
Na Luk 1:1-14, “Ebe ọtutu madu tinyere aka-ha ide akwukwọ banyere ihe ahu nke emezuworo n’etiti ayi, ha dere ihe ndi mbu ji anya ha hu ihe ndia burukwa ndi na-ekwuputa ozioma, gwara ayi, ọ di-kwa-ram nma, ebe m’soro ihe nile nke-ọma site na mbu, ka m’dere gi ka o si me, Teọfilọs di oké ebube; ka i we mata na ihe nile ejiworo okwu ọnu zí gi bu ihe kwesiri itukwasi obi. N’ubọchi Herod, eze Judia, otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n’òtù obodo Abaija puta: o nwe-kwa-ra nwunye nke si n’etiti umu-nwanyi Eron puta; aha nwayi ahu bu Elizabet. Ha abua bu ndi ezi omume n’iru Chineke, nāga n’ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n’iwu na n’ihe nile Ọ guru n’ihe ziri ezi nādighi ita uta. Ha ejighi kwa nwa, n’ihi na Elizabet bu nwanyi-àgà, ha abua aghọwo kwa agadi. Ma o rue, mb͕e ọ nālu ọlu nchu-àjà n’iru Chineke dika ha si-eme kwa ubochi, dika omume ọlu nchu-àjà nādi, ọlu ibà n’ulo nsọ nke Onye-nwe-ayi na isure ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ ruru ya site n’ife nzà. Ọra ndi-Ju nile nēkpe kwa ekpere n’èzí n’oge hour isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. Ewe me ka ọ hu mọ-ozi Onye-nwe-ayi ka o guzoro n’aka-nri ebe-ichu-àjà ebe a na-eme ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. Mb͕e Zakaraias huru ya obi we lọ ya miri ahu, ọ tu-kwa-ra egwu. Ma mọ-ozi ahu siri ya, Atula egwu, Zakaraias: n’ihi na a nuwo aririọ-gi, nwunye-gi Elizabet gāmu-kwa-ra gi nwa-nwoke, i gākpọ kwa aha-ya Jọn. I gēnwe kwa ọṅù na obi-utọ; ọtutu madu gāṅuri kwa ọṅù n’ọmumu-ya.’”
Luk nāgwa ayi agburu nke Jọn n’otù n’otù. Luk, onye nēso uzọ Jisus, nākọwa agburu nke Jọn site na nmalite. Luk zíri-ri otù nwoke anākpọ Teọfilọs ozi ọma ahu, onye si n’ome-n’ala di iche nāmataghi ihe bayere Onye-nwe-ayi.
Ya mere, ka o we zí ya bayere Jisus, Onye-nzọputa ndi-nmehie, Luk chere na o kwesiri ikọwa agburu Jọn n’otù n’otù.
Na Luk 1:5-9, ọ nākọ “N’ubọchi Herod, eze Judia, otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n’òtù obodo Abaija puta: o nwe-kwa-ra nwunye nke si n’etiti umu-nwanyi Eron puta; aha nwayi ahu bu Elizabet. Ha abua bu ndi ezi omume n’iru Chineke, nāga n’ihe nile Onye-nwe-ayi nyere n’iwu na n’ihe nile Ọ guru n’ihe ziri ezi nādighi ita uta. Ha ejighi kwa nwa, n’ihi na Elizabet bu nwanyi-àgà, ha abua aghọwo kwa agadi. Ma o rue, mb͕e ọ nālu ọlu nchu-àjà n’iru Chineke dika ha si-eme kwa ubochi, dika omume ọlu nchu-àjà nādi, ọlu ibà n’ulo nsọ nke Onye-nwe-ayi na isure ihe-nsure-ọku nēsì isì utọ ruru ya site n’ife nzà.”
N’ebe a, otù ihe mere mb͕e Zakaraias nējere Chineke ozi dika omume nke òtù ndi-nchu-àjà. Luk b͕ara àmà n’ebe ọ di ọcha na Zakaraias bu nkpuru Eron. Mb͕e ahu Zakaraias si n’òtù ole puta? Nka bu isi-okwu di nkpà nke-uku.
O kọwara, “Mb͕e Zakaraias nālu ọlu nchu-àjà n’iru Chineke dika ha si-eme kwa ubọchi, dika omume ọlu nchu-àjà nādi.” Ayi puru ihu na Luk mara Zakaraias nke-ọma otú a na ọ kọwara ozi ọma nke nb͕aputa site na Zakaraias na Elizabet.
Dika ayi bu ndi mba ọzọ sitere na mba di iche iche, ayi apughi ighọta Nzọputa nke Jisus ma ọ buru na akọwaghi ya n’otù n’otù, n’usoro. Ka ayi chọputa ihe ihe nile ndia bu n’otù n’otù. Amuru Jọn Baptist nye Zakaraias na nwunye ya Elizabet, onye si n’etiti umu-nwanyi Eron puta. Ub͕u a, ka ayi le anya n’agburu Zakaraias na Jọn.
 
 
Agburu nke Jọn Baptist 
 
Nkpuru nke onye ka Jọn Baptist bu?
Eron, onye-isi-nchu-àjà
 
Ka ewe ghọta agburu Jọn Baptist, ayi kwesiri igu Testament Ochie, I. Ihe Emere 24:1-19.
“Ekè-kwa-ra umu Eron òkè nile ha. Umu-ndikom Eron; Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama. Nedab na Abaihu we nwua n’iru nna-ha, ha enweghi kwa umu-ndikom: Eleeza na Itama we buru ndi-nchu-àjà. Devid we kè ha, ya na Zedok, onye sitere n’umu Eleeza, na Ahimelek, sitere n’umu Itama, dika ihe-nlekọta-ha si di n’òfùfè-ha. Ewe chọta ọtutu umu Eleeza ibu ndi-isi nke ndikom di ike kari umu Itama; ewe kè ha otú a: umu Eleeza nwere ndi-isi ulo nke ndi bu nna iri na isi; umu Itama nwe-kwa-ra asatọ, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di. Ewe kè ha n’ife-nzà, ndi Eleeza na ndi Itama n’otù; n’ihi na ndi-isi ebe nsọ di, na ndi-isi nke Chineke, ndi sitere n’umu Eleeza na n’etiti umu Itama. Shemaia nwa Netanel, bú ode-akwukwọ, onye sitere na ndi Livai, we de ha n’akwukwọ n’iru eze, na ndi-isi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Ahimelek nwa Abaiata, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai: otù ulo nna nke Eleeza ka ejidere, ejide-kwa-ra otù nke Itama. Ife-nzà mbu we putara Jehoiarib, nke-abua putara Jedaia; nke-atọ putara Harim, nke-anọ putara Seorim; nke-ise putara Malkija, nke-isi putara Mijamin; nke-asa putara Hakoz, nke-asatọ putara Abaija; nke-iteghete putara Jeshua, nke-iri putara Shekania; nke-iri-na-otù putara Elaiashib, nke-iri-na-abua putara Jakim; nke-iri-na-atọ putara Hupa, nke-iri-na-anọ putara Jeshebeab; nke iri-na-ise putara Bilga, nke-iri-na-isi putara Imea; nke-iri-na-asa putara Hezia, nke-iri-na-asatọ putara Hapizez; nke-iri-na-iteghete putara Petahia, nke-orú putara Jehezkel; nke-orú-na-otù putara Jakin, nke-orú-na-abua putara Gamul; nke-orú-na-atọ putara Delaia, nke-orú-na-anọ putara Maazia. Ndia bu ihe-nlekọta-ha ifè òfùfè-ha, ibà n’ulo Jehova, dika ikpé-ha si di site n’aka Eron nna-ha, dika Jehova, bú Chineke Israel, nyere ya iwu.”
Ka ayi gu ama-okwu nke 10 ọzọ. “Nke-asa putara Hakoz, nke-asatọ putara Abaija.” N’ebe a, Devid kère onye ọ bula nime umu-ndikom Eron n’ife-nzà ka ewe fè òfufè ahu n’usoro. (Dika unu nile mara, Eron bu nwa-nne Moses nke okenye. Chineke rọputara Moses dika onye nējere Ya ozi, na Eron dika onye-isi-nchu-àjà nke Ulo-ikwū Nsọ ahu n’iru ndi Israel.)
Ndi-Levai nile ndi-ọzọ ka etinyere n’okpuru ndi-nchu-àjà, Eron na umu-ya ndikom nēlekọta àjà nile n’iru Chineke. Tutu Devid kère òkè nile usoro ike òkè ahu, ndi-nchu-àjà, ndi bu nkpuru Eron, kwesiri ife nzà n’oge nile o wetarari kwa oké aghara.
Ya mere Devid doziri otù usoro site n’itinye òtù obodo ọ bula n’usoro. Enwere òtù obodo di 24 n’usoro nāmalite na umu–umu ndikom nke Eron, nke-asatọ bu kwa Abaija. Asi kwa-ra, “Otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n’òtù obodo Abaija puta.” Ya mere Zakaraias ma nwuye-ya Elizabet ha abua bu nkpuru Eron onye-isi-nchu-àjà.
Ọ bu Zakaraias, onye-nchu-àjà nke si n’òtù obodo Abaija puta, onye bu nna Jọn Baptist. Ayi mara site na Bible na ha nālu di na nwunye n’etiti ab͕uru-ha nile.
Dika I mara, Jekob luru nwa nwanyi nwa-nne nna-ya sitere n’akuku nne-ya. Ọ bu nkọwa nke ab͕uru nka nke di oké nkpà. Ọ nāsi, “Otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n’òtù obodo Abaija puta.”
Ya mere, ọ bu nkpuru Eron n’ezie. Ònye? Zakaraias, nna Jọn Baptist. Nka bu ihe di nkpà n’ikọwa nb͕aputa Jisus, na ije-ozi Jọn Baptist, na itukwasi nmehie nile nke uwa na Jisus.
 
 
Nání Umu-ndikom nke Eron Gēje Ozi dika Ndi-nchu-àjà 
 
Ònye puur ije ozi dika onye-isi-nchu-àjà n’oge nke Testament Ochie?
Eron na nkpuru-ya nile
 
Mb͕e ahu ǹ’ebe na Bible ka ekwuputara nke-ọma na umu-ndikom Eron gēje ozi dika ndi-nchu-àjà? Ka ayi chọputa ya.
N’Ọnu-Ọgugu 20:22-29, “Ha we si na Kedesh bulie ije: umu Israel, bú nzukọ ahu nile, we biarue ugwu Hoa. Jehova we gwa Moses na Eron okwu n’ugwu Hoa, n’akuku ókè ala Edom si, Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n’ala-mọ’ n’ihi na ọ gaghi-abà n’ala ahu nke M’nyeworo umu Israel, n’ihi na unu nupuru isi n’okwu-ọnum na miri ahu Meriba. Chiri Eron na Eleeza nwa-ya, me ka ha rigota n’ugwu Hoa: i gēyipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya: agāchikọta Eron na umu-nna-ya n’ala-mọ, ọ gānwu kwa n’ebe ahu. Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: ha we rigo n’ugwu Hoa n’anya nzukọ Israel nile. Moses we yipu Eron uwe-ya, yibe ha Eleeza nwa-ya; Eron we nwua n’ebe ahu n’elu ugwu ahu: Moses na Eleeza we si n’ugwu ahu ridata. Nzukọ Israel nile we hu na Eron ekubiwo, ha we kwara Eron ákwá orú ubọchi na iri, bú ulo Israel nile.” 
N’Ọpupu, edekọrọ iwu Chineke ahu, nāsi na umu-ndikom onye-isi-nchu-àjà kwesiri iketa òtù ndi-isi-nchu-àjà, dika nna-ha mere mb͕e ha tozuru okè.
N’Ọpupu 28:1-5, “Ma gi onwe-gi, me ka Eron, bú nwa-nne-gi, ya na umu-ya ndikom, si n’etiti umu Israel biakute gi nso, ka ọ we burum onye-nchu-aja, bú Eron, ya na Nedab na Abaihu, na Eleeza na Itama, bú umu-ndikom Eron. I gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, uwe nsọ, ibu ihe-nsọpuru na ihe mara nma. Gi onwe-gi gāgwa kwa ndi nile nwere obi amam-ihe, bú ndi M’mejuworo na mọ amam-ihe, ka ha me uwe Eron ido ya nsọ, ka o we burum onye-nchu-aja. Ndia bu uwe ha gēme; ihe-ib͕ochi-obi, na ephod, na uwe-nwuda, na uwe-ime turu agwa, na nkechi isi, na ihe ike n’úkwù: ha gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, na umu-ya ndikom, uwe nsọ, ka ọ we burum onye-nchu-àjà. Ndi ahu gēwere kwa ọla-edo ahu, na ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu.” 
Chineke keyeworo Eron, nwa-nne Moses, ọlu òtù ndi-nchu-àjà. Ekenyeghi madu ọzọ ọ bula òtù ndi-nchu-àjà. Ya mere, Chineke nyere Moses iwu ka ọ meju Eron dika onye-isi-nchu-àjà, ka o mere ya uwe ziri ezi dika Ọ kọwara. Ayi ekwesighi ma-ọli ichefu okwu nile nke Chineke.
Ọzọ n’Ọpupu 29:1-9, “Nka bu kwa ihe i gēme ha ido ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: were otù nwa-oke-ehi na ebulu abua nke zuru okè, na achicha ekoghieko, na ob͕e achicha ufọdu ekoghieko nke agwara manu, na mbadamba-achicha ufọdu ekoghi-eko nke etere manu: utu flour nke ọka wheat ka i gēwere me ha. I gētiye ha n’otù nkata, bute ha nso nime nkata ahu, ha na oke-ehi ahu na ebulu abua ahu. Eron na umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute, i gēwere miri ahu sa ha aru. I gāchiri kwa uwe ahu, yikwasi Eron uwe-ime, na uwe-nwuda ephod, na ephod, na ihe-ib͕ochi-obi, were kwa ihe-ọkiké nke ephod nke onye-ọ̀kà kpara ke ya: i gēkpukwasi kwa akwa nkechi ahu n’isi-ya, tiye okpu nsọ nke onye-nchu-àjà n’elu ákwà-nkukù-isi ahu. I gēwere kwa manu otite-manu ahu wukwasi n’isi-ya, we te ya. Umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso, i gēyikwasi ha uwe-ime. I gēwere kwa ihe ike n’úkwù ke ha, bú Eron na umu-ya ndikom, i gēke kwa ha ihe ike n’isi: ha gēnwe kwa ọlu nchu-àjà site n’ukpuru ebighi-ebi: i gēmeju kwa aka Eron na aka umu-ya ndikom.” 
“I gēwere kwa ihe ike n’úkwù ke ha, bú Eron na umu-ya ndikom, i gēke kwa ha ihe ike n’isi: ha gēnwe kwa ọlu nchu-àjà site n’ukpuru ebighi-ebi: i gēmeju kwa aka Eron na aka umu-ya ndikom.” Chineke kwuputara nke-ọma na nání Eron nad umu-ya ndikom ka agēmeju ije ozi òtù ndi-nchu-àjà site n’ukpuru ebighi-ebi. Mb͕e O kwuputara si, “site n’ukpuru ebighi-ebi,” ọ di ire ọbuná mb͕e Jisus biasiri n’uwa nka.
Ya mere Luk nākọwa n’omimi na Zakaraias bu nkpuru Eron onye-isi-nchu-àjà. Mb͕e Zakaraias nēje ozi dika onye-nchu-àjà n’iru Chineke n’ulo nsọ Onye-nwe-ayi, mọ ozi guzoro we gwa ya okwu si n’azawo ekpere ya; na nwunye-ya Elizabet gāmuru ya nwa nwoke.
Zakaraias apughi ikweye nka o we si, “Nwunyem aghọwo agadi, o si aṅa apu imu nwa nwoke?” N’ihi inwe obi abua ya, Chineke kpuchiri ọnu ya nwa mb͕e ntà igosi na okwu-Ya nile bu ezi-okwu.
N’oge akara àkà, nwunye ya di ime mb͕e nwa oge gasiri, Meri, otù Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, tu-kwa-ra ime. Ihe abua ahu merenu bu ọlu nile nke Chineke nke ejikeworo nye nzọputa-ayi. Ka ewe zọputa ndi madu ruru arú, O kwesiri iziga onye-ozi-Ya Jọn we kwe kwa ka amua Ọkpara Ọ muru nání Ya bú Jisus n’uwa nka.
Ya mere, Chineke mere ka eme Ọkpara Ya baptism site n’aka Jọn itukwasi nmehie nile nke uwa ka ewe zọputa ndi kwere na Ya.
 
 
Nduzi Puru Iche nke Chineke! 
 
Ònye ka Chineke jikere tutu Jisus n’ihi ọlu nke nb͕aputa?
Jọn Baptist
 
Chineke jikere ka amua Jọn n’uwa nka n’iru Jisus. Amuru Jọn ka o we pu ime Jisus baptism we tukwasi nmehie nile nke uwa na Ya. Otù nkpuru nke onye-isi-nchu-àjà kwesiri-ri ichu àjà nke nkpuchi-nmehie ka ewe mezu Ọb͕ub͕a-ndu Chineke na Testament Ochie na nke Ọhu; ka ozi ọma nb͕aputa nke Jisus buru ihe agēkwere we me kwa ka o guzozie.
N’Ọpupu, Chineke nyere Israel Iwu-Ya na Ọb͕ub͕a-ndu-Ya nile; iwu Chineke na iwu usoro-nchu-àjà nke Ulo-ikwū ahu, rue na uwe nile nke ndi-nchu-àjà, ihe nile nke àjà nile ahu n’otù n’otù, na ikeye umu ndikom nke ndi-nchu-àjà ọlu ichu-àjà. Chineke rọputara Eron na nkpuru-ya nile n’ọlu onye-isi-nchu-àjà n’ukpuru ebighi-ebi.
Ya mere, nkpuru Eron nile puru ichu àjà nile, ndi-isi-nchu-àjà puru isi nání n’ulo Eron puta. Ì nāhu ihe mere o ji diri otú a?
N’etiti ọtutu nkpuru Eron nile, Chineke rọputara otù onye-nchu-àjà aha-ya bu Zakaraias na nwunye-ya Elizabet. O siri-ri, “Le, Mu nēziga onye-ozim n’iru Gi.” Mb͕e Chineke gwara Zakaraias okwu na Ọ gēme ka Elizabet muta otù nwa nwoke, na ọ gākpọ kwa aha-ya Jọn, o juworo-ya anya nke-uku na ekpuchiri ọnu-ya site n’iwu-Ya rue mb͕e amuworo nwa nwoke ahu we kpọ ya aha. 
N’ezie, amuworo nwa-nwoke n’ulo-ya. Mb͕e o ruru oge ikpọ nwa ahu aha dika omume Israel si di, ha kwesiri ikpọ nwa-nwoke ahu aha nna-ya.
“Ma oge Elizabet zuru ka ọ gāmuta nwa; o we mua nwa-nwoke. Ndi-ab͕ata-obi-ya na ndi-ikwu-ya we nu na Onye-nwe-ayi mere ka ebere-Ya di uku n’ebe ọ nọ; ha we so ya ṅuri ọṅù. O we rue n’ubọchi nke-asato, na ha biara ibi nwatakiri ahu úgwù; ha we kpọbá ya Zakaraias, n’aha nna-ya. Nne-ya we za, si, mba; kama agākpọ ya Jọn. Ha we si ya, Ọ dighi onye ọ bula n’etiti ndi-ikwu-gi nke anākpọ aha nka. Ha we fere nna-ya aka, ihe ọ chọrọ ka akpọ ya. O we riọ ha ka ha nye ya ihe eji ede akwukwọ, o we de, si, Aha-ya bu Jọn. O we ju ha nile anya. Ngwa ngwa ọnu-ya we saghe, ire-ya tọpu kwa, o we nēkwu okwu, nāgọzi Chineke. Ndi nile bi ha gburugburu we tua egwu: ewe kwusa okwu ndia nile n’elu-ala Judia dum. Ndi nile nke nuru ha we debe ha n’obi-ha, si, Àha madu gini kwa ka nwatakiri a gābu? N’ihi na aka Onye-nwe-ayi diyere ya” (Luk 1:57-66). 
Ọnu Zakaraias kpuchiri n’oge ahu. Mb͕e oge ruru ikpọ nwa ahu aha, ndi-ikwu turu arọ na ekwesiri ikpọ nwa-nwoke ahu aha Zakaraias. Kama nne-ya rugidere na aha-ya kwesiri ibu Jọn. Na nka, ndi-ikwu we si na o nweghi onye ọ bula anākpọ aha ahu n’etiti umu-nna ahu na ekwesiri ikpọ nwatakiri ahu aha nna-ya.
Mb͕e Elizabet gara n’iru irugide n’aha ahu, ndi-ikwu ahu we gakuru Zakaraias we jua ya ihe aha nwatakiri ahu kwesiri ibu. Zakaraias, n’ihi na ọ pughi ikwu okwu, we ruọ ka ha nye ya ihe eji ede akwukwọ o we de ‘Jọn’. O juru ndi-ikwu nile ahu anya bayere nrọputa aha puru iche nka.
Ma mb͕e ikpọ aha ahu gasiri, ngwa ngwa ọnu Zakaraias meghere. O we to Chineke o juputa-kwa-ra na Mọ Nsọ we bue kwa amuma.
Luk kwuru okwu bayere ọmumu Jọn Baptist n’ulo Zakaraias. “Otù onye-nchu-àjà di, aha-ya bu Zakaraias, nke si n’òtù obodo Abaija puta.” N’ihe nketa puru iche nke Chineke, Jọn Baptist, onye nānọchi anya ndi madu ka amuworo nye Zakaraias, bú otù nkpuru Eron.
Site kwa n’aka Jọn Baptist na Jisus Kraist, Chineke mezururi nzọputa ndi madu. Azọputaworo ayi na nmehie nile ayi site n’ikwere n’ọlu nke nb͕aputa ahu nke emeworo site na Jọn ya na Jisus Kraist.
 
 

Baptism Jisus ahu

 
Gini bu ihe mere ejiri me Jisus baptism site n’aka Jọn?
Ibupu nmehie nile nke uwa 
 
Jọn Baptist b͕ara àmà na Jisus bu Ọkpara Chineke na O bupuru nmehie nile ayi. Ọ bu Jọn Baptist, onye-ozi Chineke onye b͕ara àmà nye nzọputa-ayi. Ọ putaghi na Chineke agwaghi ayi n’Onwe-ya na Ọ bu Onye-nzọputa-ayi. Chineke nālu ọlu site n’aka ndi-ozi-Ya nime nzukọ Kraist, site kwa n’ọnu ndi-Ya bú ndi azọputaworo.
Chineke nāsi, “Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n’obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n’aka Jehova okpukpu abua n’ihi nmehie-ya nile. Ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo: ma okwu Chineke-ayi gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.” (Aisaia 40:2, 8). 
“I bughi onye-nmehie ọzọ. Ekpuchiwom nmehie-gi nile, obubu-agha ahu ezuwo kwa.” Otú a olu nke ozi ọma nke nb͕aputa nāga n’iru itipuru ayi nkpu. Nka bu ihe anākpọ ozi ọma ejikeworo.
Mb͕e ayi nāghọta ọlu Jọn Baptist nile, mb͕e ayi nāghọta n’ezie na atukwasiworo nmehie nile nke uwa na Jisus site n’aka Jọn Baptist, apuru ime ka ayi dum si n’orù nmehie nile ayi pua.
Akwukwọ Ozi Ọma anọ dum nāgwa ayi okwu bayere Jọn Baptist, onye-amuma nke ikpé-azu nke Testament Ochie nāb͕a-kwa-ra Jọn Baptist àmà, onye-ozi Chineke. Testament Ọhu nāmalite site n’ọmumu Jọn Baptist ya na itukwasi nmehie nile site n’aka-ya. 
Mb͕e ahu gini mere ayi ji akpọ ya Jọn Baptist? Ọ bu n’ihi na o mere Jisus baptism. Gini bu isi baptism? Isi-ya bu ‘itukwasi ihe, ilì ihe, isa ihe’—otù ihe dika ‘ibikwasi-aka-n’isi’ na Testament Ochie.
Na Testament Ochie, mb͕e madu mehiere, ọ tukwasiri nmehie-ya nile n’isi otù àjà-nmehie, àjà nke zuru okè, site n’ibikwasi aka-ya abua n’àjà-nmehie ahu, àjà ahu nwu-kwa-ra nime nmehie nile ahu. ‘Ibikwasi-aka-n’isi’ putara ‘itukwasi ihe’. Ya mere, ‘ibikwasi-aka-n’isi’ na ‘baptism’ nēnwekọrọ otù ihe kama ha nwere aha di iche.
Mb͕e ahu gini bu ihe baptism Jisus putara? Baptism-Ya bu nání uzọ eji ekpuchi nmehie nime iwu Chineke.
Na Testament Ochie, ndi-nmehie kwesiri-ri ibikwasi aka-ha abua n’isi àjà ka ewe tukwasi nmehie nile ha n’isi-ya. Mb͕e ahu ha kwesiri-ri ibọ akpiri-ya, ndi-nchu-àjà were ọbara ahu itiye-ya n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu. Nka bu uzọ eji ekpuchi nmehie nile nke otù ubọchi.
Mb͕e ahu, ha si aṅa kpuchie nmehie nile nke otù arọ? 
Eron, bú onye-isi-nchu-àjà churu àjà nye ndi Israel nile. N’ihi na amuru Jọn Baptist n’ulo Eron, o ziri ezi ka ọ buru onye-isi-nchu-àjà, Chineke kara ya àkà ibu onye-isi-nchu-àjà nke ikpé-azu dika nkwà nke nb͕aputa-Ya si di.
Jọn Baptist bu onye nānọchi anya madu nile na onye-isi-nchu-àjà nke ikpé-azu n’ihi na Testament Ochie gwuworo mb͕e amuru Jisus Kraist. Òle onye ma-ọbughi Jon Baptist tukwasiri nmehie nile nke uwa na Jisus na Testament Ọhu, dika Eron kpuchiri nmehie nile nke ndi-ya na Testament Ochie? Dika onye-isi-nchu-àjà nke ikpé-azu na Testament Ochie na onye nānọchi anya nke ndi madu dum, Jọn Baptist tukwasiri nmehie nile nke uwa na Jisus mb͕e ọ mere Ya baptism.
N’ihi na Jọn tukwasiri nmehie nile na Jisus, apuru ib͕aputa-ayi site n’ikwere n’ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ. Jisus ghọrọ Nwa-aturu ka ewe zọputa ndi-nmehie nile, otú a lua ọlu nke nb͕aputa dika Chineke zubereri. Jisus gwara ayi na Jọn Baptist bu onye-amuma nke ikpé-azu, onye-isi-nchu-àjà nke ikpé-azu onye tukwasiri nmehie nile nke uwa na Ya.
Gini mere Jisus apughi ime ya site n’aka Onwe-ya? Gini mere O ji chọ Jọn Baptist? Enwere ihe mere ejiri mua Jọn Baptist mb͕e ọnwa isi gasiri tutu Jisus. Ọ bu imezu iwu Testament Ochie, ime Testament Ochie ka o zue okè.
Amuru Jisus nye Meri Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi-nwoke, amu-kwa-ra Jọn Baptist nye nwanyi ghọworo agadi anakpọ Elizabet. 
Ihe ndia bu ọlu nile nke Chineke, O zube-kwa-ra ha izọputa ndi-nmheie nile. Ka ewe zọputa ayi n’agha megide nmehie n’ukpuru ebighi-ebi, ya na ahuhu nile nke ndu nmehie nke ndi madu, O zigara onye-ozi-Ya bú Jọn, emesia ziga kwa Ọkpara nke aka-Ya Jisus. Ezigaworo Jọn Baptist dika onye nānọchi anya nke ndi madu dum, onye-isi-nchu-àjà nke ikpé-azu.
 
 
Onye kachasi uku N’etiti Ndi Ndinyom Muru 
 
Ònye bu nwoke kachasi uku n’uwa?
Jọn Baptist
 
Ka ayi lebà anya na Matiu 11:7-14. “Ma mb͕e ndia nāla, Jisus malitere igwa ìgwè madu nile okwu bayere Jọn, si, Ọ̀ bu gini ka unu puru je n’ọhia ka unu kiri? àmì nke nēme nkpatu site n’ifufe? Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ǹwoke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi uwe di biali-biali nọ n’ulo ndi-eze. Ma gini mere unu ji pua? ìhu onye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku. Nwoke a bu onye edeworo ihe n’akwukwọ nsọ bayere ya, si, Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n’iru Gi, Onye gēmezi uzọ-Gi n’iru Gi. N’ezie asim unu, N’etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku: ma onye dikariri ntà n’ala-eze elu-igwe ka ya uku. Site n’ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya. N’ihi na ndi-amuma nile na iwu Chineke buru amuma rue ubọchi Jọn. Ọ buru kwa na unu nāchọ inara ya nke-ọma, nwoke ahu bu Elaija, nke gaje ibia.”
Ndi nile puru n’ọhia ihu Jọn Baptist, onye tiri nkpu, “Chègharianu, unu umu nke aju-ala!” Jisus we si kwa, “Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ǹwoke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi uwe di biali-biali nọ n’ulo ndi-eze.” 
Jisus n’Onwe-ya b͕ara idi-uku nke Jọn àmà. “Gini ka unu puru ka unu hu? Ònye nāsu asusu ọzọ eyikwasiworo uwe-oyiyi nke aji camel we nēti nkpu n’oké olu? Ọ ghaghi iyikwasi uwe-oyiyi nke aji camel. Gini ka unu puru ka unu hu? Ǹwoke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Ndi nēyi uwe di biali-biali nọ n’ulo ndi-eze. Kama ọ kariri eze uku,” Jisus b͕ara àmà. “Le, ndi nēyi uwe di biali-biali nọ n’ulo ndi-eze. Ma gini mere unu ji pua? ìhu onye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku.”
N’ubọchi ochie, aguru ndi-amuna na ndi ka ndi-eze uku. Jọn Baptist kariri eze, kari kwa onye-amuma. Ọ kariri ndi-amuna nile nke Testament Ochie. N’ezi-okwu, Jọn, onye-isi-nchu-àjà nke ikpé-azu na onye nānọchi anya ndi madu, kariri Eron onye-isi-nchu-àjà nke mbu. Jisus n’Onwe-ya b͕ara Jọn àmà.
Ònye bu onye nānọchi anya ndi madu? Ewezuga Jisus n’Onwe-ya, ònye bu nwoke kachasi uku n’uwa? Jọn Baptist. “E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku. Nwoke a bu onye edeworo ihe n’akwukwọ nsọ bayere ya, si, ‘Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n’iru Gi, Onye gēmezi uzọ-Gi n’iru Gi.’”
Jọn Baptist b͕ara àmà n’agha megide nmehie ezuwo. “Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!” Ọ bu Jọn Baptist onye b͕ara àmà na Jisus bupuru nmehie nile nke uwa.
Na Matiu 11:11, “N’ezie asim unu, N’etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku.” Ènwere onye ka Jọn Baptist uku n’etiti ndi ndinyom muru?
Gini ka ọ putara ibu ‘ndi ndinyom muru’? Ọ putara ndi-madu dum. Ewezuga Adam, ndi ndinyom muru ndi madu dum. E, n’etiti ndi ndinyom muru, ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku. Ya mere, ọ bu onye-isi-nchu-àjà nke ikpé-azu na onye nānọchi anya ndi madu. Jọn Baptist bu onye-isi-nchu-àjà, onye-amuma, na onye nānọchi anya ayi. 
Na Testament Ochie, Chineke jikeworo Eron na umu-ya ndikom ife òfufe n’ukpuru ebighi-ebi. Ekwesiri isachapu nmehie nile site n’aka Eron na umu-ya ndikom. Ọ di dika Chineke nyereri n’iwu.
Ọ buru na onye ọ bula n’etiti ndi-Livai ndi ọzọ biarari we were anya-ike iso, ọ ghaghi inwu n’ezie. Nání ihe nile ha puru ime bu iweta nku n’ihi ọku nke ebe-nchu-àjà, ime akpukpọ anu nile, isacha ngiri-afọ-ha nile, iweputa iberibe mara abuba. Ọ buru na ha nweworo anya-ike zuru okè inwa ilu ọlu nke ndi-nchu-àjà, ha gara-abu nání ndi nwuworo. Ọ bu iwu Chineke. Ha apughi igafe akàra ahu.
N’uwa, ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku. Ọ bu onye kachasi uku n’etiti aru nile puru inwu anwu. “Site n’ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya.”(Matiu 11:12).
Nb͕aputa madu ka emezuworo mb͕e Jọn Baptist mere Jisus baptism, ndi nke kwere na Jisus puru ibà n’Ala-eze Elu-igwe. Ha bu ndi ezi omume. Ka ayi hu otù nna Jọn si b͕ara nwa-ya nwoke àmà.
 
 
Àmà Zakaraias, Nna Jọn 
 
Gini ka Zakaraias buru n’amuma bayere nwa-ya nwoke?
Jọn gēdozi uzọ Onye-nwe-ayi site n’ime ndi nke Ya ka ha mara nzọputa.
 
Ka ayi gu Luk 1:67-80. “Nna-ya Zakaraias we juputa na Mọ Nsọ, o we bu amuma, si, Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye-nwe-ayi, Chineke nke Israel; N’ihi na O letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra ha ọlu nb͕aputa, O weliwo-kwa-ra ayi mpi nke nzọputa N’ulo onye nējere Ya ozi, bú Devid (Dika O kwuru site n’ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ site n’oge mbu), Nzọputa n’aka ndi-iro-ayi, na n’aka ndi nile nākpọ ayi asì; Imere nna-ayi-hà ebere, Na icheta Testament nsọ Ya; Iyí Ọ ṅuru Abraham nna-ayi, Ikweye ayi, ebe adọputaworo ayi n’aka ndi-iro-ayi, Ka ayi nēkpere Ya nātughi egwu. N’obi ọcha na ezi omume n’iru Ya ubọchi-ayi nile. Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi ihe nile elu: N’ihi na i gāga n’iru Onye-nwe-ayi idozi uzọ-Ya nile; Ime ndi nke Ya ka ha mara nzọputa Nime nb͕aghara nmehie nile ha, N’ihi obi ebere nke Chineke-ayi, Nke ọwuwa-anyanwu nke sitere n’elu gēleta ayi nime ya, Imukwasi ndi nọ n’ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n’uzo udo. Nwatakiri ahu we nētọ, nēsi kwa ike na mọ-ya, o we nọ n’ọhia rue ubọchi ewere ya gosi Israel.” 
Zakaraias buru amuma ihe abua. O buru amuma na Eze ndi nile gaje ibia. Site n’ama-okwu nke 68 rue na nke 73, o buru amuma n’ọṅù na Chineke echezọghi nkwà-Ya nile na Jisus, dika Chineke kwere Abraham na nkwà, ka amuworo nye Meri Nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ka ewe zọputa nkpuru-ya nile n’aka ndi-iro-ha.
Malite n’ama-okwu nke 74, “Ikweye ayi, ebe adọputaworo ayi n’aka ndi-iro-ayi, Ka ayi nēkpere Ya nātughi egwu.” Nka bu ihe-ncheta nke Nkwà Chineke nye Abraham na ndi Israel, o we bue kwa amuma. “Ikweye ayi, Ka ayi nēkpere Ya nātughi egwu.”
Malite n’ama-okwu nke 76, o buru amuma nye nwa-ya nwoke. “Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi ihe nile elu: N’ihi na i gāga n’iru Onye-nwe-ayi idozi uzọ-Ya nile; Ime ndi nke Ya ka ha mara nzọputa Nime nb͕aghara nmehie (Bupu Nmehie) nile ha, N’ihi obi ebere nke Chineke-ayi, Nke ọwuwa-anyanwu nke sitere n’elu gēleta ayi nime ya, Imukwasi ndi nọ n’ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n’uzo udo.” 
O we si, “Ime ndi nke Ya ka ha mara nzọputa Nime nb͕aghara nmehie(Bupu Nmehie) nile ha.” Site n’aka ònye ka o siri na emeworo ka amara nzọputa? Jọn Baptist. Ùnu nile puru ihu nka? Jọn Baptist, site n’okwu nile Chineke, gēme ka ayi mara na Jisus bu Ọkpara Chineke onye bupuru nmehie nile nke uwa.
Ub͕u a, ka ayi le anya na Mak 1. “Nmalite ozi ọma jisus Kraist, Ọkpara Chineke. Dika edeworo ya n’akwukwọ Aisaia onye-amuma, si, Le, Mu onwem nēzipu onye-ozim ka ọ ga n’iru gi, Onye gēmezi uzọ-gi; Olu otù onye nēti nkpu n’ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Me okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie; Jọn putara ìhè, onye nēme baptism n’ọhia, nēkwusa kwa baptism nchèghari inwe nb͕aghara nmehie. Ala Judia nile na ndi Jerusalem nile nāpukuru ya; ọ neme kwa ha baptism n’osimiri ahu Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha.” (Mak 1:1-5).
Mb͕e ndi Israel nuru olu Jọn Baptist, ha chèghariri n’ikpọ isi ala nye chi nile Ndi Mba Ọzọ ewe me kwa ha baptism site n’aka Jọn Baptist. Kama Jọn b͕ara àmà, “Anāmeme unu baptism ka unu we laghachikute Chineke. Kama Ọkpara Chineke gaje ibia agēme kwa Ya baptism site n’akam ka ewe tukwasi nmehie nile unu na Ya. Ma ọ buru kwa na unu kwere na baptism-Ya dika anēme unu baptism site n’akam, agātukwasi nmehie nile unu na Ya, dika atukwasiri nmehie nile site n’ibikwasi aka n’isi na Testament Ochie.” Ihe ahu bu ihe Jọn b͕aworo àmà.
N’ihi na emere Jisus baptism na Jọdan n’ezie ọ putara na emeworo Ya baptism na osimiri ọnwu. Ayi nābu n’olìlì ozu, “♪N’elu ala di nma n’uwa ọzọ, anyị ga-ezukọta n’ọnụ mmiri mara mma. Anyị ga-ezukọta n’ọnụ mmiri mara mma.♪” Mb͕e ayi nwuru, ayi gāgafe Osimiri Jodan ahu. Osimiri Jọdan ahu bu osimiri ọnwu. Emere Jisus baptism n’osimiri ọnwu.
 
 
Baptism ahu nke Nātukwasi Nmehie nile Ayi 
 
Gini bu ‘ibikwasi-aka-n’isi’ na Testament Ọhu?
Baptism Jisus
 
Na Matiu 3:13-17, ayi guru, “Mb͕e ahu Jisus siri na Galili bia rue Jọdan jekuru Jọn ahu, ka o we me Ya baptism. Ma Jọn nēb͕ochi Ya, si, Ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism, Gì onwe-gi nābiakutekwam? Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n’ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya. Ma mb͕e emere Jisus baptism, ngwa ngwa O si na miri ahu rigota: ma le, emeghere elu-igwe nye Ya, O we hu Mọ nke Chineke ka Ọ nēfeda dika ndùrù, nēbekwasi kwa Ya; ma le, olu sitere n’elu-igwe, si, Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma.” 
Jisus biaruru Jọdan ewe me kwa Ya baptism site n’aka Jọn Baptist. “Mem baptism.” Jọn, nāsi kwa, “Ma ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism, Gì onwe-gi nābiakutekwam?” Ndi-isi-nchu-àjà nke elu-igwe na nke uwa zutere. 
Dika Ndi-Hibru si di, Jisus Kraist bu Onye-isi-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi dika usoro Melkizedek si di. O nweghi osuso-ọmumu. Ọ bughi nkpuru Eron, ma-ọbu madu ọ bula n’uwa. Ọ bu Ọkpara Chineke, Onye kère ayi. Ya mere, O nweghi usoro-ọmumu. Kama Ọ tufuru ebube nke elu-igwe we ridata n’uwa izọputa ndi nke Ya.
Ihe mere O ji ridata n’uwa nka bu ka ewe zọputa ndi-nmehie nile ndi huru ahuhu site n’aghughọ Setan. Tiyere nka, O bupuru nmehie nile nke uwa site n’ime Ya baptism site n’aka Jọn Baptist. “Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n’ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya”
“Kwerem ub͕u a.” Kwere ya! Jisus nye onye nānọchi anya madu nile ahu iwu we weda isi Ya ala. Na Testament Ochie, mb͕e achuworo Chineke àjà, ma-ọbu onye-nmehie ma-ọbu onye-isi-nchu-àjà bikwasiri aka-ya abua n’isi-ya we tukwasi nmehie nile. ‘Ibikwasi aka madu abua n’isi’ putara ‘itukwasi ihe.’
Emere Jisus baptism site n’aka Jọn Baptist. Ọ bu otù ihe dika ibikwasi-aka-n’isi na Testament Ochie. ‘Itukwasi ihe,’ ‘ílì ihe,’ ‘isa ihe,’ na ‘ichu àjà’ bu kwa otù ihe.. Testament Ọhu bu ezi-ihe ahu ma Testament Ochie bu onyinyo ya.
Mb͕e onye-nmehie bikwasiri aka-ya abua n’isi nwa-aturu na Testament Ochie, atukwasiri nmehie-ya na nwa-aturu ahu, nwa-aturu ahu we nwua kwa. Mb͕e nwa-aturu ahu nwuru, elìri ya. Nmehie nke onye bikwasiri aka-ya abua n’isi nwa-aturu ahu ka atukwasiri na nwa-aturu ahu ka nwa-aturu ahu we nwua n’ihi nmehie ahu! Mb͕e atukwasiworo nmehie nile na nwa-aturu ahu, onye wetara nwa-aturu ahu nso pù-kwa-ra inọ nēnweghi nmehie?
Ka ayi si na ichafọ a bu nmehie na igwe-okwu a, nwa-aturu ahu. Mb͕e m’nēbikwasi akam abua n’igwe-okwu a, nmehie nka ka atukwasiri n’igwe-okwu nka, nwa-aturu ahu. Chineke n’Onwe-ya zubere na ọ gādi otú a. “Bikwasi aka-gi abua n’isi.” Ka ewe b͕aputa na nmehie nile, madu kwesiri ibikwasi aka-ya abua n’isi. Mb͕e nka gasiri, ọ puru inọ nēnweghi nmehie. Baptism Jisus diri n’ihi isa, ílì, na itukwasi nmehie nile na Ya. Nka bu ihe ọ putara n’ezie.
 
Gini ka ọ putara imezu ezi omume nile?
Ọ bu isachapu nmehie nile site n’itukwasi nmehie nile na Jisus.
 
Ya mere mb͕e emere Jisus baptism ibupu nmehie nile nke uwa, àtukwasiri ha nile na Ya n’ezie? Atukwasiworo nmehie nile na Jisus we b͕aputa kwa ndi nile. Ọ bu otù ihe dika itukwasi nmehie nile n’àjà na Testament Ochie. Jisus biara n’uwa nka, na Jọdan, Ọ siri, “Kwerem ub͕u a: n’ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile” (Matiu 3:15).
Mb͕e ahu, Jọn mere Jisus baptism. Jisus gwara Jọn na ọ kwesiri ha imezu ezi omume nile site na baptism-Ya. ‘ezi omume nile’ putara ‘kachasi nma we kwesi kwa ekwesi.’ ‘otú a’ o kwesiri ka ha mezu ezi omume nile. Nka putara na o ziri ezi ka Jọn me Jisus baptism, na ka eme Jisus baptism site n’aka Jọn, ka ewe tukwasi nmehie nile nke uwa na Ya. 
Chineke nyere nb͕aputa n’ihi baptism Jisus, àjà-Ya n’Obe, na okwukwe-ayi. “Ndi nile nāhu ahuhu n’ihi nmehie ewe nēmekpa kwa ha aru n’ihi nmehie nile ha site n’aka ekwensu. Ya mere, ka ewe zọputa ha we ziga kwa ha n’Elu-igwe, gi, dika onye nānọchi anya madu na nkpuru Eron, kwesiri Imem baptism n’ihi ndi nile. Agēmem baptism site n’aka-gi. Mb͕e ahu agēmezu ọlu nb͕aputa” 
Mb͕e ahu o kwere. 
Ya mere Jọn mere Jisus baptism. O bikwasiri aka-ya abua n’isi Jisus we tukwasi nmehie nile nke uwa na Ya. Jisus bu Onye-nzọputa nke sachapuru nmehie nile ayi. Anāzọputa ayi site n’ikwere na nb͕aputa-Ya. Ì kwere?
Mb͕e emesiri Ya baptism, ọlu mbu Jisus nke putara ìhè nye ọra madu n’ije-ozi-Ya nile na Jọdan site n’aka abua nke onye nānọchi anya madu nile, O jeruru we nēkwusa kwa ozi ọma ahu rue arọ atọ na nkera nke arọ ebe nmehie nile nke uwa nọ kwa n’isi-Ya.
O siri nwanyi ahu ejidereri mb͕e ọ nākwa iko, “Mu onwem amaghi kwa gi ikpé.” Ọ pughi ima ya ikpé n’ihi na O būruri nmehie-ya nile nye Onwe-ya we nējeru nso inwu ọnwa n’elu Obe n’ihi ha. Mb͕e Ọ nēkpe ekpere n’ebe anākpọ Getsemane, O kpere ekpere ub͕ò atọ, nāriọ ka Nna ahu me ka iko ikpé ahu gabiga Ya, ma ngwa ngwa O wepuru obi na nka we si, “Ọ bughi dika Mu onwem nāchọ, kama dika Gi onwe-gi nāchọ” (Luk 22:42).
 
 
“Le! Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!” 
 
Ǹmehie ra aṅa ka Jisus bupuru?
Nmehie nile nke uwa
 
Jọn 1:29 nēkwu, ‘N’echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, “Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!”’ Jọn Baptist mere Jisus baptism. N’echi-ya, Jọn Baptist hu Jisus ka ọ nābiakute ya, o we tie nkpu, we b͕àra ndi ahu àmà. “Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!”
Ọkpara Chineke biara n’uwa nka we bupu kwa nmehie nile nke uwa. Jọn Baptist b͕ara àmà ọzọ. Na Jọn 1:35-36, ‘Ọzọ n’echi-ya Jọn guzoro, ya na madu abua nime ndi nēso uzọ-ya; o we le Jisus anya ka Ọ nējeghari, ọ si, “Le, Nwa-aturu Chineke!”‘
Nwa-aturu Chineke putara na Ọ bu ezi ihe ahu nke àjà Testament Ochie, nke nwuru n’ihi nmehie nile nke Israel. N’ihi mu na gi, Ọkpara Chineke, Onye kère ayi, ridatara n’uwa nka we bupu nmehie nile ayi; nmehie nile site n’òkìkè uwa rue ubọchi ọ gāgwu, site na nmehie nke mbu rue na ajọ omume nile, site na adighi-ike nile ayi rue na ihe-ita-uta ayi nile. Ọ b͕aputara ayi dum site na baptism-Ya na ọbara-Ya n’elu Obe. 
Jisus bupuru nmehie nile ayi we nye ayi nb͕aputa. Ì nāghọta nka? “Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa.”
Ihe ra ka arọ 2000 agasiwo. Ọ putara na ihe ra ka arọ 2000 agasiwo mb͕e Jisus biara n’uwa nka. Na arọ 30 A.D., Jisus bupuru nmehie nile nke uwa. Arọ 1 A.D bu arọ amuru Jisus. Ayi nākpọ oge ahu tutu Kraist B.C. Ya mere, ihe ra ka arọ 2000 agasiwo mb͕e Jisus biara n’uwa nka.
Na 30 A.D., emere Jisus baptism site n’aka Jọn Baptist. Ma n’echi-ya, Jọn tiri ndi nile ahu nkpu, “Le! Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!” “Le!” Ọ nāgwa ndi nile okwu ka ha kwere na Jisus, onye bupuru nmehie nile ha. Ọ nāb͕a àmà na Jisus bu Nwa-aturu Chineke, Onye nke zọputara ayi na nmehie nile ayi.
Jisus bupuru nmehie nile ayi we me ka agha-ayi n’ukpuru ebighi-ebi megide nmehie zue. Ayi enweghi nmehie ub͕u a n’ihi na Ọkpara Chineke bupuru nile ayi. Jọn Baptist b͕ara àmà na Jisus bupuru nmehie nile ayi, nmehie nile nke mu na gi. “Onye ahu biara ib͕a àmà, ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà, ka madu nile we site n’aka-ya kwere” (Jọn 1:17).
Ewezuga àmà Jọn, ayi gēsi aṅa pu imara na Jisus bupururi nmehie nile ayi? Bible nāgwa ayi okwu ọtutu mb͕e na Ọ nwuru ọnwu n’ihi ayi, ma n’oge nka, ọ bu nání Jọn Baptist onye b͕ara àmà na O bupuru nmehie nile ayi.
 
Ǹmehie ra aṅa bu nmehie nke uwa?
Nmehie nile nke ndi madu site na mbu rue ọgwugwu nke uwa
 
Ọtutu b͕ara àmà mb͕e Jisus nwusiri, ma nání Jọn b͕ara àmà mb͕e Ọ di ndu. N’ezie, ndi nēso uzọ Jisus b͕ara àmà nye nb͕aputa Jisus. Ha b͕ara àmà na Jisus bupuru nmehie nile ayi, na Ọ bu Onye-nzọputa-ayi.
Jisus bupuru nmehie uwa. Ub͕u a, ì ka ab͕aghi arọ 100, ọ̀ bughi ezi-okwu? Jisus bupuru nmehie nke uwa mb͕e Ọ b͕ara arọ 30. Ub͕u a, tule ihe-osise a.
 
Le! Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa
 
Ka ayi si na ọ di arọ 4000 tutu Jisus bia. Ma ọ kariwo arọ 2000 mb͕e Jisus biara. Ayi amaghi ogologo oge oleọ gādi, kama ọgwugwu gābiariri n’ezie. O we si, “Mu onwem bu Alfa ahu na Omega ahu, onye mbu na onye ikpé-azu, nmalite na ọgwugwu” (Nkpughe 22:13).
Ya mere agēnweriri ọgwugwu. Ayi nọ n’ebe anēgosi dika arọ 2024. Kraist bupuru nmehie nile ayi na 30 A.D., ọ bu kwa arọ 3 tutu Ọ nwua n’Obe.
“Le! Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa.” O bupuru nmehie nile nke uwa, nmehie nile nke mu na gi. Ihe ra ka arọ 2000 agasiwo mb͕e amusiri Jisus. Ayi nēbi ndu ub͕u a ihe ra ka arọ 2000 mb͕e Jisus bupusiri nmehie nile ayi. Ayi ka nēbi ndu we nēme kwa nmehie n’ubọchi na n’oge nka. Jisus bu Nwa-aturu Chineke nke bupuru nmehie nke uwa. Ayi nāmalite ibi n’uwa nka site n’oge amuru ayi.
Ayi nēme nmehie site n’oge amuru ayi, ma-ọbu ayi adighi-eme? —Ayi nēme.— Ka ayi tule ihe nile ahu. Malite n’ubọchi amuru ayi rue mb͕e ayi b͕ara arọ 10, àyi nēmehie, ma-ọbu ayi anaghi eme? —Ayi nēme.— Mb͕e ahu àtukwasiri nmehie nile ahu na Jisus ma-ọbughi? —Atukwasiri ha.— N’ihi na atukwasiri nmehie nile na Jisus, Ọ bu Onye-nzọputa-ayi. Ma-ọbughi-ya, Ọ gēsi aṅa pu ibu Onye-nzọputa-ayi? Atukwasiri nmehie nile na Jisus.
Malite n’arọ nke 11 rue nke 20, àyi nēmehie, ma-ọbu ayi anaghi eme? Ayi nēmehie n’obi-ayi ya na n’omume nile ayi. Ayi nēme nke-ọma na ya. Ezíwo ayi ka ayi ghara imehie, kama o diri ayi nfé ime ya.
Chineke nāgwa ayi na nmehie nile ndia ka atukwasiri na Jisus. Ọ mara ihe ayi bu, ya mere O buru uzọ bupu nmehie nile ndia.
Ma ogologo oge òle ka ayi nēbikari n’uwa nka? Ka ayi si ihe ra ka arọ 70. Ọ buru na ayi tiyere nmehie nile ayi mere n’oge arọ 70 ndia, ibu-ya gēsi aṅa di arọ́?. Ọ buru na ayi kpokọta ha nime ọtutu gwongworo ton 8, ma eleghi anya ayi gējedebe inwe ihe kari ibu-gwongworo 100. 
Ǹwa ichèputa n’èchìchè ọnu-ọgugu nmehie ayi gēme n’ogologo ndu ayi. Hà bu nmehie nile nke uwa, ma-ọbu ha abughi? Ha bu nmehie nile nke uwa. Ayi nēmehie malite n’ọmumu, rue arọ 10, 10 rue 20, 20 rue 30.... rue ubọchi ayi gānwu, kama nmehie nile ndia so na nmehie nile nke uwa nke atukwasiworo-ri na Jisus site na baptism-Ya.
 
 
Onye-nzọputa Madu, Jisus Kraist 
 
Ǹmehie ole ka Jisus bupuru?
Nmehie nile nke nna-nna ayi, nke ayi na nkpuru nile ayi, rue ọgwugwu uwa
 
Jisus nāgwa ayi na Ọ sachapuru nmehie dum ndia. N’ihi na Jisus apughi ime Onwe-ya baptism, Chineke zigara onye-ozi-Ya Jọn n’iru, onye nānọchi anya ndi madu nile ahu nke arọputaworo. ‘Agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike’ (Aisaia 9:6). Site n’Onwe-ya, site n’amam-ihe-Ya, site na ndum-ọdu-Ya, O zigara onye nānọchi anya ndi madu n’iru, n’Onwe-ya kwa, Ọkpara Chineke, biara n’anu-aru we bupu nmehie nile nke uwa site na baptism sitere n’aka Jọn Baptist. Ò bu nka abughi nzọputa di ebube?
Ọ di ebube, ò bughi ya? Ya mere, nání otù mb͕e, nání site n’ime baptism site n’aka Jọn Baptist, Ọ sachapuru nmehie nile nke ndi madu dum rue kwa ebe nile uwa sọturu we naputa kwa madu nile na nmehie site na ikpọgide n’obe. Ọ naputara ayi dum. Ché bayere ya. Nmehie-gi nile site n’arọ 20 rue 30, site n’arọ 30 rue 40, site n’arọ 40 rue 60, rue 70, rue 100, na nke umu-gi kwa. Ò hichapuru nmehie nile gi, ma-ọbu Ò meghi ya? E, O mere ya. Ọ bu Jisus Kraist, Onye-nzọputa nke ndi madu.
N’ihi na Jọn Baptist tukwasiri nmehie ayi na Jisus, n’ihi na Chineke zubereri ya otú a, apuru inaputa ayi site n’ikwere na Jisus. Mù na gi bu ndi-nmehie? Àtukwasiri nmehie nile ayi na Jisus ma-ọbughi? —Ayi abughi ndi-nmehie ọzọ, nmehie nile ayi ka atukwasiworo na Jisus.— 
Ònye puru ikwu na enwere nmehie n’uwa nka? Jisus bupuru nmehie nile nke uwa. Ọ mara na ayi gēmehie, we bupu kwa nmehie nile nke ọdi-n’iru. Ufọdu nime ayi ab͕afela arọ 50 ma ufọdu ebighi ọbuná nkera nke arọ ayi nile, kama ayi nēkwu okwu bayere ayi onwe-ayi, gunyere mu onwem, dika ayi gēbiworo ndu rue ebighi-ebi.
Enwere ọtutu nime ayi ra otú a ndi nēdu ndu aghara nile. Ka m’kọwa ya n’uzọ a. Gini bu nkera nke ogologo-ndu nke mayfly? Ọ bu ihe ra ka hour 12.
“Chi mo-o! Ezuterem nwoke di otú a ma-ọbu otú ahu o we kwufem flyswatter ọ fọduru ntàkiri ka etipiam rue n’ọnwu, ima-kwa-ra.” O biri-ri nání hour 12 ma ọ pughi ikwusi okwu. Ma ub͕u a ọ bu nkera nke ogologo-ndu ya.
Na hour 7 ma-ọbu 8 na anyasi, o gēzute ururuchi nke ndu-ya, ma n’oge nādighi anya, ọnwu. Ufọdu mayfly gālanari rue hour 20, ufọdu hour 21, ufọdu kwa nēbi rue arọ agadi nke hour 24. Ha puru ikwu okwu bayere ihe nile ha huru n’ogologo-ndu ha nile, ma ò si aṅa di n’anya ayi? Dika ayi nēbi ndu rue arọ 70, ma-ọbu arọ 80, ayi puru isi, “Emelam ihe-ọchi.” Ihe nile ha huru aputaghi ihe ọbula n’anya ayi.
Chineke nādi ebighi-ebi. Ọ nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi. Ọ nēzube nmalite na ọgwugwu. Dika Ọ nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi, Ọ nādi ndu n’ihe oge nke mb͕e ebighi-ebi. O nēle ayi anya site n’ọnọdu mb͕e ebighi-ebi-Ya.
Enwere otù mb͕e, O bupuru nmehie nile nke uwa, nwua n’Obe, we si, “Ọ gwuwo.” Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie n’ubọchi nke 3 we rigoro n’Elu-igwe. Ub͕u a Ọ nādi ndu rue mb͕e n’ebighi-ebi. Ub͕u a, Ọ nēledata onye ọ bula nime ayi anya.
Otù nwoke nāsi, “O, onye m’huru n’anya, emehiewom nke-uku. Ọbuná na ebiwom nání arọ 20, emehiewom nke-uku.” “Ebiwom ndu rue arọ 30 ma emehiewom ri nne. Ọ kari ri nne. Agēsi aṅa ma-ọli pu ib͕agharam?”
Ma Onye-nwe-ayi site na mb͕e n’ebighi-ebi-Ya gāsi, “Emelam ihe-ọchi. Ab͕aputaghm nmehie-gi nile nání rue ub͕u a, kama nmehie nile nke nna-nna-gi tutu amua gi, ma nmehie nile nke ọb͕ọ nke nkpuru-gi ndi nēbi mb͕e i inwusiri.” Ọ nāgwa gi nka site n’etiti oge mb͕e ebighi-ebi. Ì kwere nka? Kwere ya. Nata onyinye nzọputa enyeworo gi n’afọ-ofufo. We bà kwa n’ala-eze elu-igwe.
Ekwela n’èchìchè nile ayi, kama kwere n’okwu nile nke Chineke. ‘Ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile.’ Emezururi ezi omume nile site n’aka Nwa-aturu Chineke, onye bupuru nmehie nke uwa. Jisus bupuru nmehie nile nke uwa. Ò mere, ma-ọbu O meghi? O mere.
 
Gini ka Jisus kwuru n’ikpé-azu n’elu Obe?
“Ọ gwuwo.”
 
Jisus Kraist bupuru nmehie nile nke uwa, ewe ma Ya ikpé ọnwu n’ulo ikpé Pọntiọs Pailat, we kpọgide kwa Ya n’Obe.
“O we pua, nēbu Obe-Ya n’Onwe-ya, ga rue ebe anākpọ Ebe okpokoro-isi, nke anākpọ n’asusu Hibru Gọlgọta: ebe ha kpọgidere Ya n’Obe, Ya na ndikom abua ọzọ, otù n’akuku a otù n’akuku ọzọ, Jisus nọ kwa n’etiti ha. Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n’elu Obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU. Ya mere ọtutu n’etiti ndi-Ju guru ihe-ndekwasi ahu: n’ihi na ebe akpọgidere Jisus n’Obe di obodo Jerusalem nso: ede-kwa-ra ya n’asusu Hibru, n’asusu Latin, n’asusu Grik.” (Jọn 19:17-20). 
Ka ayi le anya na ihe mere mb͕e akpọgidesiri Ya n’Obe. “Mb͕e ihe a gasri, Jisus, ebe Ọ matara na ihe nile agwuwo ub͕u a, ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ we mezu.” O bururi nmehie nile dika ihe edeworo n’Akwukwọ Nsọ si di. Ọ si, ‘“Akpiri nākpọm nku.” Adọbara n’ebe ahu ite nke manya-vine b͕ara uka juru: ya mere ha were sponge nke manya-vine ahu b͕ara uka juru tukwasi n’elu osisi hyssop, che Ya n’ọnu. Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.”’ (Jọn 19:28-30).
Mb͕e Ọ narasiri manya-vine b͕ara uka, O si, “Ọ gwuwo!” we rube isi-Ya we rara mọ-Ya nye. Ọ nwuru n’ezie. Jisus Kraist biliri n’ọnwu n’ubọchi nke 3 we rigo n’elu-igwe. 
Ka ayi ché iru na Ndi-Hibru 10:1-9. “N’ihi na iwu ahu, ebe o nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apughi ime ka ndi nābiaru ha nso zue okè mb͕e ọ bula, site n’otù àjà ndia nke ha nēche n’iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile. N’ihi na ma ọ dighi otú a, àgaghi-echebìwori ha n’iru Chineke, n’ihi na ndi nēkpe ekpere, ebe emeworo ka ha di ọcha otù mb͕e, ha agaghi-enwe akọ-na-uche ọ bula nke nmehie di iche iche ọzọ? Ma nime àjà ndia ncheta nke nmehie di kwa-arọ. N’ihi na ọbara nke oke-ehi na nke ewu apughi iwepu nmehie. N’ihi nka mb͕e Ọ nābia n’uwa, Ọ si, Àjà na ihe echere n’iru Gi, I chọghi ha, Ma aru ka I kwadebere nyem; Àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, ha abughi ihe di Gi ezi nma: Mb͕e ahu ka M’siri, Le, abiawom (N’akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem) Ime ihe I nācho, Chineke. Mb͕e O buru uzọ kwu, si, Àjà na ihe echere n’iru Gi na àjà-nsuresi-ọku na àjà achuru bayere nmehie, I chọghi ha, ha abughi kwa ihe di Gi ezi nma (bú ihe anēche n’iru Chineke dika iwu si di), mb͕e ahu a Ọ siworo, Le, abiawom ime ihe I nāchọ. Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo.” 
 
 
Nb͕aputa Ebighi-ebi Ahu
 
Àyi gēsi aṅa b͕u nkpà nmehie nke kwa-ubọchi mb͕e ayi kweresiri na Jisus?
Site n’ikwezu na Jisus hichapururi nmehie dum site na Baptism-Ya
 
Iwu ahu bu onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia. Àjà nile nke Testament Ochie, nke aturu nile na ewu nile, kpughere ayi na Jisus Kraist gaje ibia we bupu nmehie nile ayi n’otù uzọ ahu ka ewe hichapu nmehie nile ayi. 
Ndi nile ahu nke Testament Ochie, Devid, Abraham, na ndi ọzọ, mara we kwere kwa n’isi ihe usoro-nchu-àjà ahu nye ha. O kpughere na Mesaia, Kraist (Kraist putara ‘Onye-nzọputa ahu’), gaje ibia n’otù ubọchi we sachapu kwa nmehie nile ha. Ha kwere na nb͕aputa-ha ewe zọputa-ha site n’okwukwe- ha.
Iwu ahu bu onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia. Ichu àjà nile n’ihi nmehie nile ha kwa-ubọchi, kwa-arọ, apughi ma-ọli ib͕aputachasi ha. Ya mere, Onye zuru ezu na Onye nādi rue mb͕e ebighi-ebi, Onye zuru okè, Ọkpara Chineke nke gaje ibia n’uwa. 
Jisus siri na Ọ biarari ime ihe Nna-Ya nāchọ dika edeworo ya n’akwukwọ nke edeworo bayere Ya. ‘Mb͕e ahu ka Ọ siworo, “Le, abiawom ime ihe I nāchọ.” Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo.’ Ab͕aputara ayi na nmehie nile ayi n’ihi na Jisus Kraist bupuru nmehie nile ayi dika edeworo na Testament Ochie, n’ihi na ayi kwe-kwa-ra na Ya.
Ka ayi gu Ndi-Hibru 10:10. “Ọ bu kwa n’ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n’iche aru Jisus Kraist n’iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e.” Ọ bu kwa n’ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n’iche aru Jisus Kraist n’iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e. Èdoworo ayi nsọ ma-ọbu edoghi-ayi? —Edowo ayi nsọ.—
Gini ka nka putara? Chineke Nna zigara Ọkpara-Ya we tukwasi nmehie nile ayi n’aru-Ya site na baptism we kpe Ya ikpé nání otù mb͕e n’Obe. Otú a, Ọ naputara ayi dum ndi nāhu ahuhu na nmehie. Ọ bu ihe Chineke nāchọ.
Ka ewe naputa ayi, Jisus churu Onwe-ya dika àjà, nání otù mb͕e, ka ewe pu ido ayi nsọ. Edoworo ayi nsọ. Jisus churu Onwe-ya ka àjà n’ihi nmehie nile ayi we nwua n’ihi ayi ka ewe ghara ikpe ayi ikpé.
Àjà ahu nke Testament Ochie ka achuru kwa-ubọchi n’ihi na nmehie nile nke ọhu chọrọ àjà ọzọ ka ewe sachapu-ha.
 
 

Isi Ime-mọ nke Jisus Isa Ukwu Pita

 
Na Jọn 13, enwere otù akukọ bayere Jisus isa ukwu Pita. Ọ sara ukwu Pita ka ewe gosi ya na Pita gēmehie n’ọdi-iru ka ewe zí kwa ya na Ọ b͕aputarari kwa nmehie nile ndi ahu. Jisus mara na Pita gēmehie ọzọ n’ọdi-iru, ya mere O tinye miri n’ihe anēji sa aru we sa ukwu-ya.
Pita nwara iju, ma Jisus we si, “Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri”(Jọn 13:7). Ihe ama-okwu a putara bu, ‘I gēmehie mb͕e ihe ndia gasiri. I gāgọnarim we mehie kwa ọzọ mb͕e M’sasiri nmehie-gi nile. I gēmehie ọbuná mb͕e Nrigom gasiri. Ya mere, M’nāsa ukwu-gi idu Setan ọdú ka ọ ghara inwa gi n’ihi na M’bupusiri ọbuná nmehie-gi nile nke n’ọdi-iru.’ 
Ì chere na Ọ sara ukwu Pita ka ewe gwa ayi na ayi kwesiri ichèghari kwa-ubọchi? É-è. Ọ buru na ayi kwesiri ichèghari kwa-ubọchi ka ewe b͕aputa ayi, Jisus agaghi ebupu nmehie nile ayi nání otù mb͕e. 
Ma Jisus siri na O doro ayi nsọ nání otù mb͕e. Ọ buru na ayi gēchèghari kwa-ubọchi, ayi kwesiri n’otù aka ahu ilaghachi n’oge Testament Ochie. Mb͕e ahu ònye puru ighọ onye ezi omume? Ònye ka apuru ib͕aputachasi? Ọbuná na ayi kwere na Chineke, ònye puru ibi ndu nēnweghi nmehie?
Ònye ka apuru ido nsọ site na nchèghari? Ayi nēmehie kwa-ubọchi nēwepughi aka, ya mere ayi gēsi aṅa pu iriọ ka ebupu nmehie ọ bula? Àyi gēsi aṅa ghọ di enweghi ihere na inye Ya nsob͕u kwa-ubọchi n’ihi nb͕aputa-ayi? O di nfé ayi ichefu nmehie nile ayi nke ututu n’ọgwugwu ubọchi, na nmehie nile nke anyasi n’ututu echi-ya. O bu ihe agaghi ekwe omume ayi ichègharisi na nmehie nile ayi.
Ya mere, emere Jisus baptism otù mb͕e we chua Onwe-ya dika àjà n’Obe otù mb͕e ka ayi we pu ighọ ndi edoworo nsọ nání otù mb͕e. Ì puru ighọta nka? Ab͕aputaworo ayi na nmehie nile ayi nání otù mb͕e. Anaghi ab͕aputa-ayi mb͕e ọ bula ayi nēchèghari.
 
Ènwere nmehie ọ bula ọzọ nke ayi aghaghi inye ekpere nile nke nchèghari?
Mba
 
Azọputaworo ayi na nmehie nile ayi site n’ikwere na Jisus bupuru nmehie nile ayi, nmehie nile gi, na nmehiem nile. 
“Onye-nchu-àjà ọ bula nēguzo kwa kwa-ubọchi nēfè òfùfè nēche kwa otù àjà ndia n’iru Chineke ọtutu mb͕e, bú àjà nke nāpughi ihichapu nmehie mb͕e ọ bula: ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n’iru Chineke n’ihi nmehie, O we nọdu n’aka-nri Chineke mb͕e nile; nēle anya n’oge fọduru rue mb͕e agēdo ndi-iro-Ya dika ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya abua. N’ihi na O sitewo n’iche Onwe-ya n’iru Chineke dika àjà otù mb͕e me ka ndi anēdo nsọ zue okè mb͕e nile. Mọ Nsọ nāb͕a-kwa-ra ayi àmà: n’ihi na mb͕e O kwuru, si, Nka bu Testament nke Mu na ha gāb͕a Mb͕e ubọchi ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru;’gētiye iwum n’obi-ha, Ọ bu kwa n’uche-ha ka M’gēdekwasi ha dika n’akwukwọ; mb͕e ahu Ọ si, M’gaghi-echeta kwa nmehie nile ha na nmebi-iwu nile ha ọzọ ma-ọli. Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n’iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ.” (Ndi-Hibru 10:11-18). 
Gini ka ọ putara, “Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di”? Na 10:18, ọ putara na nmehie n’onwe-ya, nmehie ọ bula, ka akwuworo ugwọ-ya rue mb͕e ebighi-ebi, nēnweghi nke arapuru. Chineke hichapuworo nmehie nile nke uwa. Ì kweyere nka? “Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n’iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ.”
Ka ayi chikọta ihe nile rue ub͕u a dika nka. Ọ buru na Jọn Baptist ebikwasighi aka-ya abua na Jisus, ya bu, ọ buru na o meghi Jisus baptism, àyi puru ibu ndi ab͕aputaworo? Ayi apughi ibu ndi ab͕apuatworo. Ka ayi che laghachi azu. Ọ buru na Jisus arọputaghi Jọn Baptist dika onye nānọchi anya ndi madu nile we bupu kwa nmehie nile ayi site n’aka-ya, Ọ̀ puworo isachapu nmehie nile ayi? Ọ pughi.
Iwu Chineke ziri ezi. O kwesiri ekwesi. Ọ pughi isi n’okwu-ọnu na Ọ bu Onye-nzọputa-ayi, na O bupu-kwa-ra nmehie nile ayi. O bupuru nmehie nile ayi n’ezie n’anu-aru. Gini mere Jisus, Chineke, ji biakute ayi n’anu-aru? Ọ mara nmehie dum nke ndi madu, nmehie nile di n’obi na nke aru, ka O we bupu nmehie nile nke ndi madu, Ya, bú Ọkpara Chineke, kwesiri ibiakute ayi n’anu-aru.
Ọ buru na emeghi Jisus baptism, nmehie nile ayi gābu ihe fọdurunu. Ọ buru na akpọgideworo Ya n’obe we ghara ibu uzọ bupu nmehie nile ayi, ọnwu Ya agaghi enwe isi. Ayi na ya agaghi enwe ihe nwekọ ọ bula. Ọ gaghi enwe isi ọ bula.
Ya mere, mb͕e Ọ malitere ije-ozi-Ya n’iru ọra n’arọ 30, Ọ jekuru Jọn Baptist na Jọdan ka ewe me Ya baptism. Ije-ozi Ya n’iru ọra malitere n’arọ 30 we zue n’arọ 33. Mb͕e Ọ b͕ara arọ 30, Ọ jekuru Jọn Baptist ka ewe me Ya baptism. “Kwerem ub͕u a, n’ihi na ọ kwesiri ayi ime otú a ka ewe pu izọputa ndi nile we ghọ kwa ndi ezi omume. Ọ bu ihe kwesiri ayi ime. Ub͕u a, Mem baptism.” E, emere Jisus Kraist baptism n’ihi nb͕aputa ndi nile.
N’ihi na emere Jisus baptism we bupu kwa nmehie nile ayi, n’ihi na atukwasiworo nmehie nile ayi n’aru-Ya site n’aka abua Jọn Baptist, Chineke Onwe-ya wepuru anya Ya mb͕e Jisus nēkubì ume n’Obe. Ọbuná na Jisus bu Ọkpara Ọ muru nání Ya, O kwesiri ikwe ka Ọkpara-Ya nwua. 
Chineke bu ihu-n’anya, kama O kwesiri ikwe ka Ọkpara Ya nwua. Ya mere, rue hour atọ, enwere ọchichiri n’ala dum. Jisus were oké olu tie nkpu tutu Ọ kubìe, “Eli, Eli, lama sabachthani” ya bu, “Chinekem, Chinekem, gini mere I ji rapu nání Mu?” (Matiu 27:46). Jisus tukwasiri nmehie nile ayi n’ ùbú abua-Ya we nata kwa ikpé n’ọnọdu ayi n’Obe. Otú a, Ọ zọputara ayi. Ewepu baptism Jisus, Ọnwu Ya agaghi enwe isi.
 
Ìbu onye-nmehie ma-ọbu onye ezi omume?
Onye ezi omume nke nēnweghi nmehie ọ bula n’obim
 
Ọ buru na Jisus nwuru n’Obe nēbupughi nmehie nile ayi, ma emeghi Ya baptism, Ọnwu-Ya agaghi emezu nb͕aputa ahu. Ka ewe zọputa ayi, emere Jisus baptism site n’aka Jọn, onye nānọchi anya madu nile, we nata kwa ikpé n’Obe ka ewe pu izọputa ndi nile kwere na Ya.
Ya mere, site n’ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a, emewo ala-eze elu-igwe ihe-ike. N’ihi na Jọn Baptist tukwasiri nmehie nile nke uwa na Jisus, apuru ikpuchi nmehie nile nke mu na gi. Ya mere, mu na gi puru ikpọ Chineke Nna-ayi ub͕u a we jiri nkwuwa-okwu bà n’ala-eze elu-igwe.
Na Ndi-Hibru 10:18, “Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n’iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ.” Ùnu dum ka bu ndi-nmehie? Ub͕u a Jisus kwuru ugwọ-gi nile, ùnu ka kwesiri ikwu ugwọ nile?
Enwere otù nwoke oké iṅu manya mere ka ọ nọrọ n’ugwọ n’aka ndi nke nēbinye madu ihe. Mb͕e ahu, otù ubọchi, nwa-ya nwoke buru ọgaranya we kwua ugwọ nna-ya dum, we kwua kwa ego rriri nne n’iru. Nna-ya agaghi eji ugwọ ọzọ ọbuná otu o si ṅu manya. 
Nka bu ihe Jisus mere ayi. Ọ kwuru kari ihe zuru okè n’ọdi-iru n’ihi nmehie nile ayi. Ọ bughi nání nmehie nile nke ogologo ndu-ayi, kama nmehie nile nke uwa. Atukwasiworo ha nile n’aru Jisus mb͕e emere Ya baptism. Ya mere ùnu ka bu ndi-nmehie ub͕u a? É-è, unu abughi.
Ọ buru na ayi mara ozi ọma nke nb͕aputa a site na mbu, ọ gara-abu ihe di nfé ayi ikwere na Jisus. Ma dika o si di, ọ nāda udà dika ihe ọhu nēme ka ọtutu ndi nwe obi abua n’ihi ya. 
Ma nka abughi ihe ọhu. Ọ diworo site na mbu. Ayi amaghi ya tutu. Edekọrọ ozi ọma nke miri ahu na Mọ Nsọ mb͕e nile n’Akwukwọ Nsọ ọ diwo-kwa-ra ire mb͕e nile. Ọ di ebe ahu oge nile. Ọ di n’ebe tutu amua mu na gi. Ọ diworo ebe a site n’òkìkè uwa.
 
 
Ozi ọma Ahu nke Nb͕aputa Ebighi-ebi 
 
Gini ka ayi kwesiri ime n’iru Chineke?
Ayi aghaghi ikwere ozi ọma nke nb͕aputa ebighi-ebi.
 
Jisus Kraist, onye sachapuru nmehie nile ayi nye ayi, mere ya tutu amua mu na gi. O bupuru ha nile. Ì ka nwere nmehie? —É-è— Mb͕e ahu òle bayere nmehie nile i gēme echi? Ha nile so kwa na nmehie nile nke uwa.
Ka ayi wepu nsob͕u mke nmehie nile nke echi. Nmehie nke ayi mere rue ub͕u a so kwa na nmehie nile nke uwa, hà esoghi ya? Àtukwasiworo ha n’aru Jisus ma-ọbughi? E, atukwasiworo ha.
Mb͕e ahu àtukwasi kwa-ra nmehie nile nke echi n’aru-Ya? E, O būru ha nile, nēwezugaghi. O rapughi ọbuná otù nmehie. Ozi ọma ahu nāgwa ayi ka ayi kwere nēnweghi obi abua na Jisus bupuru nmehie nile ayi, nání otù mb͕e, we kwua kwa ugwọ ha dum.
‘Nmalite ozi ọma jisus Kraist, Ọkpara Chineke’ (Mak 1:1). Ozi ọma elu-igwe bu ozi ọṅù. Ọ nāju ayi, “M’bupuru nmehie nile unu. Abum Onye-nzọputa unu. Ùnu kwere na Mu?” N’etiti ndi nāpughi iguta ọnu, nání ole-na-ole nāza, “E, m’kwere. M’kwere dika isi gwa ayi okwu. O di nfé ya mere m’puru ighọta ya ngwa ngwa.” Ndi kwuputara nka nāghọ ndi ezi omume dika Abraham.
Ma ndi ọzọ nāsi, “Apughm ikweyere ya. Ọ nāda udà ka ihe ọhu ọ we di kari ka ihe madu nāhughi mb͕e ọ bula nyem.” 
Mbe ahu O nāju, “Nání gwam okwu, Èbupurum nmehie gi nile ma-ọbughi?” 
“Ezíworom na I bupuru nání nmehie mbu, ma ọ bughi nmehiem nile nke kwa-ubọchi.” 
“Ahurum na i makariri ihe ri nne ikweye dika M’si gwa gi. N’ihi na enweghm ihe ọ bula m’gāsi gi, I ghaghi iga n’ọku-ala-mọ.” 
Azọputawo ayi site n’ikwere na nb͕aputa-Ya zuru okè. Ndi nile nke nārugide na ha nwere nmehie aghaghi iga n’ọku-ala-mọ. Ọ bu ihe ha rọputara onwe-ha.
Ozi ọma nke nb͕aputa nāmalite na àmà Jọn Baptist. N’ihi na Jisus sachapuru nmehie nile ayi site na ime Ya baptism site n’aka Jọn Baptist, ayi ga bu ndi edoworo nsọ mb͕e ayi kwere.
Onye-ozi Pọl kwuru ọtutu okwu bayere baptism Jisus na Akwukwọ-ozi-ya nile. Na Ndi Galetia 3:27, “N’ihi na ka unu ra, bú ndi emere baptism ibà nime Kraist, unu yikwasiri Kraist.” Ime baptism ibà nime Kraist putara na ayi nọ nime Kraist. Mb͕e emere Jisus baptism, atukwasiri nmehie nile ayi n’aru-Ya site n’aka Jọn Baptist, ewe sachapu kwa nmehie nile ayi.
Na I. Pita 3:21, “Bú miri ahu nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n’uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ, site na nbilite-n’ọnwu nke Jisus Kraist.” 
Nání ndi nke kwere na àmà nke Jọn Baptist, baptism Jisus ahu, na ọbara ahu n’Obe, nwere amara nb͕aputa si nime onwe-ha.
Naranu baptism Jisus n’obi-unu, ihe-atù nke nzọputa, agāzọputa kwa unu.
 
Okwuchukwu a dịkwa n`ụdị ebook. Pịa na mkpuchi akwụkwọ n`okpuru.
ÀMUWO GI ỌZỌ N’EZIE SITE NA MIRI NA MỌ NSỌ? [Nbiputa Ntughari Ọhu]