• All e-books and audiobooks on The New Life Mission website are free
  • Explore multilingual sermons in global languages
  • Two new revised editions in English have been released
  • Check out our website translated into 27 languages
Search

Sermons

Isi-okwu 4 : Ǹēdozi Nmehie Kwa-ubọchi

[4-1] Ozi Ọma ahu nke Nkpuchi-nmehie Babigara Ókè (Jọn 13:1-17)

Ozi Ọma ahu nke Nkpuchi-nmehie Babigara Ókè (Jọn 13:1-17)

 
(Jọn 13:1-17)
“Ma mb͕e ememe ngabiga akērughi, ebe Jisus matara na oge hour Ya abiawo ka O si n’uwa nka lakuru Nna-Ya, ebe Ọ huru ndi nke aka Ya nọ n’uwa n’anya, Ọ huru ha n’anya rue ogwugwu ihe nile. Mb͕e ha nēri nri-anyasi, mb͕e ekwensu tinyesiri ub͕u a n’obi Judas Iskariot, nwa Saimon, ka ọ rara Ya nye, Jisus, ebe Ọ matara na nna-Ya nyere Ya-ri ihe nile n’aka, na O si-kwa-ra n’ebe Chineke nọ puta, nālakuru kwa Chineke, O bilie na nri-anyasi, wusa uwe-Ya, we chiri ákwà anēji hicha aru, we ke Onwe-ya n’úkwù. Mb͕e ahu O tinye miri n’ihe anēji sa aru, we malite isa ukwu ndi nēso uzọ-Ya, na iji ákwà anēji hicha aru nke O kereri n’úkwù hicha ukwu-ha. Ya mere Ọ biakute Saimon Pita. Ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, Gì onwe-gi nāsa ukwum? Jisus zara, si Ya, Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri. Pita si Ya, I gaghi-asa ukwum ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. Jisus zara ya, si, Ọ buru na asaghm i, Mu na gi enweghi òkè ọ bula. Saimon Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ bughi nání ukwum, kama akam abua kwa na isim. Jisus si ya, Onye asaworo aru, nkpà isa aru ọzọ adirighi ya ma-ọbughi isa ukwu-ya, kama aru-ya dum di ọcha: unu onwe-unu di kwa ọcha, ma ọ bughi unu nile. N’ihi na Ọ matara onye gaje irara Ya nye; n’ihi nka ka Ọ siri, Ọ bughi unu nile di ọcha. Ya mere mb͕e Ọ sasiri ukwu-ha, chiri kwa-uwe Ya, nọdu kwa ala ọzọ, Ọ si ha, Ùnu mara ihe M’meworo unu? Unu onwe-unu nākpọm, Onye-ozizí, na, Onye-nwe-ayi: unu nēkwu kwa nke-ọma; n’ihi na ọ bu otú M’di. Ya mere, Ọ buru na Mu onwem, bú Onye-nwe-unu na Onye-ozizí-unu, sara ukwu-unu, unu onwe-unu nēji kwa ugwọ isarita ukwu ibe-unu. N’ihi na enyewom unu ihe-nṅomi, ka unu onwe-unu we nēme kwa dika Mu onwem mere unu. N’ezie, n’ezie, asim unu, Orù adighi-aka onye-nwe-ya uku; onye-ozi adighi-aka kwa onye zitere ya uku. Ọ buru na unu matara ihe ndia, ngọzi nādiri unu ma asi na unu nēme ha.” 
 
 
Gini mere Jisus ji sa ukwu Pita n’echi ubọchi ememe Ngabiga ahu? Mb͕e Ọ sa ukwu-ya, Jisus siri, “Gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a, ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.” Pita bu onye kachasi nma n’etiti ndi nēso uzọ Jisus. O kwere na Jisus bu Ọkpara Chineke we b͕a àmà na Jisus bu Krasit ahu. Dika Jisus sara ukwu-ya, aghaghi inwe ihe mere eji me nka. Mb͕e Pita kwuputara okwukwe-ya na Jisus bu Kraist ahu, ọ putara na o kwere na Jisus bu Onye-nzọputa nke gāzọputa-ya na nmehie-ya nile.
 
Gini mere Jisus jiri sa ukwu nke ndi nēso uzọ-Ya tutu akpọgide-Ya n’obe?
N’ihi na Ọ chọrọ ka ndi nēso uzọ-Ya ghọta nzọputa-Ya zuru okè.
 
Gini mere O jiri sa ukwu Pita? Jisus mara na Pita gāgọnari Ya ub͕ò atọ n’oge nādighi anya na ọ gāga n’iru imehie n’ọdi-n’iru.
Ọ buru na, mb͕e Jisus rigoro n’elu-igwe, Pita nwereri nmehie ọ bula fọduru n’obi-ya, ya na Jisus agaghi-etokọ buru otù ihe. Ma Jisus mara adighi-ike nke ndi nēso uzọ-Ya nile, Ọ chọghi kwa ka nmehie nile ha kpa ókè n’etiti Ya na ndi nēso uzọ-Ya. Ya mere, Ọ chọrọ izí ha na asachapuworori ajọ omume ha nile. Nka bu ihe mere O ji sa ukwu ndi nēso uzọ-Ya. Jisus, tutu Ọ nwua we rapu ha, mere ka ha ghọta ozi ọma nke baptism-Ya na nb͕aghara nmehie zuru okè nke ogologo ndu nmehie nile ha (Bupuru Nmehie).
Jọn 13 nēkwu bayere nzọputa zuru okè nke Jisus mezururi nye ndi nēso uzọ-Ya. Mb͕e Ọ nāsa ukwu-ha, Jisus gwara ha bayere amam-ihe ozi ọma nke baptism Ya nke apuru isite na ya sacha madu dum na ndahie nile ha.
“Ka ekwensu eduhiela-unu n’ọdi-n’iru. M’bupuworo nmehie nile unu site na baptism Mu n’Osimiri Jọdan M’ga būru ikpé ha n’Obe. Mb͕e ahu, agēme ka M’si na ndi nwuru anwu bilie we mezu nzọputa nke imu ọzọ nye unu dum. Izí unu na M’sachapururi ọbuná nmehie nile unu nke ọdi-n’iru, izí-unu ozi ọma mbu nke nb͕aghara (Bupuru Nmehie) nmehie nile, M’nāsa ukwu-unu tutu akpọgidem n’obe. Nka bu ihe-nzuzo nke imu ọzọ. Unu dum kwesiri ikwere otú a.” 
Ayi dum kwesiri ighọta ihe mere Jisus ji sa ukwu ndi nēso uzọ-Ya we mara ihe mere O ji si, “Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.” Nání mb͕e ahu ka ayi puru ikwere n’ozi ọma imu ọzọ ka ewe mua ayi onwe-ayi ọzọ n’ezie.
 
 
Ọ Si na Jọn 13:12 
 
Gini bu ndahie nile?
Ha bu nmehie nile nke ayi nēme kwa-ubọchi n’ihi na ayi adighi ike.
 
Tutu Ọ nwua n’Obe, Jisus ya na ndi nēso uzọ-Ya rikọrọ ememe Ngabiga ahu we me ka ha kweye ozi ọma nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie site na iwere aka nke Ya sa ukwu-ha.
“Jisus, ebe Ọ matara na nna-Ya nyere Ya-ri ihe nile n’aka, na O si-kwa-ra n’ebe Chineke nọ puta, nālakuru kwa Chineke, O bilie na nri-anyasi, wusa uwe-Ya, we chiri ákwà anēji hicha aru, we ke Onwe-ya n’úkwù. Mb͕e ahu O tinye miri n’ihe anēji sa aru, we malite isa ukwu ndi nēso uzọ-Ya, na iji ákwà anēji hicha aru nke O kereri n’úkwù hicha ukwu-ha. Ya mere Ọ biakute Saimon Pita. Ọ si Ya, Onye-nwe-ayi, Gì onwe-gi nāsa ukwum? Jisus zara, si Ya, Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.” (Jọn 13:3-7).
O zíri ndi nēso uzọ-Ya ozi ọma nke baptism na nkpuchi nmehie sitere na miri ahu nke baptism Ya. 
N’oge ahu, n’ikwesiri Jisus ntukwasi-obi, Pita enweghi ike ighọta ihe mere Jisus ji sa ukwu-ya. Mb͕e Jisus gwasiri ya okwu, uzọ nke o si kwere na Jisus b͕anwereri. Jisus chọrọ izí-ya bayere nb͕aghara nmehie (Sachapuru Nmehie), bayere ozi miri ahu nke baptism Ya.
Ọ nēcheb͕u Onwe-ya na Pita puru ighara ibiakute Ya n’ihi nmehie-ya nile nke ọdi-n’iru, karicha nmehie nile nke anu-aru-ya n’ọdi-n’iru. Jisus sara ukwu-ha ka ekwensu ghara ipu ibupu okwukwe nile nke ndi nēso uzọ-Ya. Emesia, Pita ghọtara ihe mere.
Jisus jikere uzọ ahu ka onye ọ bula nke kwere na miri ahu nke baptism Ya, na ọbara we buru onye agāb͕aputa na nmehie-ya nile rue mb͕e ebighi-ebi. 
Na Jọn 13, edekọrọ okwu nile O kwuru mb͕e Ọ nāsa ukwu ndi nēso uzọ-Ya. Ha bu okwu di nkpà nke nání ndi amuworo ọzọ puru ighọta n’ezie.
Ihe mere Jisus ji sa ukwu ndi nēso uzọ-Ya tutu ememe Ngabiga bu inyere ha aka imazu na O bupururi nmehie nile nke ogologo ndu nile ha. Jisus siri, “Ihe mere M’ji nāsa ukwu-gi i ghọtaghi ya ub͕u a, kama i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.” Okwu ndia nye Pita nwere ezi-okwu nke nb͕aputa imu ọzọ.
Ayi nile kwesiri imara we kwere na Baptism Jisus, nke sachapuworo ajọ omume nile ayi. Baptism Jisus na Jọdan bu ozi ọma nke ‘itukwasi’ nmehie nile, site n’ibikwasi aka n’isi. Ayi nile kwesiri ikwere n’okwu nile Jisus. O bupuru nmehie nile nke uwa site na baptism Ya we nweta nb͕aghara nmehie nile (Bupuru Nmehie) site n’ikpe-Ya ikpé we ikpọgide kwa Ya n’obe. Emere Jisus baptism ime ka ndi nile pua na nmehie nile ha.
 
 

Emezuworo Nb͕aghara Ndahie Nile Ayi (Bupuru Nmehie) site na Baptism na Ọbara Jisus 

 
Gini bu ‘ọnyà’ ekwensu megide ndi ezi omume?
Ekwensu nānwa iduhie ndi ezi omume ka o we me ha ndi-nmehie ọzọ.
 
Jisus mara nke-ọma na mb͕e akpọgidesiri Ya n’obe, we me kqa ka O bilie n’ọnwu, we rigoro n’elu-igwe, ekwensu na ndi nēkwusa okwukwe ugha gaje ibia we nwa iduhie ndi nēso uzọ ahu. Ayi puru ihu site na àmà Pita, “Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke di ndu,” na o kwere na Jisus. Ma ọbuná nka, Jisus chọrọ ichetara Pita otù mb͕e ọzọ idebe ozi ọma nke nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie n’uche. Ozi ọma ahu bu Baptism Jisus, nke O sitere na ya bupu nmehie nile nke uwa. Ọ chọrọ izí ya otù mb͕e ọzọ nye Pita na ndi nēso uzọ nye kwa ayi, ndi gaje ibia ma emesia. “Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri”
Mb͕e ọ bula ndi nēso uzọ Jisus mehiere, ekwensu nānwa ima ha ikpé, nāsi, “Le! Ọ buru na i ka nēme nmehie, Ì gēsi aṅa pu ikwu na inweghi nmehie? Azọputaghi-gi. I bu nání onye-nmehie.” Ka ewe b͕ochie nka, Jisus gwara ha na okwukwe-ha na Baptism Jisus sachapururi nmehie nile nke ogologo ndu-ha—nke gara aga, nke ub͕u a, na nke ọdi-n’iru.
“Unu dum mara na emerem baptism! Ihe mere ejiri mem baptism na Jọdan bu isachapu nmehie nile nke ogologo ndu-unu, ya na nmehie mbu nke ndi madu. Ùnu puru ighọta ihe mere ejiri mem baptism ub͕u a, ihe mere ejiri kwesi ikpọgidem n’obe we nwua kwa n’Obe?” Jisus sara ukwu ndi nēso uzọ-Ya igosi ha na O bupururi nmehie nile ha nke kwa-ubọchi site na baptism Ya na O gēbūru ikpé diri ha n’Obe.
Ub͕u a, ab͕aputaworo mu na gi na nmehie nile ayi site n’okwukwe n’ozi ọma nke Jisus Baptism na ọbara, nke bu nb͕aghara nmehie nile ayi (Sachapuru Nmehie). Emere Jisus baptsim we kpọgide Ya n’obe n’ihi ayi. Ọ sachapuworo nmehie nile ayi site na baptism Ya na ọbara. Onye ọ bula nke mara we kwere kwa n’ozi ọma nke nkpuchi nmehie nile, onye ọ bula nke kwere n’ezi-okwu ahu, ab͕aputawo ya na nmehie-ya nile.
Mb͕e ahu gini ka madu kwesiri ime mb͕e azọputasiri-ya? Madu ahu kwesiri ikwezu nmehie-ha nile kwa-ubọchi we kwere kwa na nzọputa nke baptism na ọbara Jisus, ozi ọma nke nkpuchi nmehie nile. Madu ahu kwesiri iwebà n’obi-ya ozi ọma na Jisus bupuru nmehie nile site na baptism Ya na ọbara Ya.
Nání n’ihi i nēmehie ọzọ, ì gābu onye-nmehie ọzọ? É-è. N’imara na Jisus bupuru nmehie nile ayi, ayi gēsi aṅa pu ighọ ndi-nmehie ọzọ? Baptism Jisus na ọbara Ya n’Obe bu ozi ọma nke nkpuchi nmehie nile ayi. Onye ọ bula nke kwere n’ozi ọma mbu nke nb͕aghara (Hichapu Nmehie) nmehie nile ka amuworo ọzọ dika ‘onye ezi omume.’
 
 

Ndi Ezi Omume Apughi Ighọ Ndi-nmehie Ọzọ Ma-ọli 

 
Gini mere ndi ezi omume apughi ighọ ndi-nmehie ọzọ?
N’ihi na Jisus kpuchiri-ri nmehie nile nke ogologo ndu-ha.
 
Ọ buru na i kwere n’ozi ọma nke nb͕aghara (Hichapuru Nmehie) nmehie nile, nke miri ahu na Mọ Nsọ, kama ka nēchè na i bu onye-nmehie n’ihi ndahie-gi nile nke kwa-ubọchi, mb͕e ahu i kwesiri iga na Jọdan ebe emere Jisus baptism ibupu nmehie-gi nile. Ọ buru na i nāghọ onye-nmehie ọzọ mb͕e i natasiri nkpuchi nmehie nile (Bupuru Nmehie), èkwesiri ime Jisus baptism ọzọ? I kwesiri inwe okwukwe na nb͕aghara nmehie nile (Bupuru Nmehie) n’ozi ọma nke baptism Jisus. I kwesiri idebe ya n’uche-gi na Jisus bupuru nmehie-gi nile nání otù mb͕e site na baptism Ya. I kwesiri inwe okwukwe nke nādighi eruda n’ala na Jisus Kraist dika Onye-nzọputa-gi.
Ikwere na Jisus dika Onye-nzọputa-gi putara na i kwere na baptism Jisus, nke bupuru nmehie nke ogologo ndu-gi nile. O buru na i kwere na baptism Ya n’ezie, Obe ahu, ọnwu ahu, na nbilite-n’ọnwu Jisus, i pughi ighọ onye-nmehie ọzọ ma-ọli, ọbuná udi nmehie i meworo. Ab͕aputawo gi na nmehie nile nke ogologo ndu-gi site n’okwukwe-gi.
Jisus Kraist sachapuru nmehie nile nke ọdi-n’iru kwa, ọbuná nmehie nile nke ayi nēme n’ihi adighi-ike-ayi. N’ihi na Jisus kwesiri ikwusi nkpà baptism Ya ike, O were miri sa ukwu ndi nēso uzọ-Ya igosiputa ozi ọma nb͕aghara (Bupuru Nmehie) nmehie nile, baptism Ya. Emere Jisus Kraist baptism, kpọgide Ya n’obe, bilie n’ọnwu, we rigoro n’elu-igwe imezu nkwà Chineke nke nkpuchi-nmehie babigara ókè n’ihi nmehie nile nke uwa izọputa ndi madu dum. N’ihi ya, ndi nēso uzọ-Ya nwere ike ikwusa ozi ọma nke nkpuchi nmehie nile, Baptism Jisus, Obe ahu, na nbilite-n’ọnwu ahu, rue na ọgwugwu ndu-ha.
 
 
Adighi-ike nke Anu-aru Pita 
 
Gini mere Pita ji gọnari Jisus?
N’ihi na ọ dighi ike
 
Bible nāgwa ayi na mb͕e busoro Pita agha site n’aka ndi nējere Kaiafas bú onye-isi-nchu-àjà ozi we bo kwa ya ebubo ibu otù nime ndi nēso Jisus, ọ gọnariri ya ub͕ò abua, nāsi, “Amataghm Nwoke a!” Mb͕e ahu ọ duru ikwù we ṅuara ya iyí nke ub͕ò atọ.
Ka ayi gu ama-okwu ahu ebe a. Si na Matiu 26:69, “Ma Pita nọduru n’èzí n’obí: otù nwa-ab͕ọghọ we biakute ya, si, Gi onwe-gi na Jisus Onye Galili nọ-kwa-ra. Ma ọ gọrọ n’iru ha nile, si, Amataghm ihe i nēkwu. Ma mb͕e ọ puru je n’uzọ-nbata, nwa-ab͕ọghọ ọzọ huru ya, ọ si ndi nọ n’ebe ahu, Nwoke a na Jisus Onye Nazaret nọ-kwa-ra. O were iṅu-iyí gọ kwa ọzọ, si, Amataghm Nwoke a. Ma mb͕e nwa oge gasiri ndi guzoro nso biakutere Pita, si ya, N’ezie gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha; n’ihi na okwu-ọnu-gi nēweputa gi n’ìhè. Mb͕e ahu ọ malitere idu ikwù na iṅu iyí, si, Amataghm Nwoke a. Ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa ákwá. Pita we cheta okwu Jisus kwururi, si, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi, i gāgọnarim ub͕ò atọ. O we pua, kwa ákwá nke-uku” (Matiu 26:69-75). 
Pita kwere na Jisus n’ezie we soro Ya n’ikwesi ntukwasi-obi. O kwere na Jisus bu “Kraist ahu, Ọkpara Chineke di ndu.” Ma mb͕e eduru Jisus ga n’ulo ikpé Kaiafas, o we di egwù ikpughe nwekọ ya na Jisus, ọ gọnariri we du Ya ikwù.
Pita amataghi na o gāgọnari Jisus. Kama Jisus mara na ọ gāgọnari. Jisus mara adighi-ike Pita nke-ọma. Ya mere, Jisus sara ukwu Pita we zíe kwa ya ozi ọma nzọputa dika edeworo ya na Jọn 13, “I gēmehie n’ọdi-n’iru, ma m’sachapururi nmehie nile nke ọdi-n’iru-gi.”
Pita gọnariri Jisus n’ezie mb͕e ọ nọ n’ize-ndu, ma ọ bu n’ihi adighi-ike nke anu-aru-ya mere ka o me nka. Ya mere, ka ewe zíe ndi nēso uzọ-Ya na Ọ zọputara ha na ajọ omume nile ha nke ọdi-n’iru-ha, Jisus buru uzọ sa ukwu ha.
“M’zọputaworori unu na nmehie nile unu nke ọdi-n’iru-unu, kwa. Agākpọgidem n’obe n’ihi na emerem baptism we bupu kwa nmehie nile unu, M’gākwupu ugwọ-ha nile ighọrọ unu dum ezi Onye-nzọputa. Abum Chineke unu, Onye-nzọputa-unu. M’gākwucha ugwọ nmehie unu nile, M’gāghọ kwa Onye nāzù unu dika aturu site na baptism Mu na ọbara. Abum Onye nāzù unu dika aturu nke nzọputa-unu.” 
Ikusi ezi-okwu a ike dika ihe-ọkukú n’obi-ha, Jisus sara ukwu-ha tutu ememe Ngabiga. Nka bu ezi-okwu nke ozi ọma ahu.
N’ihi na anu-aru-ayi adighi ike ọbuná mb͕e amuworo ayi ọzọ, ayi gēmehie ọzọ. N’ezie, ayi ekwesighi imehie, ma dika Pita zutere nsob͕u siri ike n’ihi nmehie nke amaghi-ama, ayi kwa puru imehie n’ezie n’amaghi-ama. N’ihi na ayi nēbi ndu dika anu-aru si chọ, anēduru ayi rue na nbibi site n’aka nmehie-ayi. Anu-aru-ayi gēmehie ka ha ra bu ogologo oge ayi nēbi n’uwa nmehie a, ma Jisus hichapuru nmehie ndia nile site na baptsim Ya na ọbara n’Obe.
Ayi anaghi agọnari na Jisus bu Onye-nzọputa-ayi, ma mb͕e ayi nēbi ndu dika anu-aru si chọ, ayi nāga n’iru imehie megide ihe Chineke nāchọ. Ọ bu n’ihi na amuworo ayi site n’anu-aru.
Ma Jisus mara nke-ọma na ayi bu ndi-nmehie n’anu-aru. Jisus ghọrọ Onye-nzọputa-ayi site n’ikwupu ugwọ nmehie-ayi site na baptism Ya na ọbara. O meworo ka ayi nwere onwe ayi na nmehie nile site n’ikwere na nzọputa-Ya na nbilite-n’ọnwu-Ya.
Ozi Ọma anọ ahu nāmalite na baptism Jisus sitere n’aka Jọn baptist. Isi ndu nke madu Ya bu imezu ozi ọma imu ọzọ, ozi ọma nzọputa.
 
Ògologo oge ra aṅa ka ayi nēmehie n’anu-aru?
Ayi nēmehie na ndu nile ayi rue ubọchi ayi nānwu.
 
Mb͕e Pita gọnariri Ya ọ bughi otù mb͕e, ma-ọbu ub͕ò abua, kama ub͕ò atọ tutu oke-ọkuku kwa ákwá, ọ gēsi aṅa tiwa obi-ya? Le ka o si nwe ihere? Ọ ṅuru iyí n’iru Jisus na ọ gaghi arara Ya nye ma-ọli. O mehiere n’ihi adighi-ike nke anu-aru-ya, ma òle otù ọ gēsi kwesiri ebere mb͕e ọ dabàra na adighi-ike-ya we gọnari Jisus ọ bughi otù mb͕e, kama ub͕ò atọ? Òle otù ọ gēsi nwe ihere mb͕e o lere Jisus anya ọzọ?
Ma Jisus mara ihe ndia nile na ndi ọzọ. Ya mere, O siri, “M’mara na i gēmehie ọzọ. Ma M’bupururi nmehie ndia nile site na baptism Mu, ka nmehie-gi emela-gi ka isu ngọngọ we me gi onye-nmehie ọzọ, ka i ghara ihu-ya dika ihe agaghi-ekwe omume ilaghachikutem ọzọ. M’ghọworo Onye-nzọputa zuru okè nye gi site n’imem baptism we kpem ikpé n’ihi nmehie-gi nile. M’ghọworo Chineke-gi, Onye nāzù gi dika aturu. Kwere na ozi ọma nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie-gi nile. M’gāga n’iru ihu gi n’anya ọbuná ma ọ buru na i me nmehie n’anu-aru. M’sachapururi ajọ omume gi nile. Ozi ọma nb͕aghara (Bupuru Nmehie) nmehie nile gi nādi ire rue ebighi-ebi. Ihu-n’anyam nye gi nādi kwa rue ebighi-ebi.”
Jisus gwara Pita ya na ndi nēso uzọ ahu, “Ọ buru na asaghm i, Mu na gi enweghi òkè ọ bula.” Ihe mere O ji kwue bayere ozi ọma nka na Jọn 13 bu na o di nkpà imu ndi madu ọzọ site na miri na Mọ Nsọ. Ì kwere na nka?
N’ama-okwu nke 9-10, “Pita si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ bughi nání ukwum, kama akam abua kwa na isim. Jisus si ya, Onye asaworo aru, nkpà isa aru ọzọ adirighi ya ma-ọbughi isa ukwu-ya, kama aru-ya dum di ọcha.”
Ndi eyì m’huru n’anya, ùnu gēme nmehie ‘nke anu-aru’ n’ọdi-n’iru, ma-ọbu unu gaghi-eme? Unu gēme n’ezie. Ma Jisus siri na O sachapururi ọbuná nmehie nile nke ọdi-n’iru, ajọ omume nile nke anu-aru-ayi site na baptism Ya na ọbara Ọ we gwa ndi nēso uzọ-Ya okwu ezi-okwu ahu nke-ọma, nke ozi ọma nkpuchi-nmehie tutu akpọgide Ya n’obe.
N’ihi na ayi nēbi ndu n’anu-aru-ayi site na adighi-ike-ayi, ayi apughi ighara imehie. Jisus sachapuru nmehie nile nke uwa site na baptism Ya. Ọ sachaghi nání isi na aru ayi, kama ukwu ayi kwa, nmehie nile ayi nke ọdi-n’iru. Nka bu ozi ọma nke imu ọzọ, nke Baptism Jisus.
Mb͕e emesiri Jisus baptism, Jọn Baptist b͕ara àmà, “Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!” (Jọn 1:29) Ayi kwesiri ikwere na nmehie nile nke uwa ka asachapuworo site n’itukwasi ha n’aru Jisus mb͕e emere Ya baptism.
Mb͕e nēbi ndu n’uwa nka, ndi madu apughi ighara imehie. Ayi kwesiri inabata nka dika ezi-okwu kachasinu. Mb͕e ọ bula adighi-ike nke anu-aru-ayi putara ìhè, ayi kwesiri ichetara onwe-ayi na Jisus sachapuru nmehie nile ayi na nmehie nile nke uwa site na ozi ọma nke baptism we kwua ugwọ-ha site na ọbara Ya. Ayi kwesiri inye Ya ekele site nime ala obi-ayi. Ka ayi jiri okwukwe kwuputa na Jisus bu Onye-nzọputa-ayi na Chineke-ayi. Tonu Onye-nwe-ayi.
Onye ọ bula n’uwa nka nēmehie site n’anu-aru. Ndi madu nānwu n’ihi nmehie nile nke ogologo ndu anu-aru-ha. Ndi madu nēmegide nmehie site n’anu-aru-ha.
 
 
Ajọ Èchìchè nile di n’Obi Ndi nile 
 
Gini nēmeru madu?
Nmehie di iche iche na ajọ èchìchè nile
 
Jisus nāsi na Matiu 15:19-20. “N’ihi na n’obi ka ajọ èchìchè nile, ib͕u-madu nile, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko nile, ori nile, àmà ugha nile, nkwulú nile, si aputa: ndia bu ihe nēmeru madu: ma iwere aka anākwọghi akwọ iri ihe adighi-emeru madu.” N’ihi nmehie di iche iche n’obi madu nēmeru ya, ha dighi ọcha.
 
 
Madu Kwesiri Imazu Ajọ Òkìkè Nke Aka Ya 
 
Gini nọ n’obi madu nile?
Udi nmehie ahu di iri na abua (Mak 7:21-23)
 
Ayi kwesiri inwe ike ikwu si, “Udi nmehie ndia di iri na abua nọ n’obi ndi nile. M’nwere ha nile n’obim. M’nwere udi nmehie ahu di iri na abua nimem nke edeworo bayere-ya na Bible.” Tutu amua ayi ọzọ site na miri na Mọ Nsọ, ayi kwesiri ikwezu na nmehie nile ahu nọ n’obi-ayi. Ayi kwesiri imazu na ayi bu ndi-nmehie zuru okè n’iru Chineke. Ma ayi anaghi eme nka ọtutu mb͕e. Ọtutu nime ayi nēme ọtutu ihe-ngọpu n’ihi nmehie nile ayi, nāsi, “Enweghm èchìchè ndia ahu n’obim ma-ọli, emere ka m’hie uzọ nwa mb͕e ntà.” 
Ma gini ka Jisus kwuru bayere ndi madu? O mere ka ọ di ọcha na ihe nke si nime obi madu puta ‘nēmeru’ ha. Ọ gwara ayi na ndi nile nwere ajọ èchìchè nime ha. Gini ka i nēchè? Ì di nma ma-ọbu i jọrọ njọ? Ì mara na madu nile nwere èchìchè nile jọrọ njọ? E, èchìchè madu nile jọrọ njọ.
Ogologo oge gara aga ngalaba ulọ ahia nke Sampoong Department Store na Seoul tọb͕ọrọ n’ala n’otù ntabi-anya. Èzí-na-ulọ nile nke ndi ha huru n’anya nwuru anwu nọ n’oké ihe-nb͕u riri nne n’obi. Ma ọtutu madu gara n’ebe ahu iji nkiri ahu di egwù nwe aṅuri.
Ufọdu chere, ‘Madu òle nwuru? 200? É-è, ọnu-ọgugu a di ntà, 300? Mà eleghi anya? Ọ di nma, ọ gādi nnọ̄ utọ kari we di kwa nma ikiri anya ma asi na ọnu-ọgugu ndi nwuru anwu ruworo nnù abua na ọgu iri.’ Obi ndi nile puru idi njọ otú a. Ayi kwesiri inabata ya. Le ka o si buru ihe enweghi nsọpuru nye ndi nwuru anwu! Le ka o si buru ihe nētiwa-obi nye èzí-na-ulọ nile ahu! Ufọdu bu ndi ebibiri n’ebe ego di.
N’ezie, ufọdu nime ndi nēkiri ihe ahu anya enweghi obi ebere ri nne. ‘Ọ gādi nnọ̄ utọ karia ma asi na ọtutu nwuru! Le ihe-nkiri! Gini gēme ma ọ buru n’otù ihe a me na ballpark ebe juputara na ndi madu? Agēli ọnu-ọgugu riri nne nke anāpughi iguta nime nkume ulo na àjà, àgaghi elei ha? O, E! Ọ gābu ihe dikariri nka obi utọ n’ezie!’ Ma eleghi anya ufọdu nwere èchìchè nile di otú a.
Ayi dum matara otù ayi si adi njọ mb͕e ufọdu. N’ezie, ha agaghi ekwuputa udi ajọ èchìchè nile n’oké olu ma-ọli. Ha puru itachi ire ha nile we kwuputa ọmiko ha, ma na nzuzo, n’obi-ha, ha nāchọsi ike ka ọ dikaria nma ikiri anya. Ha nāchọ ihu ihe ọnọdu ọjọ di egwù ebe agēb͕u ọnu-ọgugu riri nne nke anāpughi iguta ka ha ra bu mb͕e ọ nādighi emegide ọchichọ-ha nile. Ọ bu uzọ obi ndi madu si alu ọlu. Ọtutu nime ayi di otú a tutu amua ayi ọzọ.
 
 
Ib͕u-madu n’Obi Madu Nile 
 
Gini mere ayi ji emehie?
N’ihi na ayi nwere èchìchè nile jọrọ njọ n’obi-ayi.
 
Chineke gwara ayi na enwere ib͕u-madu n’obi madu nile. Ma ọtutu gāgọnari ya. “Ì gēsi aṅa pu ikwu nka? Enweghm èchìchè ib͕u-madu ọ bula n’obim! Ì gēsi aṅa pu ichè ọbuná udi ihe a!” Ha agaghi ekwezu ma-ọli na ha nwere ib͕u-madu n’obi-ha. Ha nēchè na ndi-ob͕u-madu bu ndi ọmumu-ha di iche.
“Onye-ob͕u-madu n’usoro na ntá akukọ n’ubọchi ọzọ ahu, ndi ìgwè madu ndi b͕uru we re ndi madu ọku n’okpuru ulo-ha, ha bu ndi nwere ib͕u-madu n’obi-ha! Ha bu ndi ọmumu-ha di iche. Apughm idi ka ha ma-ọli! Ha bu ndi omume ọjọ! Ndi-ob͕u-madu!” Ha ghọrọ ndi nēwes iwe nke-uku we tie nkpú, “Ekwesiri ikpochapu ndi amuru site na nkpuru jọrọ njọ n’elu uwa nka! Ekwesiri ima ha nile ikpé ọnwu!”
Ma na nwuta uku, èchìchè ib͕u-madu di n’obi nile ndia nēwe iwe nke-uku dika ọ di n’obi nile ndi-ob͕u-madu n’usoro na ndi-ob͕u-madu. Chineke nāgwa ayi n’obi ndi nile, enwere ib͕u-madu. Ayi kwesiri inabata Okwu Chineke, onye nāhu ihe nile bayere ayi. Ayi kwesiri ikwezu, “Abum onye-nmehie nwere ib͕u-madu n’obim.”
E, Chineke gwara ayi na enwere ajọ èchìchè nile, gunyere ib͕u-madu, n’obi ndi nile. Ka ayi nabata Okwu Chineke. Dika ọb͕ọ ndi madu nāghọ ihe jọrọ njọ kari, ngwa-agha nchekwa onwe di iche iche gābu ihe eji eb͕u madu. Nka bu ihe ib͕u-madu n’obi-ayi muputara. I puru ib͕u madu n’ọnọdu iwe, ma-ọbu egwù. Anaghm asi na onye ọ bula nime ayi gēb͕u ndi ọzọ n’ezie, kama na ayi nwere èchìchè bayere ya n’obi-ayi.
H’ihi na amuru ndi nile site n’ajọ èchìchè nile, ayi dum nwere ha n’obi-ayi. Ufọdu ndi nējedebe ib͕u madu n’ezie, ọ bughi n’ihi na amuru ha dika ndi-ob͕u-madu, kama n’ihi na ayi dum nwere ike ighọ ndi-ob͕u-madu. Chineke nāgwa ayi na ayi nwere ajọ èchìchè nile na ib͕u-madu n’obi-ayi. Ọ bu ezi-okwu. O nweghi otù onye nime ayi agēwezuga n’ezi-okwu a.
Ya mere, uzọ ziri ezi ayi gēwere bu inabata okwu Chineke we ṅa ya nti. Ayi nēmehie n’uwa nka n’ihi na ayi nwere ajọ èchìchè nile n’obi-ayi.
 
 
Ikwa-iko n’Obi-Ayi 
 
Chineke nāsi na enwere ikwa-iko n’obi madu ọ bula. Ì kweyere? Ì kwezuru na i nwere ikwa-iko n’obi-gi? E, enwere ikwa-iko n’obi madu ọ bula.
Nka bu ihe mere ikwa-iko na ndahie ikwa-iko nile ndi ọzọ ji nēme nke-ọma n’obodo-ayi. Ọ bu otù nime uzọ kachasi nfé ikpata ego n’oge nile nke usoro akukọ nke madu. Ihe nile ndi ọzọ nāhu ahuhu nime ihe isi ike nke àkù, ma ihe ndia jọrọ njọ anaghi ahu ahuhu rue otú a n’ihi na enwere ikwa-iko nēbi n’obi madu dum.
 
 
Nkpuru Ndi-nmehie Bu Nmehie 
 
Gini bu ihe eji atuyere madu? 
Osisi nke nāmi nkpuru nmehie
 
Dika osisi apple nāmi apple, osisi pearl nāmi pearl, osisi date nāmi date, na osisi persimmon nāmi persimmon, ayi, ndi amuworo nime udi nmehie di 12 n’obi-ayi, nāmi nkpuru nmehie. 
Jisus nāsi na ihe nke si nime madu puta nke ahu nēmeru ya. Ì kweyere? Ayi puru nání ikweyere n’okwu nile Jisus we si kwa, “E, ayi bu nkpuru ndi-nmehie, ndi nēme ihe ọjọ. E, I nēkwu ezi okwu, Onye-nwe-ayi.” E, ayi kwesiri ikwezu ajọ ihe ayi nile. Ayi kwesiri ikwezu ezi-okwu ahu nye onwe-ayi n’iru Chineke.
Dika Jisus Kraist ṅara ihe Chineke nāchọ nti, ayi kwesiri inabata Okwu Chineke we ṅa kwa Ya nti. O bu nání uzọ ahu ka apuru isi zọputa-ayi na nmehie nile ayi site na miri ahu na Mọ Nsọ. Ihe ndia bu onyinye nile si na Chineke.
Ewere oge anọ di nma gọzie obodom. Dika oge ndia nāga n’iru, osisi nile di iche iche nāmi nkpuru-ha. N’otù uzọ ahu, nmehie nile ahu di iri na abua n’obi-ayi nējidesi ayi aka ike mb͕e nile we nēduru ayi imehie. Ta, ọ puru ibu ib͕u-madu nējidesi ayi aka ike n’obi-ayi echi, ọ puru ibu ikwa-iko.
Mb͕e ahu n’echi-ya, èchìchè nile jọrọ njọ, ọzọ ikwa-iko, ori, ib͕a àmà ugha, na ndi ọzọ. Ayi nāga n’iru imehie ogologo arọ dum, kwa-ọnwa, kwa-ubọchi, kwa-hour. O nweghi mb͕e ubọchi nāgafe nke ayi adighi eme ufọdu udi nmehie. Ayi nāga n’iru iṅu iyí na ayi gēsi n’ebe nmehie nọ pua, ma ayi apughi ighara imehie n’ihi na amuru-ayi n’uzọ a. 
Ì huwo mb͕e osisi apple nāju imi apple n’ihi na ọ chọghi ya? “Achọghm imi apple!” Ọbuná ọ buru na o zube-ya n’uche-ya iju imi nkpuru, ọ̀ gēsi aṅa pu ighara imi apple? Otù ọ di okoko-ọhia ahu gēpute n’udumiri, apple gētolite we cha kwa na mb͕e okpom-ọku, nkpuru gējike-kwa-ra ka ewe ghọ ya n’ubi ewe ri ya n’owuwe-ihe-ubi.
Ọ bu ihe akwadebere òkìkè, ndu ndi-nmehie aghaghi kwa iso otù iwu òkìkè ahu. Ndi-nmehie apughi ighara imi nkpuru nile nke nmehie.
 
 

‘Baptism ahu na Obe ahu nke Jisus’ Diri Ikpuchi Nmehie nile ayi 

 
Gini ka ọ putara bú nkpuchi-nmehie?
Ọ bu ikwu ugwọ-ọlu nke nmehie site na Baptism Jisus (ibikwasi-aka-n’isi) na ọbara Ya n’Obe.
 
Ka ayi gu ama-okwu sitere na Bible ichọputa otù ndi-nmehie, umu nke ndi nēme ajọ ihe, puru si ekpuchi nmehie nile ha n’ebe Chineke nọ we bi kwa ndu-ha n’obi utọ. Nka bu ozi ọma nke nkpuchi nmehie nile.
Na Levitikọs 4, ọ we si, “Ma ọ buru na otù madu n’etiti ndi ala emehie n’amaghi-ama, n’ime ihe megide otù nime ihe Jehova nyere n’iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya; ọ buru kwa na eme ka ọ mara nmehie-ya nke ọ mehieworo, ọ gēweta kwa ewu, bú nne zuru okè, bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, ka ọ buru onyinye-ya iji biaru nso. Ọ gēbi-kwasi aka-ya n’isi ihe àjà-nmehie ahu, b͕u kwa ihe àjà-nmehie ahu n’ebe àjà-nsure-ọku. Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, tiye ya n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà. Abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika ewezugara abuba n’elu ihe àjà nke àjà-udo; onye-nchu-àjà gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’ebe-ichu-àjà, ka ọ buru ihe ísì utọ anēsurere Jehova; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.” (Levitikọs 4:27-31). 
N’ubọchi ndia nke Testament Ochie, ndi ahu si aṅa kpuchie nmehie nile ha? Ha bikwasiri aka-ha n’isi àjà-nmehie ahu we tukwasi kwa nmehie-ha n’elu ya.
Edeworo ya na Levitikọs. “Mb͕e madu ọ bula n’etiti unu gēweta nso Jehova onyinye iji biaru nso, unu gēsi n’etiti anu-ulo, n’etiti ìgwè ehi na n’etiti ìgwè ewu na aturu weta nso onyinye-unu ijì biaru nso. Ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu àjà-nsure-ọku sitere n’ìgwè ehi, oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso: n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ka ọ gēweta ya nso, ka o we buru ihe nātọ utọ n’iru Jehova O gēbikwasi aka-ya n’isi àjà-nsure-ọku ahu; agānara kwa ya nke-ọma n’ọnọdu ya iji kpuchiri ya nmehie-ya” (Levitikọs 1:2-4).
Chineke jikereri àjà-nmehie nke agēji kpuchie nmehie nile nke Israel. O we gwa ha ka ha ‘bikwasi aka-ha’ n’isi àjà-nmehie ahu, ka ewe tukwasi nmehie nile. Nime ogige Ulo-ikwū ahu di nsọ, enwere ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku. O bu ib͕e nke ji ihe ntà di uku kari table pulpit o nwe-kwa-ra mpi n’akuku anọ. Ndi Israel kpuchiri nmehie nile ha site n’itukwasi nmehie nile ha n’isi àjà-nmehie ahu we sure anu-ya ọku n’elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.
Chineke siri na Levitikọs ka ndi nile “gēweta ya nso: n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ka ọ gēweta ya nso, ka o we buru ihe nātọ utọ n’iru Jehova.” Atukwasiri nmehie-ha n’elu àjà-nmehie ahu mb͕e ha bikwasiri aka-ha abua n’isi ya, mb͕e ahu onye-nmehie ahu gēbe kwa akpiri nke àjà ahu we b͕ue ya. Ndi-nchu-àjà we tiye kwa ọbara-ya n’elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.
Mb͕e nka gasiri, asara organ nile di nime aru àjà ahu, agēbe anu-ya n’iberibe we sure ya ọku rue na ntu n’ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku. Mb͕e ahu agēwetara Chineke ísì utọ nke anu ahu bayere nkpuchi-nmehie-ha. Otú a ka ha si kpuchie nmehie nile ha nke otù ubọchi.
Mb͕e ahu enwere àjà nke nkpuchi nmehie nile ha nke otù arọ. Ọ di iche na nke àjà nkpuchi nmehie nile nke kwa-ubọchi na nka onye-isi-nchu-àjà bikwasiri aka-ya abua n’àjà-nmehie ahu n’ọnọdu ndi Israel nile we fesa ọbara n’akuku iru-anyanwu nke ebe-nkpuchi-nmehie ahu ub͕ò asa. Ọzọ kwa, ibikwasi aka abua n’isi nkpi ahu di ndu ka emeworo n’iru ndi Isreal n’ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa kwa-arọ (Levitikọs 16:5-27).
 
Ònye nānọchi anya àjà-nmehie nke Testament Ochie?
Jisus Kraist
 
Ub͕u a, ka ayi chọputa otù esi b͕anwe usoro-nchu-àjà na Testament Ọhu na otù ukpuru ebighi-ebi nke Chineke digideworo ogologo arọ nile ahu. 
Gini bu ihe mere Jisus ji kwesi inwu n’Obe? Gini bu ihe O mere di njọ n’uwa nka na Chineke ji kweye ka Ọkpara-Ya nwua n’Obe? Ònye manyere Ya inwu n’Obe? Mb͕e ndi-nmehie nile nke uwa, putara ayi dum, dabàrari nime nmehie, Jisus biara n’uwa nka izọputa-ayi.
Emere Ya baptism site n’aka Jọn Baptist na Jọdan we būru ahuhu n’Obe n’ihi nmehie nile n’ọnọdu ndi madu. Uzọ ejiri me Jisus baptism, uzọ O jiri wusì ọbara n’Obe yiri àjà nkpuchi nmehie na Testament Ochie, ibikwasi aka n’isi àjà-nmehie na iwusì ọbara-ya.
Otú a bu uzọ emeworo ya-ri na Testament Ochie. Onye-nmehie bikwasiri aka-ya abua n’àjà-nmehie ahu we kwuputa kwa nmehie-ya nile, nāsi, “Onye-nwe-ayi, emehiewom. Eb͕uwom madu we kwa kwa iko.” Mb͕e ahu agātukwasi nmehie-ya n’elu àjà-nmehie ahu.
Dika otù onye-nmehie bere akpiri àjà-nmehie ahu we weta ya nso n’iru Chineke, achuru Jisus n’otù uzọ a ka ewe kpuchie nmehie nile ayi. Emere Jisus baptism we wusì ọbara n’Obe izọputa ayi we kpuchi kwa nmehie nile ayi site na àjà Ya.
N’ezie, Jisus nwuru n’ihi ayi. Mb͕e ayi nēchè bayere ya, gini bu isi ichu anumanu ndia ahu zuru okè dika àjà n’ihi nmehie nile ndi ahu? Ànumanu ndia ahu matarari ihe nmehie bu? Anumanu amataghi nmehie. Ha apughi ibupu nmehie nke ndi madu nile.
Dika anu nile ndia zuchasiri okè, otú a kwa ka Jisus nēnweghi nmehie. Ọ bu Chineke di Nsọ, Ọkpara Chineke, O mehieghi kwa ma-ọli. Ya mere, O bupuru nmehie nile ayi site na baptism Ya na Jọdan mb͕e Ọ b͕ara arọ 30.
Ọ bu n’ihi ibupu nmehie nile ayi, O we nwu kwa n’Obe n’ihi nmehie nile nke O bupunari ayi. Ọ bu ije-ozi Ya n’ihi nzọputa nke sachapuru nmehie nile nke ndi madu. Edeworo ya na Matiu 3.
 
 
Nmalite Ozi Ọma nke Nkpuchi Nmehie Nile 
 
Gini bu ihe mere ejiri me Jisus baptism site n’aka Jọn Baptist na Jọdan?
Imezu ezi omume nile
 
Ub͕u a, edeworo ya na Matiu 3, “Mb͕e ahu Jisus siri na Galili bia rue Jọdan jekuru Jọn ahu, ka o we me Ya baptism. Ma Jọn nēb͕ochi Ya, si, Ọ di mu onwem nkpà ka I mem baptism, Gì onwe-gi nābiakutekwam? Ma Jisus zara, si ya, ‘Kwerem ub͕u a: n’ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya” (Matiu 3:13-15). 
Ayi kwesiri ima we ghọta kwa ihe mere ejiri me Jisus baptism mb͕e Ọ b͕ara arọ 30. Emere Ya baptism ikpuchi nmehie nile nke ndi nile ka ewe mezu kwa ezi omume nile nke Chineke. Ka ewe zọputa ndi nile na nmehie nile ha, Jisus Kraist, Onye ahu zuru okè, ka emere baptism site n’aka Jọn Baptist.
Otú a, O bupuru nmehie nile nke uwa we chua Onwe-ya dika àjà ikpuchie nmehie nile nke ndi madu dum. Ka ewe zọputa na nmehie, ayi kwesiri imara ezi okwu we kwere kwa na ya. Ọ diri ayi ikwere na nzọputa-Ya ka ewe zọputa-ayi.
Gini bu ihe isi baptism Jisus? Ọ bu otù ihe dika ibikwasi-aka-n’isi na Testament Ochie. Na Testament Ochie, nmehie nile nke ndi nile ahu ka atukwasiri n’isi àjà-nmehie site n’ibikwasi aka n’isi. N’uzọ yiri nka, na Testament Ọhu, Jisus bupuru nmehie nile nke uwa site n’iche Onwe-ya dika àjà-nmehie ya na site n’ime Ya baptism site n’aka Jọn Baptist.
Jọn Baptist bu madu kachasi uku n’etiti ndi madu nile, onye nānọchi anya ndi madu nke Chineke rọputaworo. Dika onye nānọchi anya ndi madu, onye-isi-nchu-àjà nke ndi dum, o bikwasiri aka-ya abua n’isi Jisus we tukwasi kwa nmehie nile nke uwa n’aru Ya. ‘Baptism’ putara, ‘itukwasi ihe, ílí ihe, na isa ihe.’
Ì mara ihe mere Jisus ji bia n’uwa nka ewe me kwa Ya baptism site n’aka Jọn Baptist? Ì kwere na Jisus nāmara isi baptism Ya? Baptism Jisus diri ibupu nmehie nile ayi, nmehie nile nke ayi, nkpuru nke bu ndi nēme ihe ọjọ, nēme n’anu-aru ayi na ndu nile ayi. Emere Jisus baptism site n’aka Jọn Baptist n’ihi nmezu nke ozi ọma mbu nke nkpuchi nmehie nile ayi.
Na Matiu 3:13-17, edeworo ya, ‘Mb͕e ahu,’ ọ putara oge ahu emere Jisus baptism, oge ahu atukwasiri nmehie nile nke uwa n’aru Ya. 
‘Mb͕e ahu’ Jisus bupuru nmehie nile nke ndi madu, nwua n’Obe mb͕e arọ atọ gasiri, eme kwa ka O bilie n’ọnwu mb͕e ubọchi atọ gasiri. Ka ewe sachapu nmehie nile nke uwa, emere Ya baptism nání otù mb͕e, nwua n’Obe nání otù mb͕e, eme ka O bilie n’ọnwu nání otù mb͕e. Nye ndia ahu bú ndi nāchọ ka ab͕aputa nmehie nile ha (Bupuru Nmehie) n’iru Chineke, O zọputara ha dum nání otù mb͕e.
Gini bu ihe mere eji kwesi ime Jisus baptism? Gini bu ihe mere eji kpube Ya okpu-eze nke eji ogwu me we kpe kwa Ya ikpé n’ulo ikpé nke Pailat dika onye nālu ọlu ọjọ ka ndi ọzọ? Gini bu ihe mere eji kwesi ikpọgide Ya n’Obe wusì kwa ọbara rue n’ọnwu? Ihe mere ihe nile a di n’elu bu n’ihi na O bupuru nmehie nile nke uwa, na nmehie nile nke mu na gi, nye Onwe-ya site na baptism Ya. N’ihi nmehie nile ayi, O kwesiri inwu n’Obe.
Ayi kwesiri ikwere na okwu nzọputa ahu na Chineke zọputaworo ayi we nēkele Ya. Ewezuga baptism Jisus, Obe Ya, na nbilite-n’ọnwu Ya, agāghi enwe nzọputa nye ayi.
Mb͕e emere Jisus baptism ite n’aka Jọn ibupu nmehie nile nke uwa, O bupuru nmehie nile ayi otú a we zọputa ayi ndi kwere n’ozi ọma nzọputa-Ya. Enwere ndi nke nēchè, ‘Jisus bupuru nání nmehie mbu ahu, Ò bupughi ya?’ Ma ha ezighi ezi. 
Edekọrọ ya nke-ọma na Bible na Jisus bupuru nmehie nile nke uwa nání otù mb͕e mb͕e emere Ya baptism. Nmehie nile ayi, nke gunyere nmehie mbu ahu, ka asachapuwo. Edeworo ya na Matiu 3:15, “N’ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile.” Imezu ezi omume nile putara na nmehie nile, nēwezugaghi nke ọ bula, ka ebupunariri ayi.
Jìsus sachapuworo nmehie nile nke ogologo ndu-ayi, kwa? E, Ọ sachapuworo ha. Ka ayi buru uzọ chọputa ihe-àmà ya na Levitikọs. Ọ nāgwa ayi bayere onye-isi-nchu-àjà na àjà nke Ubọchi Nkpuchi-nmehie.
 
 
Àjà Nkpuchi-nmehie n’ihi Nmehie nile nke Kwa-Arọ nke Ndi Israel nile
 
Ìdi-nsọ nke Ndi Israel puru idigide site n’àjà-nmehie nke uwa nka?
Ma-ọli
 
 “Eron gēweta kwa nso oké-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, ọ gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha. Ọ gēwere kwa nkpi abua ahu, guzo ha n’iru Jehova n’ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. Eron gēfe kwa nzà n’elu nkpi abua ahu; otù nzà diri Jehova, otù nzà di-kwa-ra ewu-ọpupu. Eron gēweta kwa nso nkpi ahu nke nzà nke diri Jehova mara, ọ gēme kwa ya ka ọ buru àjà-nmehie. Ma nkpi ahu, nke nzà nke diri ewu-ọpupu mara, agēguzo ya na ndu n’iru Jehova, ikpuchi nmehie n’elu ya, izilaga ya n’ọzara ka ọ buru ewu-ọpupu.” (Levitikọs 16:6-10). N’ebe a Eron wetara nkpi abua n’ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute ikpuchie nmehie nile nke otù arọ nke ndi Israel.
“Eron gēfe kwa nzà n’elu nkpi abua ahu; otù nzà diri Jehova, otù nzà di-kwa-ra ewu-ọpupu.” Achọrọ ewu-ọpupu n’ihi nkpuchi-nmehie.
N’aka nke ọzọ, àjà nkpuchi-nmehie nke nmehie kwa-arọ bú nke onye-nmehie bikwasiri aka-ya abua n’isi àjà ahu itukwasi nmehie-ya nile. Kama bayere nmehie nile nke kwa-arọ nke ndi Israel, onye-isi-nchu-àjà, n’ọnọdu ndi ahu, tukwasiri nmehie nile nke otù arọ n’àjà-nmehie ahu n’ọnwa nke-asa n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu kwa-arọ.
Na Levitikọs 16:29-31, edeworo ya, “Ọ gābu-kwa-ra unu ukpuru ebighi-ebi: n’ọnwa nke-asa, n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, unu gēweda nkpuru-obi-unu n’ala, ghara kwa ije ozi ọ bula, ma ọ bu onye amuru n’ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n’etiti unu: n’ihi na n’ubọchi a ka agēkpuchiri unu nmehie-unu, ime ka unu di ọcha; site na nmehie nile unu ka unu gādi ọcha n’iru Jehova. Ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ buru unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n’ala: ọ bu ukpuru ebighi-ebi” (Levitikọs 16:29-31). 
Na Testament Ochie, ndi Israel wetara àjà-nmehie nso ikpuchie nmehie nile kwa-ubọchi we tukwasi kwa nmehie nile ha n’isi ya, nēkwuputa, “Onye-nwe-ayi, Emewom nmehie di otú a na otú a.” Mb͕e ahu o bere akpiri àjà-nmehie ahu, nye onye-nchu-àjà ọbara ya, we laghachi n’ulo, kweyesie ike na emere ka ọ pua na nmehie ub͕u a. Àjà-nmehie ahu nwuru n’ihi onye-nmehie, nēbūru nmehie ahu n’isi-ya. Eb͕uru àjà-nmehie ahu n’ọnọdu onye-nmehie ahu. Na Testament Ochie, àjà-nmehie ahu puru ibu ewu, nwa-ehi, nwa-oke-ehi, ha zuru okè buru kwa otù nime anu nile di nsọ nke Chineke meworo ka ha di iche.
Karia onye-nmehie inwu n’ihi nmehie nile ha, Chineke, n’ebere ebighi-ebi-Ya babigara okè, kwere ka achu ndu anu n’ọnọdu ya.
N’uzọ a na Testament Ochie, ndi-nmehie puru ikpuchi nmehie nile ha site n’àjà nkpuchi-nmehie. Ndahie nile nke onye-nmehie ahu ka atukwasiri n’elu àjà-nmehie ahu site n’ibikwasi aka n’isi, enye-kwa-ra onye-nchu-àjà ọbara-ya ikpuchi nmehie nile nke onye-nmehie ahu.
Otú ọ di, ọ bughi ihe kwere omume ikpuchi nmehie nile kwa-ubọchi. Ya mere, Chineke kwere ka onye-isi-nchu-àjà kpuchie nmehie nile nke ogologo otù arọ, kwa-arọ n’ọnwa nke-asa n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, n’ọnọdu ndi Israel.
Mb͕e ahu gini bu ọlu Onye-isi-nchu-àjà n’Ubọchi Nkpuchi-nmehie ahu? Na mbu, Eron bú onye-isi-nchu-àjà bikwasiri aka-ya abua n’àjà-nmehie ahu, nēkwuputa nmehie nile nke ndi ahu, “Onye-nwe-ayi, ndi Israel meworo nmehie nile di otú a na otú a: ib͕u-madu, ikwa-iko nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko, ori, àmà ugha, nkwulú....”
Mb͕e ahu, o bere akpiri àjà-nmehie ahu, were ọbara-ya, fesa ọbara ahu ub͕ò asa n’ebe-nkpuchi-nmehie ahu nime ulo-ikwū nzute ahu di nsọ. (Na Bible, ọnu-ọgugu a bu 7 ka anāgu n’ ọnu-ọgugu zuru okè.)
Ọ bu ọlu-ya itukwasi nmehie nile nke otù arọ nke ndi ahu n’isi àjà-nmehie ahu n’ọnọdu ndi Israel dum, ewe chu àjà-nmehie ahu n’ọnọdu-ha.
N’ihi na Chineke nēkpe ikpé ziri ezi, ka ewe zọputa ndi ahu na nmehie nile ha, O kwere ka àjà-nmehie ahu nwua n’ọnọdu ndi ahu. N’ihi na Chineke nwere obi ebere n’ezie, O kwere ka ndi ahu chua ndu nke anu-àjà ahu n’ọnọdu ha onwe-ha. Onye-isi-nchu-àjà mb͕e ahu fesara ọbara ahu n’akuku iru-anyanwu nke ebe-nkpuchi-nmehie n’otú a kpuchie nmehie nile nke ndi Israel n’ihi arọ gara aga n’Ubọchi Nkpuchi-nmehie, n’ọnwa nke-asa n’ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu.
 
Ònye bu Nwa-aturu àjà ahu dika Testament Ochie si di?
Jisus onye zuru okè
 
Onye-isi-nchu-àjà aghaghi-ichu nkpi abua dika àjà n’Ubọchi Nkpuchi-nmehie n’ihi ndi Israel. Otù nime ha ka anākpọ ewu-ọpupu, nke putara ‘iwepu.’ N’otù uzọ ahu, ewu-ọpupu nke Testament Ọhu bu Jisus Kraist. “N’ihi na Chineke huru uwa n’anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n’iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi” (Jọn 3:16).
Chineke nyere ayi Ọkpara Ọ muru nání Ya dika Nwa-aturu àjà. Dika Nwa-aturu àjà nke madu nile, emere Ya baptism site n’aka Jọn Baptist we ghọ Onye-nzọputa, Mesaia ahu nke uwa. Mesaia putara ‘Onye-nzọputa,’ Jisus Kraist putara ‘Eze onye biaworo izọputa ayi.’
Ya mere, dika ekpuchiri nmehie nile nke otù arọ nke ndi Israel n’Ubọchi Nkpuchi-nmehie na Testament Ochie, Jisus Kraist, ihe ra ka arọ 2000 gara-aga, biara n’uwa nka ka ewe me Ya baptism we wusì ọbara n’Obe ka ewe mezu ozi ọma nke nkpuchi nmehie nile ayi. 
N’isi-okwu a, ka ayi gu ama-okwu na Levitikọs. “Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n’isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n’elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie nile ha; o gētiye kwa ha n’elu isi nkpi ahu, zilaga ya n’ọzara site n’aka nwoke jikere ejikere: nkpi ahu gēbu kwa n’aru ya ajọ omume-ha nile rue ala nkewapu: o gēzilaga kwa nkpi ahu n’ọzara” (Levitikọs 16:21-22).
Edeworo ya na etiyere nmehie nile nke ndi ahu dum n’isi nkpi dika esi kwue ya na Levitikọs 16. ‘Njehie-ha nile’ putara nmehie nile ha mere n’obi-ha, nmehie nile ha mere site n’anu-aru-ha. Ọzọ kwa ‘Njehie-ha nile’ ka etiyere n’isi àjà-nmehie ahu site n’ibikwasi aka n’isi.
 
 
Site n’Iwu Chineke, Ayi Kwesiri Inwe Ezi Nmazu nke Nmehie nile ayi 
 
Gini ihe mere Chineke ji nye ayi Iwu ahu?
Inye ayi nmazu nke nmehie
 
Iwu ahu na ihe nile Chineke nyere n’iwu mejuputara ihe di 613. N’ezie, mb͕e ayi nēchè bayere ya, ayi meworo ihe O siri ayi emela we ghara ime ihe O siri ayi me.
Ya mere, ayi bu ndi-nmehie. Edeworo ya na Bible na Chineke nyere ayi iwu nile ndia ahu ka ayi we mazu nmehie nile ayi (Ndi Rom 3:20). Ọ putara na O nyere ayi Iwu-Ya na ihe nile O nyere n’iwu izí ayi na ayi bu ndi-nmehie. O nyeghi ayi ha n’ihi na ayi nwere ike idebe ha, kama ka ayi we mazu nmehie nile ayi.
O nyeghi ayi iwu-Ya na ihe nile O nyere n’iwu ka ayi debe ha. I pughi inwe olile-anya ka nkita nēbi ndu dika madu. N’otù aka ahu, ayi apughi idebe Iwu Chineke kama ayi puru nání imazu nmehie nile ayi site n’Iwu-Ya na ihe nile O nyere n’iwu.
Chineke nyere ayi Iwu ahu n’ihi na ayi amataghi na ayi bu okpotokpo nmehie. “Unu bu ndi-ob͕u-madu, ndi nākwa iko, ndi nēme ihe ọjọ.” Ọ gwara ayi ka ayi ghara ib͕u madu, ma ọbuná ayi nēb͕u madu n’obi-ayi mb͕e ufọdu b͕ue kwa madu n’ezie.
Otú ọ di, n’ihi na edeworo ya n’Iwu ahu na ayi ekwesighi ib͕u madu, ayi mara na ayi bu ndi-ob͕u-madu, nāsi, “A, ezighm ezi. Abum onye-nmehie n’ihi na emerem ihe m’nēkwesigi ime. Emehieworom.” 
Ya mere, ka ewe zọputa ndi Israel na nmehie, Chineke kweyere ka Eron chua àjà nke nkpuchi nmehie na Testament Ochie, ọ bu kwa Eron onye kpuchiri nmehie ndi ahu otù mb͕e n’arọ. 
Na Testament Ochie, àjà-nmehie abua ka ekwesiri iwetara Chineke nso n’Ubọchi Nkpuchi-nmehie. Achuru otù n’iru Chineke nke ọzọ ka ezilagara n’ọzara mb͕e ebikwachasiri aka abua n’isi-ya, we nēbūru nmehie nile nke otù arọ nke ndi-Israel. Tutu ezilaga nkpi ahu n’ọzara site n’aka nwoke jikere ejikere, onye-isi-nchu-àjà bikwasiri aka-ya abua n’isi nkpi ahu di ndu we kwuputa nmehie nile nke Israel. “Onye-nwe-ayi, ndi a b͕uworo madu, kwaworo iko, zuworo ori, kpọworo isi ala nye arusi... Ayi emehiewo.”
Ọzara ahu bu ala ájá ájá na ala nkewapu. Ewu-ọpupu ahu ka ezilagara n’ọzara nke enweghi ngwusi we nwua. Mb͕e ezilagara ya, ndi Israel gara n’iru ilegide ya anya rue mb͕e ọ gēfunari anya-ha n’ebe di anya, we kwe-kwa-ra na nmehie nile ha soworo ewu-ọpupu ahu pua. Ndi ahu we nwe udo, ewu-ọpupu ahu nwuru n’ọzara n’ihi nmehie nile nke otù arọ nke ndi-Israel dum.
Chineke kpuchiri kwa-ra nmehie nile ayi site na Nwa-aturu Chineke, Jisus Kraist. Nmehie nile ayi ka asachapusiri site na baptism Jisus na ọbara Ya n’Obe.
Chineke bu Chineke na Onye-nzọputa-ayi. Ọ bu Ọkpara Chineke onye biara izọputa ndi madu dum na nmehie Ọ bu kwa Onye kère èkè ahu onye mere ayi n’onyinyo-Ya. O ridata kwa n’uwa nka izọputa ayi na nmehie.
Ọ bughi nání nmehie nile ayi nēme kwa-ubọchi site n’anu-aru-ayi, kama nmehie nile ayi nke ọdi-n’iru, na nmehie nke uche-ayi na nke anu-aru-ayi ka atukwasiri n’aru Jisus. Otú a, ekwesiri ime Ya baptism site n’aka Jọn Baptist imezu ezi omume nile nke Chineke, nkpuchi nmehie nile zuru okè nke uwa. 
Arọ atọ tutu akpọgide Jisus n’obe, mb͕e O buru uzọ malite ije-ozi-Ya n’iru ọra, O bupuru nmehie nile nke uwa site n’ime Ya baptsim site n’aka Jọn Baptist na Jọdan. Nzọputa nke Ọ zọputara ndi madu site n’ikpuchi nmehie nile ayi sitere na baptism Ya. 
N’Osimiri Jọdan, n’ebe miri di omimi rue ihe ra ka afọ-madu, Jọn Baptist tiyere aka-ya abua n’isi Jisus we mikpue Ya nime miri ahu. Baptism a bu otù ihe dika ibikwasi aka n’isi na Testament Ochie we nēme kwa otù ihe dika itukwasi nmehie nile.
Imikpu nime miri ahu putara ọnwu, iputa kwa nime miri ahu putara nbilite-n’ọnwu. Otú a, site n’ime Ya baptism site n’aka Jọn Baptist, Jisus mezuri we kpughe kwa ihe atọ ahu dum: ibupu nmehie nile, nkpọgide n’obe, na nbilite-n’ọnwu.
Apuru izọputa-ayi nání ma ọ buru na ayi ṅa nti n’okwu nile nke Jisus were zọputa-ayi na nmehie. Chineke zubereri izọputa ayi site na Jisus, emezuwo kwa ọb͕ub͕a-ndu nke O b͕arari na Testament Ochie otú a. Jisus jeruru n’Obe ahu nēbūru nmehie nile ayi n’isi-Ya.
 
Gini bu udi ọlu fọduru ayi n’ihi na Jisus hichapuru nmehie nile ayi?
Ihe nile ayi kwesiri ime bu inwe okwukwe n’okwu nile Chineke.
 
Na Jọn 1:29, edeworo ya, “N’echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, ‘Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!’” Jọn Baptist b͕ara àmà, “Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!” Nmehie nile nke ndi madu ka atukwasiri n’elu Jisus mb͕e emere Ya baptism na Jọdan. Kweye ya! Mb͕e ahu agāgọzie gi site n’ikpuchi nmehie-gi nile.
Ayi kwesiri inwe okwukwe n’okwu Chineke. Ayi kwesiri irapu èchìchè nile nke aka-ayi na iwezuga-onwe-ayi, we kwere nání n’ezi-okwu ahu na Jisus bupuru nmehie nile nke uwa, we ṅa kwa nti okwu Chineke nile edeworo.
Ikwu na Jisus bupuru nmehie nile nke uwa, na ikwu na O mezuru ezi omume Chineke site n’ikpuchi nmehie nile ayi bu otù ihe n’ezie. ‘Ibikwasi-aka-n’isi’ na ‘baptism’ puta-kwa-ra otù ihe.
Ọbuná otú ọ di ayi puru ikwu si ‘nile,’, ‘ihe nile,’ ma-ọbu ‘dum,’ isi a bu otù ihe. Isi okwu a, ‘ibikwasi-aka-n’isi’ na Testament Ochie digidere otù ihe na Testament Ọhu, ma ewezuga na eji okwu a bú ‘baptism’.
O nēridata n’ezi-okwu ahu di nfé na emere Jisus baptism we kpe kwa Ya ikpé n’Obe ikpuchi nmehie nile ayi. Anāzọputa ayi mb͕e ayi kwere n’ozi ọma mbu nka.
Mb͕e ayi nāsi na Jisus bupuru ‘nmehie nke uwa’ dum (Jọn 1:29), gini ka ayi nēkwu site na nmehie nke uwa? Ọ putara nmehie nile eji mua ayi na èchìchè nile jọrọ njọ, ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa-iko nile, ib͕u-madu nile, ori nile, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulú, npako, na enweghi-uche nke nọ nime uche-ayi nile. Ọ putara ndahie nile na njehie nile nọ n’anu-aru na n’obi.
“N’ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Chineke-ayi” (Ndi Rom 6:23). “Ọ buru kwa na nwusì ọbara adighi nb͕aghara nmehie adighi” (Ndi Hibru 9:22). Dika ekwuru n’ama-okwu ndia nile, akwuru ugwọ nke nmehie nile. Jisus Kraist, ka O we zọputa ndi madu dum na nmehie, churu ndu nke Ya dika àjà we kwua kwa ugwọ-ọlu nke nmehie n’ihi ayi nání otù mb͕e.
Ya mere, ihe nile ayi kwesiri ime bu ikwere na Baptism Jisus na ọbara Ya, ozi ọma mbu ahu, ya na Jisus idi dika Chineke ayi na Onye-nzọputa-ayi ka ewe me ka ayi nwere onwe-ayi na nmehie nile.
 
 
Nkpuchi Nmehie Nile nke Echi
 
Àyi kwesiri iche àjà n’iru n’ihi nmehie nile ayi ọzọ?
Apughi ime ya ọzọ ma-ọli
 
Nmehie nile nke echi na nke ubọchi mb͕e echi gasiri, na nmehie nile nke ayi nēme rue ubọchi ayi nānwu nēso kwa nime ‘nmehie nke uwa,’ dika nmehie nile nke ta, nke nnyahu, na nke ubochi tutu nnyahu so-kwa-ra nime ‘nmehie nke uwa.’ Nmehie nile nke ndi nile site n’ọmumu rue na ọnwu nēso nime ‘nmehie nke uwa,’ nmehie nke uwa ka atukwasiri n’aru Jisus site na baptism Ya. Ya mere nmehie nile ayi gēme rue ubọchi ayi gānwu ka ebupunariworo ayi.
Ayi kwesiri ikwere nání n’ozi ọma mbu a, okwu nile nke Chineke edeworo, we ṅa kwa nti ka ewe zọputa ayi. Ayi kwesiri irapu èchìchè nile nke aka ayi ka ewe b͕aputa ayi na nmehie nile ayi. I puru iju nke-ọma, “Ò gēsi aṅa pu ibupu nmehie nile nke akēmeghi ub͕u a?” Mb͕e ahu, m’gājughachi gi, “Mb͕e ọ bula ayi nēmehie, Jìsus kwesiri ilaghachi n’uwa nka iwusì ọbara-Ya ọzọ?”
Nime ozi ọma imu ọzọ, enwere iwu nkpuchi nmehie nile. “Ọ buru kwa na nwusì ọbara adighi nb͕aghara nmehie adighi” (Ndi Hibru 9:22). Mb͕e madu chọrọ ka ab͕aputa-ya na nmehie-ya nile n’ubọchi ndia nke Testament Ochie, o kwesiri itukwasi nmehie-ya nile site n’ibikwasi aka-ya abua n’isi àjà-nmehie, àjà-nmehie ahu kwesiri inwu kwa n’ihi nmehie-ya nile.
Ihe ra ka otù ihe ahu, Ọkpara Chineke ridatara n’uwa nka izọputa ndi madu nile. Emere Ya baptism ibupu nmehie nile ayi we wusì ọbara n’Obe ikwu ugwọ-ọlu nke nmehie nile ayi we nwua kwa n’Obe, nāsi, “Ọ gwuwo!” Emere ka O bilie n’ọnwu mb͕e ubọchi 3 gasiri we nānọ kwa ub͕u a n’aka-nri nke Chineke. Ọ ghọworo Onye-nzọputa-ayi rue mb͕e ebighi-ebi.
Ka ewe b͕agharasia nmehie nile ayi (Sachapuru Nmehie), ayi kwesiri itupu èchìchè nke aka ayi nke guzosiri ike we rapu okwukwe okpukpe nke nāsi na ekwesiri ib͕aputa ayi na nmehie nile ayi nke kwa-ubọchi kwa-ubọchi. Ka ewe kwu ugwọ nmehie nile nke ndi madu, ekwesiri ichu àjà, nání otù mb͕e. Chineke nọ n’Elu-igwe tukwasiri nmehie nile nke uwa n’elu Nwa nke aka-Ya site na baptism Ya we kwe ka akpọgide-Ya n’obe n’ihi ayi. Site na nbilite-n’ọnwu-Ya na ndi nwuru anwu, emezuru nzọputa ayi.
“N’ezie ọria nile nke ayi ka ya onwe-ya bupuworo, ihe-nb͕u nile nke ayi kwa, o buruwo ha; ma ayi onwe-ayi guru ya n’onye etiworo ihe-otiti, onye Chineke tiworo ihe, na onye ewedara n’ala. Ma ya onwe-ya bu onye amapúworo site na njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n’ajọ omume nile nke ayi:… Ma Jehova emewo ka ajọ omume nke ayi nile dakwasi ya.” Na Aisaia 53, o kwuru si na njehie nile na ajọ omume nile nke uwa, nke ndi madu nile ka atukwasiri n’elu Jisus Kraist.
Na Testament Ọhu, na Ndi Efesos 1:4, edeworo ya, “Dika Ọ roputara ayi nime Ya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa.” Nka nāgwa ayi na Ọ rọputara ayi nime Ya mb͕e akākeghi uwa. Mb͕e akākeghi ọbuná uwa, Chineke rọputara ime ayi ndi-Ya, ndi ezi omume zuru okè nime Kraist. Ihe ọ bula ayi chere tupu ub͕u a, ub͕u a ayi kwesiri ikwere we ṅa kwa nti n’Okwu Chineke, okwu nile nke miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu.
Chineke gwara ayi na Nwa-aturu Ya, Jisus Kraist, bupuru nmehie nile nke uwa we kpuchie kwa nmehie ndi madu dum. Na Ndi Hibru 10, edeworo ya, “N’ihi na iwu ahu, ebe o nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ihe ndia, ha apughi ime ka ndi nābiaru ha nso zue okè mb͕e ọ bula, site n’otù àjà ndia nke ha nēche n’iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile” (Ndi Hibru 10:1).
N’ebe a ọ nāsi n’iche otù àjà ahu n’iru Chineke kwa-arọ mb͕e nile apughi ime ka ayi zue okè ma-ọli. Iwu ahu nwere nání onyinyo nke ezi ihe ahu nile gaje ibia, ọ bughi ezi oyiyi onwe-ya nke ezi ihe ndia ahu. Jisus Kraist, Mesaia ahu nke gaje ibia, mere ka ayi zue okè nání otù mb͕e (Dika ekpuchiri nmehie nile nke otù arọ nke Israel nání otù mb͕e) site n’ime-Ya baptism na ikpọgide-Ya n’obe ka ewe kpuchi nmehie nile ayi.
Ya mere Jisus we si na Ndi Hibru 10, “Mb͕e ahu ka Ọ siworo, Le, abiawom ime ihe I nāchọ. Ọ nēwepu nke-mbu, ka O we me ka nke-abua guzo. Ọ bu kwa n’ọchichọ a ka edoworo ayi nsọ site n’iche aru Jisus Kraist n’iru Chineke dika àjà nání otù mb͕e. Onye-nchu-àjà ọ bula nēguzo kwa kwa-ubọchi nēfè òfùfè nēche kwa otù àjà ndia n’iru Chineke ọtutu mb͕e, bú àjà nke nāpughi ihichapu nmehie mb͕e ọ bula: ma Onye ahu, mb͕e O chereri otù àjà n’iru Chineke n’ihi nmehie, O we nọdu n’aka-nri Chineke mb͕e nile; nēle anya n’oge fọduru rue mb͕e agēdo ndi-iro-Ya dika ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya abua. N’ihi na O sitewo n’iche Onwe-ya n’iru Chineke dika àjà otù mb͕e me ka ndi anēdo nsọ zue okè mb͕e nile. Mọ Nsọ nāb͕a-kwa-ra ayi àmà: n’ihi na mb͕e O kwuru, si,Nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ha gāb͕a Mb͕e ubọchi ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru; M’gētiye iwum n’obi-ha, Ọ bu kwa n’uche-ha ka M’gēdekwasi ha dika n’akwukwọ; mb͕e ahu Ọ si, M’gaghi-echeta kwa nmehie nile ha na nmebi-iwu nile ha ọzọ ma-ọli. Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n’iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ” (Ndi Hibru 10:9-18). 
Ayi kwere na Jisus zọputaworo ayi na nmehie nile nke uwa site na Baptism-Ya na ọbara-Ya n’Obe.
 
 
Nzọputa Imu Ọzọ nke Miri na Mọ Nsọ Nke Atuworo nime Obi na Uche Ayi Nile 
 
Àyi bu ndi ezi omume nání n’ihi ayi adighi emehie ọzọ?
É-è. Ayi bu ndi ezi omume n’ihi Jisus bupuru nmehie-ayi, ayi we kwere kwa na Ya.
 
Ùnu dum kwere na nzọputa Ya zuru okè? —Amen— Ùnu ji okwukwe ṅa nti n’okwu nile Chineke ahu na emere Jisus Kraist n’Onwe-ya baptism we wusì kwa ọbara n’Obe izọputa-ayi? Ayi aghaghi iṅa nti ka ewe mua-ayi ọzọ. Mb͕e ayi kwere na Jisus Kraist, site n’ozi ọma nb͕aghara nmehie nile (Bupuru Nmehie), sachapu nmehie nile ayi, ya na nmehie nile nke uwa, apuru izọputa ayi.
Ayi apughi ighọ zuru okè ma-ọli site n’idebe Iwu Chineke, kama ayi puru ighọ ndi zuru okè site n’okwukwe ayi n’ọlu nile nke Jisus Kraist. Jisus Kraist bupuru nmehie nile ayi site na baptism Ya na Jọdan we nata ikpé we hu kwa ahuhu n’ihi nmehie nile ayi n’Obe. Site n’iwere obi-ayi dum kwere n’ozi ọma a, apuru ib͕aputa-ayi na nmehie nile ayi we ghọ kwa ndi ezi omume. Ì kweyere nka?
Baptism Jisus, nkpọgide-Ya n’obe na nbilite-n’ọnwu-Ya diri n’ihi nb͕aghara (Hichapuru Nmehie) nmehie nile nke ndi madu na iwu nzọputa dabere n’ihu-n’anya ebighi-ebi Chineke nke. Chineke huru ayi n’anya n’otù ayi di Ọ bu kwa onye ezi omume, ya mere O mere ayi ndi ezi omume. Jisus mere ayi ndi ezi omume site n’ibūru nmehie nile ayi site na baptism Ya.
Ka ewe sachapu nmehie nile ayi, O zitere Ọkpara Ọ muru nání Ya, Jisus, ridata n’uwa nka n’ihi ayi. O we kweye ka Jisus bupu nmehie nile nke uwa site na baptism Jisus mb͕e ahu we tukwasi kwa ikpé n’elu Ọkpara Ya n’ihi nmehie nile ayi. O mere ayi umu-Ya ndi bu ndi ezi omume site na nzọputa nke miri ahu na ọbara ahu, agape Chineke.
Edeworo ya na Ndi Hebru 10:16, “M’gētiye iwum n’obi-ha, Ọ bu kwa n’uche-ha ka M’gēdekwasi ha dika n’akwukwọ.” 
N’obi-ayi na uche-ayi, àyi bu ndi-nmehie n’iru Chineke ma-ọbu ndi ezi omume? Ọ buru na ayi nwere okwukwe n’Okwu Chineke, ayi nāghọ ndi ezi omume. Jisus Kraist bupuru nmehie nile ayi ewe kpe Ya ikpé n’ihi ha. Jisus Kraist bu Onye-nzọputa-ayi. Ayi puru iche, “N’ihi na ayi nēmehie kwa-ubọchi, àyi gēsi aṅa pu ighọ ndi ezi omume? Ayi bu ndi-nmehie n’ezie.” Ma mb͕e ayi ṅara nti n’okwu Chineke, dika Kraist Jisus ṅara Nna-Ya nti, ayi nāghọ ndi ezi omume.
N’ezie, dika m’siri mb͕e gara-aga, ayi nwereri nmehie n’obi-ayi tutu amua ayi ọzọ. Mb͕e ayi weresiri n’obi-ayi ozi ọma nb͕aghara (Bupuru Nmehie), azọputara-ayi na nmehie nile ayi. Mb͕e ayi amataghi ozi ọma ahu, ayi bu ndi-nmehie. Ma ayi ghọrọ ndi ezi omume mb͕e ayi kwere na nzọputa Jisus, mb͕e ahu ayi ghọrọ umu Chineke ndi bu ndi ezi omume. Nka bu okwukwe nke ighọ ndi ezi omume nke onye-ozi Pọl kwuru bayere ya. Okwukwe n’ozi ọma nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie mere ayi ‘ndi ezi omume.’
Ma-ọbu onye-ozi Pọl ma-ọbu Abraham ma-ọbu ndi-mbu nke okwukwe aghọghi ndi ezi omume site n’ọlu-ha, kama site n’inwe okwukwe we ṅa kwa Okwu Chineke nti, okwu nile nke ngọzi.
Na Ndi Hibru 10:18, “Ma ebe nb͕aghara ihe ndia di, iche àjà n’iru Chineke bayere nmehie adighi ọzọ.” Dika edeworo ya, Chineke zọputara ayi ka ayi ghara inwu n’ihi nmehie nile ayi. Ì kwere na nka? —Amen—
Na Ndi Filipai 2, “Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus: Onye, ọ bu ezie na Ọ diri n’udi nke Chineke na mbu, ma Ọ gughi ya n’ihe O gējidesi ike, bú ira ka Chineke, kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n’inara udi nke orù, ewe me Ya n’oyiyi nke madu; ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n’oyiyi-Ya, O wedakwara Onwe-ya, we buru Onye nāṅa nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe. N’ihi nka Chineke welikwara Ya elu nke-uku, were kwa amara nye Ya aha ahu nke kariri aha nile ọ bula elu; ka ọ gābu n’aha Jisus ka ikperè nile we b͕ue n’ala, nke ihe nile di n’elu-igwe na ihe nile di n’elu uwa na ihe nile di n’okpuru ala, ka ire nile ọ bula we kwuputa kwa na Jisus Kraist bu Onye-nwe-ayi, ka ewe nye Chineke, bú Nna, otuto.” (Ndi Filipai 2:5-11). 
Jisus Kraist esoghi okwukwe n’uwa site na nsọpuru di uku nye Onwe-ya. Kama, O mere Onwe-ya onye nānara udi nke orù, we bia n’oyiyi nke madu. O wedara Onwe-ya we buru Onye nāṅa nti rue ọnwu izọputa ayi.
Ya mere, ayi nēto Jisus, “O bu Chineke-ayi, Onye-nzọputa na Eze.” Ihe mere ayi nēto Chineke we nēto kwa Jisus bu n’ihi na Jisus ṅara uche Nna-Ya nti rue ọgwugwu. Ọ buru na Ọ ṅaghi nti, ayi agaghi eto Ọkpara Chineke ub͕u a. Kama n’ihi na Ọkpara Chineke ṅara uche Nna-Ya nti rue ọnwu, ihe nile ekère èkè na ndi madu nile n’uwa nka nēto Ya gēme kwa otú a rue mb͕e ebighi-ebi.
Jisus Kraist ghọrọ Nwa-aturu Chineke onye bupuru nmehie nile nke uwa, edewo-kwa-ra ya na O bupuru ha site na Baptism Ya. Ub͕u a ihe ra ka arọ 2000 agasiwo mb͕e O bupuru nmehie nile nke uwa. N’ihi na mu na gi nēbi n’uwa nka site na mb͕e amuru ayi, nmehie nile ayi so kwa-ra na nmehie nile nke uwa.
 
Àyi gāghọ ndi-nmehie ma ọ buru na ayi mehie echi?
É-è. N’ihi na Jisus bupuru nmehie nile ayi nke gara aga, nke ub͕u a, na nke ọdi-n’iru.
 
Ma ewezuga ikpa ókè n’etiti nmehie mbu na ndahie nile nke ogologo ndu nke ayi, àyi emehieghi site n’oge amuru-ayi? 
Jisus mara na ayi gēmehie site n’ubọchi amuru-ayi rue ubọchi ayi nwuru O we bupuru nmehie nile ayi n’ọdi-n’iru. Ì puru ihu ya ub͕u a? Ọ buru na ayi gādi ndu rue arọ 70, nmehie nile ayi gējuputa ihe kariri ọgu moto truck ise. Ma Jisus bupuru nmehie nile otù mb͕e nye madu nile site na baptism Ya, we būru kwa ikpé n’ihi nmehie nile ayi n’Obe.
Ọ buru na Jisus bupururi nání nmehie mbu, ayi gānwu we ga n’ọku-ala-mọ. Ọbuná ma ọ buru na ayi chere na Ọ pughi ibupu nmehie nile ayi, ọ gaghi ab͕anwe ma-ọli ezi-okwu ahu bu na Jisus hichapuru nmehie nile ayi.
Nmehie ra aṅa ka ayi puru ime n’uwa nka? Nmehie nile ayi nēme nēso na nmehie nile nke uwa.
Mb͕e Jisus siri Jọn ka o me Ya baptism, ọ bu isi ihe O kwuru n’ezie. Jisus b͕ara Onwe-ya àmà na O bupururi nmehie nile ayi. Chineke zitere onye-ozi Ya tutu Jisus site kwa n’aka-ya me Jisus baptism. Ya mere, site n’ime Ya baptism site n’aka Jọn onye nānọchi anya ndi madu, site n’iweda isi Ya n’iru ya ka eme Ya baptism, Jisus bupuru nmehie nile nke ndi madu nile.
Nmehie nile ayi site n’arọ 20 rue arọ 30, site n’arọ 30 rue arọ 40, we gaba n’iru otú a; ọbuná nmehie nile nke umu-ayi-hà nēso na nmehie nile nke uwa, nke Jisus bupuru site na baptism Ya.
Ònye puru ikwu si na enwere nmehie n’uwa nka? Jisus Kraist bupuru nmehie nile nke uwa. Apuru izọputa kwa ayi nile mb͕e ayi kwere n’obi-ayi, nēnweghi obi abua ọ bula, n’ihe Jisus mere ikpuchi nmehie nile ayi: baptism-Ya ya na iwusì ọbara Ya di oké ọnu-ahia.
Ọtutu ndi madu nēbi ndu aghara nile ha nēkpuchi onwe-ha nime èchìchè nile nke aka ha, nēkwu bayere ndu-ha ka agasi na ndu-ha bu ihe nile. Ma enwere ọtutu ndi duworo ndu nile sikariri ike. Ọtutu madu, mu onwem neso, biworo ndu aghara nile. Ì gēsi aṅa pu ighara ighọta we nab͕ata kwa ozi ọma nb͕aghara (Hichapuru Nmehie) nmehie nile, nke baptism Jisus na ọbara Ya?
 
 
Emezuwo Nzọputa nke Ndi-nmehie 
 
ini bu ihe mere Jisus jiri sa ukwu Pita?
N’ihi na Ọ chọrọ ka Pita nwe okwukwe siri ike n’ ezi-okwu ahu na O sachapururi nmehie-ya nile nke ọdi-n’iru site na baptism-Ya.
 
Ka ayi gu Jọn 19. “O we pua, nēbu obe-Ya n’Onwe-ya, ga rue ebe anākpọ Ebe okpokoro-isi, nke anākpọ n’asusu Hibru Gọlgọta: ebe ha kpọgidere Ya n’obe, Ya na ndikom abua ọzọ, otù n’akuku a otù n’akuku ọzọ, Jisus nọ kwa n’etiti ha. Pailat we de kwa ihe-ndekwasi, debe ya n’elu obe-Ya. Ma ihe edeworo bu, Jisus ONYE NAZARET EZE NDI-JU. Ya mere ọtutu n’etiti ndi-Ju guru ihe-ndekwasi ahu: n’ihi na ebe akpọgidere Jisus n’obe di obodo Jerusalem nso: ede-kwa-ra ya n’asusu Hibru, n’asusu Latin, n’asusu Grik.” (Jọn 19:17-20). 
Ndi-eyì m’huru n’anya, Jisus Kraist būru nmehie nile nke uwa ewe ma kwa Ya ikpé ikpọgide Ya n’obe n’ulo ikpé nke Pailat. Ub͕u a ka ayi chekọrita bayere ihe nkiri a.
Site na ama-okwu nke 28, “Mb͕e ihe a gasri, Jisus, ebe Ọ matara na ihe nile agwuwo ub͕u a, ka ihe edeworo n’akwukwọ nsọ we mezu.” Jisus bupuru nmehie nile ayi imezu Akwukwọ Nsọ. O we si, kwa, “Akpiri nākpọm nku!”
“Adọbara n’ebe ahu ite nke manya-vine b͕ara uka juru: ya mere ha were sponge nke manya-vine ahu b͕ara uka juru tukwasi n’elu osisi hyssop, che Ya n’ọnu. Ya mere mb͕e Jisus narasiri manya-vine ahu nke b͕ara uka, Ọ siri, Ọ gwuwo O we rube isi, rara mọ-Ya nye.” (Jọn 19:28-30).
Mb͕e ubọchi atọ gasiri, emere ka O si na ndi nwuru anwu bilite n’ọnwu.
Baptism Jisus ahu site n’aka Jọn Baptist ya na ọnwu Ya n’Obe bu ihe aghaghi ijikọta onwe-ha ọnu, otù enweghi ihe o ji anọ ma nke ọzọ anọghi ya. Ya mere, ka ayi to Onye-nwe-ayi Jisus n’ihi izọputa ayi site n’ozi ọma Ya nke nb͕aghara (Bupu Nmehie) nmehie nile.
Anu-aru nke ndi madu nēso ihe anu-aru nāchọ, ayi apughi ighara imehie site anu-aru-ayi. Jisus Kraist nyere ayi baptism Ya na ọbara Ya izọputa ayi na nmehie nile nke anu-aru-ayi. Ọ zọputara ayi na nmehie nile nke anu-aru-ayi site na ozi ọma Ya.
Ndi nke nwere nb͕aghara nmehie zuru okè (Hichapu Nmehie) puru ibà n’ala-eze elu-igwe n’oge ọ bula site n’ikwere na Jisus, onye amuru na Betlehem, onye emere baptism na Jọdan, onye nwuru n’Obe ewe me kwa ka O bilie n’ọnwu mb͕e ubọchi 3 gasiri. Ya mere, ayi nēto Onye-nwe-ayi we nēnye kwa aha Ya otuto rue ebighi-ebi.
N’isi nke ikpè-azu nke Jọn, Jisus gara na Galili mb͕e emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie n’ọnwu. Ọ jekuru Pita we si ya, “Saimon, nwa Jọn, ì hurum n’anya kari ndia?” Pita we za kwa Ya si, “E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm.” Mb͕e ahu Jisus si ya, “Nēnye umu-aturum nri.”
Pita mazuru ihe nile, ozi ọma nke baptism Jisus na ọbara Ya, nb͕aghara (Hichapu Nmehie) nmehie nile. Ub͕u a o kwere n’ozi ọma miri ahu na ọbara ahu nke nyere ya nb͕aghara nmehie-ya nile (Sachapuru Nmehie), we nāmazu ihe mere Jisus jiri sa ukwu-ya, okwukwe-ya na Jisus ghọrọ ihe sikariri ike.
Ka ayi gu Jọn 21:15 ọzọ. “Ya mere mb͕e ha risiri nri-ututu-ha, Jisus si Saimon Pita, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n’anya kari ndia? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nēnye umu-aturum nri.” Ọ puru itiye aturu-Ya n’aka Pita n’ihi na Pita bu onye nēso uzọ-Ya, n’ihi na azọputasiri Pita, n’ihi na Pita ghọ-kwa-ra-ri onye ezi omume na orù Chineke zuru okè.
Ọ buru na Pita ghọrọri onye-nmehie ọzọ n’ihi nmehie-ya nile nke kwa-ubọchi, Jisus agaghi agwa ya ka o kwusa ozi ọma nkpuchi nmehie nile, n’ihi na ya, nāgunye ndi nēso uzọ-Ya ndi ọzọ, apughi ighara imehie kwa-ubọchi n’anu-aru. Kama Jisus gwara ha kwusa ozi ọma ahu nke hichapuru nmehie nile ha n’ihi na ha kwere na baptism Jisus na ọbara Ya n’Obe, ozi ọma nke nkpuchi nmehie nile.
 
 
“Onye-nwe-ayi; Gi Onwe-gi Matara Na I Bu Eyìm”
 
Ì gāghọ ‘onye-nmehie’ ọzọ mb͕e i mehiere ọzọ?
É-è. Jisus bupururi nmehie gi nile nke ọdi-n’iru na Jọdan.
 
Ka ayi che bayere okwu nile Jisus nye Pita. “Saimon, nwa Jọn, ì hurum n’anya kari ndia?” “E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm.” Nkwuputa ihu-n’anya-ya bu ezi okwu, nke nēbili dika o si n’okwukwe n’ozi ọma nke nb͕aghara nmehie nile.
Ọ buru na Jisus ezíghi Pita ya na ndi nēso uzọ-Ya ndi ọzọ ozi ọma nb͕aghara (Bupu Nmehie) nmehie nile site n’isa ukwu-ha, ha agaghi enwe ike ikwuputa ihu-n’anya-ha n’uzọ ahu.
Kama, mb͕e Jisus biakutere ha we jua, “Ì hurum n’anya kari ndia?” Pita gara asi, “Onye-nwe-ayi, abum onye ezughi okè abu-kwam onye-nmehie. Onye apughi ihu Gi n’anya kari ndia. Biko rapum aka.” Ma Pita gara ab͕afu we zonari onwe-ya n’ebe Jisus nọ.
Ma ka ayi che bayere ọziza nile nke Pita. Ewere ozi ọma nb͕aghara nmehie nile (Hichapu Nmehie) gọzie ya, nke baptism Jisus na ọbara Ya nke zọputara ndi madu dum.
Ya mere, ọ siri, “E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm.” Nkwuputa ihu-n’anya nka si na okwukwe-ya n’ozi ọma nb͕aghara nmehie Jisus (Sachapuru Nmehie) aputa. Pita kwere n’ezi ozi ọma nke nb͕aghara nmehie nile (Bupu Nmehie), nke Jisus sitereri na ya bupu nmehie nile nke uwa, ọbuná nmehie nile nke ọdi-n’iru, nke ndi madu aghaghi ime n’ihi erughi eru na adighi-ike nke anu-aru.
N’ihi na Pita kweresiri ike n’ozi ọma nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie nile, n’ihi na o kwe-kwa-ra na Jisus bu Nwa-aturu Chineke, o nwere ike izaghachi Onye-nwe-ayi nēnweghi obi abua. Nzọputa nke Jisus biara site n’ozi ọma nke nb͕aghara nmehie nile (Bupu Nmehie), otú a kwa azọputawo Pita na nmehie-ya nile nke kwa-ubọchi kwa. Pita kwere na nzọputa site n’ozi ọma nb͕aghara (Hichapuru Nmehie) nmehie nile nke uwa.
Ì di kwa ka Pita? Ì puru ihu Jisus n’anya we tukwasi obi na Ya, onye bupuru nmehie nile ayi site na ozi ọma nb͕aghara nmehie (Bupu Nmehie), site na baptism Ya na ọbara? Ì gēsi aṅa pu ighara ikwere ma-ọbu ihu Ya n’anya? Enweghi uzọ ọzọ.
Ọ buru na Jisus bupururi nání nmehie nile gara aga ma-ọbu nke ta, we rapuru-ayi nmehie nile nke ọdi-n’iru, ayi apughi ito Ya dika ayi nēme ub͕u a. Ma tiyere nka, ayi gāga n’ọku-ala-mọ n’ezie. Ya mere, ayi nile kwesiri ikwuputa na azọputawo ayi site n’ikwere n’ozi ọma nb͕aghara (Hichapu Nmehie) nmehie nile.
Ọ diri anu-aru nfé ime nmehie mb͕e nile, ayi nēmehie kwa oge nile. Ya mere, ayi aghaghi ikwuputa na azọputawo ayi site n’ikwere n’ozi ọma nke nkpuchi-nmehie babigara ókè (Sachapuru Nmehie) nke Jisus nyeworo ayi, ozi ọma nke baptism na ọbara Jisus.
Ọ buru na ayi ekweghi n’ozi ọma nke nb͕aghara nmehie nile, nke bu baptism na ọbara Jisus, o nweghi onye kwere ekwe nke agāzọputa na nmehie nile nke ogologo ndu-ya. Ma tiyere nka, ọ buru na ab͕aputaworo ayi na nmehie nile nke ogologo ndu-ayi site n’ikwuputa na ichèghari mb͕e ọ bula, ma eleghi anya ayi gādikari ume-ngwu inọgide dika ndi ezi omume oge nile we nēnwe kwa nmehie n’obi-ayi mb͕e nile.
Ọ buru na ọ di otú a, ayi gālaghachi ighọ onye-nmehie we ghara kwa ihu Jisus n’anya ma-ọbu ibiarute Ya nso. Mb͕e ahu ayi agaghi kwa enwe ike ikwere na nzọputa Jisus we ghara kwa inwe ike iso Ya rue ọgwugwu ndu-ayi.
Otù ọ di, Jisus nyere ayi ozi ọma nb͕aghara nmehie nile (Hichapuru Nmehie) we zọputa ndi nke kwere. Ọ ghọworo Onye-nzọputa zuru okè we sachapu ndahie-ayi nile nke ayi nēme kwa-ubọchi na ndu ayi ka ayi we nwe ike ihu Ya n’anya n’ezie.
Ya mere, ayi ndi kwere ekwe apughi ighara ihu ozi ọma baptism na ọbara Jisus n’anya, nke nb͕aghara nmehie nile ayi (Sachapuru Nmehie). Ndi nile kwere ekwe puru ihu Jisus n’anya rue ebighi-ebi we ghọ kwa ndi nọ n’ọnyà ihu-n’anya nke nzọputa sitere na ozi ọma nb͕aghara (Bupuworo Nmehie) nmehie nile nke Jisus nyeworo ayi.
Ndi m’huru n’anya. Ọ buru na Jisus rapururi ọbuná nmehie ntà n’azu, i gaghi-enwe ike ikwere na Jisus, ma-ọbu inwe ike ighọ onye-àmà nye ozi ọma nb͕aghara nmehie nile (Sachapuru Nmehie). I gaghi-enwe ike ilu ọlu dika orù Chineke.
Ma ọ buru na i kwere n’ozi ọma nb͕aghara nmehie nile (Hichapuru Nmehie), apuru izọputa-gi na nmehie nile nke uwa. O nēkweye ka azọputa-gi na nmehie nile nke uwa mb͕e i mazuru ezi ozi ọma nke nb͕aghara nmehie (Sachapuru Nmehie) nke edekọrọ n’okwu nile nke Jisus.
 
 
“Ì Hurum N’anya Kari Ndia?”
 
Gini bu ihe meworo ka ayi hu Jisus n’anya kari ihe ọzọ ọ bula?
Ihu n’anya Ya nye ayi nke sitere na baptism Ya nke sachapuru nmehie nile ayi, ọbuná nmehie nile nke ọdi-n’iru-ayi
 
Chineke ṅubara nwa-aturu Ya nye ndi-orù Ya, ndi kwere n’ozi ọma nb͕aghara nmehie nile nke-ọma. Jisus juru ub͕ò atọ, “Saimon, nwa Jọn, ì hurum n’anya kari ndia?” Pita za-kwa-ra oge ọ bula, “E, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara na I bu eyìm.” Ub͕ua a, ka ayi che bayere ọziza nile nke Pita. Ayi puru ihu na nka abughi okwu sitere n’ihe ọ nāchọ, kama okwukwe-ya n’ozi ọma nb͕aghara (Bupuru Nmehie) nmehie nile.
Mb͕e ayi huru madu n’anya, ma ọ buru na ihu-n’anya ahu dabere n’ihe ayi nāchọ, ike puru igwu-ya mb͕e ike gwuru ayi. Kama ọ buru na ihu-n’anya ahu dabere n’ikenke ihu-n’anya-Ya, mb͕e ahu o gādigide rue ebighi-ebi. Ihu-n’anya Chineke, ya bu, nkpuchi nmehie nile ayi nke babigara ókè, nzọputa nke miri ahu nke baptism Jisus na Mọ Nsọ, di otú a.
Okwukwe-ayi n’ozi ọma nb͕aghara (Bupuworo Nmehie) nmehie nile, kwesiri idi ka ntọ-ala ihu-n’anya Onye-nwe-ayi nye ayi. Ọ buru na ayi were uche-ayi hu Ya n’anya dika ntọ-ala-ayi, ayi gāsu ngọngọ echi we jedebe kwa ikpọ onwe-ayi asì n’ihi ajọ omume ayi nile. Otú ọ di, Jisus sachapuru nmehie nile ayi: nmehie mbu, nmehie nile ayi nke kwa-ubọchi nke gara aga, nmehie nile nke echi, na nmehie nile nke ogologo ndu-ayi. O rapughi onye ọ bula n’iru uwa na nzọputa-Ya.
Ihe nile ziri ezi. Ọ buru na ihu-n’anya na okwuke-ayi dabere n’uche-ayi, ayi gāda n’okwukwe-ayi. Kama n’ihi na ihu-n’anya na okwukwe ayi dabere n’ozi ọma nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie nile nke Jisus nyeworo ayi, ayi bururi umu Chineke, ndi ezi mume. N’ihi na ayi kwere na nzọputa nke miri ahu na Mọ Nsọ, ayi enweghi nmehie.
N’ihi nzọputa-ayi biara, ọ bughi site n’okwukwe nime onwe-ayi kama site n’ihu-n’anya Chineke, iwu-Ya nke ezi nzọputa site na nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie nile ayi, ayi bu ndi ezi omume ọbuná na ayi ezughi okè na ayi adighi kwa ike n’ezi ndu. Ayi gābà n’ala-eze elu-igwe, n’ikpe-azu we nēto kwa Chineke rue mb͕e ebighi-ebi. Ì kweyere nka?
I. Jọn 4:10 nēkwu, “Nime nka ka ihu-n’anya di, ọ bughi na ayi onwe-ayi huru Chineke n’anya, kama ọ bu na Ya onwe-ya huru ayi n’anya, we zite Ọkpara-Ya ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi bayere nmehie-ayi.” Jisus zọputara ayi site na miri ahu na Mọ Nsọ, ya mere ayi kwesiri inwe okwukwe n’ozi ọma nb͕aghara (Bupuru Nmehie) nmehie nile, baptism Jisus na ọbara Ya.
Ọ buru na Chineke azọputaghi ayi site n’ozi ọma nb͕aghara (Bupuru Nmehie) nmehie nile, apughi izọputa-ayi, ọbuná otù ayi si kwesie ike. Kama Jisus sachapuru nmehie nile ayi nēme n’obi-ayi na n’anu-aru-ayi.
Ka ayi we kwere na Chineke, we ghọ ndi ezi omume, ayi aghaghi imazu nzọputa-ayi site n’okwukwe n’okwu nile nke miri ahu na Mọ Nsọ, ozi ọma nkpuchi (Hichapuru Nmehie) nmehie nile. Ozi ọma nke nb͕aghara (Bupuru Nmehie) nmehie nile nke uwa bu inwe okwukwe na baptism Jisus na ọbara Ya. Ozi ọma nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie nile bu ezi okwukwe, ezi ntọ-ala nzọputa, na nkpisi-ugodi nke ozi ọma Chineke.
 
 
Ayi Kwesiri Itufu Okwukwe nke Uche nke Aka Ayi 
 
Òle ebe ezi okwukwe si-abia?
Ọ nēsi n’ihu-n’anya Onye-nwe-ayi bia, onye sachapururi nmehie nile ayi nke ub͕u a na nke ọdi-n’iru.
 
Okwukwe ma-ọbu ihu-n’anya nke amuworo site n’uche nke madu abughi ezi ihu-n’anya ma-ọbu ezi okwukwe. Enwere ọtutu n’uwa nka ndi buru uzọ kwere na Jisus site n’ezi uche, mb͕e ahu emesia ha we rara okwukwe-ha dum nye n’ihi nmehie di n’obi-ha.
Kama ayi kwesiri imazu na Jisus sachapuru nmehie nile nke uwa: ọ bughi nání ajọ omume nile nādighi uku, kama oké nmehie kwa nke emere site na amaghi-ihe.
Na Jọn isi 13, ka ewe zí ndi nēso uzọ-Ya otù nzọputa Ya si di irè, Jisus kpọkọtara ndi nēso uzọ-Ya tutu akpọgide Ya n’Obe. Mb͕e Ya na ndi nēso uzọ-Ya nērikọ nri-anyasi, O biliri we sa ukwu-ha ka ewe gosi ezi-okwu nke nzọputa-Ya. Ayi dum kwesiri imara we kwere kwa n’ozi ọma nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie nile, Jisus zíri ndi nēso uzọ site n’isa ukwu-ha.
Ma Pita we jusie ike ikwe ka Jisus sa ukwu-ya na mbu. “I gaghi-asa ukwum ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi!” Ma nka bu okwu okwukwe si n’uche nke aka ya. Kama Jisus gwara ya, “Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.”
Ub͕u a, site n’ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ, ayi puru ighọta okwu nile nke Jisus. Ha bu Okwu ezi-okwu, ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ, nb͕aghara nmehie nile (Bupuru Nmehie), nke kweyere ka onye-nmehie ghọ onye ezi omume site n’iji obi-ya dum kwere.
Pita ya na ndi nēso uzọ-Ya ndi ọzọ gara ib͕u azù. Ha jere ib͕u azù dika ha meworo tutu ha zute Jisus. Mb͕e ahu Jisus putara n’ebe ha nọ we kpọ ha òkù. Jisus jikereri ha nri-ututu, mb͕e ha nēri kwa nri-ututu, Pita mazuru isi okwu nile ahu nke Jisus kwuworori tutu. “Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.” N’ikpè-azu ọ mazuru ihe Jisus putara site n’isa ukwa-ya tutu.
“Onye-nwe-ayi sachapuru nmehiem nile. Nmehie nile m’nēme n’ihi adighi-ikem, gunyere nmehie nile m’gēme n’ọdi-n’iru kwa.” Ya mere Pita rapuru okwukwe amuru site n’ihe ọ nāchọ we malite kwa ikwere na baptism na ọbara Jisus, ozi ọma nke nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie.
Mb͕e nri-ututu gasiri, Jisus juru Pita, “Ì hurum n’anya kari ndia?” Ub͕u a, okwukwe n’ihu-n’anya Jisus wusiri-ya ike, Pita kwuputara. “E, Onye-nwe-ayi, Gi onwe-gi matara na I bu eyìm.” Pita puru ikwu ya n’ihi na ọ mazururi ihe Jisus putara mb͕e Ọ siri, “I gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.” O puru ikwuputa ezi okwukwe-ya, okwukwe na baptism na ọbara Jisus, ozi ọma nb͕aghara (Hichapu Nmehie) nmehie.
 
 
Emesia, Ọ Ghọrọ Ezi Orù Chineke
 
Ya mere, mb͕e ihe-iriba-ama ahu gasiri, Pita na ndi nēso uzọ-Ya ndi ọzọ kwusara ozi ọma ahu rue ọgwugwu ubọchi nile ha. Ọbuná Pọl, onye kpab͕uru ndi Kristian nēnweghi obi ebere, b͕ara ozi ọma ahu àmà n’ubọchi ndia ahu siri ike nke Ala-eze ndi-Rom.
 
Ì gēsi aṅa pu ighọ ezi orù Chineke?
Site n’ikwere na nkpuchi-nmehie-Ya nke nmehiem nile rue ebighi-ebi
 
N’etiti ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ Jisus, Judas rere Jisus emesia kwa kwub͕ue onwe-ya. Ọ bu Onye-ozi Pọl onye were ọnọdu-ya. Ndi nēso uzọ-Ya rọputarari Mataias n’etiti onwe-ha, kama ọ bu Pọl ka Chineke rọputara, ya mere Pọl ghọrọ onye-ozi Jisus we kwusa kwa ozi ọma nb͕aghara (Bupuru Nmehie) nmehie nile ya na ndi nēso uzọ Jisus ndi ọzọ.
Ọtutu ndi nēso uzọ Jisus nwuru dika onye eji oké nkpab͕u b͕ue. Ọbuná mb͕e eji ọnwu bara ha nba, ha gabara n’iru ikwusa ozi ọma mbu ahu.
“Jisus Kraist sachapuru nmehie nile nke anu-aru-gi site n’ozi ọma nke baptism Ya na ọbara, ya bu, site na ozi ọma Ya nke nkpuchi (Bupuru Nmehie) nmehie nile. Jisus bupuru nmehie-gi nile site na baptism Ya na Jọdan we būru kwa ikpé ahu n’ihi gi n’Obe. Kwere n’ozi ọma baptism nke Jisus na ọbara Ya n’Obe, ka azọputa-gi.”
Ọtutu n’ezie ka azọputara site n’inu ozi ọma ahu we kwere kwa na ya. Ọ bu ike okwukwe nime ozi ọma nke baptism Jisus, ọbara Ya, na Mọ Nsọ.
Ndi nēso uzọ-Ya kwusara ozi ọma nke miri ahu na Mọ Nsọ, nāsi, “Jisus bu Chineke na Onye-nzọputa.” Ọ bu n’ihi na ha b͕ara ozi ọma nke miri ahu na Mọ Nsọ àmà, ka mu na gi puru inu ozi ọma nke baptism na ọbara Jisus ub͕u a, nke azọputa, ewe zọputa kwa ayi na nmehie. N’ihi ihu-n’anya ebighi-ebi Chineke na nzọputa zuru okè nke Jisus, ayi dum ghọworo ndi nēso uzọ Jisus.
Ùnu dum kweyere? Jisus huru ayi n’anya nke-uku na O nyere-ayi ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ, nb͕aghara nmehie (Bupuru Nmehie), ayi ghọwo-kwa-ra ndi nēso uzọ Jisus ndi bu ndi ezi omume. Ka ewe zí ezi ozi ọma nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie nile, Jisus sara ukwu ndi nēso uzọ-Ya.
Jisus sara ukwu ndi nēso uzọ-Ya izí ha na ayi na nmehie nile nke uwa, nmehie nile ayi nēme ogologo ndu-ayi, ka asachapuru mb͕e emere Jisus baptism we wusì kwa ọbara n’Obe. Ayi nēkele Jisus n’ihi ihu-n’anya-Ya na ozi ọma nb͕aghara nmehie nile (Bupuru Nmehie).
Jisus zíri ayi ihe abua site n’isa ukwu ndi nēso uzọ-Ya. Nke mbu, ọ bu izí ha, dika O si kwue, “Ihe Mu onwem nēme, gi onwe-gi amataghi ya ub͕u a; ma i gāmara mb͕e ihe ndia gasiri.” Na asachapuru nmehie nile ayi site n’ozi ọma nb͕aghara (Hichapuru Nmehie) nmehie nile, baptism Jisus na ọbara Ya.
Ozizí nke abua bu na Jisus wedara Onwe-ya izọputa ndi-nmehie we me kwa ha ndi ezi omume, ayi, ndi amuworo ọzọ, kwesiri ijere ndi ọzọ ozi site na ikwusa ozi ọma nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie nile. Ọ bu ihe ziri ezi nye ayi bú ndi buru uzọ bia, ijere ndi ọzọ ozi bú ndi gaje ibia ma emesia.
Ihe abua ahu mere Jisus ji sa ukwu ndi nēso uzọ-Ya n’ubọchi ahu tutu ememe Ngabiga di ọcha, ha ka nādigide kwa nime Nzukọ Kraist. 
Onye nēso uzọ apughi-ika onye-ozizí-ya uku ma-ọli. Ya mere, ayi nēkwusa ozi ọma ahu nye uwa we nējere ya ozi dika ayi nējere Jisus ozi. Ayi kwa, ndi eburu uzọ zọputa, kwesiri ijere ndi gaje iso ayi n’azu ozi. Ka ewe zí nka, Jisus sara ukwu ndi nēso uzọ-Ya. Ma tiyere nka, site n’isa ukwu Pita, O gosiri ayi na Ọ bu Onye-nzọputa zuru okè nye ayi ka ekwensu we ghara iduhie ayi ọzọ ma-ọli.
Apuru izọputa unu dum site n’ikwere n’ozi ọma nb͕aghara (Bupuru Nmehie) nmehie nile, site na miri ahu na Mọ Nsọ. Jisus sachapuru nmehie nile ayi site na baptism-Ya, nkpọgide n’obe-Ya, na nbilite-n’ọnwu-Ya, nání ndi nke kwere n’ozi ọma-Ya ka apuru izọputa na nmehie nile nke uwa rue ebighi-ebi.
 
 
N’inwe Okwukwe n’Ozi Ọma Nke Sachapuru Nmehie nile ayi nke Kwa-ubọchi 
 
Ayi puru ibipu nduhie nile nke ekwensu site n’ikwere n’ozi ọma nb͕aghara nmehie nile (Hichapuru Nmehie), okwu nile nke miri ahu na Mọ Nsọ. Anēduhie ndi nile site n’aka ekwensu n’uzọ di nfé, ekwensu nātakwu kwa ntakwu na nti-ha mb͕e nile. Nāmata na anu-aru ndi nile nēme nmehie nēwepughi aka n’uwa, hà gēsi aṅa pu ighara inwe nmehie mb͕e nile? Ndi nile bu ndi-nmehie.
Ayi mara ọziza ahu. “N’ebe amatara na Jisus bupuru nmehie nile nke anu-aru-ayi site na baptism-Ya, ònye kwere ekwe gēsi aṅa pu inwe nmehie? Jisus kwuzuru ugwọ-ọlu nke nmehie, ya mere òle nmehie ọzọ diri ayi ikwu ugwọ-ọlu-ya?”
Ọ buru na ayi ekweghi n’ozi ọma miri ahu na ọbara ahu, okwu nile ekwensu gādi ka ihe nwere uche. Kama, ọ buru na ayi nwe ozi ọma ahu n’akuku-ayi, ayi puru inwe okwukwe nēnweghi obi-abua n’ezi-okwu nke okwu nile nke Chineke.
Ya mere ayi kwesiri inwe okwukwe n’ozi ọma imu ọzọ nke miri na ọbara. Ezi okwukwe bu ikwere n’ozi ọma nke Baptism Jisus, ọbara-Ya n’Obe, ọnwu-Ya na nbilite-n’ọnwu-Ya.
Ìhuwo ihe-osise ọdidi ulo-ikwū ahu di nsọ ma-ọli? Ọ bu ulo di ntà. Ekewara ulo ahu nkera abua, akuku dipuru adipu bu ebe di nsọ na akuku di nime bu Ebe Nsọ Kachasi Ebe Nsọ Nile ahu nke ebe-nkpuchi-nmehie ahu di nime ya.
Enwere ngukọta ide di 60 nēguzo n’Ogige dipuru adipu nke Ulo-ikwū ahu, ebe ahu di nsọ nwe kwa-ra ibo di 48. Ayi aghaghi inwe ihe-osise ulo-ikwū ahu di nsọ n’uche-ayi ka ayi we ghọta isi okwu nile Chineke.
 
 
Gini Bu Ihe Eji Me Ọnu-uzọ-ama nke Ogige ulo-ikwū ahu? 
 
Gini bu ihe eji me ọnu-uzọ-ama nke ogige Ulo-ikwū ahu?
Ákwà-nkwuchi nke ogho anunu, ogho ododo na ogho uhie na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.
 
Akọwara ọnu-uzọ-ama nke ogige Ulo-ikwū ahu na Ọpupu 27:16, “Ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu gēnwe kwa ákwà-nkwuchi orú cubit, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọdudu-ákwà: ide-ha gādi anọ, ukwu-ha anọ kwa.” Ihe nile ejiri me ọnu-uzọ-ama nke ogige Ulo-ikwū ahu bu ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma. Akpara ya nke-ọma we nēb͕u kwa maramara nke-uku.
Chineke nyere Moses iwu ka ewere ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie kpa ọnu-uzọ-ama ahu n’ib͕u maramara nke-uku ka ọ di nfé madu nile ichọputa ọnu-uzọ ahu. Ọnu-uzọ-ama nke eji ogho anunu, ogho ododo, ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma me kwubara n’ide anọ.
Ihe anọ ahu nēgosi ihe-atù nzọputa Chineke, nke Ọ gēsi na ya zọputa ndi kwere na Ọkpara Ya, na baptism na ọbara Jisus, ya na n’ibu Chineke Ya. 
Ihe ọ bula nime ihe nile eji wue ulo-ikwū ahu di nsọ nwere isi-ya we nānọchi kwa anya okwu Chineke ya na ìzù-Ya nile izọputa ndi madu site na Jisus.
Ub͕u a, ọtutu ihe ra aṅa di iche iche ka ejiri me ogige ọnu-uzọ-ama nke ulo-ikwū ahu di nsọ? Ogho anunu, ogho ododo, ogho uhie, na ezi ákwà ọcha. Ihe anọ ndia di nkpà inyere ayi aka ime ka okwukwe ayi guzosie ike n’ozi ọma imu ọzọ. Ọ buru na ọ dighi nkpà, agaghi edekọ ozi a nke-uku n’otù n’otù na Bible.
N’ihi na ihe nile nke ọnu-uzọ-ama nke ogige Ulo-ikwū ya na Ulo-ikwū ahu bu kwa akuku di nkpà nke nzọputa, ejiri ogho anunu, ogho ododo, ogho uhie, na ezi ákwà ọcha me ya. Nzọputa nka sachapuru nmehie nile ayi nke kwa-ubọchi, nmehie nile nke mbu, na nmehie nile nke ọdi-n’iru. Ya mere, Chineke kpughere Moses ihe ndia we si ya ka o me ya otú ahu esiri gwa ya okwu.
 
 
Gini Bu Isi Ogho Anunu, Ogho Ododo, na Ogho Uhie nime Ozi Ọma Chineke?
 
Gini ka ihe nile eji me ulo-ikwū ahu nēgosi dika ihe-atù?
Nzọputa Jisus nke sitere na baptism Ya na ọbara
 
Nime ulo-ikwū ahu di nsọ, ogho anunu, ogho ododo, ogho uhie, na ezi ákwà ọcha ka ejiri me ákwà-nb͕ochi nke akwubara n’etiti ebe di nsọ na Ebe Nsọ Kachasi Ebe Nsọ Nile. Otù ihe nile ahu ka ejiri me uwe-nwuda nke onye-isi-nchu-àjà, onye jere ozi nime Ulo-ikwū ahu di nsọ.
Ogho anunu bu ihe-atù baptism Jisus. Na I. Pita 3:21, ọ siri, “Bú miri nke nāzọputa kwa unu ub͕u a n’uzọ yiri ihe-atù a, ya bu baptism.” Baptism Jisus nke O sitere na ya būru nmehie nile nke uwa ka Pita mere ka o guzosie ike n’ama-okwu a dika ihe-atù nke nzọputa nkpuchi-nmehie. Nmehie nile ayi, nmehie nile nke uwa, ka atukwasiri n’elu Jisus site na baptism-Ya. Ya mere, ogho anunu, baptism Jisus ahu, bu akuku kachasi di nkpà n’okwu nzọputa ahu.
Ogho uhie nēgosi ọbara Jisus, ma ogho ododo nēgosi Ibu-Chineke-Ya—udi Jisus dika Eze na Chineke. Ya mere, iru ogho atọ ahu di nkpà nye okwukwe-ayi na Jisus na nzọputa-Ya.
Uwe mara nma nke onye-isi-nchu-àjà nēyi anākpo ephod bu kwa anunu anunu. Onye-isi-nchu-àjà yiri ákwà-nkukù-isi n’isi-ya nke eb͕uru n’elu ya ihe di mbara nke ọla-edo anāgwaghi agwa dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, ‘IHE NSỌ JEHOVA NWERE.’ Ihe di mbara ahu dikwasiri n’ákwà-nkukù-isi ahu nke atukwasiri n’eriri-nma anunu.
 
 
Ezi-okwu Ahu nke Ogho Anunu Nọchiri Anya 
 
Gini bu ihe ogho anunu nēgosi?
Baptism Jisus
 
M’lere ihe ogho anunu putara na Bible. Gini bu ihe Bible nēkwu bayere iru anunu? Ayi kwesiri ighọta ogho anunu n’etiti ogho nile nke ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie.
Ogho anunu putara baptism Jisus. Emere Jisus Kraist baptism site n’aka Jọn Baptist ibūru nmehie nile nke uwa (Matiu 3:15).
Ọ buru na Jisus ebupughi nmehie nile nke uwa site na baptism Ya, ayi apughi ighọ ndi edoro nsọ n’ebe Chineke nọ. Ya mere, Jisus Kraist kwesiri ibia n’uwa a ka ewe me Ya baptism site n’aka Jọn Baptist n’Osimiri Jọdan ibupu nmehie nile nke uwa.
Ihe mere eji kwesi inwe ogho anunu n’ọnu-uzọ-ama nke ogigi ulo-ikwū ahu di nsọ bu n’ihi na ayi apughi ighọ ndi edoro nsọ ma ewezuga baptism Jisus. 
Ogho uhie putara ọnwu Jisus. Iru ododo putara Mọ Nsọ, otú a udi Jisus dika “Onye nání Ya bu Onye di ike, bú Eze kachasi ndi bu eze, Onye bu kwa Onye-nwenu kachasi ndi nāchi ka ndi-nwe madu” (I. Timọti 6:15).
Ogho uhie putara ọbara Kraist, onye wusiri ọbara n’Obe ikwu ugwọ-ọlu nke nmehie nile nke ndi madu dum. Jisus Kraist biara n’uwa nka n’anu-aru ibūru nmehie nile nke ndi madu n’elu Onwe-ya site na baptism Ya, tutu kwua ugwọ-ọlu nke nmehie nile site n’ichu Onwe-ya dika àjà n’Obe imezu nb͕aghara nmehie (Bupuru Nmehie). Baptism Jisus bu ezi ozi ọma nke nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie nile, nke eburu amuma-ya site n’iru nile nke ogho ejiri me ulo-ikwū ahu di nsọ na Testament Ochie.
Ejiri osisi acacia me ide nile nke ulo-ikwū ahu, ukwu-ha nile gābu kwa ọla, ejiri ngegide ọla-ọcha kpuchie ukwu ọla nile ahu.
Ndi-nmehie nile ka ekwesiri ikpe ikpé n’ihi nmehie nile ha n’ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie nile bu ọnwu. Tutu agọzie madu site n’aka Chineke ka ewe mua ya ọzọ, o kwesiri ikwezu na ekwesiri ikpe ya ikpé n’ihi nmehie-ya nile.
Ya mere, baptism Jisus na Testament Ọhu, nke ogho anunu nke ulo-ikwū ahu di nsọ nọchiri anya ya, būruri nmehie nile ayi. Jisus būru nmehie nile ayi ga n’Obe iwusì ọbara ewe kpe kwa Ya ikpé n’ihi ha. N’ime otú a, Ọ zọputara ayi dum bú ndi nwere okwukwe n’ozi ọma nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie nile. Ọ bu Eze kachasi ndi bu eze na Chineke di Nsọ.
Ndi m’huru n’anya, baptism Jisus bu nzọputa Jisus, onye zọputara ayi site n’ibupu nmehie nile ayi. Jisus, onye bu Chineke, ridatara n’uwa n’anu-aru; emere Ya baptism ibūru nmehie nile nke uwa; akpọgidere Ya n’obe we wusì ọbara n’Obe inata ikpé n’ọnọdu-ayi. Baptism Jisus nāgwa ayi okwu nēnweghi obi abua ọ bula na Ọ ghọworori ezi Onye-nzọputa nke ndi madu dum. 
Ayi puru ihu ya n’iru nile nke ejiri me ọnu-uzọ-ama nke ulo-ikwū ahu di nsọ. Iji ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma putara na Ọ zọputara ayi dum nādighi iche na nmehie nile nke uwa.
Ikpa ákwà ọnu-uzọ-ama ahu nke-ọma site n’ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie na ezi ákwà ọcha bu igwa ayi n’ebe ọ di ọcha ezi-okwu nke nzọputa Chineke. Ọ kachasi di nkpà nye nzọputa nke nkpuchi-nmehie.
Ayi puru ihu site na ihe nile eji me ọnu-uzọ-ama ulo-ikwū ahu di nsọ na Jisus Kraist azọputaghi ayi ndi-nmehie n’uzọ aghara, nāb͕aghi ìzù. Ya, n’izo ìzù Chineke nke-ọma n’otù n’otù, emere Ya baptism, mb͕e ahu kpọgide Ya n’obe, ewe me ka O si na ndi nwuru anwu bilie n’ọnwu imezu nzọputa nke ndi madu. Site n’ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie, ihe nile nke ozi ọma nb͕aghra (Sachapuru Nmehie) nmehie nile, Jisus zọputara ndi dum ndi kwere na nzọputa-Ya.
 
 
Ite Ọla Ọsisa-Miri Ahu nke Testament Ochie Bu Onyinyo Baptism nke Testament Ọhu 
 
Gini bu ihe mere ndi-nchu-àjà ji asa aka-ha na ukwu-ha tutu ha bà nime ebe ahu di nsọ?
N’ihi na ha aghaghi iguzo n’iru Chineke nēnweghi nmehie ọ bula.
 
Eji ọla me kwa ite ọsisa-miri ahu. Ọla nānọchi anya ikpé Jisus huru n’ihi ayi. Ite ọsisa-miri ahu nēgosi okwu ozi ọma ahu, nke nāgwa ayi na asachapuru ajọ omume nile ayi.
Ọ nēgosi ayi otù esi me ọsisa nmehie nile. Ọ bu oyinyo nke ezi-okwu ahu na nmehie nile nke uwa ka asachapuworo site n’okwukwe n’okwu nike nke baptism Jisus.
Ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku nānọchi anya ikpé. Miri ahu nke Jisus, nke bu ogho anunu, bu ozi ọma nke nkpuchi nmehie nile, baptism Jisus site n’aka Jọn Baptist (Matiu 3:15, I. Jọn 5:5-10). Ọ bu okwu àmà nke ozi ọma nzọputa ahu site na nkpuchi-nmehie.
Na I. Jọn 5, edeworo ya, “Nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi. N’ihi na ndi ahu ndi nāb͕a àmà di atọ, bú Mọ ahu, na miri ahu, na ọbara ahu: ha atọ diri ime otù ihe ahu.” Ọ nāgwa kwa ayi na onye nke kwere na Ọkpara Chineke nwere àmà nke miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu nime ya.
Chineke kweyere ka edo ayi nsọ site n’okwukwe n’ozi ọma nke nkpuchi-nmehie na ibà n’ulo-ikwū ahu di nsọ. Ya mere, ub͕u a ayi puru ibi ndu n’okwukwe, ewe zù ayi site n’okwu nile Chineke, ewe gọzi-ayi site n’aka Ya, we nēbi kwa ndu nke ndi ezi omume. Ighọ ndi nke Chineke putara izọputa site n’okwukwe n’ozi ọma nkpuchi-nmehie we nēbi kwa n’ulo-ikwū ahu di nsọ.
Ọtutu ndi ta nāsi na o zuru okè nání ikwere nēchèghi bayere isi ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie nke ọnu-uzọ-ama ulo-ikwū ahu di nsọ. Ọ buru na madu kwere na Jisus nāmataghi bayere ihe ndia, okwukwe-ha agaghi ezi ezi n’ihi na ha ka nwere nmehie n’obi-ha. Madu ka gēnwe nmehie n’obi-ha n’ihi na ha ekweghi n’ezi-okwu nke imu ọzọ site na ozi ọma nkpuchi-nmehie, nke miri ahu, ọbara ahu, na Mọ ahu.
Ọ buru na ariọ madu ka ọ tule onye madu ahu nāmataghi nke-ọma, ọ buru kwa na, ime ihe gādi onye nēge ya nti ezi nma, ọ siri, “E, m’kweyere onye nka. Ezuteghm ya ma-oli, kama otù ọ di m’kweyere ya” Ì nēchè na ihe ahu gādi onye nēge ya nti ezi nma? Ma eleghi anya ọ gādi ufọdu nime unu ezi nma, kama nka abughi udi ntukwasi-obi Chineke nāchọ n’aka-ayi.
Chineke nāchọ ka ayi kwere n’ozi ọma nb͕aghara (Bupuworo Nmehie) nmehie nile, nzọputa Jisus ahu sitere na ogho anunu (baptism Jisus), ogho ododo (Ibu-Chineke Jisus), na ogho uhie (ọbara Jisus). Ayi kwesiri imara, tutu we nēnwe okwukwe na Jisus, otù O si zọputa-ayi na nmehie nile.
Mb͕e ayi kwere na Jisus, ayi kwesiri imata otù O si zọputa-ayi na nmehie nile ayi site na miri ahu (baptism Jisus ahu), ọbara ahu (ọnwu Ya), na Mọ Nsọ (Jisus ibu Chineke). 
Mb͕e ayi ghọtara n’ezie, ayi puru ihuta ezi okwukwe, okwukwe zuru okè ewe jide kwa ayi. Okwukwe-ayi agaghi-ezu okè ma-ọli ma ọ buru na ewepu ezi-okwu a. Ezi okwukwe nābia nání site n’ighọta àmà nke nzọputa Jisus, ozi ọma nb͕aghara nmehie nile (Bupuru Nmehie), ya na Jisus ibu ezi Onye-nzọputa nke ndi madu.
Gini, mb͕e ahu, bu ihe okwukwe nēlelì Jisus di ka ya? Ka ayi hu.
 
 
Okwukwe Ahu Nke Nēlelì Jisus 
 
Gini bu ihe akāchasi chọ n’ihi okwukwe?
Amam-ihe zuru okè nke baptsim Jisus
 
I kwesiri imata na ikwere na Jisus n’uzọ ọ bula bu ilelì Ya. Ọ buru na i nēchè, “O sirim ike ikwere, ma n’ihi Ọ bu Chineke na Ọkpara Chineke, m’gēkwesi ikwere,” mb͕e ahu i nēlelì Jisus. I kwesiri ikwere na baptism na ọbara Jisus, ozi ọma nkpuchi-nmehie.
Ikwere na Jisus n’amazughi ozi ọma nkpuchi-nmehie nile (Hichapuru Nmehie) di njọ kari ekweghi na Jisus ma-ọli. Ikwusa ozi ọma nání ọbara Jisus bu ilu ọlu n’efu n’amazughi ezi-okwu ahu.
Jisus anaghi-achọ ka onye ọ bula kwere na Ya n’uzọ ọ bula ma-ọbu nēnweghi uche-obi. Ọ nāchọ ka ayi kwere na Ya site n’imazu ozi ọma nkpuchi-nmehie.
Mb͕e ayi kwere na Jisus, ayi matara na ozi ọma nkpuchi-nmehie bu baptism na ọbara Jisus. Mb͕e ayi kwere na Jisus, ayi kwesiri ighọta ozi ọma nkpuchi-nmehie site n’okwu Ya nile we mazu otù ahu O si sachapu nmehie nile ayi.
Ayi kwesi kwa-ra imazu ihe ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie n’ọnu-uzọ-ama ulo-ikwū nānọchi anya ha. Mb͕e ahu, ayi puru inwe ezi okwukwe nke gādigide rue ebighi-ebi.
 
 
Apughi Imu-Ayi Ọzo Ma-ọli Ma Ayi Ekweghi na Jisus, Onye bu Nmezu Ogho Anunu, Ogho Ododo, na Ogho Uhie 
 
Gini bu ihe ndi-nchu-àjà mere tutu ha bà nime ebe ahu di nsọ?
Ha sara aka na ukwu ha site na miri ahu si n’ite ọsisa-miri ọla ahu.
 
Onye-nwe-ayi Jisus zọputara ayi. Ayi apughi ighara ito Onye-nwe-ayi mb͕e ayi nāhu otù O si zọputa-ayi n’uzọ zuru okè. Ayi kwesiri ikiri ulo-ikwū ahu di nsọ. O nyere ayi okwu nile nke ozi ọma nkpuchi-nmehie site na ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie nke ulo-ikwū ahu di nsọ we were kwa ha zọputa ayi. Ayi nēkele we nēto kwa Onye-nwe-ayi.
Ndi-nmehie apughi ibà n’ebe ahu di nsọ. Onye nwere nmehie gēsi aṅa pu ibà n’ebe ahu di nsọ? Nka bu ihe agaghi ekwe omume. Ọ buru na onye di otú a bà, agēb͕u-ya mb͕e ahu n’ebe ahu. Ọ gaghi-abu ngọzi, kama ikpé siri ike. Onye-nmehie apughi ibà ma-ọli n’ebe ahu di nsọ we nwe kwa olile-anya idi ndu.
Onye-nwe-ayi zọputara ayi site n’ihe-nzuzo ezoro n’ọnu-uzọ-ama n’ulo-ikwū ahu di nsọ. Site na ogho anunu, ogho ododo na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha ahu, Ọ zọputara ayi. O we gwara kwa ayi ihe-nzuzo nke nzọputa-Ya site n’ihe ndia.
Àzọputara mu na gi n’uzọ ahu? Ọ buru na ayi ekweghi n’okwu nile nke ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie, nzọputa site n’ozi ọma nkpuchi-nmehie agaghi-adi. Iru anunu anaghi anọchi Chineke, ọ putara baptism Jisus. Ọ putara baptism Jisus onye bupuru nmehie nile ayi.
Madu puru ibà rue n’ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku nēkweghi na ogho anunu ahu. Otú ọ di, ọ pughi ibà n’ebe ahu di nsọ bú ebe Chineke nēbi.
Ya mere, tutu ayi abà n’ọnu-uzọ-ama nke ulo-ikwū ahu di nsọ, ayi kwesiri ikwere na ogho anunu (baptism Jisus), ogho uhie (ọbara Ya n’Obe), na ogho ododo (Jisus ibu Chineke na Ọkpara Chineke). Nání mb͕e ayi kwere ka Chineke nānabata ayi we kwe kwa ka ayi bà site na ákwà-nb͕ochi nke Ebe Nsọ Kachasi Ebe Nsọ Nile ahu.
Ufọdu nābà n’ogige dipuru adipu nke ulo-ikwū ahu we nēchè na ha nọ nime. Ma nka abughi nzọputa Rùe ebe ka ayi kwesiri iga ka ewe zọputa-ayi? Ayi kwesiri inwe ike ibà n’Ebe Nsọ Kachasi Ebe Nsọ Nile ahu.
Ka ewe bà nime Ebe Nsọ Kachasi Ebe Nsọ Nile ahu, ayi kwesiri igāfe ite ọsisa-miri ọla ahu. Ite ọsisa-miri ọla ahu nānọchi anya baptism Jisus, ayi kwesiri kwa-ra isachapu nmehie nile ayi nke kwa-ubọchi site na baptism Jisus we ghọ ndi edoro nsọ ibà n’ebe ahu di nsọ.
Na Testament Ochie, ndi-nchu-àjà kwesiri isa onwe-ha tutu ha bà, na Testament Ọhu kwa, Jisus sara ukwu ndi nēso uzọ-Ya igosi ihe-atù isachapu ndahie nile nke ogologo ndu-ha.
Iwu Chineke nāsi, “N’ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.” (Ndi Rom 6:23). Chineke nēkpe nmehie nile nke madu ikpé nādighi iche, ma Ọ tukwasiri ha n’elu Ọkpara-Ya we kpe kwa Ya ikpé n’ọnọdu-ayi. Nka bu ihu-n’anya Chineke, nzọputa-Ya. Agēru ezi nzọputa nání mb͕e ayi kwere n’ozi ọma nkpuchi-nmehie, baptism ahu, ọbara ahu, na ọnwu ahu, na nbilite-n’ọnwu nke Jisus.
 
 
Ka Ewe Mua Ọzo, Madu Ekwesighi Ikwá Ezi Okwu Nke Akwukwọ Nsọ Emò Ma-ọli, Ozi Ọma Nkpuchi Nmehie Nile 
 
Gini bu nání ihe fọduru ayi ime?
Ọ bu ikwere n’okwu nile Chineke edeworo.
 
Anaghm akwa ndi ọzọ emò. Mb͕e madu nēkwu bayere ihe m’nāmaghi nke-ọma, m’nāju ha ka ha zíem ya. Ma mb͕e m’juru bayere ihe ulo-ikwū ahu di nsọ putara, o nweghi onye puru igwam. 
Mb͕e ahu gini bu ihe m’puru ime? M’kwesiri ilaghachi na Bible. Na Bible, n’èbe ka ekwuru bayere ulo-ikwū ahu di nsọ? Akọwara-ya n’otù n’otù n’akwukwọ Ọpupu. Ọ buru na madu gu akwukwọ a nke-ọma, ọ puru ighọta isi-ya site n’okwu nile nke Chineke edeworo.
Ndi-eyì m’huru n’anya, apughi izoputa unu site n’ikwere na Jisus n’uzọ kpuru ìsì. Apughi imu unu ọzọ nání site iga nzukọ Kraist mb͕e nile. Ayi matara ihe Jisus gwara Nikọdimọs. “N’ezie, n’ezie, asim i, Ọ buru na amughi madu site na miri na Mọ Nsọ, ọ pughi ibà n’ala-eze Chineke....Gì onwe-gi bu onye-ozizí Israel, ma i maghi ihe ndia?” (Jọn 3:5, 10)
Ndi nile ndi kwere na Jisus kwesiri ikwere na ogho anunu (atukwasiri nmehie dum nke uwa n’elu Jisus mb͕e emere Ya baptism), ogho uhie (ọnwu Jisus n’ihi nmehie nile ayi), na ogho ododo (Jisus bu Onye-nzọputa, Chineke, na Ọkpara Chineke).
Ayi kwesiri ikwere na Jisus bu Onye-nzọputa ndi-nmehie nile nke uwa. Ma enweghi okwukwe a, apughi imu madu ọzọ ma-ọli, ọ pughi kwa ibà n’ebe ahu di nsọ nke ala-eze Chineke. Madu apughi ọbuná ibi ndu ntukwasi-obi n’uwa nka ma ewezuga ya.
Ọ̀ gaghi-abu ihe di nfé ma ọ buru na apuru imu madu ọzọ nání site n’inwe okwukwe na Jisus? —E— “♫Azọputawo-gi. Azọputawom. Azọputawo-ayi dum.♫” Le ka o si di nma! Ma enwere ọtutu ndi kwere na Jisus ma ha abughi ndi ‘amuworo ọzọ’ n’ezie.
Madu kwesiri imazu ezi-okwu ahu na Bible we nwe kwa okwukwe na Jisus. Ayi kwesiri ighọta ozi ọma nb͕aghara (Sachapuru Nmehie) nmehie na Bible ya na isi ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie ka ewe bà n’ulo-ikwū ahu di nsọ we soro Chineke nọkọ n’uwa okwukwe ahu. Nime ulo-ikwū nke okwukwe ahu, ayi puru ibi n’obi utọ rue mb͕e oge nābia iduru ayi rue n’ala-eze-Ya. Ọ di nkpà ayi ikwere na Jisus n’uzọ ziri ezi.
 
 
Ozi Ọma Mbu Ahu Nāmu Ido-Nsọ site na Ogho Anunu 
 
Gini bu ọnọdu di nkpà n’ihi nzọputa-ayi?
Baptism nke Jisus
 
Mb͕e ufọdu madu nēche na ọ puru ibi ndu zuru okè na emeghi ihe nile hiere-uzọ. Otú ọ di, mb͕e ọ nānwasi ike ime ezi ihe, ọ gāmata erughi-eru-ha nile n’oge nādighi anya. Ndi madu ezughi okè, ọ bu kwa ihe agaghi ekwe omume ka ha ghara imehie. Otú ọ di, n’ihi na Jisus zọputara-ayi site na ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie, ozi ọma nkpuchi-nmehie ahu, apuru ido ayi nsọ we bà kwa n’ebe ahu di nsọ nke Chineke.
Ọ buru na Chineke azọputaghi ayi site na ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie, ayi apughi ma-ọli inwe ike ibà n’ebe ahu di nsọ site n’onwe-ayi. Gini bu ihe mere nka? Ọ buru na nání ndi nēbi ndu zuru okè n’anu-aru-ha puru ibà, agaghi enwe onye ọ bula onye gētozu okè. Mb͕e madu kwere na Jisus we ghara imazu ozi ọma ahu, ha nētiye ọtutu nmehie n’obi-ha kari.
Jisus zọputara ayi site na nzọputa-Ya ab͕ara ìzù-ya nke-ọma, nzọputa nke ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie, na ákwà ọcha. Ọ sachapuru nmehie-ayi dum. Ì kwere na nka? —E.— Ì nwere ezi-okwu ozi ọma nb͕aghara nmehie nile (Sachapuru Nmehie) n’obi-gi we nāb͕a-kwa-ra ya àmà? —E.—
Nání mb͕e i nāb͕ara ozi ọma ahu àmà ka i puru itiye n’egedege-iru-gi ihe di mbara nke nāsi ‘IHE NZỌ JEHOVA NWERE’ we nēso kwa ‘òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze’ (I. Pita 2:9). Nání mb͕e ahu ka i puru iguzo n’iru ndi madu we gwa ha na ibu orù Chineke, nālu ọlu dika onye-nchu-àjà.
Ákwà-nkukù-isi nke onye-isi-nchu-àjà nwere ihe di mbara nke ọla-edo nke atukwasiri n’eriri-nma anunu. Gini mere o ji buru anunu? N’ihi na Jisus zọputara ayi site n’ozi ọma nb͕aghara nmehie nile (Sachapuru Nmehie), n’ihi na O bupuru nmehie nile ayi we me kwa ayi ndi nēnweghi nmehie site na baptism Ya (ibikwasi aka n’isi na Testament Ochie, baptism na Testament Ọhu).
Ọbuná otù ayi si were ntukwasi-obi kwesie ike na Jisus, ayi apughi inwe ike inweta ihe di mbara nke eb͕uru n’elu-ya, ‘IHE NZỌ JEHOVA NWERE’ ma ọ buru na ewezuga ihe-nzuzo nke okwu nile nke ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie. 
Àyi si aṅa ghọ ndi ezi omume? Edeworo ya na Matiu 3:15, “Otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile.” Emere Jisus baptism we zọputa kwa ayi na nmehie nile nke uwa. N’ihi na emere Ya baptism we bupu kwa nmehie nile ayi, ayi ndi kwere ekwe ghọworo ndi ezi omume.
Àyi gēsi aṅa pu ikwu na ayi enweghi nmehie ma ọ buru na enweghi baptism Jisus? Ọbuná ma ọ buru na ayi kwere na Jisus, ọbuná ma ọ buru na ayi nētie nkpu, nēchè bayere ọnwu Ya n’Obe, anya-miri nile di n’uwa nka apughi isachapu nmehie nile ayi. É-è. Ọbuná otù ayi si tie nkpu we chèghari kwa, nmehie nile ayi gādigide nime ayi.
‘IHE NZỌ JEHOVA NWERE.’ N’ihi na O bupuru nmehie nile ayi site na baptism-Ya na ọbara-Ya, n’ihi na Chineke kweyere ka atukwasi nmehie nile nke ndi-nmehie n’aru Jisus, n’ihi na edekọ-kwa-ra okwu nke nzọputa na Bible, ayi ghọworo ndi ezi omume site n’okwukwe-ayi ọbuná adighi-ike nile ayi.
Ya mere, ub͕u a ayi puru iguzo n’iru Chineke. Ub͕u a ayi puru ibi ndu dika ndi ezi omume we kwusa kwa ozi ọma ahu nye uwa. “♪O, Azọputawo-gi. Azọputawom. Azọputawo ayi dum.♪” Azọputawo ayi dika ìzù Chineke di ebere si di.
Ewezuga okwu ozi ọma nkpuchi-nmehie n’obi-gi, enweghi nzọputa, ọbuná otù i si nwasie ike. O yiri abu nēwu ewu bayere ihu-n’anya nke enyeghachighi. “♫O, obim nākusi ike n’enweghi ihe mere ya mb͕e ọ bula m’huru-ya, oge nile m’nọ ya nso. Aghaghm inọ nime ihu-n’anya.♫” Obim nākusi ike, kama ọ bughi nke ya. Nke di nwuta nke-uku, ihu-n’anya bu ihe enyeghachighi.
Ndi nile nēchè na nzọputa nābia n’ọtutu uzọ di iche iche nye ndi di iche iche. Ha nāju, “Gini mere o geji buru site nání n’ozi ọma baptism Jisus?” Ọ buru na ọ biaghi site n’ozi ọma nke baptism Jisus, ọ bughi nzọputa zuru okè. Ọ bu nání uzọ ayi gēsi pu ighọ ndi ezi omume n’ebe Chineke nọ n’ihi na ọ bu nání uzọ agēsi pu isachasi nmehie nile ayi.
 
 
Gini Bu Nzọputa nke Ogho Anunu nke Jisus Nyere Ayi? 
 
Gini meworo ayi ndi ezi omume?
Ozi ọma nke ogho anunu, ogho, ododo na ogho uhie
 
Nzọputa sitere na ozi ọma nke ogho anunu, ogho ododo, na ogho uhie bu onyinye Chineke nye ndi madu dum. Onyinye a nyeworo ayi ike ibà n’ulo-ikwū ahu di nsọ we nēbi kwa n’udo. O meworo ayi ndi ezi omume. O meworo ayi ndi ezi omume we nye kwa ayi ike ibi nime nzukọ Kraist ewe nāzù ayi site n’okwu nile ahu di nsọ nime nzukọ Kraist.
Mb͕e ọ bula ayi nāga n’iru Chineke ikpe ekpere, ozi ọma ahu nāgọzi ayi site n’ihu-n’anya-Ya. Nka bu ihe mere nzọputa ji buru ihe di oké ọnu-ahia nye ayi. Jisus nāgwa ayi ka ewu ulo ‘n’elu oké nkume.’ Oké nkume ahu bu baptism Jisus. Ekwesiri izọputa ayi dum, were nzọputa bie ndu, ga n’Elu-igwe, nata ndu ebighi-ebi, we ghọ kwa umu Chineke. 
Ndi-eyì m’huru n’anya, n’ihi ozi ọma nkpuchi-nmehie, ayi nwere ike ibà nime ulo-ikwū ahu di nsọ site n’okwukwe. N’ihi isachapu nmehie nile ayi (baptism Jisus) ya na ikpé n’Obe, azọputawo-ayi site n’inwe okwukwe.
Nkpuchi-nmehie babigara ókè n’ihi nmehie nile ayi, baptism na ọbara Jisus, bu ozi ọma nke sachapuru nmehie nile ayi. Ì kwere na nka? Ezi ozi ọma ahu bu ozi ọma nkpuchi-nmehie nke elu-igwe nke sachapusiri nmehie nile ayi.
Amuwo ayi ọzọ site n’ikwere na ozi ọma nkpuchi-nmehie. Jisus nyeworo ayi ozi ọma nkpuchi-nmehie, nke sachapuru nmehie nile ayi nke kwa-ubọchi ọbuná nmehie nile nke ọdi-n’iru. Tonu Onye-nwe-ayi. Hallelujah! Ekele nile diri Onye-nwe-ayi.
Ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ (ozi ọma miri ahu na ọbara ahu) bu ezi ozi ọma nke Jisus Kraist kwuru okwu ya. Edeworo akwukwo a ka ewe kpughe ihe-nzuzo nke ozi ọma Jisus, ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ.
N’ihi na ọtutu madu kwere na Jisus we ghara kwa imazu ezi-okwu, ub͕u a ha nālu ọlu n’uwa nke nkà-nmụta-okpukpe nke Kristian (Ihe a anākpọ nkà ihe ọmuma nke nkà-nmụta-okpukpe); na npiakọta, ha nēbi ndu nime irọ-òtù na aghara. Ya mere, ayi kwesiri ilaghachi we kwe-kwa-ra n’ezi ozi ọma ahu. Ub͕u a oge akādighi anya.
Agamabà n’ihe a n’otù n’otù n’akwukwọ nke abua n’ihi ndi nwere ajuju bayere ozi ọma miri ahu na Mọ Nsọ.
 
Okwuchukwu a dịkwa n`ụdị ebook. Pịa na mkpuchi akwụkwọ n`okpuru.
ÀMUWO GI ỌZỌ N’EZIE SITE NA MIRI NA MỌ NSỌ? [Nbiputa Ntughari Ọhu]