• All e-books and audiobooks on The New Life Mission website are free
  • Explore multilingual sermons in global languages
  • Two new revised editions in English have been released
  • Check out our website translated into 27 languages
Search

Sermons

Isi-okwu 3 : Ozi Ọma Miri ahu na Mọ Nsọ

[3-3] Jisus Kraist Were Miri, Ọbara, na Mọ Nsọ Bia (I Jọn 5:1-12)

Jisus Kraist Were Miri, Ọbara, na Mọ Nsọ Bia (I Jọn 5:1-12)(I Jọn 5:1-12)

“Onye ọ bula nke kwere na Jisus bu Kraist ahu, amuwo ya site na Chineke: ọzọ onye ọ bula nke nāhu Onye ahu Nke muru n’anya, ọ nāhu kwa onye ahu nke amuworo site na Ya n’anya. Nime nka ka ayi mara na ayi nāhu umu Chineke n’anya, mb͕e ọ bula ayi nāhu Chineke n’anya, me kwa ihe nile O nyere n’iwu. N’ihi na nka bu ihu-n’anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adighi kwa arọ́. N’ihi na ihe ọ bula nke amuworo site na Chineke nēmeri uwa: nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi. Ma ònye bu onye nēmeri uwa, ma-ọbughi onye ahu nke kwere na Jisus bu Ọkpara Chineke? Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist; ọ bughi nání nime miri ahu, kama ọ bu nime miri ahu na nime ọbara ahu. Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāb͕a àmà, n’ihi na Mọ ahu bu ezi-okwu. N’ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu. Ọ buru na ayi anata àmà nke madu, àmà nke Chineke ka ya uku: n’ihi na àmà nke Chineke bu nka, na Ọ b͕awo àmà bayere Ọkpara-Ya. Onye kwere n’Ọkpara Chineke nwere àmà ahu nime ya: onye nēkweghi okwu Chineke emewo Ya onye-ugha; n’ihi na o kweghi n’àmà ahu nke Chineke b͕aworo bayere Ọkpara-Ya. Àmà ahu bu nka, na Chineke nyere ayi ndu ebighi-ebi, ndu ahu di nime Ọkpara-Ya. Onye nwere Ọkpara ahu nwere ndu ahu; onye nēnweghi Ọkpara Chineke enweghi ndu ahu.” 
 
 
Gini bu ihe Jisus were bia?
Miri, ọbara, na Mọ Nsọ
 
Jìsus were miri bia? E, Ọ were ya bia. Ọ were baptism-Ya bia. Miri ahu bu baptism Jisus nke sitere n’aka Jọn Baptist n’Osimiri Jọdan. Ọ bu baptism nb͕aputa nke O ji bupu nmehie nile nke uwa. 
Jisus were ọbara bia? E, Ọ were ya bia. Ọ biara n’anu-aru madu ewe me kwa Ya baptism ibupu nmehie nile nke uwa, mb͕e ahu we kwua ugwọ nmehie site n’iwusì ọbara n’Obe. Jisus were ọbara bia.
Jìsus were Mọ Nsọ bia? E, Ọ were ya bia. Jisus bu Chineke, kama Ọ biara dika Mọ Nsọ n’anu-aru ibu Onye-nzọputa ndi-nmehie.
Ọtutu madu adighi-ekweye na Jisus were miri, ọbara na Mọ Nsọ bia. Nání ufọdu kweyere na Jisus bu Eze kachasi ndi-eze nile n’ezie na Chineke kachasi chi nile. Ọra madu ka nēnwe obi abua, ‘Jìsus bu Ọkpara Chineke n’ezie ma-ọbu Ọkpara Madu?’ Ọtutu kwa, gunyere ndi-ọ̀kà-nmuta-okpukpe na ndi-ozi, kwere na Jisus dika madu kari dika Chineke, Onye-nzọputa, na Onye zuru okè.
Ma Chineke siri na onye ọ bula nke nēkwere na Jisus bu Eze kachasi ndi-eze nile, ezi Chineke, na ezi Onye-nzọputa agāmu ya site na Ya. Ndi huru Chineke n’anya huru Jisus n’anya, ndi nke kwe-kwa-ra na Chineke n’ezie huru Jisus n’anya n’otù aka ahu. 
Madu apughi imeri uwa. Onye-ozi Jọn gwara ayi na nání ezi ndi-Kristian puru imeri uwa. Ihe mere ndi kwesiri ntukwasi obi ji emeri uwa bu n’ihi na ha nwere okwukwe na miri ahu, ọbara ahu, na Mọ Jisus. Ike eji emeri uwa apughi iputa site n’ihe madu nāchọ, inwa ime ihe, ma-ọbu oké agu.
“Asi na ejim asusu di iche iche nke madu na nke ndi-mọ-ozi nēkwu okwu, ma enweghi m ihu-n’anya, aghọwom ọla nāra ara, ma-ọbu ájà ọla nāda udà. Asi kwa na enwerem onyinye ibu-amuma, mata kwa ihe-omimi nile na ihe-ọmuma nile; asi kwa na enwerem okwukwe nile, nke mere m’gēnwe ike ibubiga ugwu, ma enweghi m ihu-n’anya, abughm ihe ọ bula. Asi kwa na ewerem ihe nile m’nwere zùa ndi-ob͕eye, asi kwa na araram arum nye ka ewe rem ọku, ma enweghm ihu-n’anya, ọ baghm urù ọ bula” (I. Ndi Kọrint 13:1-3). ‘Ihu-n’anya’ ekwuru bayere ya n’ebe a putara na Jisus, onye were miri, ọbara na Mọ Nsọ bia.
 
 
Nání Onye Nke Kwere na Miri ahu na Ọbara ahu Puru Imeri Uwa
 
Ònye puru imeri uwa?
Ndi nke kwere na nb͕aputa nke baptism Jisus, nke ọbara Ya na nke Mọ Nsọ
 
“Ma ònye bu onye nēmeri uwa, ma-ọbughi onye ahu nke kwere na Jisus bu Ọkpara Chineke? Nka bu Onye ahu Nke were miri na ọbara bia, bú Jisus Kraist.”
Ndi-Kristian ibem, Onye ahu nke meriri uwa, onye meriri Setan bu Jisus Kraist. Onye nke kwere n’okwu nke miri ahu, ọbara ahu na Mọ ahu nke Jisus gēmeri uwa. Jisus si aṅa merie uwa? Site na nb͕aputa nke miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu.
Na Bible, ‘miri’ putara ‘baptism Jisus’ (I. Pita 3:21). Jisus biara n’uwa nka n’anu-aru. Ọ biara izọputa ndi-nmehie nke uwa; emere Ya baptism ibupu nmehie nile nke ndi-nmehie dum nke uwa O we nwua kwa n’Obe ikpuchi nmehie ndia nile. 
Ọbara ahu n’Obe nēgosi ezi-okwu ahu bú na Ọ biara n’uwa nka site n’anu-aru madu. Ọ biara n’oyiyi anu-aru nke madu izọputa ndi-nmehie ewe were miri me kwa Ya baptism. Ya mere, Jisus were miri na ọbara ha abua biakute ayi. Ya bu, O bupuru nmehie nile nke uwa site na miri ahu nke baptism-Ya na ọbara ahu nke ọnwu-Ya.
Setan si aṅa achi uwa? Setan mere ka ndi madu nwe obi abua n’Okwu Chineke we kunye nkpuru nke aṅaghi-nti n’obi-ha. Ya bu, Setan mere ka ndi madu ghọ ndi nējere ya ozi site n’iduhie ha nime aṅaghi nti n’Okwu Chineke. 
Otú ọ di, Jisus biara n’uwa nka we hichapu nmehie nile nke ndi nile site na miri ahu nke baptism Ya na ọbara Ya n’Obe: O meriri Setan we hichapu kwa nmehie nile nke uwa. 
Ihe a mere n’ihi na Jisus Kraist bu Onye-nzọputa ndi-nmehie. Ọ ghọrọ Onye-nzọputa-ayi n’ihi na O were miri na ọbara bia.
 
 

Jisus Bupuru Nmehie Nile Nke Uwa site na Baptism-Ya nke Nb͕aputa

 
Gini bu ihe ọ putara na Jisus nēmeri uwa?
Ọ putara na O bupuru nmehie nile nke uwa.
 
N’ihi na emere Jisus baptism ibupu nmehie nile nke uwa we nwua kwa ikpuchi ha, Ọ puru inaputa ayi na nmehie nile. N’ihi na emere Jisus baptism n’Osimiri Jọdan site n’aka Jọn Baptist, onye nānọchi anya madu nile, atukwasiri nmehie nile nke uwa na Ya. O we nye kwa ndu-Ya n’Obe n’ihi ugwọ-ọlu nke nmehie. N’ihi na Ọ nwuru ewe me me kwa ka O si na ndi nwuru anwu bilie, O meriri ike Setan. Ọ kwuru ugwọ-ọlu nke nmehie site n’ọnwu Ya.
 
 

Jisus Biakutere Ndi-nmehie site na Miri ahu nke Baptism-Ya na Ọbara ahu n’Obe 

 
Onye-ozi Jọn siri na nb͕aputa esiteghi nání na miri, kama site na miri na ọbara. Ya mere, dika Jisus kwesiri itukwasi nmehie nile we hichapu nmehie nile ayi rue mb͕e ebighi-ebi, agāzọputa ndi-nmehie nile na nmehie site n’ikwere na Ya, we nēkwesi kwa ntukwasi obi n’Okwu-Ya nile.
 
Ò si aṅa merie ike nke Setan?
Site na baptism Ya, ọbara ahu na Mọ ahu
 
Mb͕e Jisus ridatara n’uwa, O bupuru nmehie nile nke uwa. O bupuru nmehie nile ayi site na baptism-Ya na Jọdan we kwua kwa ugwọ-ọlu nke nmehie ndia ahu nile n’Obe; Ọ kwuru ugwọ nke nmehie nile ayi site n’ọnwu Ya. Amuma nke iwu Chineke ziri ezi nke nāsi na ‘ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu’ (Ndi Rom 6:23) ka emezuworo.
Gini bu ihe Jisus nēkwu site n’imeri uwa? Okwukwe nke nēmeri uwa bu okwukwe nke ozi ọma nke nb͕aputa, nke Jisus wetara ayi site na miri na ọbara. Ọ biara n’udi anu-aru we b͕ara nzọputa àmà site na baptism nke miri Ya na ọnwu Ya n’Obe.
Jisus meriri uwa, ya bu Setan. Ndi nēso uzọ-Ya nke nzukọ Krasit mbu guzosiri ike ọbuná n’iru oké nkpab͕u we ghara kwa ido onwe-ha n’okpuru Ala-eze ndi-Rom ma-ọbu n’ọnwunwa nile nke uwa nka.
Nka bu ihe okwukwe-ha na Jisus were miri bia (emere Ya baptism ibupu nmehie nile ayi), na site na ọbara Ya n’Obe (Ọ kwuru ugwọ-ọlu nke nmehie nile site n’ọnwu Ya) nwetara.
Jisus were Mọ Nsọ bia (Ọ biara n’anu-aru nke madu), O bupu nmehie nile nke ndi-nmehie site na baptism-Ya na ọbara-Ya n’Obe ka ayi nile ndi agaje ib͕aputa we pu imeri uwa.
 
 
Bú Miri nke Nāzọputa kwa Unu Ub͕u a N’uzọ Yiri Ihe-atù a, Ya Bu Baptism, site na Nbilite-n’ọnwu nke Jisus Kraist (I. Pita 3:21) 
 
Gini bu ihe-atù nke nzọputa?
Baptism Jisus
 
O we si na I. Pita 3:21, “Bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n’uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ, site na nbilite-n’ọnwu nke Jisus Kraist.” Onye-ozi Pita b͕ara àmà na Jisus bu Onye-nzọputa na O were miri ahu nke baptism na ọbara bia.
N’ihi ya, ayi kwesiri ikwere na Jisus onye were miri na ọbara bia. Ayi kwesi-kwa-ra imara na miri ahu nke baptism Jisus bu ihe-atù nke nzọputa ayi. Onye-ozi Pita siri ayi na ‘miri’ ahu nke baptism, ‘ọbara’ ahu, na ‘Mọ ahu’ bu ‘ihe nile zuru okè’ nime nb͕aputa.
O nweghi onye ọ bula nime ndi nēso uzọ-Ya nke kwere nání na ọbara n’Obe we wepu baptsim nke Jisus. Ikwere nání na ọbara ahu bu inwe nkera nke ezi okwukwe ahu. Okwukwe nke dabere na nkera ma-ọbu ezi-okwu nēzughi okè nāju oyi dika oge nāgafe. Ma okwukwe nke ndi kwere na ozi ọma nke miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu nētosi ike kari dika oge nāgafe. 
Otú ọ di, olu nke ozi ọma nke nání ọbara nādasi ike kari n’uwa n’ubọchi ndia. Gini mere o ji di otú a? Ndi madu amaghi Okwu nke ezi-okwu ahu, nb͕aputa ahu sitere na miri ahu na Mọ Nsọ; ya mere apughi imu ha ọzọ.
N’otù mb͕e, nzukọ Kraist nile nke ndi-Ọdida-anyanwu dabara nime okwukwe-ugha. Ha di ka ha nēme nke-ọma nwa mb͕e ntà, ma ndi nējere Setan ozi we nye aka ime okwukwe ahu ka ọ buru okwukwe-ugha. 
Okwukwe-ugha bu ikwere na ekwensu gāb͕apu ma ọ buru madu se Obe n’iberibe akwukwọ ma-ọbu jiri osisi me ya, na agāchupu Setan ma ọ buru madu kwere n’ọbara Jisus. Site na ihe ndia na okwukwe-ugha nile ndi ọzọ, Setan duhiere ndi nile n’ikwere na ha kwesiri ikwere nání n’ọbara Jisus. Setan nēme ka ọ nātu ọbara ahu ujọ, nāsi na Jisus wusìri ọbara n’ihi ndi-nmehie.
Otú ọ di, Pita na ndi nēso uzọ-Ya ndi ọzọ b͕ara ezi ozi ọma nke baptism Jisus na ọbara n’Obe àmà. Otú ọ di, gini ka ndi-Kristian n’ubọchi nile ndia nāb͕ara àmà? Ha b͕ara nání ọbara Jisus àmà. 
Ma, ayi kwesiri ikwere na okwu nile edeworo na Bible we nwe okwukwe na nzọputa Mọ Nsọ, na nke baptism Jisus, na nke ọbara ahu. Ọ buru na ayi nēlefu baptism Jisus anya we nāb͕ara kwa nání ezi-okwu ahu na Jisus nwuru n’ihi ayi n’Obe àmà, nzọputa apughi izu okè.
 
 
‘Okwu Àmà’ ahu nye Nzọputa nke Chineke 
 
Gini bu ihe-àmà ahu na Chineke zọputara-ayi?
Miri ahu, ọbara ahu,na Mọ ahu
 
Na I. Jọn 5:8, Onye-nwe-ayi nāsi, “Ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ.” Nke mbu bu Mọ ahu, nke abua bu miri ahu nke baptism Jisus, nke atọ bu kwa ọbara ahu n’Obe. Ha atọ dum dika otù ihe. Jisus biara n’uwa a izọputa ayi dum na nmehie nile ndia. Nání Ya mere ihe a site na ihe atọ, Baptism ahu, Ọbara ahu, na Mọ ahu.
“Ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ.” Ndi ahu di atọ nke nāb͕a àmà na Chineke zọputara ayi. Ihe atọ nke àmà ahu bu miri ahu nke baptism Jisus, ọbara ahu, na Mọ Nsọ. Ihe atọ ndia bu ihe Jisus mere n’ihi ayi n’uwa nka.
Ọ buru na agēwepu otù nime ihe atọ a, nzọputa agaghi ezu okè. Ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ: Mọ ahu, miri ahu, na ọbara ahu. 
Jisus Kraist onye biakutere ayi n’anu-aru bu Chineke, Mọ Nsọ, na Ọkpara ahu. O ridatara n’uwa nka dika Mọ Nsọ n’anu-aru nke madu ewe me kwa Ya baptism nime miri ahu ibupu nmehie nile nke uwa. O būru nmehie nile ayi n’anu-aru-Ya we zọputa-ayi bú ndi-nmehie site n’iwusi ọbara rue n’ọnwu n’Obe. Ọ we kwucha ugwọ nmehie nile. Ọ bu ozi ọma nke nb͕aputa zuru okè sitere na miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu.
Ọbuná ma ọ buru na ewepu nání otù nime ihe ndia, Ọ gābu iju nzọputa Chineke nke zọputaworo ayi na nmehie nile. Otù ọ di, ta, ọtutu ndi kwere ekwe nāb͕a àmà we kwere kwa nání n’Ozi ọma ọbara ahu na Mọ Nsọ.
Ma Onye-ozi Jọn siri na ihe ahu ndi b͕ara àmà di atọ: miri ahu nke baptism Jisus, ọbara n’Obe, na Mọ Nsọ. Onye-ozi Jọn doziri àmà ya.
Okwukwe nke nāb͕aputa onye-nmehie bu okwukwe nke Mọ ahu, miri ahu, na ọbara ahu. N’ebe ka okwukwe nke nēnye madu ike imeri uwa nọ? Ọ nọ ebe a. Ọ bu ikwere na Jisus onye were miri, ọbara, na Mọ Nsọ bia. Kwere na nka we nara kwa nzọputa na ndu ebighi-ebi.
 
Nzọputa Chineke ò zuru okè ma ewepu baptism Jisus?
É-è
 
Ogologo oge gara aga, tutu amuam ọzọ, mu onwem kwa, bu onye-Kristian onye kwere nání n’ọbara n’Obe ahu na Mọ Nsọ. M’kweyere na O ridatara dika Mọ Nsọ we nwua n’ihim n’Obe we zọputam na nmehie nile. M’kwere nání na ihe ndia di abua we nwe anya-ike ikwusa ha nye ndi nile.
M’zubereri igu nkà-mmụta-okpukpe ighọ onye ozi-ala-ọzọ ka m’we lu ọlu we nwua kwa n’ihi nkpuru-obi dika Jisus meworo. M’zubereri ọtutu ihe di oké uku. 
Ma, dika m’nāga n’iru ikwere na nání n’ihe abua ahu, nmehie nānọgide n’obim mb͕e nile. N’ihi ya, apughm imeri uwa. Apughi ime ka m’si na nmehiem pua. Mb͕e m’kwere nání na ọbara ahu na Mọ Nsọ, m’ka nwere nmehie n’obim.
Ihe mere m’ji ka nwe nmehie n’obim ọbuná na m’kwere na Jisus bu n’ihi na amaghm bayere miri ahu, bú baptism Jisus. Nnaputam ezughi okè rue mb͕e ab͕aputaram site okwukwe na miri ahu nke baptism, ọbara ahu, na Mọ ahu. 
Ihe mere enweghm ike imeri nmehie nke anu-aru bu n’ihi na amaghm isi baptism Jisus. Ọbuná ub͕u a ọtutu ndi kwere na Jisus ma nēme kwa ọtutu nmehie nke anu-aru. Ha ka nwere nmehie n’obi-ha we nānwa ihe nile itute ihu-n’anya mbu ha nwere nye Jisus. 
Ha apughi itute oké ọchichọ obi-ire-ọku mbu ha n’ihi na asapughi ha ma-ọli na nmehie nile ha site na miri ahu. N’ihi na ha amataghi na atukwasiworo nmehie nile ha na Jisus mb͕e emere Ya baptism, ha apughi kwa ime ka okwukwe-ha di ndu ọzọ mb͕e ọ dasiri.
M’nāchọ ime ka nka di ọcha nye unu dum. Ayi puru idi ndu site n’okwukwe we merie kwa uwa mb͕e ayi kwere na Jisus. Ọbuná na ayi ezughi okè, ọbuná nmehie ra aṅa ayi nēme n’uwa nka, ka oge ahu ra mb͕e ayi nēkwere na Jisus dika Onye-nzọputa-ayi onye mere ka ayi si n’orù nmehie pua site na baptism-Ya, ayi puru iguzo dika ndi-nmeri.
Otú ọ di, ọ buru na ayi kwere na Jisus ma wezuga miri ahu nke baptism, apughi izọputachasi ayi. Onye-ozi Jọn gwara ayi na okwukwe nke nēmeri uwa bu okwukwe nime Jisus Kraist onye were miri ahu nke baptism, ọbara ahu na Mọ Nsọ bia. 
Chineke zigara ayi Ọkpara Ọ muru nání Ya ib͕aputa ndi nke kwere na Baptism na ọbara-Ya. Jisus bupuru nmehie nile ayi site na baptism Ya. Jisus, Ọkpara Chineke muru nání Ya, biakutere ayi na Mọ Nsọ (n’anu-aru nke madu). O we wusì kwa ọbara n’Obe ikwu ugwọ-ọlu nke nmehie. Otú a Jisus naputara madu nile na nmehie.
Okwukwe ahu nke nēduru ayi imeri uwa nābia site n’ikwere n’ezi-okwu na Jisus biakutere ayi site na miri, ọbara, na Mọ Nsọ we me ka ayi pusia n’orù nmehie nile.
Ọ bururi na enweghi miri ahu nke baptism na ọbara ahu n’Obe, agaghi enwe ezi nzọputa. Ewepu otù ma-ọbu nke ọzọ, ayi apughi inwe ezi nzọputa. Apughi inweta ezi nzọputa ma ewepu miri ahu na ọbara ahu na Mọ ahu. Ya mere, ayi kwesiri ikwere na miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu. Mara nka i ga enwe kwa ezi okwukwe.
 
 
Asim Gi Na Ọ Bughi Ezi Nzọputa ma Ewezuga Àmà nke Miri ahu, Ọbara ahu, na MỌ ahu 
 
Gini bu ndi ahu di nkpà ndi di atọ nke b͕ara nzọputa àmà?
Miri ahu, obara ahu, na Mọ ahu
 
Madu puru iche bayere ajuju ahu di n’elu dika nka: “Jisus bu Onye-nzọputam. Ekwerem na ọbara n’Obe m’nāchọ kwa inwu dika onye eji oké nkpab͕u b͕ue. Ekwerem na Jisus ọbuná na enwerem nmehie n’obim. M’chègharisiri ike we lusie ọlu ike ime omume di nma, nke ziri ezi na omume inye-aka kwa-ubọchi. Enyeworom ndum na ihem nile nke uwa n’ihi Gi. Alughm ọbuná di ma-ọbu nwunyi. Chineke gēsi aṅa pu ighara imaram? Jisus nwuru n’Obe n’ihim. Chineke-ayi di Nsọ ridatara dika madu we nwua kwa n’ihi ayi n’Obe. Ekwerem na Gi, churu Gi àjà, we luru Gi ọlum kwesiri ntukwasi-obi. Ọbuná na ezughm okè we nwe kwa ufọdu nmehie n’obim, Jìsus gēzigam n’ọku-ala-mọ n’ihi nka ahu? É-è, Ọ gaghi.” 
Enwere ọtutu ndi di otú a. Ha bu ndi nēkweyeghi na emere Jisus baptism ibupu nmehie nile nke uwa. Mb͕e ndia ndi kwere na Jisus we ka nwe nmehie, òle ebe ha gāga? Ha gāga n’ọku-ala-mọ. Ha bu ndi-nmehie!
Ha, ndi nēchè dika o si di ha ezi nma we were ya na Chineke aghaghi iche kwa otú a, gāga n’ọku-ala-mọ. Ọzọ, ufọdu nāsi na n’ihi na Jisus bupuru nmehie nile mb͕e O nwuru n’Obe, enweghi nmehie n’uwa. Otú ọ di, nka bu nání ikwu okwu bayere ọbara ahu na Mọ ahu. Nka abughi okwukwe nke nēduru madu rue na nb͕aputa zuru okè. 
Ayi kwesiri kweye na Jisus bupuru nmehie nile ayi site na baptism Ya, ekpere Ya ikpé, we nwua kwa n’Obe n’ihi ayi, ewe me ka O si na ndi nwuru bilie n’ubọchi nke atọ mb͕e Ọ nwusiri. 
Ewepu okwukwe di otú a, nb͕aputa zuru okè agaghi enwe isi. Emere Jisus Kraist baptism, we nwua n’Obe, ewe me kwa ka O bilie n’ọnwu. Jisus Kraist were miri, ọbara, na Mọ Nso biakute ayi. O bupuru nmehie nile nke uwa.
Enwere ndi ahu di atọ di nkpà nke nāb͕ara nzọputa àmà: Mọ ahu, miri ahu, na ọbara ahu.
Nke mbu, Mọ Nsọ nāb͕a àmà na Jisus bu Chineke na O ridatara n’anu-aru nke madu.
Nke abua bu àmà nke ‘miri’ ahu. Miri ahu bu baptism Jisus na Jọdan site n’aka Jọn Baptist, nke esitere na ya tukwasi nmehie nile ayi n’aru Jisus. Atukwasiworo nmehie nile ayi n’aru Jisus mb͕e emere Ya baptism (Matiu 3:15).
Àmà nke atọ bu ‘ọbara’ ahu nke nānọchi anya ndu ọhu na Jisus inata ikpé nke diri n’ihi nmehie nile ayi n’ọnọdu ayi. Jisus nwuru n’ihi ayi we nata kwa ikpé nke Nna Ya n’ihi ayi ewe me ka O si na ndi nwuru anwu bilie mb͕e ubọchi 3 gasiri. 
Chineke nke Nna nēziga Mọ Nsọ n’obi nile nke ndi nke kwere na baptism na ọbara Ọkpara Ya ib͕ara nb͕aputa-ayi àmà. 
Ndi nke amuworo ọzọ nwere Okwu ahu nke ha ji emeri uwa. Ndi ab͕aputaworo gēmeri Setan, okwu-ugha nile nke ndi-amuma ugha nile, ihe-nb͕ọchi nile, nrugide nile nēbuso ha agha nēwepughi aka. Ihe mere ayi ji nwe ike nka bu n’ihi na ayi nwere àmà atọ ahu n’obi-ayi: miri ahu nke Jisus, ọbara Ya, na Mọ Nsọ.
 
Àyi si aṅa emeri uwa na Setan?
Site n’ikwere na àmà nile ahu di atọ
 
Ayi nēmeri Setan na uwa n’ihi na ayi kwere na Mọ ahu, miri ahu, na ọbara ahu. Ndi nke kwere na baptism na ọbara Jisus puru imeri udi ndi-amuma ugha ọ bula. Okwukwe-ayi, nke nwere ike nka imeri uwa, di nime miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu. Ì kwere na nka?
Apughi imu gi ọzọ, i pughi kwa imeri uwa ma ọ buru na i nweghi okwukwe na nb͕aputa sitere na baptism Jisus, ọbara Ya, na okwukwe na Jisus bu Ọkpara Chineke na Onye-nzọputa-ayi. Ǹka di n’obi-gi?
Ì nwere Mọ Nsọ na miri ahu n’obi-gi? Ì kwere na atukwasiri nmehie-gi nile n’aru Jisus? Ì nwere ọbara nke Obe ahu n’obi-gi?
I gēmeri uwa ma ọ buru na i nwere baptism ahu, miri ahu nke Jisus n’obi-gi, ma ọ buru kwa na i kwere na Jisus nwuru n’Obe n’ihi gi O we būru ikpé n’ihi gi.
Onye-ozi Jọn meriri uwa n’ihi na o nwereri ihe ndia ahu di nkpà di atọ n’obi-ya. O kwu-kwa-ra okwu bayere nb͕aputa nye unu-nna-ya nile n’okwukwe ndi nāgabiga ihe nb͕ọchi nile na egwù nile n’ọlu-ha. Ọ b͕ara àmà, “Otú a ka unu onwe-unu gēsi meri kwa uwa. Jisus were Mọ ahu, miri ahu, na ọbara ahu bia. Dika O meriri uwa, ndi nke kwere na Mọ Nsọ, miri, na ọbara gēmeri kwa uwa. Otú a bu nání uzọ ndi kwesiri ntukwasi obi gēsi meri uwa.”
Na I. Jọn 5:8, ọ siri, “N’ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu.” Ọtutu ka nēkwu bayere nání ọbara ahu na Mọ Nsọ, ma ha nārapu miri ahu nke baptism Jisus. Ọ buru na ha wepu ‘miri,’ ahu anēduhie-ha site n’aka Setan. Ha kwesiri isite n’azu nduhie nke aka ha puta we chèghari; ha kwesiri ikwere na ‘miri’ ahu nke Jisus Baptism, nke imu ọzọ.
O nweghi onye ọ bula puru imeri uwa ma o kweghi na miri ahu na ọbara ahu. Asim gi ọzọ, o nweghi onye ọ bula! Ayi kwesiri iwere miri ahu na ọbara ahu nke Jisus b͕o agha dika ngwa agha. Okwu Ya bu mma-agha nke Mọ Nsọ, Ìhè ahu.
Enwe-kwa-ra ọtutu dikariri uku ndi nēkweyeghi na Baptism Jisus nke sachapuru nmehie nile ha. Enwe-kwa-ra ọtutu dikariri uku ndi kwere nání na ihe abua ahu. Mb͕e Jisus nāsi ha ‘bilie nwue kwa,’ ha apughi inwu ma-ọli. Ha ka nwere nmehie n’obi-ha. Ọbuná na ha kwere na Jisus ha nējedebe n’ọku-ala-mọ.
 
 
Ekwesiri Ib͕ara Ozi Ọma nke Baptism na Ọbara Jisus Àmà Nke-ọma Ka Ndi Madu We Pu Inu, Ikwere, ka Ewe Zọputa kwa ha
 
Òkwukwe na baptism Ya ọ bu nání udi ozizí madu?
É-è, ọ bughi ozizí madu. Ọ bu ezi-okwu ahu.
 
Mb͕e ayi nāb͕ara ozi ọma ahu àmà, o kwesiri di ọcha. Jisus were Mọ Nsọ, were Baptism (nke bupuru nmehie nile ayi), were kwa ọbara (nke kwuru ugwọ nmehie nile ayi) bia. Ayi aghaghi ikwere na ndi ahu dum di atọ.
Ma-ọbughi ya, ayi anaghi ekwusa ozi ọma kama nání okpukpe. Ndi-Kristian n’ubọchi ta nākpọ Kristianiti otú okpukpe. Apughi ikọwa Kristianiti dika otù okpukpe. Ọ bu okwukwe nb͕aputa ewuru n’elu ezi-okwu, okwukwe nke ilegide Chineke anya. Ọ bughi otú okpukpe.
Okpukpe bu ihe madu ji aka kè, ma okwukwe bu ilegide nzọputa Chineke nyere ayi anya. Nka ahu bu ihe di iche. Ọ buru na i lefu ezi-okwu a anya, i naguru Kristianiti dika nání okpukpe ọzọ we nēkwusa kwa ya site na omume nile na ukpuru nile.
Jisus Kraist abiaghi ime ka otù okpukpe guzo n’uwa nka. O meghi ka otú okpukpe anākpọ Kristianiti guzo ma-ọli. Gini mere i ji kweye na ọ bu otù okpukpe? Ọ buru na ha nile bu otù ihe, gini mere ikweghi na Buddhism n’ọnọdu-ya Ì nēchè na m’hiere uzọ ikwu okwu a? 
Ufọdu ndi nēkwere na Jisus dika otù ndu okpukpe, we nējedebe isi, “Gini bu ihe di iche? Elu-igwe, Nirvana, paradais.... Ha nile bu otù ihe ahu, ha nwere nání aha di iche. Ayi nile gējedebe n’otu ebe ahu o otu ọ di.”
Ndi-Kristian ibem, ayi kwesiri iguzogidesi ike n’ezi-okwu ahu. Ayi kwesi-kwa-ra ‘ibili we nwue kwa.’ Ayi kwesiri inwe ike ikwu ezi-okwu ahu nēnweghi obi abua.
Mb͕e madu nāsi, “Nka apughi ibu nání uzọ” I kwesiri ikwu okwu n’olu ike, “É-è! Ọ bu nání uzọ: I puru iga n’Elu-igwe nání mb͕e i kwere na Jisus Kraist onye were miri, ọbara, na Mọ Nsọ bia.” I kwesiri inwusi ike otú a ka nkpuru-obi ndi ọzọ we pu inu okwu nb͕aputa ahu, ewe mua-ha ọzọ, we bà kwa n’Elu-igwe.
 
 
Nwe Ezi Okwukwe: Ndi Huru Jisus N’anya Nke O nyeghachighi Bú Ndi Nāmaghi Nb͕aputa nke Baptism Jisus na Ọbara-Ya Gāla N’iyì
 
Ònye gāla n’iyì ọbuná na o kwere na Jisus?
Ndi nēkweghi na Baptism Jisus
 
Nání ikwu n’ikwere na Jisus n’uzọ ọ nke aka-gi bu ihu-n’anya Jisus nēnyeghachighi bu-kwa-ra igu ezi-okwu dika nání okpukpe. 
Otù ub͕ọ-miri nke nāgafe n’osimiri Pacific mikpuru madu ole-na-ole ndi lanaririnu ka nọ kwa nārigo n’elu ihe rubber nke ub͕ọ-miri ahu. Ha zipuru ozi SOS, ma ebili-miri nke oké osimiri b͕ochiri ub͕ọ-miri ndi ọzọ ibia nyere ha aka. Mb͕e ahu, helicopter biara we tudà udọ̀. 
Ọ buru na otù onye nime ha were aka-ya abua jidesi udọ̀ ahu aka ike kari ikegide ya b͕urub͕uru aru-ya, ọ gādi ka nwoke dara n’ihu-n’anya Jisus enyeghachighi, nēkwere na Chineke dika o si di ya ezi nma. Akēchekwaghi ya, ma ọ nāsi, “M’kwere. Zọputam. M’kwere, ya mere m’chère na agāzọputam.”
Onye nke nāghọtaghi ezi-okwu nke baptism Jisus na ọbara Ya nēkwere na agāzọputa ya nání n’ihi na o nējigidesi udọ̀ ahu aka ike. 
Ma dika anādọputa ya, aka-ya abua gārapu ijidesi udọ̀ ahu aka ike. Ọ nējigide site na nání ike nke aka ya. Mb͕e ike ahu gwusiri, ike aka-ya gēfunariri-ya o we dakwasi kwa nime osimiri ahu ọzọ.
Inọ nime ihu-n’anya Jisus enyeghachighi di otú a. Ọtutu gāsi na ha kwere na Chineke na Jisus; na ha kwere na Jisus onye were Mọ Nsọ bia, ma nka bu nání otù akuku nime equation dum ahu. Ha apughi ikwere n’ezie ma-ọbu nọdu n’ozi ọma ahu zuru okè, ya mere ha nāmanye onwe-ha ikwu okwu nēwepughi aka na ha kwere.
Ikwere ya na inwa ikwere abughi otù ihe. Ha siri na ha gēso Jisus rue n’ọgwugwu ma agēnupu ha n’ubọchi ikpé-azu n’ihi nmehie nke fọduru n’obi-ha. Ha huru Jisus n’anya nāmataghi na Jisus were baptism Ya, ọbara, na Mọ Nsọ bia. Ọ buru na ha hu Jisus n’anya n’ihi nání ọbara Ya, ha gāga n’ọku-ala-mọ.
Were miri nke Baptism, na okwu nke ọbara ahu n’Obe ke nkpuru-obi-gi. Mb͕e Jisus nātudà udọ̀ nzọputa ahu, agāzọputa ndi nke were miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu ke onwe-ha. 
Onye ahu nāzọputa site na helicopter ahu tiri nkpu site n’igwe-okwu, “Biko gem nti nke-ọma. Mb͕e m’tudàtara udọ̀ a, ke ya n’ara-gi b͕urub͕uru n’okpuru aka-gi abua. Mb͕e ahu nání nọdu otú ahu. Ejila aka-gi abua jide udọ̀ ahu. Nání ke ya b͕urub͕uru n’okpuru obi-gi ama-kwa-la jijiji. Mb͕e ahu agāzọputa-gi.”
Mb͕e o nyesiri idọ-aka-na-nti nile ahu, otù nwoke nke soro idọ-aka-na-nti nile ahu we were udọ̀ ahu ke onwe-ya, azọputara onye ahu. Ma nwoke nke ọzọ siri, “Echeb͕ula onwe-gi. Aru sirim ike. Anāmab͕ati aru na club aru-isi-ike. Ì puru ihu akwaram? M’gējidesi ike rue ọtutu miles.” Mb͕e ahu o were aka-ya abua jidesie udọ̀ ahu aka ike dika anādọli udọ̀ elu.
Na nmalite anādọputa umu-nwoke abua ahu. Ma enwere ihe di iche. Adọputara onye nke ṅara nti n’idọ-aka-na-nti nile ahu we ke udọ̀ ahu b͕urub͕uru onwe-ya nēnweghi nzob͕u. Ọbuná akọ-na-uche funariri-ya n’uzọ ma otú ọ di adọputara ya.
Onye nke nwere npako n’ike nke aka ya rapuru ijidesi aka-ya ike rue n’ikpé-azu n’ihi na ike-ya gwusiri. Ma ọ nwuru n’ihi na ọ chọghi ige nti we lefu kwa idọ-aka-na-nti nile ahu anya.
Ka ewe nweta nb͕aputa zuru okè, madu aghaghi ikwere na nb͕aputa miri ahu nke baptism-Ya na ọbara ahu nke zọputara nkpuru-obi nile na nmehie. Nzọputa diri ndi nile were obi-ha dum kwere n’Okwu ahu: “M’zọputara gi nke-ọma site na Baptism Mu onwem sitere n’aka Jọn Baptist ya na nwusì ọbaram rue n’ọnwu n’Obe.”
Ndi nke kwere nání na ọbara nāsi, “Echeb͕ula onwe-gi, m’kwere. M’gēnwe obi ekele rue n’ọgwugwu ndum n’ihi ọbara Jisus. M’gēso Jisus rue n’ọgwugwu, okwukwem nání na ọbara ahu zukariri okè imeri uwa na nmehie nile rue n’oge ndum nke fọdurunu.”
Otú ọ di, nka ezughi okè. Ndi nke Chineke nēkwezu dika ndi-Ya bu ndi nke kwere na àmà nile ahu di atọ: na Jisus were Mọ Nsọ bia ewe me Ya baptism (Jisus bupuru nmehie nile site na baptism Ya na Jọdan), na Ọ nwuru n’Obe ikwu ugwọ-ọlu nke nmehie nile, na emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie. 
Mọ Nsọ nābiakute nání ndi nke kwere na ndi ahu di atọ we nāb͕ara ha àmà. “E, Abum Onye-nzọputa-gi. Azọputaram gi site na miri ahu na ọbara ahu. Abum Chineke-gi.” 
Ma nye ndi nēkweghi na ndi ahu di atọ, Chineke adighi enye nzọputa. Ọbuná ma ọ buru na ewepuru nání otù, Chineke nāsi, “É-è, azọputaghi gi.” Ndi nēso uzọ-Ya nile kwere na ndi ahu di atọ. Jisus nāsi na Baptism-Ya bu ihe-atù nke nzọputa, na ọbara-Ya bu ikpé ahu.
 
 
Onye-ozi Pọl na Pita B͕a-kwa-ra Baptism ahu na Ọbara ahu nke Jesus Àmà 
 
Gini ka ndi nēso uzọ Jisus b͕ara àmà?
Baptism Jisus na ọbara Ya
 
Ònye-ozi Pọl kwuru okwu bayere Baptism Jisus? Ka ayi hu otu o si kwue okwu bayere baptism Jisus ọtutu mb͕e. Ọ siri na Ndi Rom 6:3, “Ma-ọbu ùnu amaghi na ka ayi-ra, bú ndi emere baptism iba nime Kraist Jisus, emere ayi baptism ibà n’ọnwu-Ya?” Ọzọ na 6:5, “N’ihi na asi na ejiri oyiyi ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe, agēji kwa oyiyi nke nbilite-n’ọnwu-Ya me ka ayi na Ya tokọ buru otù ihe.”
Ọ si-kwa-ra na Ndi Galetia 3:27, “N’ihi na ka unu ra, bú ndi emere baptism ibà nime Kraist, unu yikwasiri Kraist.” Ndi-ozi Jisus nile b͕ara ‘miri’ ahu, bú baptism Jisus àmà. “Bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n’uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism” (I. Pita 3:21).
 
 

Nzọputa nke Nb͕aputa Onye-nwe-ayi Biara site na Miri ahu na Ọbara Jisus 

 
Òle ndi Chineke nākpọ ndi ezi omume?
Ndi nēnweghi nmehie ọ bula n’obi-ha
 
Nb͕aputa Jisus nyere madu bu nke miri ahu nke baptism Jisus na ọbara Ya n’Obe. Site na nb͕aputa ahu ayi puru ibili we nwue kwa. Èsi aṅa? Site n’ib͕ara ndi ahu di atọ àmà.
“Bilie, nwue; n’ihi na ìhè-gi abiawo, ebube Jehova awawo kwa n’aru gi dika anyanwu” (Aisaia 60:1). Chineke nwuru ayi ìhè we si ayi nwue kwa. Ayi kwesiri idebe iwu ahu. 
Ayi kwesiri ikwusa ozi ọma ahu site n’ike-ayi dum. Otú ọ di, ọtutu ra otú a adighi aṅa nti. Kwere na Jisus agāb͕aputa-gi. I gābu onye ezi omume. Ọ buru na nmehie ka di n’obi-gi, i bughi onye ezi omume. I ka emerighi nmehie nile nke uwa rue ub͕u a.
I pughi iwepu nmehie di n’obi-gi ma-ọli ma ọ buru na i kweghi na miri ahu nke Jisus (Baptism Jisus). I pughi izere ikpé ma-ọli ma ọ buru na i kweghi na ọbara Jisus. Apughi izọputa-gi ma-ọli ma ọ buru na i kweghi na Jisus Kraist onye were Mọ Nsọ bia. I pughi ibu onye ezi omumue zuru okè ma-ọli ma ọ buru na i kweghi na àmà ndi ahu di atọ.
Ezi omume nēzughi okè nēdu rue nání na ‘nke anākpọ ezi omume.’ Ọ buru na otù onye nāsi na ọ ka nwere nmehie ma nāgu onwe-ya na onye ezi omume, ọ ka anọghi nime Jisus rue ub͕u a. Ufọdu ndi n’ubọchi ndia nānwa irapara na nb͕aputa n’elu ‘nke ha nākpọ ezi omume.’ Ha edewo kwa ọtutu tons edemede nābaghi urù n’isi-okwu ahu.
Chineke ọ̀ nākpọ madu onye nēnweghi nmehie mb͕e nmehie ka di n’obi-ya? Ọ pughi ime ihe ahu. Ọ nākpọ ya dika O si nāhu ya. Ọ bu onye puru ime ihe nile ma Ọ pughi ikwu okwu ugha. Ọtutu ndi aghọtaghi ihe ezi omume ahu putara n’ezie. Ayi nākpọ ihe ‘ihe di ọcha’ ma ọ buru nání na ọ di ọcha. Ayi adighi asi na ọ di ‘ọcha’ mb͕e enwere nmehie.
I puru iche na Jisus nākpọ-gi onye ezi omume ọbuná I nwere nmehie n’obi-gi. Nka ahu ezighi ezi.
Jisus nākpọ ayi ndi ezi omume mb͕e ayi kwere na Jisus dika Onye were Mọ Nsọ, were miri ahu (na O bupuru nmehie nile ayi mb͕e emere Ya baptism), na ọnye were ọbara (Ọ biara n’anu-aru we nwua n’ihi ayi) bia. 
Ndi-Kristian ibem, ‘Nke anākpọ ezi omume’ enweghi ihe-nwekọ ọ bula n’ozi ọma nke miri ahu na ọbara ahu. ‘Nke anākpọ ezi omume,’ ma-ọbu ‘ikpọ onye ezi omume’ bu ozizí nke madu muputara. Chineke ọ̀ nākpọ-gi onye ezi omume mb͕e i nwere nmehie n’obi-gi? Chineke adighi akpọ madu onye ezi omume mb͕e o nwere nmehie n’obi-ya, ọbuná otù o si kwesie ike na Jisus. Jisus apughi ikwu okwu ugha.
Ma, ì ka nēchè na Ọ nākpọ madu onye ezi omume mb͕e enwere nmehie di n’obi-ha? Nka ahu bu ihe ndi madu nēchè, ọ bughi Chineke. Chineke nākpọ okwu-ugha nile asì. Ọ̀ gākpọ-gi onye ezi omume mb͕e i kwere nání na ‘Mọ Nsọ’ na ‘ọbara’ ahu? Ma-ọli.
Enwere nání udi ndi nke Chineke nāmazu dika ndi ezi omume. Ọ bu onye nēnweghi nmehie ọ bula n’obi-ya. Ọ nāmazu nání ndi nke kwere na ndi ahu nile di atọ: na Jisus, onye bu Chineke, ridatara n’uwa n’anu-aru, ewe me Ya baptism na Jọdan, Ọ we wusì kwa ọbara n’Obe ihichapu nmehie nile ayi.
Nání ndi nke kwere na ozi ọma nke nb͕aputa ka Chineke mazuworo. Ha bu ndi kwere nke-ọma. Ha kwere n’ihe nile O mere ayi. Ha kwere na Jisus biara na emere Ya baptism ibupu nmehie nile ha na O būru ikpé n’ihi ayi site n’inwu n’Obe, na eme-kwa-ra ka O si na ndi nwuru anwu bilie.
Emere ihe ndia nile site n’ihu-n’anya Chineke. Jisus si n’elu-igwe ridata we si “Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n’ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike.” (Matiu 11:28). O mere nka site n’ibupu nmehie nile ayi.
Chineke adighi amazu ndi nke kwere nání na ọbara Jisus. Ndi nke kwere nání na ọbara Jisus ka nwere nmehie n’obi-ha.
Ònye ka Jisus nāmazu ka onye ab͕aputaworo? “M’bupuru nmehie-gi nile mb͕e M’ridatara n’uwa nka ewe mem baptism site n’aka Jọn Baptist. M’nāmab͕a àmà na atukwasiri nmehie nile nke uwa n’arum. M’kwuru ugwọ nmehie nile n’Obe. M’zọputara gi otú a.” Okwukwe na baptism Jisus, ọbara Ya, na ezi-okwu ahu bú na Ọ bu Chineke. Ha dum di nkpà n’ihi nzọputa.
Nye ndi nke kwere na ndi ahu di atọ, Jisus nāsi, “E, azọputara-unu. Unu bu ndi ezi omume na umu Chineke.” Azọputa-gi ma ọ buru na i kwere na ha dum achikọtara ọnu bú Baptism Jisus, ọbara Ya, na Mọ Nsọ. Ndi nke kwere nání na ọbara ahu na Mọ Nsọ ka nwere nmehie n’obi-ha.
N’Ala-eze Chineke, enwere nání otù ezi-okwu. Enwere ikpé ziri ezi, ezi-okwu, ihu-n’anya, na obi-ọma. Enweghi ọbuná ugha ntà. Okwu-ugha nile na ihe nile ekwensu nēzuputa adighi n’elu-igwe.
 
Ònye bu onye ‘nke nālu ọlu nēmebi iwu?’
Onye nke nēkweghi na Baptism Jisus
 
“Ọtutu madu gāsim n’ubọchi ahu, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, àyi jiri aha-Gi bu amuma, àyi jiri kwa aha-Gi chupu ndi-mọ ọjọ, àyi jiri kwa aha-Gi lu ọtutu ọlu di ike?’” (Matiu 7:22) 
Chineke adighi amazu ọlu nile nke madu. “Ma mb͕e ahu ka M’gēkwuputara ha, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula M’mara unu: si n’ebe M’nọ pua, unu ndi nālu ọlu nēmebi iwu” (Matiu 7:23)
“Enyerem Gi ulo abua. Arapurum ọbuná ndum n’ihi Gi. Ì hughm? Agọnarighm Gi ma-ọli rue n’ume nke ikpè azum. Ì hughm?” 
“Ya mere ì nwere nmehie n’obi-gi?”
“E, Onye-nwe-ayi. Enwerem nke ntà.” 
“Mb͕e ahu si n’ebe pua. Enweghi onye-nmehie agākwe ka ọ bia ebe a.” 
“Ma anwurum dika onye eji oké nkpab͕u b͕ue!” 
“Ihe unu nēkwu ọ putara gini, ìnwu dika onye eji oké nkpab͕u b͕ue? Unu nwuru nání n’ihi iwezuga-onwe-unu. Ùnu kwezuru baptism na ọbara Mu? Ò nwe mb͕e b͕ara unu àmà n’obi-unu na unu bu ndi Nkem? Unu ekweghi na baptism Mu ab͕aghi Kwam unu àmà na unu bu ndi Nkem, ma unu jidesiri okwukwe-unu aka ike we nwua kwa n’ihi ya. Òle mb͕e M’b͕ara unu àmà? Unu onwe-unu wetara ya. Ùnu huru nb͕aputa-unu n’anya we nwa kwa nání n’ihi nb͕aputa nke si n’aka unu. Ùnu nāghọta? Ub͕u a, gabá n’uzọ onwe-unu.” 
Jisus gwara ayi okwu ka ayi bilie we nwue kwa. Ndi ab͕aputaworo nwere ike iji ujọ weda onwe-ha n’ala n’iru ndi bu ndi-Kristian ugha ọtutu ndi-amuma ugha, we dà inwu nke-ọma! Ma ire-ọku ntàkiri puru imalite ọku sara mbara. Ọ buru na otù onye guzo n’obi-ike we b͕ara ezi-okwu ahu àmà, uwa dum gēnwuli.
N’Aisaia 60:1-2, ọ nāsi, “Bilie, nwue; n’ihi na ìhè-gi abiawo, ebube Jehova awawo kwa n’aru gi dika anyanwu. N’ihi na, le, ọchichiri nēkpuchi kwa ndi nile di iche iche: ma n’aru gi ka Jehova gāwa dika anyanwu, ebube-Ya ka agāhu kwa n’aru gi.” 
O nyere-ayi iwu ibili we nwue kwa n’ihi na ọchichiri nke okwu-ugha na ozi ọma ugha gēkpuchi uwa. Nání ndi kwere na Jisus puru ihu Ya n’anya. Ndi ab͕aputaghi apughi ihu Jisus n’anya ma-ọli. Hà puru isi aṅa? Ha nēkwu nání okwu bayere ihu-n’anya ma apughi ha ihu Ya n’anya n’ezie ma-ọli rue mb͕e ha nēkwere.
 
 
Enwere Ndi Ahu Di Atọ Ndi Nābara Nzọputa Ndi-nmehie Àmà
 
Gini bu àmà nke nzọputa n’obi-ayi?
Baptism Jisus
 
“N’ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu.” Jisus biara n’uwa O we lu ọlu-Ya site na miri ahu na ọbara ahu. O mere nka we zọputa kwa ayi.
“Ọ buru na ayi anata àmà nke madu, àmà nke Chineke ka ya uku: n’ihi na àmà nke Chineke bu nka, na Ọ b͕awo àmà bayere Ọkpara-Ya. Onye kwere n’Ọkpara Chineke nwere àmà ahu nime ya: onye nēkweghi okwu Chineke emewo Ya onye-ugha; n’ihi na o kweghi n’àmà ahu nke Chineke b͕aworo bayere Ọkpara-Ya. Àmà ahu bu nka, na Chineke nyere ayi ndu ebighi-ebi, ndu ahu di nime Ọkpara-Ya. Onye nwere Ọkpara ahu nwere ndu ahu; onye nēnweghi Ọkpara Chineke enweghi ndu ahu” (I. Jọn 5:9-12).
Ndi amuworo ọzọ nānata àmà nke madu. Amazuworo ayi dika ndi ezi omume. Mb͕e ndi amuworo ọzọ bú ndi ab͕aputaworo nēkwu ezi-okwu ahu bayere nb͕aputa, ndi madu apughi iru uka bayere ya. Ha nānabata ya. Ha nāsi na ayi kwere nke-ọma, na ayi ziri ezi n’okwukwe-ayi. Ọ buru na ayi agwa ha okwu otù esi mua ayi ọzọ, o nweghi onye nēguzogide ezi-okwu ahu. Ha nāsi na ayi ziri ezi. Ayi nānata àmà nke madu. 
Ma ama-okwu a nāsi kwa, “Àmà nke Chineke ka ya uku: n’ihi na àmà nke Chineke bu nka.” Ọ nāsi na àmà nke Chineke bu bayere Ọkpara Ya. Ò ziri ezi? Gini bu àmà nke Ọkpara Ya? Ihe-àmà na Chineke zọputara ayi bu na Jisus were Mọ Nsọ bia, O were miri ahu nke nb͕aputa bia, O were ọbara ahu n’Obe bia. Chineke nāb͕a àmà na otú a bu uzọ O ji zọputa ayi, na ayi bu ndi-Ya n’ihi na ayi kwere na ya. 
“Onye kwere n’Ọkpara Chineke nwere àmà ahu nime ya: onye nēkweghi okwu Chineke emewo Ya onye-ugha; n’ihi na o kweghi n’àmà ahu nke Chineke b͕aworo bayere Ọkpara-Ya.” 
Ama-okwu a nāgwa ayi nke-ọma ndi bu ndi anaputaworo. Ọ nāsi na onye nke kwere na Ọkpara Chineke nwere àmà ahu nime onwe-ya. Ì nwere àmà ahu n’obi-gi? Ọ di nime gi na nimem Chineke biara n’uwa n’ihi ayi. (Ọ biara n’anu-aru site n’aru nke Meri site n’aka Mọ Nsọ.) Mb͕e Ọ b͕ara arọ 30, emere Ya baptism ibūru nmehie nile ayi nye Onwe-ya. N’ihi nmehie nile ayi, ekpere Ya ikpé n’Obe. Emere ka O bilie n’ọnwu n’ubọchi nke atọ inye ayi ndu ebighi-ebi. Jisus zọputara ayi otú a. 
Gini gara-eme ma ọ buru na emeghi ka O bilie n’onwu? Ọ̀ gēsi aṅa pu ib͕aram àmà n’ílì? Ọ bu n’ihi nka ka O ji buru Onye-nzọputam. Ihe a bu ihe ayi kwere.
Ma dika O si kwue, Ọ zọputara ayi site na baptism Ya na ọbara. N’ihi na ayi kwere, azọputawo mu na gi. Àmà ahu di nimem ọ di kwa nime gi. Ndi ab͕aputaworo apughi ilefu ‘miri’ ahu nke baptism Ya anya. Ayi apughi ma-ọli iwepu ihe nile O mere izọputa-ayi.
“N’ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile” (Matiu 3:15). Ayi apughi igọnari na Jisus bupuru nmehie nile ayi na Jọdan mb͕e emere Ya baptism site n’aka Jọn Baptist. Ndi ab͕aputaworo apughi igọnari ma-ọli ‘miri’ ahu, bú baptism Jisus.
 
 
Ndi Nke Kwere ma Ab͕aputaghi Ha Nāgọnari Baptism Jisus Rue N’Ọgwugwu
 
Ònye nēme Chineke onye-ugha?
Onye nke nēkweghi na baptism Jisus
 
Le ka o si di ọcha mb͕e Onye-ozi Jọn siri, “Onye nēkweghi okwu Chineke emewo Ya onye-ugha” Ọ buru na Onye-ozi Jọn nēbi ub͕u a n’ebe a, gini ka ọ gāgwa ayi, ndi-Kristian? Ọ gāju ma ‘Jisus bupuru nmehie-ayi mb͕e emere Ya baptism.’ 
Ọ̀ bu Jọn Baptist agaghi ab͕a-kwa-ra ozi ọma ahu àmà na Jisus b͕aputara-ayi site na baptism Ya? “Ọ̀ bu na atukwasighi nmehie-gi nile n’isi Jisus, Ọ̀ bu na O būrughi kwa nmehie-gi nile n’ubu-Ya mb͕e emere Ya baptism site n’akam?” Ọ gara ab͕a àmà na “emere Jisus baptism izọputa gi.”
Ndi nke nēkweghi na Chineke, ndi nēkweghi na’ihe nile O mere izọputa ayi, nēme Ya onye-ugha. Mb͕e ayi nāsi na Jisus bupuru nmehie nile ayi mb͕e emere Ya baptism, ha nāsi, “O, onye m’huru n’anya! Ọ pughi ibupu nmehie nile ayi! O bupuru nání nmehie mbu, ya mere nmehie nile ayi nke kwa-ubọchi ka fọduru” 
Ha nārugide na ha kwesiri ‘ichèghari kwa-ubọchi we kwuputa kwa nmehie nile nke ub͕u a ka ewe b͕aputa-ha.’ Nka bu ihe ha kwere. Ùnu nile nēkwu kwa otú a? Ndi nke nēkweghi n’asachapuworo nmehie nile ayi site baptism Jisus nēme Chineke onye-ugha.
 
 
Jisus B͕aputara Ayi nání Otù mb͕e Mb͕e Emere Ya Baptism we Wusì Ọbara n’Obe 
 
Ònye nēkwu okwu-ugha?
Onye nke nēkweghi na baptism Jisus
 
Emere Jisus baptism we bupu nmehie nile nání otù mb͕e. Chineke nāzọputa ndi nke kwere na baptism na ọbara Jisus, ma rapu ndi nke nēkweghi. Ha nāga n’ọku-ala-mọ. Ya mere, ma azọputara ayi ma-ọbu azọputaghi-ayi nādabere n’ihe ayi kweyere. Jisus naputara ayi na nmehie-ya nile nke uwa. Agāzọputara ndi nke kwere, agaghi azọputaghi ndi nke nēkweghi n’ihi na ha emewo Chineke onye-ugha.
Ndi madu adighi-aga n’ọku-ala-mọ n’ihi adighi-ike-ha, kama n’ihi ekweghi ekwe. “Onye nēkweghi okwu Chineke emewo Ya onye-ugha” (I. Jọn 5:10). Ndi nke nēkweghi na atukwasiri nmehie nile ha n’aru Jisus ka nwere nmehie n’obi-ha. Ha apughi isi na ha enweghi nmehie. 
Otù mb͕e ezuterem deacon we ju ya, “Deacon, nmehiem nile gāpuchasi ma ọ buru na m kwere na Jisus?”
“N’ezie ha gāpuchasi.”
“Mb͕e ahu, n’ihi na Jisus būru nmehie nile nke uwa we si na ‘ọ gwuwo,’ azọputawo-gi. Ọ̀ bughi ihe ezighi ezi?” 
“E, Azọputawom.” 
“Mb͕e ahu I ghaghi ibu onye nēnweghi nmehie.” 
“E, Abum.” 
“Gini gēme ma ọ buru na i mehie ọzọ?” 
“Ayi bu nání madu. Àyi gēsi aṅa pu ighara imehie ọzọ? Ya mere ayi kwesiri ichèghari we sachapu kwa nmehie nile ayi kwa-ubọchi.” 
Deacon nka ka nwere nmehie n’obi-ya n’ihi na o maghi ezi-okwu ahu zuru okè nke nb͕aputa. 
Ndi di ka ya bu ndi nēme Chineke ihe-ọchì we nēme kwa Ya onye-ugha. Ọ̀ bu Jisus, onye bu Chineke, dara iwepu nmehie nile nke uwa? Ọ bu ihe nākpasu iwe. Ọ buru na Jisus ewepughi nmehie nile, Ọ̀ gēsi aṅa pu ibu Chineke nke Nzọputa? Ọ̀ gēsi aṅa pu igwa ayi ka ayi kwere na Ya? Ì nāchọ ime Ya onye-ugha? Anamadu-gi ọdu ka ighara ime nka! 
Bible siri ka ayi ghara ime Ya ihe-ọchì. Nka putara emela ya onye-ugh, anwa-kwa-la iduhie Ya. Ọ dighi ka ayi.
Onye-ozi Jọn nāgwa ayi okwu n’ebe ọ di ọcha bayere ozi ọma nke nb͕aputa. Ọtutu ndi achọghi ikwere n’ihe nile nke Chineke mere ayi (ezi-okwu bú na Jisus Kraist were miri, ọbara, na Mọ Nsọ bia). 
Ma ọ buru na enwere ndi nke nēkweghi dika agwara ha na ndi nke kwere n’ihe nile nke Chineke meworo ayi (ndi nke nēkwuputa n’iru Chineke, “Abum onye ezi omume” na ndi ọzọ nke nēkwuputa, “Abum onye-nmehie”), òle ndi nke nēkwu ezi okwu? 
Ndi nke nēkweghi n’ihe nile Chineke mere, àmà nke miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu nēkwu okwu ugha. Ha nwere okwukwe ugha. Ndi nke nēkweghi nēme Chineke onye-ugha. 
Emela Ya onye-ugha. Jisus biara n’Osimiri Jọdan we si otú a (site n’ime Ya baptism) mezue ezi omume nile (bupuru nmehie nile nke uwa).
 
 
Nkpuru-obi Ezighi Ezi Nāgọnari Baptism Jisus na Idi Nsọ Ya 
 
Gini bu ihe Setan na ekwensu nāgọnari?
Baptism Jisus na Idi Nsọ Ya
 
Onye nke kwere n’Ọkpara Ya nwere àmà ahu nime ya. Onye amuworo ọzọ kwere na atukwasiri nmehie nile ha n’aru Jisus mb͕e emere Ya baptism, na anaputara ha site miri ahu na ọbara ahu nke Jisus. Ha kwere na amuru Jisus n’uwa nka site n’aru Meri; emere Ya baptism na Jọdan tutu Ọ nwua n’Obe; Ọ nwuru ewe eme ka O bilie n’ọnwu.
Ndi ezi omume nwere àmà ahu. Nnwaputa nke nzọputa nọ nime okwukwe-ayi na Jisus, onye were miri, ọbara, na Mọ Nsọ bia. Àmà ahu nọ nime gi. ‘Nwe àmà ahu nime onwe-gi.’ Asim gi: Ọ bughi nzọputa ma ọ buru na enweghi àmà; nnwaputa nke nzọputa nọ nime gi.
Onye-ozi Jọn siri, “Onye kwere n’Ọkpara Chineke nwere àmà ahu nime ya” (I. Jọn 5:10). Ọ̀ bu inwe àmà ahu bú ikwere nání na ọbara n’Obe? Ìkwere na miri ahu ma ghara ikwere n’ọbara ahu? I kwesiri ikwere na ndi nile ahu di atọ ka Chineke we mazu gi. 
Nání mb͕e ahu ka Jisus gāb͕ara gi àmà na ‘azọputawo gi.’ Ì nēkwu na i gēnwe àmà ahu ma ọ buru na i kwere nání na ndi abua (ọbara ahu, na Mọ ahu)? Ọ gābu ikwere na Chineke n’uzọ nke aka-gi. Ọ gābu ‘ib͕ara onwe-gi àmà.’
Enwere ọtutu ndi ra otú a. Enwere ọtutu n’uwa ndi kwere nání na ndi abua nime ndi ahu di atọ. Ha nāb͕a àmà na azọputawo ha we nēde ọtutu akwukwọ bayere ya. Le ka ha si ekwu okwu nke-ọma! Ọ nākuda mọ nke-uku. Ha nākpọ onwe-ha ‘Ndi-Evangelical.’ Ha nēchè na ha abughi nání ‘Ndi-Evangelical,’ kama ‘ndi okpukpe.’ Ha ekweghi na ‘miri’ ahu kama nāfuli elu n’ihi nzọputa! Le ka okwu-ha si nwe ezi uche! Kama ha enweghi àmà nke Chineke. Ọ bu nání èchìchè.
Ì gēsi aṅa pu ikpọ-ya nzọputa? Nání ndi nke kwere na Jisus, onye were Mọ Nsọ, miri, na ọbara bia, nwere àmà nke Chineke na nke madu.
Onye-ozi Pọl siri, “Na ọ bughi nání n’okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n’ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu” (I. Ndi Tesalọnaika 1:5). Setan nēnwe obi utọ mb͕e ndi nile kwere nání na ọbara Jisus. “O, ndi-nzuzù, eduhiewom unu… ha-ha!” Enwere ọtutu ndi kwere na mb͕e ndi madu nēto ọbara Jisus, Setan gāpu. Ha nēchè na Setan nātu Obe ahu ujọ. Setan nētiye nání ihe-nkiri. Ekwesighi ighọb͕u-ayi site na ya.
Mb͕e mọ ọjọ bara nime madu ọ puru ib͕a ara we nāsu kwa ufufu n’ọnu. Ọ bughi ihe siri ekwensu ike. Ekwensu nwere ike ime ka madu me ihe ra ka ihe nile. Ekwensu gēwere nání uburu ya nke ntà. Chineke nyere ekwensu ike di iche iche ma ewezuga ike ib͕u madu. Ekwensu puru ime madu ka ọ ma jijiji dika ahihia aspen, nēti nkpú, nāsu ufufu n’ọnu.
Mb͕e nka mere, ndi kwere ekwe gēti nkpu, “B͕afu n’aha Jisus! B͕afu!” Ma mb͕e madu ahu nwetara uche ya nile we laghachi n’ọnọdu mbu-ya, ha nāsi na ọ bu ọbara Jisus nke nwere ike ahu. Ma nka abughi ike nke ọbara Ya. Ọ bu nání ekwensu nētiye ‘ihe-nkiri’.
Setan na ekwensu nātu ndi nke kwere na Jisus egwù kari, onye sara ayi di ọcha site na baptism Ya, na onye būru ikpé n’ihi ayi site na ọbara Ya, n’ubọchi nke atọ emere ka O bilie n’ọnwu. Setan agaghi-anọ nso n’ebe àmà baptism Jisus na nzọputa nke ọbara ahu di. 
Dika i mara, ndi-nchu-àjà nke Catholic nāga ozi ichupu Setan. Ayi ahuwo ya n’ọtutu ihe-nkiri. N’ihe-nkiri ‘The Omen,’ onye-nchu-àjà weliri Obe osisi ahu we ma ya jijiji kama onye-nchu-àjà ahu nwuru. Onye amuworo ọzọ abughi onye agēmeri otú a.
Ọ nēji nkwuwa-okwu ekwu okwu bayere miri ahu na ọbara nke Jisus. Mb͕e ekwensu nwara imekpa ya aru, o gāju ekwensu, “Ì mara na Jisus bupuru nmehiem nile?” Ekwensu gāb͕afu mb͕e ahu. Ekwensu nākpọ ya asì inọ nso n’ebe ‘onye amuworo ọzọ nọ.’ Ọ buru na ‘onye amuworo ọzọ’ nọdu ebe ahu, ekwensu gānwa ib͕apu. Ọ siri na ndi nke nēkweghi na Chineke nēme Ya onye-ugha. Ha ekweghi na àmà nke Ọkpara Ya, àmà nke miri ahu na ọbara ahu.
 
Gini bu àmà nke Ọkpara Chineke?
Baptism Ya, ọbara Ya, na Mọ Nsọ
 
Gini bu àmà nke Ọkpara Chineke? Ọ bu na O were Mọ Nsọ bia we bupu nmehie nile ayi site na miri. O būru nmehie nile nke uwa nye onwe-Ya we wusì ọbara n’Obe n’ihi ayi. Ọ̀ bu nka abughi nb͕aputa nke miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu?
Ndi nile nēkwu okwu ugha n’iru Chineke n’ihi na ha ekweghi n’ozi ọma nke miri ahu na ọbara ahu, ozi ọma nke nb͕aputa. Okwukwe-ha nile bu ugha, ha nēkwusa kwa okwu-ugha nile.
Ka ayi laghachi na I. Jọn 5. Ama-okwu nke 11 nāsi, “Àmà ahu bu nka, na Chineke nyere ayi ndu ebighi-ebi, ndu ahu di nime Ọkpara-Ya.” Ọ nāsi ayi na Chineke nyeworo ayi ndu ebighi-ebi, na ndu ahu di nime madu nke nānara ya. Ọzọ, ndu ahu di nime Ọkpara-Ya.
Ndi nke nānata ndu ebighi-ebi bu ndi nke ab͕aputaworo site n’ikwere na baptism Jisus na ọbara Ya. Ndi ab͕aputaworo nānata ndu ebighi-ebi we nādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi. Ì natawo ndu ebighi-ebi?
N’ama-okwu nke 12, “Onye nwere Ọkpara ahu nwere ndu ahu; onye nēnweghi Ọkpara Chineke enweghi ndu ahu.” Ya bu, ndi nke kwere n’ihe nile Ọkpara ahu mere n’uwa: ime Ya baptism, na inwu n’Obe, na nbilite-n’ọnwu Ya, nwere ndu ebighi-ebi. Ma onye nke nēwepu ọbuná otù nime ihe ndia agaghi enwe ndu, ma-ọbu ib͕aputa ya.
Onye-ozi Jọn kpara ókè n’etiti ndi nke Chineke dabere n’okwukwe-ha n’ihe nile nke Jisus mere: miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu. Ihe nile ndia nāgwa ayi ka ha nwere Okwu ahu nime ha. O nāmata ndi ab͕aputaworo site n’okwukwe-ha na miri ahu nke baptism Jisus, ọbara Ya, na Mọ Nsọ.
 
 
Ndi Nke Amughi Ọzo Apughi Ikpa Ókò n’etiti Aturu na Ewu 
 
Ònye puru ikpa óké n’etiti ndi ab͕aputaworo na ndi ab͕aputaghi?
Onye nke amuworo ọzọ
 
Onye-ozi Jọn matara ndi ezi omume bú ndi ab͕aputaworo nke-ọma. Onye-ozi Pọl me kwa ya. Ndi nējere Chineke ozi gēsi aṅa akpa ókè n’etiti aturu na ewu? Ha si aṅa akpa ókè n’etiti ezi ndi nējere Chineke ozi na ndi nēme ka ha nēje ozi ahu? Ndi ab͕aputaworo site n’ikwere na miri ahu na ọbara Jisus ahu nānata ike eji-ahu uzọ.
Ma madu o bu onye nēlekọta nzukọ Kraist anya, onye nēzísa ozi ọma, ma-ọbu okenye, ọ buru na ọ pughi imata onye ab͕aputaworo, ọ buru na ọ pughi ikpa ókè n’etiti aturu na ewu, akāmughi ya onwe-ya ọzọ, o nweghi kwa ndu ahu nime ya. Kama ndi nke amuworo ọzọ n’ezie puru ihu ihe di iche ahu nke-ọma. Ndi nēnweghi ndu ahu nime onwe-ha apughi ihu ihe di iche ahu ma-ọbu imazu ya.
Ọ dika ikpa ókè n’etiti iru nile n’ọchichiri. Iru akwukwọ ndu bu iru akwukwọ ndu iru ọcha bu kwa iru ọcha. Ọ buru na ikpuchi anya-gi abua, i pughi ihu ma-ọbu imazu iru nile.
Ma ndi anya-ha abua meghere puru imata ọbuná ihe ntakiri dikariri iche nime iru. Ha puru ikwu nke bu iru akwukwọ ndu na nke bu iru ọcha. N’otù aka ahu, enwere ihe di iche putara ìhè n’etiti ndi ab͕aputaworo na ndi ab͕aputaghi.
Ayi kwesiri ikwusa ozi ọma nke nb͕aputa, ozi ọma nke miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu. Ayi kwesiri ibili we nwue kwa. Mb͕e ayi kpọkọtara ndi madu buruburu ayi ikwusa ezi okwukwe ahu, ayi adighi-ekwu site n’okwu nile nke madu. Na Bible, I. Jọn 5 nākọwa ihe ọ putara. Ayi kwesiri ikọwa ya n’otù n’otù ka ewe ghara inwe aghara.
Okwu a nke ayi nēkwusa, ya bu, okwu nke miri ahu, ọbara ahu, na Mọ nke Jisus, bu ìhè nke nb͕aputa. Ime ka ndi nile mazu ‘miri’ nke Jisus ahu bu inwu nke-ọma. Ime ka ndi nile mazu ‘ọbara’ nke Jisus ahu bu inwu nke-ọma. Ayi kwesiri ime ka ọ di ọcha ka enwela onye ọ bula n’uwa nke nāmaghi ezi-okwu a.
Ọ buru na ndi amuworo ọzọ ebilighi we nwue kwa, ọtutu ndi gānwu nēnweghi nb͕aputa, ọ gaghi-adi kwa Chineke ezi nma. Ọ gākpọ ayi ndi-orù di ume-ngwu. Ayi kwesiri ikwusa ozi ọma nke miri na ọbara Jisus.
Ihe mere m’ji ekwughari onwem nēwepughi aka bu na baptism Jisus bu ihe di oké nkpà n’ihi izọputa ayi. Mb͕e ayi nāgwa umu-ntakiri okwu, ayi kwesiri ikọwa ihe nile nēwepughi aka, nāga n’isi-okwu nile ka ayi mara na ha nāghọta.
Ọ buru na ayi nwa izí onye nāmaghi-ihe ihe, ma eleghi anya ayi gēbu uzọ malite na nkpuru-edemede. Mb͕e ahu ayi puru izí ya nwayọ nwayọ otù esi eji nkpuru-edemede ahu ede okwu nile. Mb͕e ọ puru ideputa ọtutu okwu dika ‘ahuhu,’ ayi gāmalite ikọwa ihe okwu ndia putara. Otú a ka ayi kwesiri iji gwa ndi nile bayere Jisus ka ewe mara na ha nāghọta n’ezie.
Ayi kwesiri ikọwa baptism Jisus nke-ọma. Ọ biara n’uwa nka site na miri, ọbara, na Mọ Nsọ. M’nēkpe ekpere na iga ekwere na Jisus dika Onye-nzọputa-gi ka ewe nb͕aputa-gi.
Nb͕aputa site na miri ahu na Mọ Nsọ nēsi n’okwukwe na baptism Jisus, ọbara ahu n’Obe, na okwukwe na Jisus bu Chineke, Onye-nzọputa-ayi asùputa dika miri. 
 
Okwuchukwu a dịkwa n`ụdị ebook. Pịa na mkpuchi akwụkwọ n`okpuru.
ÀMUWO GI ỌZỌ N’EZIE SITE NA MIRI NA MỌ NSỌ? [Nbiputa Ntughari Ọhu]