
(I. Pita 3:20-22)
“Ndi nēkweyeghi n’oge gara aga, mb͕e ogologo-ntachi-obi Chineke nēchesi ike n’ubọchi Noa, mb͕e anēdozi ub͕o, nke ewere miri zọputa madu ole-na-ole, ya bu madu asatọ, nime ya: bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n’uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ, site na nbilite-n’ọnwu nke Jisus Kraist; Onye nọ n’aka-nri nke Chineke, ebe Ọ gara ba n’elu-igwe; edowo kwa ndi-mọ-ozi na ndi nāchi isi na ndi di ike n’okpuru Ya.”
| Site na gini ka ayi ighọrọ ndi ezi omume? |
| Site n’amara Chineke |
Amuru ayi n’uwa nka, ma Chineke buru uzọ mara ayi. Ọ mara na agāmu ayi dika ndi-nmehie we zọputa kwa ayi dum ndi kwere ekwe site baptism Ya, nke bupuru nmehie nile nke uwa. Ọ zọputara ndi nile kwere ekwe we me kwa ha ndi-Ya.
Ihe nile a bu ihe amara Chineke putara. Dika esi kwue ya n’Abù Ọma 8:4, “Gini ka madu bu, na I nēcheta ya?” Ndi azọputaworo na nmehie nile bu ndi nānatara ihu-n’anya-Ya puru iche. Ha bu umu-Ya.
Gini ka ayi bu, ndi kwere nání n’ọbara Ya na Mọ Nsọ, tutu ayi ghọ umu Chineke, tutu ayi ghọ ndi ezi omume ewe zọputa, nye kwa ayi ike ikpọ Ya Nna? Ayi bu ndi-nmehie, nání ndi-nmehie ndi amuworo ibi n’uwa nka rue arọ 60-70 ma-ọbu rue arọ 70-80 ma ọ buru na aru di ayi ike.
Tutu asa nmehie nile ayi, tutu kwa ayi nwe okwukwe n’ozi ọma nke Baptism Jisus na ọbara Ya, ayi bu ndi ajọ omume ndi nāla n’iyì n’ezie.
Onye-ozi Pọl we si na ọ bu n’ihi amara Ya ka o buworo ihe ọ bu. Ọ bu nání n’ihi amara-Ya ka ayi bu ihe ayi bu ub͕u a. Ayi nēkele Ya n’ihi amara Ya. Onye ahu kère èkè ridatara n’uwa nka we zọputa ayi, me ayi umu-Ya, ndi-Ya. Ayi nēkele Ya n’ihi amara nzọputa nke miri ahu na Mọ Nsọ.
Gini bu ihe mere O ji kwe ka ayi buru umu-Ya, ndi ezi omume? Ọ̀ bu n’ihi na ayi mara nma ile anya? Ọ̀ bu n’ihi na ayi kwesiri ekwesi nke-uku? Ma-ọbu ọ̀ bu n’ihi na ayi di nma nke-uku? Ka ayi che bayere ya we nye kwa ekele n’ebe o kwesiri.
Ihe mere ya bu na Chineke kère ayi ime ayi ndi ndi-Ya na ikwe ka ayi na Ya bi n’ala-eze elu-igwe. Chineke mere ayi ndi-Ya ikwe ka ayi na Ya bi rue mb͕e ebighi-ebi. Enweghi ihe ọzọ mere Chineke ji were ndu ebighi-ebi gọzie ayi. Ọ bughi ezi-okwu na O mere ayi ndi-Ya n’ihi na ayi dikariri nma ile anya, kwesiri ekwesi, ma-ọbu nēbi ndu nke-ọma kari ihe nile ndi ọzọ O kère èkè. Nání ihe mere ya bu na Ọ huru ayi n’anya.
“Bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n’uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism” (I. Pita 3:21). “Nke ewere miri zọputa madu ole-na-ole, ya bu madu asatọ, nime ya” (I. Pita 3:20).
Nání ole-na-ole, otù site n’otù obodo abua site n’otù ab͕uru ka azọputaworo. Àyi di nma kari ndi ọzọ? Ọ bughi ma-ọli. Ayi apughi iche otú a, ma otú ọ di azọputawo ayi site n’okwukwe-ayi na miri ahu na Mọ Nsọ.
Ọ bu ihe-iriba-ama n’etiti ihe-iriba-ama nile na azọputawo ayi, ọ bu kwa onyinye nke anaghi-adabere n’ihe ọ bula na ngọzi si n’aka Chineke na ayi puru ikpọ-Ya Nna-ayi, Onye-nwe-ayi. Ayi apughi igọnari nka ma-ọli. Àyi gēsi aṅa pu ikpọ-Ya Nna-ayi ma-ọbu Onye-nwe-ayi ma ọ buru na ayi ka bu ndi-nmehie?
Mb͕e ayi nēchè bayere ezi-okwu ahu na azọputawo ayi, ayi mara na Chineke huworo ayi n’anya. Ayi gara-abu ndi amuru we nwua kwa nime ndu nēnweghi olile-anya we jedebe kwa n’ọku-ala-mọ ma ọ buru na ọ bughi n’ihi ihu-n’anya-Ya, ngọzi-Ya nile. Ayi nēkele Chineke nēwepughi aka n’ihi ngọzi-Ya nile na ihu-n’anya nke mere ayi umu-Ya na ndi kwesiri ekwesi n’anya-Ya.
Nzọputa di Oké ọnu-ahia Enyeworo Ayi site na Baptism Jisus
| Gini mere ndi madu n’oge Noa ji la n’iyì? |
| N’ihi na ha ekweghi na miri ahu (Baptism Jisus). |
“Bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n’uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism.” Edeworo ya na I. Pita na azọputara nání nkpuru-obi asatọ site na miri. Madu òle gānọ n’ebe ahu n’oge Noa? Ayi enweghi uzọ ayi ji amara ole ha di, ma ka ayi were ya na ha ra ka otù million. Nání madu 8 n’èzí-na-ulo Noa n’etiti otù milion ka azọputara.
Òkè ya gābu ihe ra ka otù ihe ta. Ha nāsi na enwere ihe kariri billion madu 8 n’uwa ub͕u a. Madu òle ka asaworo nmehie nile ha n’etiti ndi kwere na Jisus ta? Ọ buru na ayi gēle anya nime nání otù obodo, agēnwe ole-na-ole nime ha.
N’obodo nke nwere ihe ra ka madu 250, 000, ndi òle ka ab͕aputaworo na nmehie nile ha n’etiti ha―ma eleghi anya 200? Mb͕e ahu gini gābu òkè ya? Ọ putara ihe dikariri ntà n’otù nime nnù madu abua na ọgu iri nataworo ngọzi nke nb͕aputa.
Emere atu-matu na enwere ihe ra ka million ndi-Kristian 12 na Korea, gunyere ndi-Catholic. Nime ndia, ndi òle n’etiti ha ka amuworo ọzọ site na miri na Mọ Nsọ? Ayi kwesiri idebe ya n’uche-ayi na enwere nání madu 8 na ndi azọputara n’etiti ọnu-ọgugu uwa n’oge Noa. Ayi kwesiri imara we kwere na Jisus sachapuru nmehie nile nke ndi nile kwere na Baptism Ya, nke O sitere na ya bupu nmehie nile.
Enweghi ọtutu ndi kwere na Jisus b͕aputara ayi nile site na Baptism Ya na ọbara Ya n’Obe. Le anya na foto ama ama nke ‘Nbilite-n’ọnwu nke Jisus.’ Madu òle ndi biliri n’ọnwu ka egosiworo n’ebe ahu? Madu òle n’etiti ha bu ndi-ọ̀kà-nmuta-okpukpe?
Ta, enwere ọtutu ndi-ọ̀kà-nmuta-okpukpe n’uwa, ma ayi nāhu ole-na-ole ndi mara we kwere kwa na baptism nke nb͕aputa. Ọtutu ndi-ọ̀kà-nmuta-okpukpe nāsi na ihe mere eji me Jisus baptism bu n’ihi na O wedara Onwe-ya n’ala, ndi ufọdu kwa nāsi na emere Ya baptism ka O di ka madu ndi ọzọ.
Kama edeworo Bible na ndi-ozi nile, gunyere Pita na Jọn, b͕ara àmà na atukwasiri nmehie nile ayi n’aru Jisus site na Baptism Ya, we kwe-kwa-ra ya.
Ndi-ozi nile b͕ara àmà n’Akwukwọ Nsọ na atukwasiri nmehie nile n’aru Jisus site na Baptism Ya. O bu ihe àmà itu-n’anya nye amara Chineke na apuru inaputa-ayi nání site n’ikwere na ya.
Enweghi ‘Ma eleghi anya’ bayere Baptism Nb͕aputa
| Ònye nānata ihu-n’anya Chineke nēnweghi nsọtu? |
| Onye nke kwere na Baptism nke Jisus na ọbara Ya |
Nzukọ okpukpe dum kwezuru na nzọputa di n’okwukwe ha nile, ọtutu nēchè kwa na baptism Jisus bu náná otù ozízí nke obodo ndi-Kristian. Ma ọ bughi ezi okwu. N’etiti ọtutu akwukwọ anadigh-aguta aguta nke m’guworo, achọtaputaghm akwukwọ ọ bula bayere nzọputa nke nēzíputa nwekọ n’etiti nb͕aputa di nime baptism na ọbara Jisus ya na nzọputa.
Nání 8 ka azọputaworo n’oge nke Noa. Amaghm ọnu-ọgugu ndi azọputaworo ta, kama ma eleghi anya ha adighi ọtutu. Ndi nke agāzọputa bu ndi nke kwere na baptism na ọbara Jisus. Mb͕e m’nēleta ọtutu nzukọ Krasit, m’nāmazu ọtutu ubò na enweghi onye nēkwusa ozi ọma nke baptism Jisus, nke bu ozi ọma ezi-okwu.
Ọ buru na ayi ekweghi na nb͕aputa nke baptism na ọbara Jisus, ayi ka bu ndi-nmehie. (Ọbuná otù ayi si nāga nzukọ Kraist n’ikwesi ntukwasi-obi.) Ayi puru iga nzukọ Kraist n’ikwesi ntukwasi-obi na ndu nile ayi. Ma ọ buru na ayi ka nwere nmehie n’obi-ayi, ayi ka bu ndi-nmehie.
Ọ buru na ayi gara nzukọ Kraist rue arọ 50 ma ka nwe nmehie n’obi-ayi, okwukwe-ayi nke arọ 50 bu nání nke ugha. Ọ bu ihe dikariri oké nma inwe nání otù ubọchi nke ezi okwukwe. N’etiti ndi kwere na Jisus, nání ndi kwere nke-ọma n’ihe baptism Jisus putara na ọbara Ya ka agākwe ka ha bà n’ala-eze elu-igwe.
Ezi okwukwe bu ikwere na ezi-okwu ahu bú na Ọkpara Chineke ridatara n’uwa nka na emere Ya baptism ibupu nmehie nile nke uwa. Ọ bu okwukwe nke nēdu ayi bà n’ala-eze elu-igwe. Ayi kwesi-kwa-ra ikwere na Jisus wusiri ọbara n’Obe n’ihi mu na gi. Ayi kwesiri ima nka ka ewe kele kwa Ya.
Gini ka ayi bu? Ayi bu umu-ndikom ndi Ọ zọputara site na baptism na ọbara Ya. Àyi gēsi aṅa pu ighara ikele Ya? Emere Jisus baptism na Jọdan mb͕e Ọ b͕ara arọ 30 ka ewe zọputa ayi. Site na nka, O bupuru nmehie nile ayi we nata ikpé n’ihi ayi n’Obe.
Mb͕e ayi nēchè bayere ya, ayi enweghi ihe ayi puru ime kari iweda onwe-ayi we kele Ya. Ayi kwesiri ima na ihe nile Jisus mere n’uwa nka bu n’ihi nzọputa-ayi. Na mbu O ridatara n’uwa nka. Emere Ya baptism, kpọgide-Ya n’Obe, me ka O si na ndi nwuru anwu bilie n’ọnwu mb͕e ubọchi 3 gasiri, ub͕u a nọdu kwa n’aka-nri Chineke.
Nb͕aputa Chineke diri onye ọ bula nime ayi nēwezugaghi. Nzọputa Jisus diri mu na gi. Ayi nēto Chineke n’ihi ihu-n’anya-Ya na ngọzi-Ya nile.
Ayi mara otù abù nke nāga otú a. “♫Enwere akukọ mara nma. N’etiti ọtutu ndi n’uwa, abum onye nwere ihu-n’anya-Ya na nzọputa. O, le ka ihu-n’anya-Ya si di itu-n’anya! Ihu-n’anya-Ya nyem, ihu-n’anya-Ya nyem. Enwere akukọ mara nma. N’etiti ọtutu ndi n’uwa, ayi bu ndi azọputaworo, ndi ghọrọ ndi-Ya. Ayi nēyi ihu-n’anya-Ya dika uwe. O, ihu-n’anya Chineke, amara Chineke. O, le ka ihu-n’anya-Ya si di itu-n’anya! Ihu-n’anya-Ya nyem. ♫”
Jisus ridatara izọputa mu na gi, nb͕aputa ahu nke baptism-Ya bu kwa n’ihi mu na gi. Ozi ọma ahu abughi nání ufọdu akukọ ifo, ọ bu ezi-okwu nke nēweli ayi elu site na ndu ọlu-ike-ayi rue nime ala-eze Chineke mara nma. Okwukwe bu nwekọ di n’etiti Chineke na mu onwem.
O ridatara n’uwa nka ka ewe zọputa-ayi. Emere Ya baptism we nata kwa ikpé n’Obe isachapu nmehie nile ayi.
Le ka o si buru ngọzi mb͕e ndi kwesiri ntukwasi-obi puru ikpọ Chineke Nna-ha! Àyi gēsi aṅa pu ikwere na Jisus dika Onye-nzọputa-ayi ka ewe zọputa-ayi na nmehie site n’okwukwe-ayi? Ọ bu ihe kwere omume n’ihi ihu-n’anya-Ya nke enweghi nsọtu nye ayi. Azọputaworo ayi n’ihi Ya bú onye buru uzọ hu ayi n’anya.
Jisus Sachapuru Nmehie nile ayi Nání Otù Mb͕e
“N’ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu bayere nmehie, nání otù mb͕e, Onye ezi omume n’ihi ndi ajọ omume, ka O we kuru ayi biakute Chineke” (I. Pita 3:18). Emere Jisus Kraist baptism n’ihi nb͕aputa-ayi we nwua kwa otù mb͕e n’Obe ka ewe zọputa mu na gi, ndi ajọ omume.
| Àzọputara-ayi nání otù mb͕e ma-ọbu nwayọ nwayọ? |
| Nání otù mb͕e |
Ka ewe b͕ochiere ayi iguzo n’iru Chineke n’ihi ikpé ayi, Ọ nwuru otù mb͕e n’uwa nka. Ka ayi we pu ibi n’ala-eze elu-igwe n’iru Chineke, O ridatara n’uwa nka n’anu-aru we sachapuchasia nmehie nile ayi nání otù mb͕e site na Baptism Ya, ọnwu-Ya n’Obe, na nbilite-n’ọnwu-Ya.
Ì kwere na Jisus Kraist zọputasiri ayi site na Baptism Ya na ọbara? Ọ buru na ikweghi na ozi ọma nke Baptism Ya na ọbara, apughi izọputa-gi. N’ihi na ayi adighi ike otú a, apughi imu ayi ọzọ ma ọ buru na ayi ekweghi na Jisus sachapusiri nmehie nile ayi nání otù mb͕e site na Baptism Ya na ọbara.
Emere Ya baptism ibupu nmehie nile ayi ewe kpe-Ya ikpé n’Obe n’ihi ayi náná otù mb͕e. Jisus sachapuru nmehie nile nke ndi-nmehie nání otù mb͕e site na nb͕aputa nke Baptism Ya na ọbara.
Ọ gābu ihe agaghi-ekwe omume nye ayi dika ndi madu n’ib͕aputa-ayi ma ọ buru na ayi kwesiri ichèghari n’oge nile ayi mehiere, idi nma we nwe kwa obi-ebere oge nile, we nye kwa nzukọ Kraist ọtutu ihe.
Ya mere, okwukwe na Baptism Jisus na ọbara n’Obe bu ihe aghaghi-idi n’ihi nzọputa-ayi. Ayi aghaghi-ikwere na miri ahu na ọbara ahu. Ayi apughi nání ilu ọtutu ọlu di nma ka ewe mua ayi ọzọ.
Ọ gaghi-eme ezi ihe ọ bula izutara uwe di nma nye ndi ob͕enye ma-ọbu ijere ndi nēlekọta nzukọ Kraist ozi nri di utọ. Jisus nāzọputa nání ndi nke kwere na Baptism Ya na ọbara Ya. Ọ buru na ayi kwere na Chineke zọputara ayi site na Jisus site na Baptism Ya na ọbara Ya nání otù mb͕e, agāzọputa-ayi.
Ufọdu we nēchè na ọbuná Chineke kwuru otú a na Bible, ha kwesiri ichebàra ya èchìchè. Nka di n’aka-ha. Kama ayi kwesiri ikwere n’Okwu-Ya dika edeworo ya.
Na Ndi Hibru 10:1-10, edeworo ya na Ọ zọputara ayi nání otù mb͕e. Ọ bu ezi okwu na Chineke zọputara ndi kwere na baptism ahu na ọbara Jisus ahu nání otù mb͕e. Ayi kwesiri ikweye ya otú a. “♫Ọ nwuru otù mb͕e, zọputa-ayi nile nání otù mb͕e. O umu-nna, kwere ka ab͕aputa-unu. Tiye ibu-unu nile n’okpuru baptism Jisus.♫” Jisus zọputara ayi n’ikpé nēzighi ezi na nmehie nile nání otù mb͕e site na ime Ya baptism otù mb͕e we wusì ọbara otù mb͕e.
“N’ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu bayere nmehie, nání otù mb͕e, Onye ezi omume n’ihi ndi ajọ omume” (I. Pita 3:18). Jisus bu Chineke nēnweghi nmehie, O mehieghi kwa ma-ọli. O ridakuru ayi n’anu-aru izọputa ndi nile na nmehie nile ha. Emere Ya baptism ibupu nmehie nile nke ndi ajọ omume. Ọ zọputara ayi na nmehie na ikpé ezighi ezi.
Atukwasiworo nmehie nile nke ndi nile site n’ọmumu-ha rue na ọnwu-ha n’aru Jisus mb͕e emere Ya baptism, ewe zọputa kwa ha n’ikpé mb͕e O wusiri ọbara we nwu kwa n’Obe. Emere Ya baptism n’ihi ndi-nmehie we nwua kwa n’ọnọdu-ha ndi-nmehie.
Nka bu nb͕aputa nke Baptism Ya. Jisus zọputara ayi nile ndi bu ndi-nmehie nání otù mb͕e. Le otù onye ọ bula nime ayi si ghara idi ike! Jisus b͕aputara nmehie nile ayi site n’ọmumu-ayi rue n’ọnwu-ayi we chu onwe-Ya dika àjà n’ihi ikpé nke Obe. Ayi ndi kwere na Jisus kwesiri ikwere na O were baptism Ya na ọbara zọputa ayi nání otù mb͕e.
Ayi adighi ike, ma Jisus adighi ka ayi. Ayi ekwesighi ntukwasi-obi, ma Jisus kwesiri ntukwasi-obi. Chineke zọputara ayi nání otù mb͕e. “N’ihi na Chineke huru uwa n’anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi” (Jọn 3:16). Chineke nyere ayi Ọkpara Ọ muru nání Ya. O kwereri ka eme Ọkpara-Ya baptism ka ewe tukwasi nmehie nile nke uwa n’aru Ya ka O we nata ikpé n’ihi ndi madu dum.
Le ka nzọputa nka si di itu-n’anya! Le ka ihu-n’anya nka si di itu-n’anya! Ayi nēkele Chineke n’ihi ihu-n’anya na nzọputa Ya. Chineke nāzọputa ndi nke kwere na miri ahu na ọbara Jisus: baptism Jisus na ezi okwu ahu bú na Jisus bu Ọkpara Chineke.
Ya mere, apuru izọputa ndi nke kwere na Jisus site n’ikwere n’ezi okwu nke baptism na ọbara Jisus we nwe kwa ndu ebighi-ebi dika ndi ezi omume. Ayi dum aghaghi ikweye ya.
Ònye zọputara ayi? Ọ̀ Chineke bu onye zọputara-ayi, ma-ọbu otù onye nime ndi O kère èkè zọputara ayi? Ọ bu Jisus, onye bu Chineke, onye zọputara ayi. Azọputara ayi n’ihi na ayi kwere na nb͕aputa Chineke, nka bu kwa nzọputa nke nb͕aputa.
Jisus Bu Onye-nwe Nzọputa
| Gini ka ‘Kraist’ putara? |
| Onye-nchu-àjà, Eze, na Onye-amuma |
Jisus Kraist bu Chineke. Jisus putara Onye-nzọputa, Kraist putara ‘onye etere manu.’ Dika Samuel tere Sọl manu na Testament Ochie, etere ndi-eze manu, etere ndi-nchu-àjà manu ka onye-amuma we je kwa ozi-ya, ekwesiri ite ya manu.
Jisus biara n’uwa nka ewe te kwa Ya manu n’ihi ọlu atọ: nke Onye-nchu-àjà, nke Eze, na nke Onye-amuma. Dika Onye-nchu-àjà nke elu-igwe, emere Ya baptism ibupu nmehie nile nke ndi madu nile nye Onwe-ya.
N’ige nti n’ihe Nna-Ya nāchọ, O chere Onwe-ya dika àjà nmehie n’iru Nna ahu. “Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu” (Jọn 14:6). Jisus zọputara ayi ndi kwere na Ya site n’ibupu nmehie nile ayi site na baptism-Ya na site n’ikpọgide-Ya n’obe.
“N’ihi na ndu nke anu-aru, n’ọbara ka ọ di” (Levitikọs 17:11). Jisus wusiri ọbara n’Obe mb͕e emesiri Ya baptism; otú a chua ndu-Ya n’iru Chineke dika àjà n’ihi ugwọ-ọlu nke nmehie nile ka ewe pu izọputa ayi ndi kwere ekwe.
Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie n’ubọchi nke atọ mb͕e O nwusiri n’Obe we kwusara ndi-mọ nọ n’ulọ-nkpọrọ ozi ọma ahu. Ndi nke azọputaghi dika ndi-mọ nọ n’ulọ-nkpọrọ nke nmehie, nye kwa ha, Jisus nēkwusa ozi ọma nke ezi-okwu, ozi ọma miri ahu na ọbara ahu. Chineke nyeworo ayi ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ izọputa ayi. Amuru onye ọ bula nke kwere na ya ọzọ.
Baptism na Ọbara Jisus Nāzọputa Ndi-nmehie nile
| Àyi gēsi aṅa pu inwe ezi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ? |
| Site n’inwe okwukwe na baptism na ọbara Jisus |
Jisus Kraist bu Onye-nzọputa-ayi, ab͕a-kwa-ra ya àmà na I. Pita 3:21, “Bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n’uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism, ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ.” Miri ahu nke baptism Jisus bu ihe aghaghi-idi nye nzọputa ndi-nmehie.
Jisus sachapuru nmehie nile nke ndi-nmehie site n’ibūru nmehie ndia nye Onwe-ya site na baptism Ya. Ì kwere na baptism Jisus? Ì kwere na asara obi nile ayi di ọcha na nmehie nile site na baptism Jisus? Asara obi nile ayi di ọcha na nmehie nile, kama anu-aru-ayi ka nēmehie.
‘Ib͕aputa madu’ aputaghi na ọ agaghi emehie ọzọ. Ayi nēmehie. Kama obi-ayi nādigide ọcha n’ihi okwukwe-ayi na baptism-Ya. Ọ putara, “Ọ bughi itupu inyi nke aru, kama ọ bu ajuju nke ezi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ” (I. Pita 3:21).
N’ihi na Jisus sachapuru nmehiem nile, n’ihi na Chineke nabatara ikpé n’ihim, m’gēsi aṅa pu ighara ikwere na Ya? Imara na Jisus, onye bu Chineke, zọputaram site na baptism-Ya na ọbara, m’gēsi aṅa pu ighara ikwere na Ya? Azọputara-ayi n’ebe Chineke nọ, ub͕u a akọ-na-ucha-ayi di ọcha. Ayi apughi ikwu ọzọ n’ebe Chineke nọ si na Jisus asachapuchasighi nmehie nile ayi, dika ayi apughi ikwu si na Chineke ahughi ayi n’anya.
Akọ-na-uche-ayi nēnwe nwuta nke-uku we nāgwa ayi mb͕e ọ bula ayi nēme ajọ ihe. Ọ buru na anēsob͕u akọ-na-uche-ayi ọbuná nke ntà, ayi apughi inwere onwe-ayi na nmehie ma ọ buru na ayi ghara ikwere na baptism Jisus. Ọ bu nání uzọ a ka ayi gēsi pu inwe ezi akọ-na-uche.
Mb͕e akọ-na-uche-ayi nēsob͕u ayi, ọ putara na ihe adighi nma. Miri ahu nke baptism Jisus nāsachapu inyi nile nke nmehie. Jisus bupuru nmehie nile ayi site na baptism Ya we sacha ayi di ọcha. Mb͕e ayi kwere nka n’ezie, akọ-na-uche-ayi gādi kwa ọcha n’ezie. Àkọ-na-uche-ayi gēsi aṅa pu idi ọcha? Site n’ikwere na baptism na ọbara Jisus. Onye ọ bula nwere akọ-na-uche jọrọ njọ site n’ọmumu. Kama ọ buru na ayi kwere na atukwasiworo nmehie nile ayi n’aru Jisus, ayi puru ihichapu nmehie nile ayi.
Nka bu okwukwe nke ndi amuworo ọzọ. Ọ bughi ihe nke i nēkwezu site akọ-na-uche. Àkọ-na-uche-gi di ọcha? Ọ̀ di ọcha n’ihi na i biworo ndu di nma, ma-ọbu ọ di ọcha n’ihi na atukwasiri nmehie-gi nile na Jisus na n’ihi na i kwere na Ya? Ọ bu nání site n’okwukwe a ka i puru isi nweta akọ-na-uche di ọcha.
Enwere okwu nile nke nwere ndu na okwu nile nke nēnweghi ndu. Àkọ-na-uche nile nke ndi nile gēsi aṅa pu idi ọcha? Nání uzọ ayi gēsi pu ibu ndi ezi omume we nwe kwa akọ-na-uche di ọcha bu ikwere na nb͕aputa zuru okè sitere na Jisus.
Mb͕e anēdo ayi nsọ site n’ikewere na baptism Ya, ọ putaghi na atupuwo inyi nke aru, kama ọ ajuju nke ezi akọ-na-uche-ayi n’ebe Chineke nọ. N’ihi nka, Ọ biara eme kwa Ya baptism we nwua kwa n’Obe ewe me kwa ka O si na ndi nwuru anwu bilie we nọdu kwa n’aka-nri Chineke.
Mb͕e oge ahu biara, Ọ gaje ibia n’uwa nka ọzọ. “Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ub͕ò abua, ma nmehie adighi ya, ka ewe zọputa ha” (Ndi Hibru 9:28). Ayi kwere na Ọ gaje ibia iwere ayi ndi nēchè Ya, bú ndi kwere na baptism na ọbara Ya.
Nwale Okwukwe dika nke Aru-ike
| Àpuru izọputa ayi ma ewezuga baptism Jisus? |
| Ma-ọli |
Ayi jedebere ime ntakiri nwale nke aru-ike nke ezubeghi n’otù nime Nzukọ Kraist nile.
Pastor Park nke Nzukọ Kraist nka gwara di na nwuye na enweghi nmehie n’uwa, ma ghara ikwu bayere isi baptism Jisus. Di ahu nāraruri ura mb͕e anēkwu okwuchukwu nile mb͕e ọ gara nzukọ Kraist ndi ọzọ n’ihi na ndi nēlekọta nzukọ Kraist anya kwusara ozi ọma we nārapu nb͕aputa sitere na baptism Jisus, otú a manye ya ichèghari kwa-ubọchi.
Kama na nzukọ Kraist ahu, ọ ṅara okwuchukwu nti were anya-ya abua meghe nke-ọma mb͕e ọ nuru na atukwasiri nmehie nile ya na Jisus. O mere ya ka ọ di nfé nwunye-ya ime ya ka o kweye iso ya bia na nzukọ Kraist.
Otù ubọchi, ọ nānọdu na nzukọ Kraist we nu Ndi Rom 8:1. “Ya mere ub͕u a ọ dighi amam-ikpe ọ bula diri ndi nọ nime Kraist Jisus.” Mb͕e ahu, o we che ngwa ngwa, ‘A, ọ buru na madu kwere na Jisus, o nweghi nmehie. N’ihi na m’kwere na Jisus, enweghi kwam nmehie.’
Ya mere ọ kpọrọ ọgọ-ya nwoke na ndi eyì-ya nile n’otù n’otù n’ekwe nti we si, “Ì nwere nmehie n’obi-gi? Mb͕e ahu okwukwe-gi ezighi ezi.” Na nka, Pastor Park amaghi ihe ọ gēme. Di ahu amaghi bayere Baptism Jisus, ma ọ rugidere madu nile na o nweghi nmehie ub͕u a.
Mb͕e ahu di na nwuye ahu malitere inwe ọtutu nsob͕u. Nwunye ahu bururi onye kwesiri ntukwasi-obi kari di-ya, ma ọ ka nwere nmehie n’obi-ya, ebe di-ya siri na o nweghi nmehie. Di ahu gara nzukọ Krasit nání oge ole-na-ole, ma ọ we si na o nweghi nmehie.
Nwunye ahu mazuru na ha abua ka nwere nmehie n’obi-ha. Ha we malite irurita uka bayere ya. Di ahu rugidere na o nweghi nmehie n’ihi na “Ọ dighi amam-ikpe ọ bula diri ndi nọ nime Kraist Jisus.” Ma nwunye-ya we rugide na ọ ka nwere nmehie n’obi-ya.
Mb͕e ahu n’otù ubọchi, nka kpasuru nwuye-ya iwe na o zubere ijekuru we ju onye ahu nēlekọta ulọ nzukọ Kraist anya ihe ọ putara mb͕e ọ siri na atukwasiworo nmehie nile na Jisus.
Ya mere n’otù ubọchi mb͕e ozi òfùfè nke anyasi gasiri, o zigara di-ya n’ulọ we jua Pastor Park ajuju. Ọ we si, “Amaram na i nānwa igwa-ayi ihe, ma m’mara na enwere otù akuku di nkpà ezonariworo. Biko gwam ihe ọ bu.” Pastor Park we gwa ya bayere imu ọzọ site na miri ahu na Mọ Nsọ.
Mb͕e ahu ọ matara otù mb͕e ihe mere eji de ya na Ndi Rom 9:1, “Ọ dighi amam-ikpe ọ bula diri ndi nọ nime Kraist Jisus.” O kwere otù mb͕e ewe zọputa ya. Ọ matara n’ikpé-azu na atukwasiri nmehie nile ayi na Jisus site na baptism Ya ya mere agaghi-ama ndi nọ nime Kraist ikpé.
Ọ malitere ighọta Okwu ahu edeworo. Ọ chọputara n’ikpé-azu na nkpisi-ugodi nke nb͕aputa bu baptism Jisus na ayi puru ighọ ndi ezi omume site na nb͕aputa nke baptism ahu.
Di -ya alaghachighi n’ulọ kama ọ nēchère-ya n’èzí. Ọ juru, “Ab͕aputawo-gi ub͕u a?”
Ma mb͕e ọ gesiri nti n’ihe onye nēlekọta nzukọ Kraist anya gwara nwuye-ya o we nwe aghara n’obi. Ọ nughi ma-ọli bayere ozi ọma baptism Jisus na mbu. Ọ we mazue na o nweghi nmehie n’obi-ya ọbuná mb͕e ewezugara baptism Jisus. Ya mere n’ulọ, ha nārurita uka ọzọ.
N’oge a, ọnọdu b͕anwere. Nwuye ahu we manye di ahu ka o nwere nmehie n’obi-ya ma-ọbughi. Ọ juru ya otù ọ gēsi pu inọ nēnweghi nmehie mb͕e o kweghi na baptism Jisus. O we kwaye ya ka o le anya n’akọ-na-uche-ya nke-ọma. Ọ matara mb͕e o nēnyocha n’akọ-na-uche-ya na ọ ka nwereri nmehie n’obi-ya.
Ya mere o jekuru Pastor Park we kwuputa na o nwere nmehie n’obi-ya. Ọ juru, “Mb͕e ha tiyere aka-ha abua n’isi ewu-ọpupu ahu, ọ̀ bu tutu ha b͕ue ya, ma-ọbu mb͕e ha b͕usiri ya?” Ọ nughi ma-ọli bayere ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ. Ya mere o nwere aghara di egwù.
Nka bu isi-okwu nke nwale nke ime-mọ a. Ekwesiri ime Jisus baptism ka ewe tukwasi nmehie nile nke uwa n’aru Ya. Nání mb͕e ahu ka Ọ puru inwu n’Obe n’ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu.
“Hà bikwasiri aka-ha abua n’isi àjà ahu tutu, ma-ọbu mb͕e eb͕usiri ya?” Ọ juru nka n’ihi na o nwere aghara bayere ibikwasi aka-abua na baptism Jisus. Ya mere Pastor Park kọwara-ya nb͕aputa nke baptism Jisus.
N’ubọchi ahu, di ahu we nu na mbu ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ ewe b͕aputa kwa ya. Ọ nuru ozi ọma ahu nání otù mb͕e ewe naputa kwa ya.
Nka bu nwale nke nēwepu baptism Jisus. Ayi puru ikwu na ayi enweghi nmehie, ma n’ezie ayi ka nwere nmehie n’obi-ayi ma ewepu baptism Jisus. Ndi nile nāsi kari na Jisus sachara nmehie nile site n’inwu n’Obe, ma nání ndi nke kwere na baptism na ọbara Jisus puru ikwu na ha enweghi nmehie n’ebe Chineke nọ.
Pastor Park nwaputara site na di na nwuye ahu na apughi ib͕aputachasi ayi na nmehie nile ayi ma ewepu nb͕aputa sitere na okwukwe na baptism Jisus.
Ihe-Atù nke Nzọputa: Baptism Jisus
| Gini bu ihe-atù nke nzọputa? |
| Baptism nke Jisus |
“Bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n’uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism.” Jisus ridatara isachapu nmehie nile nke uwa, ime ka akọ-na-uche-ayi di ọcha ka snow. Asaworo nmehie nile ayi n’ihi na Jisus būru ha nye Onwe-ya site na baptism Ya. Ọ zọputara ayi site na baptism Ya na ọbara. Ya mere, madu dum kwesiri ib͕u ikperè n’ala n’iru Ya.
Anāzòputa ayi site n’ikwere na Jisus. Ayi nāghọ umu Chineke we ga n’elu-igwe site n’ikwere na Jisus. Ayi gāghọ ndi ezi omume site n’ikwere na Jisus. Ayi bu òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze. Ayi puru ikpọ Chineke Nna-ayi. Ayi nēbi n’uwa nka, ma ayi bu ndi eze.
Ì kwere n’ezie na Chineke zọputara ndi ahu nime ayi ndi kwere na nb͕aputa nke miri ahu na Mọ Nsọ? Nb͕aputa-ayi apughi izu okè ma-ọli ma ewezuga baptism Jisus. Ezi okwukwe nke Chineke na Jisus nēkwezu bu ikwere na ozi ọma nke Jisus nke nāzọputa ayi site na baptism Ya, Obe Ya, na Mọ Nsọ. Nka bu nání ezi okwukwe.
Asachapuru nmehie nile ayi mb͕e Jisus bupuru ha site na baptism ewe kwua ugwọ nmehie nile ayi mb͕e Ọ wusiri ọbara n’Obe. Kraist Jisus zọputara-ayi site na miri ahu na Mọ Nọ. E! Ayi kwere!
Okwuchukwu a dịkwa n`ụdị ebook. Pịa na mkpuchi akwụkwọ n`okpuru.