Search

Mensagens de Vídeo de Colaboradores

Nụrụnu ozi ọma miri ahụ na Mọ Nsọ dịka edere na Bible. Nání site n`ozi ọma a ka a pụrụ ịzọpụta ayi.

  • Ndubuisi Okorie
  • Nigeria
  • 11/06/2023 9977

Ka Ayi Buru Ndi-ọlu Chineke, Ndi-nmechi Ntipú


Ayi nēbi ndu n’oge di nso n’ọgwugwu uwa. Oge a bu mb͕e nmehie nke ndi madu ri kariri nne, ikpé ziri ezi nke Chineke di kwa nso. Ufọdu ndi scientist gāra nke-ọma ikpuputa aturu, ‘Dolly’, ndi nile nọ na njikere inara ndi madu apkuru apku.
Ta, ha nēwu ulo-elu ọzọ nke Bebel. Oge nke ikpè-azu mb͕e ndi madu chọrọ ime ihe di otú a, Chineke b͕asara ha n’elu uwa dum me asusu-ha nile nọ n’aghara. Ub͕u a bu oge mb͕e Oké Nkpab͕u, ezi iwe nke Chineke, ka agāwusì n’oge nādighi anya  nye nkpuru-obi furu efu bu ndi amughi ọzọ rue ub͕u a.
Ya mere, m’nāriọ-gi ka ichuso akwukwọ a nke-ọma. M’nēkpe ekpere ka ‘amua gi ọzọ site na miri na Mọ Nsọ.’ Akwukwọ a nēkwusa ozi ọma ahu n’ezie dika edeworo-ya n’Akwukwọ Nsọ.
M’mara na onye ọ bula gumiri akwukwọ a nke-ọma aghaghi imu-ya ọzọ n’ezie. Jisus Onye-nwe ayi nāsi, “Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n`okwum, unu bu ndi nēso uzọm n`ezie; unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n`orù.” (Jọn 8:31-32). Kāb͕aputa-gi ka inwe kwa ndu ebighi-ebi nime Ya!
Ka ayi lukọ ọlu nke Nna ka ewe zọputa nkpuru-obi nile furu efu site n’ikwusa ‘ozi ọma miri ahu na ọbara ahu.’ Enwerem olile-anya n’ezie na ezi ozi ọma ahu gēnwupu n’uwa nile ọzọ. M’mara na ezi ozi ọma gēme ka i mechie ntipú okwukwe Kristian ub͕u a site n’ezi okwu nile.
“Ndi gēsi n`aru-gi puta gēwu kwa ebe nile bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: ntọ-ala nke ọtutu ọb͕ọ ka i gēwuli; agākpọ kwa gi Onye-nmechi ntipú, Onye-nkwazi okporo-uzọ ibi ebi.” (Aisaia 58:12)
Ọtutu nime unu amaghi n’ezie ozi ọma imu ọzọ site na miri na Mọ Nsọ. Ya mere, m’nwara itukwasi oké mkpà na ozi ọma nke baptism Jisus ahu na Obe Ya n’okwuchukwu nile.
Ọ bururi na baptism Jisus ahu adighi, ọnwu-Ya n’Obe enweghi isi nye ayi dum. Ihe ndia mere ka m’lekwasiri anya nke-uku na baptism Ya nēwepughi aka.
Isim bu ime ka ọ di ọcha. Rue mb͕e agēwere ozi ọma nke miri ahu (baptism Jisus ahu) na Mọ Nsọ gọzie unu dum, m’chọrọ ikwughari-ya nye unu nēwepughi aka.
M’nēle anya n’inu ọku obi na unu nile gēkwere na ozi ọma nke baptism-Ya na ọbara ka ewe zọputa unu na nmehie. M’mara na akwukwọ a gēduru unu rue imu ọzọ site na miri na Mọ Nsọ.